Jigide Okwukwe na Ezi Akọ na Uche
Isi Ihe Ndị Sitere na Timoti nke Mbụ
N’IHE dị ka afọ 56 O.A., Pọl onyeozi dọrọ ndị okenye nke ọgbakọ Efesọs aka ná ntị na “agụ jọgburu onwe ha” ga-ebilite n’etiti ha “na-ekwu ihe dị iche iche na-eduhie mmadụ ụzọ, ka ha dọpụ ndị na-eso ụzọ Jisọs iso ha n’azụ.” (Ọrụ 20:29, 30) N’ime afọ ole na ole, ozizi nke ndị dapụrụ n’ezi ofufe esiwo ike nke ukwuu nke na Pọl gbara Timoti ume ka o buo agha ime mmụọ n’ime ọgbakọ iji chebe ịdị ọcha ya nakwa iji nyere ndị kwere ekwe ibe ya aka ịnọgide n’okwukwe ahụ. Nke ahụ bụ otu isi ihe mere Pọl ji dee akwụkwọ ozi mbụ o degaara Timoti site na Masedonia n’ihe dị ka afọ 61-64 O.A.
Ọ gwara Timoti okwu banyere ihe bụ ọrụ onye okenye, ọnọdụ Chineke kenyere ndị inyom, iru eru nke ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi, na ihe ndị ọzọ. Ntụziaka dị otú ahụ bakwara uru taa.
Agbamume maka Okwukwe
Pọl ji ndụmọdụ banyere ijigide okwukwe na ezi akọ na uche meghee okwu ya. (1:1-20) Ọ gbara Timoti ume ka ọ nọgide n’Efesọs ma “nye mmadụ ụfọdụ iwu ka ha ghara izi ihe dị iche.” Pọl nwere ekele maka ije ozi ahụ nke e kenyere ya, na-ekwupụta na ya mere ihe n’amaghị ihe nakwa n’enweghị okwukwe mgbe ọ kpagburu ndị na-eso ụzọ Jisọs. Onyeozi ahụ gwara Timoti ka ọ gaa n’ihu n’ibu agha ime mmụọ, “na-enwe okwukwe na ezi akọ na uche,” gharakwa iyi ndị ahụ ‘ụgbọ ha kpuworo n’ebe okwukwe ha dị.’
Ndụmọdụ n’Ihe Banyere Ife Ofufe
Ọzọkwa, Pọl nyere ndụmọdụ dị ka “onye ozizi nke ndị mba ọzọ n’ime okwukwe na eziokwu.” (2:1-15) E kwesịrị ikpe ekpere banyere ndị nọ n’ọkwa dị elu ka ndị Kraịst wee nwee ike ịdị ndụ n’udo. Ọ bụ nzube Chineke ka a zọpụta ụdị mmadụ nile, otu ozizi dịkwa oké mkpa bụ na Kraịst “nyere onwe ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ihi mmadụ nile.” Pọl gosiri na onye bụ nwanyị kwesịrị iji imeru ihe n’ókè chọọ onwe ya mma, gharakwa inwe ike n’ebe nwoke nọ.
A ghaghị ịhazi ọgbakọ nke ọma. (3:1-16) Ya mere Pọl setịpụrụ iru eru a chọrọ maka ndị nlekọta na ndị ohu na-eje ozi. Site n’ihe ndị onyeozi ahụ dere, Timoti ga-ama ụzọ ọ ga-esi duzie onwe ya n’ime ọgbakọ, bụ́ “ide na ntọala nke eziokwu.”
Pọl nyere Timoti ndụmọdụ onwe onye iji nyere ya aka ịnọ na nche megide ozizi ụgha. (4:1-16) Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, ụfọdụ gaje ịdapụ site n’okwukwe ahụ. Ma site n’ilezi onwe ya na ozizi ya anya, Timoti ‘ga-azọpụta onwe ya na ndị na-ege ya ntị.’
Timoti natakwara ndụmọdụ n’ihe banyere imeso ndị mmadụ ihe n’otu n’otu, ma ụmụntakịrị ma ndị okenye. (5:1-25) Dị ka ihe atụ, a ga-eme ndokwa kwesịrị ekwesị maka ndị inyom di ha nwụrụ, bụ́ ndị meworo okenye karị, ndị a na-agbakwara àmà ọma dị ka ndị Kraịst. Kama ịnọ na-agbagharị àsị̀rị̀, ndị inyom di ha nwụrụ ndị ka bụ ụmụ agbọghọ kwesịrị ịlụ di ma mụọ ụmụ. A ga-ele ndị okenye, bụ́ ndị na-arụ ọrụ nlekọta ha n’ụzọ ziri ezi anya dị ka ndị kwesịrị inweta nsọpụrụ okpukpu abụọ.
Nsọpụrụ Chineke na Inwezu Ihe Dị Mkpa
E ji ndụmọdụ metụtara inwe nsọpụrụ Chineke mechie akwụkwọ ozi Pọl. (6:1-21) “Nsọpụru Chineke, ya na inwezu ihe nile dị mkpa” bụ ụzọ irite uru nke ukwuu, ma ikpebisi ike ịba ọgaranya na-eduje ná mbibi na ịla n’iyi. Pọl gbara Timoti ume ka ọ gbaa mgba ọma nke okwukwe ahụ, ‘jidesiekwa ndụ ebighị ebi ike.’ Iji wee jide ndụ ahụ nke bụ ndụ n’ezie aka, ndị bara ọgaranya ekwesịghị “ịtụkwasị obi n’ihe ahụ a na-ejighị aka, bụ́ akụ, kama ka ha tụkwasị obi na Chineke.”
Igbe/Foto dị na peeji nke 30]
Ndị A Ga-esite n’Ọmụmụ Nwa Zọpụta: Pọl adịghị ekwu ihe banyere nzọpụta gaa ná ndụ ebighị ebi kama ọ bụ ọrụ kwesịrị ekwesị nke dịịrị nwanyị nke na-asọpụrụ Chineke ka ọ na-ekwu okwu banyere ya mgbe o dere, sị: “A ga-esite n’ọmụmụ nwa zọpụta ya, ma ọ bụrụ na ha anọgide n’ime okwukwe na ịhụnanya na odido nsọ, ya na uche zuru okè.” (1 Timoti 2:11-15) Site n’ịmụ nwa, ilekọta ụmụ ya, na ilekọta ụlọ anya, a ‘ga-azọpụta’ nwanyị pụọ n’ịbụ onye na-agba àsị̀rị̀ nke na-ejighị ọrụ n’aka na onye na-etinye anya n’ihe na-agbasaghị ha. (1 Timoti 5:11-15) Ọrụ ọ na-arụ n’ụlọ ga-atụkwasị ihe n’ozi ọ na-ejere Jehova. N’eziokwu, ndị Kraịst nile kwesịrị iche omume ha nche, jirikwa oge ha mee ihe n’ụzọ amamihe.—Ndị Efesọs 5:15, 16.