Dabere n’Ike nke Chineke Nyeworo
Isi Ihe Ndị Sitere na Timoti nke Abụọ
JEHOVA na-enye ndị ohu ya ike iji nagide ule na mkpagbu dị iche iche. Leekwa nnọọ ka o si dị Timoti na ndị Kraịst ndị ọzọ mkpa inweta ike nke Chineke nyeworo! Otu ọkụ ọgbụgba repịara Rom n’Afọ 64 O.A., e busakwara otu akụkọ na ọ bụ Onye Ọchịchị Alaeze Ukwu bụ Nero kpatara ya. Iji wee chebe onwe ya, o boro ya ndị Kraịst, ma eleghị anya nke a kpalikwara oké mkpagbu. Ma eleghị anya, n’oge ahụ (ihe dị ka 65 O.A.), a tụkwara Pọl onyeozi mkpọrọ ọzọ na Rom. Ọ bụ ezie na ọ na-eche ọnwụ ihu, ọ bụ mgbe ahụ ka o dere akwụkwọ ozi nke abụọ o degaara Timoti.
Akwụkwọ ozi Pọl kwadebere Timoti iguzogide ndị dapụrụ n’ezi ofufe ma guzosie ike n’agbanyeghị mkpagbu. Ọ gbara ya ume ịnọgide na-enwe ọganihu ime mmụọ, kwuokwa banyere ọnọdụ Pọl n’ụlọ mkpọrọ. Akwụkwọ ozi ahu na-enyekwara ndị na-agụ ya aka ịdabere n’ike nke Chineke nyeworo.
Hụjuo Anya, Jirikwa Ịdị Nwayọọ Na-ezi Ihe
Chineke na-enye ike anyị ji na-anagide mkpagbu dị ka ndị na-ekwusa ozi ọma. (1:1-18) Ọ dịghị mgbe ọ bụla Pọl chefuru Timoti n’ekpere ya, o chetakwara okwukwe ya nke ihu abụọ na-adịghị ya. Chineke nyere Timoti, ‘ọ bụghị mmụọ nke ụjọ, kama ọ bụ nke ike, ịhụnanya, na uche zuru okè.’ Ya mere ka ihere ghara ime ya n’ịgba àmà na ịhụju anya n’ihi ozi ọma ahụ. A gbakwara ya ume ka o “jide ihe ilereanya nke okwu na-enye ezi ndụ” nke ọ nụrụ n’ọnụ Pọl, dịkwa ka anyị kwesịrị ịrapagidesi ike n’eziokwu ndị Kraịst nke bụ ezie ọ bụ ezie na ndị ọzọ na-echigharị pụọ na ya.
A ga-ewere ihe nile Pọl kụziri nyefee ndị ikom kwesịrị ntụkwasị obi ka ha kụziekwara ha ndị ọzọ. (2:1-26) A gbara Timoti ume ka ọ bụrụ onye agha ọma nke Kraịst, na-ekwesị ntụkwasị obi mgbe ọ na-ahụju anya. Pọl n’onwe ya tara ahụhụ n’agbụ ụlọ mkpọrọ n’ihi ikwusa ozi ọma ahụ. Ọ gbara Timoti ume ka o mee ihe nile o nwere ike ime iji chee onwe ya n’ihu mmadụ dị ka onye ọrụ Chineke nke a nwapụtaworo, na-ajụ okwu na-abaghị n’ihe ndị na-emerụ ihe dị nsọ. A gwakwara ya na onye bụ ohu nke Onyenwe anyị aghaghị iji ịdị nwayọọ na-ezi ndị ọzọ ihe.
Kwusaa Okwu ahụ!
Ọ ga-adị mkpa inwe ike nke Chineke na-enye iji wee chee mgbe ikpeazụ ahụ ihu ma kwadosie eziokwu nke Akwụkwọ nsọ ike. (3:1-17) N’etiti ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke ka ndị ikom ga-esi bilite, bụ́ “ndị na-amụ ihe mgbe nile, ma ha apụghị ịbịaru ịmazu eziokwu mgbe ọ bụla.” Ndị nile dị otú ahụ, bụ́ “ajọ mmadụ nile na ndị aghụghọ ga na-aga n’ihu n’ịjọkarị njọ, na-eduhie ndị ọzọ, a na-eduhiekwa ha.” Otú ọ dị, Timoti ‘ga-anọgide n’ime ihe nile ọ mụtaworo.’ Otú ahụkwa ka anyị kwesịrị ime, na-amara na “ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta, ọ bakwara uru iji zie ihe, na iji tụọ mmadụ mmehie ha n’anya, na iji mee ka uche mmadụ guzozie, na iji zụpụta nzụpụta nke dị n’ezi omume: ka onye nke Chineke wee zuo okè, onye e meworo ka o zuo okè ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla.”
Timoti ga-eguzogide ndị si n’ezi ofufe dapụ, jezuokwa ozi ya. (4:1-22) Ọ pụrụ ime nke ahụ site ‘n’ikwusa okwu ahụ’ na ịnọgidesi ike na ya. Nke a dị oké mkpa, ebe ọ bụ na ọgbakọ ahụ na-eche ‘oge ihe isi ike’ ihu n’ihi na ụfọdụ ndị na-ezi ozizi ụgha. Ndịàmà Jehova na-arapagidesikwa ike n’Okwu Chineke ugbu a, na-ekwusa ya ngwa ngwa n’ime ọgbakọ nakwa nye ndị nọ n’èzí, ọbụna n’oge ọnọdụ na-adịchaghịrị ha mma. Pọl ‘debere okwukwe ahụ,’ ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị gbakụtara ya azụ. Ma ‘Onyenwe anyị mere ka ọ dị ike, ka e wee site n’ọnụ ya kwusazuo nkwusa ahụ.’ Ka anyị onwe anyị na-adaberekwa n’ike nke Chineke nyeworo, nọgidekwa na-ekwusa ozi ọma ahụ.
Igbe/Foto dị na peeji nke 31]
Onye Agha Ọma: Pọl gbara Timoti ume, sị: “Soo m hụjukọọ anya, dị ka onye agha ọma nke Kraịst Jisọs. Ọ dịghị onye agha ọ bụla na-atụhị onwe ya n’ihe nke ibi obi a mgbe ọ na-ebu agha; ka o wee mee ihe ga-atọ onye dere aha ya n’akwụkwọ dị ka onye agha.” (2 Timoti 2:3, 4) Onye agha Rom nke ji ụkwụ aga ‘na-ahụju anya’ mgbe ọ na-ebu ihe agha ndị dị arọ, anyụike, nkata, nri ọ ga-eri ruo ụbọchị atọ, nakwa ihe ndị ọzọ. (Akwụkwọ Josephus bụ Wars of the Jews, Akwụkwọ 3, isi 5) Ọ dịghị achụso ọdịmma dị iche iche nke azụmahịa, n’ihi na nke ahụ agaghị atọ onye isi ya ụtọ, a na-ewetakwa ego e ji eme mmefu ya nile. N’otu aka ahụ, onye Kraịst na-ata ahụhụ ọnwụnwa ndị e jikọtara ha na ịbụ “onye agha ọma nke Kraịst.” Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịrụ ọrụ ego iji wee rụzuo ibu ọrụ ya ndị Akwụkwọ nsọ kwadoro, o kwesịghị ikwe ka imikpubiga onwe ya ókè n’ịchụso ihe onwunwe mee ka ọ kwụsị ibu agha ime mmụọ ahụ. (1 Ndị Tesalọnaịka 2:9) N’ịgba àmà site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ọ na-eji “mma agha nke mmụọ nsọ, nke bụ okwu Chineke,” na-eme ihe, na-enyekwa aka ịtọhapụ ụmụ mmadụ site ná nduhie nke okpukpe. (Ndị Efesọs 6:11-17; Jọn 8:31, 32) Ebe ọ bụ na ndụ nọ n’ihe ize ndụ, ka ndị agha nile bụ ndị Kraịst nọgide na-eme ihe ga-atọ Jisọs Kraịst na Jehova Chineke ụtọ n’ụzọ dị otú a.