Otu Ihe Omimi Dị Nsọ Amalite Imeghe
“Ọ bụkwa ihe a na-ekwupụta na ọ dị ukwuu, bụ́ ihe omimi nke nsọpụrụ Chineke.”—1 TIMOTI 3:16.
1. Ihe omimi dị aṅaa ka a kọwara na 1 Timoti 3:16?
IHE ndị dị omimi hà na-akpali mmasị gị? Ọ̀ na-amasị gị inyoba anya iji ghọta ihe nzuzo dị iche iche? Ọ na-amasị ihe ka ọtụtụ n’ime anyị! Ya bụrụ otú ahụ, sonyere anyị ka anyị na-enyocha otu n’ime ihe omimi ndị kasị ukwuu—bụ́ ihe omimi nke e zochiri n’ime Okwu Chineke ruo ọtụtụ puku afọ ugbu a. Ihe omimi nke a dị nsọ metụtara ndụ anyị n’ụzọ dị mkpa, ma ndụ nke ugbu a ma nke ọdịnihu. Ọ bụ “ihe omimi nke nsọpụrụ Chineke,” nke a kọwaara anyị na 1 Timoti 3:16. Lee ka anyị ga-esi nwee obi ekele nye Jehova, bụ́ ‘onye na-ekpughe ihe nzuzo nile,’ maka iji amara ya mee ka anyị mara ihe omimi nke a dị ebube na nkọwa ya!—Daniel 2:28, 29
2. (a) Olee mgbe mbụ Jehova kwuru okwu banyere ihe omimi, gịnịkwa ka o kwere nkwa ya n’oge ahụ? (b) Ajụjụ dịgasị aṅaa chọrọ ka a zaa ha?
2 Mgbe mbụ Jehova kwuru okwu banyere ihe omimi dị nsọ bụ mgbe Agwọ ahụ duhiesịrị Iv, Adam wee sorokwa ya banye ná nnupụisi. Mgbe ahụ, Jehova kwere nkwa na “mkpụrụ” ma ọ bụ nwa ahụ gaje ịzọpịa isi Agwọ ahụ. (Jenesis 3:15) Ònye bụ Mkpụrụ ahụ? Olee ụzọ ọ ga-esi merie Agwọ ahụ? Ọ̀ ga-akwado ịbụ onye eziokwu nke Chineke na nzube Ya n’ebe elu ala nke a dị?
3. Amụma dị iche iche ndị sitere n’aka Chineke nyere ihe àmà dịgasị aṅaa banyere ihe a ga-eji mata Mkpụrụ ahụ na ọrụ ya?
3 Mgbe oge na-aga, amụma dị iche iche ndị sitere n’aka Chineke nyere ihe àmà banyere ihe a ga-eji mata Mkpụrụ ahụ nakwa ọrụ ọ ga-arụ n’ọdịnihu. Ọ gaje ịbụ onye si n’usoro ọmụmụ Abraham, ọ ga-eketa alaeze Devid, a ga-akpọ ya Onyeisi Udo. “Ọ dịghị ọgwụgwụ ọ bụla ịba ụba nke ịbụ onyeisi ya na udo ya ga-agwụ.” (Aịsaịa 9:6, 7; Jenesis 22:15-18; Abụ Ọma 89:35-37) Ma, dị ka Ndị Rom 16:25 na-asị, ihe omimi ahụ dị nsọ bụ nke ‘e meworo ka o kpuchie ọnụ n’oge ebighị ebi.’
Ikpughe Ihe Omimi ahụ
4. Olee otú ihe omimi ahụ dị nsọ si malite imeghe n’afọ 29 O.A.?
4 N’ikpeazụ, mgbe puku afọ anọ gasịrị, e mere ka e nweta nghọta ya na mberede! Ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa? N’afọ 29 O.A., Jọn mere Jisọs onye Nazaret baptism n’Osimiri Jọdan, olu Chineke sitekwara n’eluigwe kwupụta, sị: “Onye a bụ Ọkpara m m hụrụ n’anya, onye ihe ya dị m ezi mma.” (Matiu 3:17) Aa, n’ikpeazụ, nke a bụ Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa! Ihe omimi ahụ dị nsọ amalitewo imeghe n’akụkụ ya nile dị ebube, gụnyere n’okwu metụtara nsọpụrụ Chineke.
5. Gịnị bụ “nsọpụrụ Chineke,” oleekwa otú o si emetụta ndị na-agbaso ya?
5 Gịnị ka anyị na-aghọta site n’okwu ahụ bụ́ “nsọpụrụ Chineke”? N’akụkụ Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, okwu ahụ pụtara nanị iri ugbo abụọ, ihe karịrị ọkara n’ime ndị a pụtara n’akwụkwọ ozi abụọ ahụ Pọl degaara Timoti. Akwụkwọ bụ́ Insight on the Scriptures kọwara “nsọpụrụ Chineke” dị ka “nsọpụrụ dị omimi, ofufe, na ijere Chineke ozi, na-ekwesị ntụkwasị obi nye ịbụ ọkaaka eluigwe na ala ya.” Nsọpụrụ dị omimi na-esite n’obi nke na-adọta mmadụ nso n’ebe Chineke nọ, na-enwe oké egwu nke ịdị ebube ya, ịdị ebighị ebi ya, na ịdị ọtụtụ nke oké ihe okike ya dị iche iche, na-enwekwa ekele maka onyinye ime mmụọ na nke anụ ahụ ndị ọ na-ezokwasị ụmụ mmadụ ndị nwere ekele dị ka mmiri. N’ezie, onye ọ bụla n’ime anyị nke nwere nsọpụrụ Chineke pụrụ ikwu, dị ka onye ọbụ abụ ahụ kwuru n’Abụ Ọma 104:1, sị: “Gọzie Jehova, mkpụrụ obi m. Jehova, Chineke m, ị dị ukwuu nke ukwuu; ebube na ịma mma ka i yiriworo dị ka uwe.”
6. Olee ụzọ ndị na-efe Jehova si dị iche site ná ndị Krisendọm na-abịa nanị ịnọdụ ala? (b) Gịnị ka Pọl kwuru ná Ndị Rom 11:33, 34, oleekwa ajụjụ ndị nke a na-ewelite?
6 Anyị aghaghị ime ngosipụta nke nsọpụrụ Chineke anyị, a na-emekwa nke a site n’omume. N’ihe banyere nke a, ndị na-efe ezi Chineke ahụ bụ́ Jehova dị nnọọ iche site ná ndị na-abịa nanị ịnọdụ ala n’ime chọọchị nile na-adakpọ adakpọ nke Krisendọm. Nye ọtụtụ ndị nọ n’elu ala, okpukpe—ma ọ bụrụ na ha ka nwere okpukpe—bụ nnọọ ihe a na-eme iji mezuo iwu, uwe nke a na-eyikwasị iji mee ka à ga-asị na ha dị nsọ ebe ha na-ebi ndụ nke kwekọrọ n’ụwa rụrụ arụ nke ha bi n’ime ya. Ha amaghị ọbụna onye Chineke bụ. N’ụzọ doro anya, ọ dị mkpa ka ndị dị otú a tụlee okwu Pọl nke dị n’Ọrụ Ndị Ozi 17:23, mgbe ọ gwara ndị Atens ahụ na-asọpụrụ chi nke ha na-amaghị ama, sị: “Ihe unu na-asọpụrụ n’amaghị ama, nke a ka mụ onwe m na-ekwusara unu.” N’ihe banyere Chineke ahụ dị ebube, Pọl tipụrụ mkpu ná Ndị Rom 11:33, 34, sị: “Aa! Omimi nke akụ nke amamihe na nke ihe ọmụma kwa nke Chineke! Lee otú a na-enweghị ike ịchọpụta ikpe ya nile, otú a na-enweghịkwa ike ịtụpụta ụzọ ya nile! N’ihi na ònye maara uche [Jehova, NW] ma ọ bụ ònye pụtara ịbụ onye ya na ya na-agba izu?” Ya mere, olee otú anyị si wee mara ụzọ nile nke Chineke? Ọ bụ site n’ịmụ ihe banyere “ihe omimi nke nsọpụrụ Chineke.” Ma olee ụzọ anyị ga-esi mee nke ahụ?
7. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ‘ọ dị ukwuu n’ezie bụ́ ihe omimi dị nsọ nke nsọpụrụ Chineke’?
7 Na Timoti nke Mbụ isi 3, Pọl onyeozi bu ụzọ setịpụ ihe a chọrọ n’aka ndị ohu a tụkwasịrị obi n’ime ezinụlọ Chineke, nke a kọwara n’amaokwu 15 dị ka “nzukọ nke Chineke dị ndụ, bụ́ ide na ntọala nke eziokwu.” Mgbe ahụ, Pọl kwukwara, n’amaokwu 16, sị: “Ọ bụkwa ihe a na-ekwupụta na ọ dị ukwuu, bụ́ ihe omimi nke nsọpụrụ Chineke.” Ọ dị ukwuu n’ezie n’ihi na Jehova zitere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya n’elu ala iji kpughee ihe omimi nke a, iji gosi ihe nsọpụrụ Chineke bụ n’ezie na ụzọ o si dị oké mkpa, bụrụ isi ihe, n’ezi ofufe. Ndụ Jisọs dịrị n’elu ala ebe a mere ka ihe omimi nke a nke nsọpụrụ Chineke pụta ìhè. Ndị nile hụrụ Jehova n’anya aghaghị iwukwasị okwukwe na ndụ ha n’elu Kraịst, bụ́ onye mere ezi ihe nlereanya nke nsọpụrụ Chineke. N’ihi ya, olee ụzọ Jisọs si mee ka ihe omimi dị nsọ nke nsọpụrụ Chineke doo anya?
Akụkụ Isii
8. (a) Olee akụkụ isii dị n’ihe omimi ahụ dị nsọ Pọl kọwara na 1 Timoti 3:16? (b) Ònye bụ “Onye ahụ” e mere ka ọ pụta ìhè?
8 Site n’ike mmụọ nsọ Chineke, Pọl na-aza ajụjụ ahụ. N’ebe a, na 1 Timoti 3:16, ọ kọwara akụkụ isii nke ihe omimi dị nsọ nke a, na-sị: “Onye ahụ nke [1] e mere ka ọ pụta ìhè n’anụ ahụ, [2] nke a gụrụ ya n’onye ezi omume n’ime mmụọ, [3] nke e mere ka ndị mmụọ ozi ya hụ ya anya, [4] nke e kwusara ya n’etiti ndị mba ọzọ, [5] nke e kweere na ya n’ime ụwa, [6] nke a naara ya n’elu n’ime ebube.” Ònye bụ “onye” ahụ nke e mere ka ọ pụta ìhè? O doro anya na “onye” ahụ bụ Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa, bụ́ Jisọs, onye bịara ime uche Chineke. Ọ bụ onye bụ isi n’ihe omimi ahụ dị nsọ, na-eme ka ọ dị ukwuu n’ezie.
9. Ihe àmà dị aṅaa ka e nwere nke na-egosi na 1 Timoti 3:16 ekwesịghị ịgụ, sị: “Chineke pụtara ìhè n’anụ ahụ”?
9 Ndị na-ezi ozizi Atọ n’Ime Otu na-agbalị ịgwagbu nghọta nke ihe omimi nke a site n’ikwu na “Onye ahụ” nke dị na 1 Timoti 3:16 bụ Chineke n’onwe ya. Ha na-adabere nke a ná nsụgharị Bible King James nke na-agụ, sị, “Chineke pụtara ìhè n’anụ ahụ.” Otú ọ dị, gịnị ka ihe odide Grik ndị kasị kwesị ntụkwasị obi na-ekwu? Ha nile nọgidere na-eji okwu nnọchiaha ahụ bụ́ “onye” kama iji “Chineke” na-eme ihe. Ndị na-enyocha ihe odide ihe na-ekwerezi ugbu a na ntinye e tinyere “Chineke” n’akụkụ akwụkwọ nsọ nke a bụ ndehie ihe. Otú a, nsụgharị ndị nke katụ ọhụrụ, ndị dị ka American Standard Version, The New English Bible, na New World Translation na-agụ n’ụzọ ziri ezi, sị: ‘E mere ya [ma ọ bụ, Ya, onye e mere] ka ọ pụta ìhè n’anụ ahụ.’ Ee e, ọ bụghị Chineke n’onwe ya ka a hụrụ anya “n’anụ ahụ.” Kama nke ahụ, ọ bụ Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya na ihe mbụ o kere eke, onye Jọn onyeozi dere banyere ya, sị: “Okwu ahụ wee ghọọ anụ ahụ bụ́ mmadụ, o wee biri n’etiti anyị, (anyị kirikwara otuto ya, bụ́ otuto dị ka nwa nwoke a mụrụ nanị ya na-anata n’aka nna ya), o jupụtara n’amara na eziokwu.”—Jọn 1:14.
“E Mere Ka Ọ Pụta Ihe n’Anụ Ahụ”
10. (a) Olee ụzọ akụkụ mbụ nke ihe omimi ahụ dị nsọ si pụta ìhè n’oge e mere Jisọs baptism? (b) N’ihi gịnị ka Jisọs ji ghọọ “Adam ikpeazụ” ahụ?
10 Mgbe e mere Jisọs baptism, akụkụ nke mbụ nke ihe omimi ahụ dị nsọ pụtata ìhè: “E mere ka [Jisọs] pụta ìhè n’anụ ahụ” dị ka Ọkpara Chineke e tere mmanụ. Jehova Chineke sitere n’eluigwe bufee ndụ nke Ọkpara ya gaa n’akpa nwa nke Meri ka e wee mụọ Jisọs n’anụ ahụ dị ka mmadụ zuru okè. Otú a, dị ka 1 Ndị Kọrint 15:45-47 na-egosi, Jisọs ghọrọ Adam nke abụọ, ma ọ bụ nke “ikpeazụ,” bụ́ mkpụrụ obi mmadụ zuru okè nke kwekọrọ kpọmkwem n’Adam nke mbụ ahụ. Ọ̀ bụ maka nzube dị aṅaa? Timoti nke Mbụ 2:5, 6 na-ezo aka n’ebe “Adam ikpeazụ” ahụ nọ dị ka “mmadụ, bụ́ Kraịst Jisọs, onye nyere onwe ya ka ọ buru ihe mgbapụta n’ihi mmadụ nile.” N’ihe ndabere nke a iwu kwadoro nke àjà mmadụ zuru okè, Jisọs bụ onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ n’ebe 144,000 mmadụ nọ, bụ́ ndị ga-aghọ ndị ha na ya na-eketakọ ihe n’Alaeze ya. Mkpughe 14:1-3.
11. N’ebe ole ndị nọ ka abamuru nile nke àjà mgbapụta Jisọs gbasaruru?
11 Ndị ọzọ hà ga-eritekwa uru site n’ọnwụ ọchụchụ àjà nke Jisọs nwụrụ? Ee, kpọmkwem! Jọn nke Mbụ 2:2 na-asị na Jisọs Kraịst bụ “ihe ịjụrụ Chineke obi banyere mmehie nile anyị [ya bụ, mmehie nile nke ndị Kraịst e tere mmanụ dị ka Jọn]; ma ọ bụghị ihe ịjụrụ ya obi banyere nanị mmehie nke anyị onwe anyị, kama ọ bụkwa ihe ịjụrụ ya obi banyere mmehie nke ụwa dum.” Otú a, abamuru nile nke àjà mgbapụta Jisọs na-agbasapụ metụta ihe karịrị 114,000 ndị Kraịst ahụ e tere mmanụ ruo n’ebe ụwa dum nke ihe a kpọrọ mmadụ nọ. “Oké ìgwè mmadụ” nke ndị dị ndụ ugbu a nakwa ọtụtụ ijeri mmadụ ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ n’elu ala nke bụ́ Paradaịs gaje inwe ndụ ebighị ebi n’ihe ndabere nke okwukwe ha nwere n’àjà mgbapụta Jisọs. Ka ọ dị ugbu a, dị ka e buru n’amụma ná Mkpughe 7:9, 10, oké ìgwè mmadụ ahụ asawo uwe mwụda ha, meekwa ka ha dị ọcha site n’itinye okwukwe n’ọbara nke Nwa Atụrụ ahụ a wụfuru, bụ́ Jisọs Kraịst. A na-agụ ha ná ndị ezi omume iji bụrụ ndị enyi Chineke. Ha ji ọṅụ na-amụta akụkụ dị iche iche nke ihe omimi ahụ dị nsọ, na-egosipụtakwa nsọpụrụ Chineke n’ụzọ kwekọrọ n’ihe nlereanya nke Jisọs!
Akụkụ Ndị Ọzọ
12. Olee ụzọ e si ‘gụọ Jisọs n’onye ezi omume n’ime mmụọ’?
12 Ugbu a, gịnị banyere akụkụ nke abụọ ahụ dị na 1 Timoti 3:16? “A gụrụ [Jisọs] n’onye ezi omume n’ime mmụọ.” Ma ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa? Site na Jehova ịkpọlite Ọkpara ya nke na-ekwesị ntụkwasị obi site ná ndị nwụrụ anwụ gaa n’ịdị ndụ dị ka mmụọ. Nke a pụtara na Chineke weere ya na Jisọs bụ nnọọ onye ezi omume n’akụkụ nile, ruokwa eru inweta ọrụ ndị ọzọ dị elu karị. Dị ka Ndị Rom 1:4 si kwuo ya, Jisọs bụ “onye a kaworo ịbụ Ọkpara Chineke n’ike, dị ka mmụọ nke ịdị nsọ si dị, site ná mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ.” N’ịkwado nke ahụ, Pita na-agwa anyị n’akwụkwọ ozi mbụ ya, isi 3, amaokwu 18, sị: “Kraịst hụkwara ahụhụ banyere mmehie, nanị otu mgbe, onye ezi omume n’ihi ndị ajọ omume, ka o wee kuru anyị bịakwute Chineke; n’ihi na e mere ka ọ nwụọ anwụ n’anụ ahụ ya, ma e mere ka ọ dị ndụ ná mmụọ ya.” Ihe nlereanya Jisọs nke nsọpụrụ Chineke ọ̀ na-ekuru gị bịakwute Chineke?
13. Olee mmụọ ozi ndị e mere ka ha hụ Jisọs ahụ e meworo ka o si n’ọnwụ bilite anya, oleekwa ụdị ozi o kwusaara ha?
13 N’ịga n’ihu na 1 Timoti 3:16, Pọl gara n’ihu wee zoo aka n’akụkụ nke atọ nke ihe omimi ahụ dị nsọ, na-asị na “e mere ka ndị mmụọ ozi hụ [Jisọs] anya.” Olee ndị bụ ndị mmụọ ozi ndị a? N’ihe banyere Jisọs, bụ́ onye ‘e meworo ka ọ dị ndụ ná mmụọ ya,’ Pita dere na 1 Pita 3:19, 20, sị: “Ọ bụkwa n’ime ya ka ọ gara wee kwusaara ndị mmụọ nọ n’ụlọ mkpọrọ okwu, ndị na-ekwenyeghị n’oge gara aga, mgbe ogologo ntachi obi Chineke na-echesi ike n’ụbọchị Noa.” Dị ka Jud amaokwu 6 si kwuo, ndị mmụọ ndị ahụ bụ “ndị mmụọ ozi ndị na-edebeghị ịbụ isi nke aka ha, kama ha hapụrụ ebe obibi nke aka ha” n’eluigwe. Ha yikwasịrị anụ ahụ mmadụ ka ha wee soro ndị inyom kporie ndụ nke mmekọahụ na-ezighị ezi. Mgbe Iju Mmiri ahụ manyere ndị mmụọ ozi ndị a ịlaghachi n’ógbè ebe ndị bụ́ mmụọ, a tụbara ha na Tatarọs, bụ́ ọnọdụ nke mweda n’ala zuru ezu. (2 Pita 2:4) Jisọs ahụ e meworo ka o si n’ọnwụ bilite kwusaara ha ozi ọma. Nke ahụ ọ̀ bụ ozi nzọpụta? Ọ bụghị ya ma ọlị! Kama nke ahụ, Jisọs katọrọ ajọ omume ha ịbụ kpọmkwem ihe megidere nsọpụrụ Chineke. Onye ọ bụla n’etiti ndị Chineke, bụ́ onye ji mmekọahụ na-ezighị ezi na-egwuri egwu taa kwesịrị ịnara ịdọ aka ná ntị site n’ikpe a mara ndị mmụọ ozi ndị ahụ!
14. Olee otú o si bụrụ na ozi ọma ahụ banyere Jisọs bụ nke a malitere ‘ikwusa n’etiti ndị mba ọzọ’?
14 Akụkụ nke anọ nke 1 Timoti 3:16 bụ na “e kwusara [Jisọs] n’etiti ndị mba ọzọ.” Olee ụzọ e siworo mezuo nke a? N’oge na-adịghị anya tupu e jide ya, Jisọs gwara ndị ozi ya, sị: “N’ezie, n’ezie, asị m unu, Onye na-ekwere na mụ, ọrụ mụ onwe m na-arụ ka onye ahụ ga-arụkwa; ọrụ ka ndị a ukwuu ka ọ ga-arụkwa; n’ihi na mụ onwe m na-agakwuru Nna m.” (Jọn 14:12) N’oge na-adịghị anya mgbe nke a gasịrị, na Pentikọst nke afọ 33 O.A., Jisọs wụkwasịrị mmụọ nsọ n’isi ndị na-eso ụzọ ya, ha malitekwara ikwusara ndị Juu ozi ahụ na-akpali akpali nke bụ́ na “Jisọs nke a ka Chineke mere ka o si n’ọnwụ bilie.” Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, ndị Sameria nakwerekwara okwu Chineke wee malite ịnata mmụọ nsọ. (Ọrụ 2:32; 8:14-17) Mgbe ahụ, n’afọ 36 O.A., Pita kwusaara Kọniliọs na ndị Jentaịl ndị ọzọ zukọtara n’ụlọ ya ozi ọma. Otú a, ozi ọma ahụ banyere Jisọs malitere ịbụ nke ‘e kwusara n’etiti ndị mba ọzọ,’ ya bụ, n’etiti ndị na-abụghị ndị Juu, ndị e jikwara mmụọ nsọ tee mmanụ.
15. Gịnị na-egosi na ndị Kraịst nke narị afọ mbụ amụtawo ihe omimi dị nsọ nke nsọpụrụ Chineke nke ọma?
15 Dị ka a kọrọ n’Ọrụ Ndị Ozi 12: 24, “okwu Chineke na-aga n’ihu, na-abakwa ụba.” Ọrụ Ndị Ozi 17:6 kọrọ na n’ebe ugwu Gris, ndị mmegide tiri mkpu, dịkwa ka ha na-eme n’ebe ahụ ruo taa, sị: “Ndị a, bụ́ ndị kpuru elu ụwa dum mmadụ bi ihu, ha eruwokwa n’ebe a.” Tupu iri afọ atọ agabiga, Pọl pụrụ ịnọ na Rom dee na ozi ọma ahụ abụrụwo nke “e kwusara n’etiti ihe nile e kere eke dị n’okpuru eluigwe.” (Ndị Kọlọsi 1:23) Ndị Kraịst nke oge ahụ amụtawo ihe omimi dị nsọ nke nsọpụrụ Chineke nke ọma. Leekwa ka ha si jiri ịnụ ọkụ n’obi na-etinye ya n’ọrụ! Ka anyị mụtakwa ma na-etinye ya n’ọrụ n’otu aka ahụ n’oké ụbọchị nke a nke nkwusa Alaeze!
16. Gịnị bụ akụkụ nke ise nke ihe omimi ahụ dị nsọ, oleekwa ọrụ nke mere ka ọ pụta ìhè?
16 N’ịzaghachi ná nkwusa ahụ e kwusara na narị afọ nke mbụ, akụkụ nke ise nke ihe omimi ahụ dị nsọ dị na 1 Timoti 3:16 pụtara ìhè n’ụzọ a hụrụ anya. Ugbu a, “e kweere na [Jisọs] n’ime ụwa.” Nke a mere n’ihi nsọpụrụ Chineke ahụ yiri nke Kraịst nke ndị ozi ala na-anụ ọkụ n’obi, gụnyere Pọl na Timoti, gosipụtara. Ha buuru ozi ọma ahụ banye n’Asia Minor na Europe, ma eleghị anya garuo Spain, banyekwa n’Ọwụwa Anyanwụ Africa site n’ọnụ onye Etiopia ahụ e mere baptism, ebe Pita jere ozi na Babilọn.
17. N’ihi gịnị ka e ji kwere na Jisọs n’ime ụwa dum nke oge a?
17 Gịnị banyere n’oge anyị a? Kemgbe afọ 1919, ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ anọgidewo na-egosipụta nsọpụrụ Chineke kwesịrị nṅomi. Ndị a e tere mmanụ adaberesiwo ike n’elu ntọala nke okwukwe Jisọs tọrọ. Karịsịa kemgbe 1935, ha agawo n’ihu n’ịchịkọta oké ìgwè mmadụ ahụ ndị na-aṅụrị ọṅụ n’olileanya nke ịdị ndụ gabiga “oké mkpagbu” ahụ, wee nweta ndụ ebighị ebi n’elu ala nke bụ́ paradaịs. (Mkpughe 7:9, 14) Otú a, ozi ọma ahụ nke ji Jisọs mere isiokwu ya nke “e kwere na ya” n’ime ụwa dum nke oge a. Ná nsọpụrụ Chineke, ihe karịrị 3,700,000 mmadụ bụ́ Ndịàmà nke Jehova nọ ugbu a na-ekwusa ozi ọma ahụ, na-abakwa ụba gburugburu ụwa!
18. Olee ụzọ e si ‘nara Jisọs n’elu n’ime ebube’?
18 Ọ ka fọdụrụ otu akụkụ nke ihe omimi ahụ dị nsọ, bụ́ akụkụ nke isii: “A naara [Jisọs] n’elu n’ime ebube.” Ruo iri ụbọchị anọ mgbe e mesịrị ka ọ dị ndụ ná mmụọ ya, Jisọs mere ka ndị na-eso ụzọ ya hụ ya anya n’anụ ahụ o nwoghatara enwoghata, na-agwa ha “ihe nile banyere alaeze Chineke.” Mgbe ahụ, ọ lagoro n’eluigwe. (Ọrụ 1:3, 6-9) Ekpere ya nke e dekọrọ na Jọn 17:1-5 si otú a bụrụ nke a zara: “Nna, . . . nye Ọkpara gị otuto, ka Ọkpara gị wee nye gị otuto . . . Mụ onwe m nyere gị otuto n’elu ụwa . . . Nna, gị onwe gị werekwa otuto nke m nwere n’ebe ị nọ mgbe ụwa akadịghị nye m otuto ugbu a n’ebe gị onwe gị nọ.”
19. Gịnị bụ ihe na-aghaghị isochiworị nlọghachi Jisọs n’eluigwe?
19 Lee nnọọ oké ọṅụ a na-aghaghị inweworị mgbe Jisọs lọghachitere n’eluigwe! Ogologo oge tupu mgbe ahụ, mgbe Jehova tọrọ ntọala ụwa, ‘ụmụ Chineke nile tisiri mkpu ọnụ ike.’ (Job 38:7) Ìgwè ndị mmụọ ozi ahụ aghaghị inwebigaworị ọṅụ ókè karị n’ịnataghachi n’etiti ha Onyeisi ahụ nke ji ikwesị ntụkwasị obi na-akwado ịbụ ọkaaka nke Jehova!
20. N’ihi gịnị ka Jisọs jiworo keta aha dị oké mma otú a, gịnịkwa ka o mere mgbe ọ nọ n’elu ala?
20 Ná Ndị Hibru 1:3, 4, Pọl na-ekwu banyere Jisọs ahụ nke nweworo mmeri, sị: “Mgbe ọ sachasịrị mmehie nile anyị, o wee nọdụ n’aka nri nke ịdị ukwuu ahụ dị n’elu; ebe e mere ya rịị ka ọ ka ndị mmụọ ozi mma n’ụzọ hà otú o ketaworo aha nke ka ha mma.” Kraịst natara aha ahụ n’ihi mmeri o nwere megide ajọ omume. N’ezie, Ọkpara Chineke nke a esetịpụwo ezi ihe nlereanya nke nsọpụrụ Chineke n’elu ala ebe a. O setịpụwokwa ụkpụrụ nke ndị ọzọ nile ga-enweta ndụ ebighị ebi na-aghaghị ịgbaso. Mgbe e buliri Jisọs elu gaa n’aka nri nke Chineke n’eluigwe, e kpughere ihe omimi dị nsọ nke nsọpụrụ Chineke n’akụkụ ya nile.
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaghachi?
◻ Gịnị bụ “nsọpụrụ Chineke”?
◻ Jisọs si aṅaa bụrụ onye “e mere ka ọ pụta ìhè n’anụ ahụ,” mesịakwa bụrụ onye ‘a gụrụ n’onye ezi omume n’ime mmụọ’?
◻ Olee mmụọ ozi ndị e mere ka ha hụ Jisọs anya, ozi dị aṅaa ka o jikwa jekwuru ha?
◻ Olee ụzọ e siworo ‘kwusaa Kraịst n’etiti ndị mba ọzọ,’ oleekwa otú o si bụrụ onye “e kweere na ya n’ime ụwa”?
◻ Olee mgbe “a naara [Jisọs] n’elu n’ime ebube,” ọ̀ bụkwa mgbe o mesịrị gịnị n’ihe banyere nsọpụrụ Chineke?