Ịmụta Ihe Omimi Dị Nsọ nke Nsọpụrụ Chineke
“Kraịst hụkwara ahụhụ n’ihi unu, na-ahapụrụ unu ihe ilereanya, ka une wee soo ije ụkwụ ya nile.”—1 PITA 2:21.
1. Gịnị bụworo nzube Jehova banyere “ihe omimi nke nsọpụrụ Chineke”?
“IHE omimi nke nsọpụrụ Chineke” ahụ abụghịzikwa ihe omimi ọzọ! (1 Timoti 3:16) Lee nnọọ ka o si dị iche n’ihe omimi nile nke okpukpe ụgha, dị ka ihe omimi nke Atọ n’Ime Otu, ndị nọgidekwara na-abụ ihe omimi! Ọ dịghị onye pụrụ ịghọta ha. Kama nke ahụ, Jehova ezubewo na e kwesịrị inye ihe omimi nke a nke e kpughere n’ahụ Jisọs Kraịst mkpọsa dị ukwuu ruo ókè o kwere mee. Jisọs n’onwe ya ghọrọ ihe nlereanya pụrụ iche nke onye ji ịnụ ọkụ n’obi na-akpọsa Alaeze Chineke. Anyị pụrụ ịmụta ihe dị ukwuu site n’ozi ya na ụzọ o si kwusaa ya, dị ka anyị ga-ahụ ugbu a.
2. N’ihi gịnị ka e ji debe ije ozi Jisọs n’ọnọdụ bu àjà mgbapụta ahụ uzọ? (Matiu 20:28)
2 Ya mere, ka anyị lebakwuo anya na Jisọs ịbụ onye “e mere ka ọ pụta ìhè n’anụ ahụ.” (1 Timoti 3:16) Na Matiu 20:28 anyị na-agụ na Jisọs “abịaghị ka e jeere ya ozi, kama ka o jee ozi, ka o werekwa ndụ ya nye ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” Nke a debere ije ozi ya ọbụna n’ihu ihe mgbapụta ahụ. Gịnị mere o ji dị otú ahụ? Ee, laa azụ n’Iden, Agwọ ahụ dị aghụghọ rụrụ ụka banyere izi ezi nke Chineke ịbụ onye ọchịchị nke ihe a kpọrọ mmadụ, na-egosi na ihe ndị Chineke kere nwere ntụpọ, na ọ dịghịkwa onye pụrụ ijigide ikwesị ntụkwasị obi ya nye Onye ahụ Kasị Elu ma ọ bụrụ na e tinye ya n’ule. (Tụlee Job 1:6-12; 2:1-10.) Ozi na-enweghị ntụpọ Jisọs jere dị ka onye zuru okè, bụ́ “Adam ikpeazụ” ahụ gosipụtara onye ahụ na-ama aka, bụ́ Setan, ịbụ ajọ onye ụgha. (1 Ndị Kọrint 15:45) Karịsịa, Jisọs nwapụtara n’ụzọ zuru ezu na ya ruru eru ijere Chineke ozi dị ka “Onyendú na Onye nzọpụta” nakwa ‘ikpe elu ụwa dum mmadụ bi ikpe n’ezi omume,’ iji kwadoo ịchịisi nke Jehova.—Ọrụ 5:31; 17:31.
3. Olee otú Jisọs si gosi n’ụzọ zuru ezu na ihe ịma aka Sẹtan bụ ụgha?
3 Jisọs gosiri n’ụzọ zuru ezu na ihe ịma aka ịkwa emo nke Setan bụ ụgha! N’akụkọ ihe mere eme nile, ọ dịghị onye ọ bụla nọ n’elu ala ebe a nke ji obi ya nile jeere Chineke ozi otú a—n’agbanyeghị ịkwa emo, ịpịa ụtarị, na inye ahụhụ n’ụzọ anụ ahụ na n’ụzọ nke uche. Kraịst tachiri obi ná nkọcha ndị e wetaara ya n’ụzọ nkwulu dị ka Ọkpara Chineke. N’ime ihe ndị a nile—ọbụna ruo n’ọwụ obi ọjọọ nke ọ nwụrụ n’ụzọ ihere—o guzosiri ike, bụrụ onye a na-apụghị ime ka ọ maa jijiji n’ikwesị ntụkwasị obi ya nye Nna ya. Ná Ndị Filipaị 2:8, 9, Pọl dere na n’ihi na Jisọs rubere isi ‘ruo ọnwụ, ee, ọnwụ n’elu osisi ịta ahụhụ, Chineke buliri ya elu wee nye ya aha nke kachasị aha nile ọ bụla elu.’ Jisọs kpughere Setan dị ka onye ụgha jọgburu onwe ya!
4. N’ihi gịnị ka Jisọs ji nwee ike ịgwa Paịlet na ya bịara n’ụwa ịgba àmà nye eziokwu ahụ?
4 Otú a, ná ngwụsị nke nanị afọ ole na ole nke ịrụsi ọrụ ike ná nkwusa ozi ọma, Jisọs pụrụ iji anya ike gbaara Pọntiọs Paịlet àmà, sị: “Gị onwe gị na-asị na mụ onwe m bụ eze. A mụwo mụ onwe m ime ihe a, abịawokwa m n’ime ụwa ime ihe a, ka m wee gbaara eziokwu àmà. Onye ọ bụla nke sitere n’eziokwu ahụ na-anụ olu m.” (Jọn 18:37) Jisọs egosipụtawo nsọpụrụ Chineke na-enweghị atụ n’ịkpọsa eziokwu nke Alaeze Chineke n’ime Palestine nile. Ọ zụrụ ndị na-eso ụzọ ya ịbụkwa ndị nkwusa na-anụ ọkụ n’obi. Lee nnọọ ka ihe nlereanya ya si akpali anyị ịgbaso nzọụkwụ ya nile taa!
Ịmụta Ihe n’Aka Onye Anyị Na-eṅomi
5. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta banyere nsọpụrụ Chineke site n’ilekwasị Jisọs anya nke ọma?
5 Site n’anyị iji nsọpụrụ Chineke na-eme ihe Jehova na-achọ, anyị onwe anyị pụkwara ịnwapụta Ekwensu dị ka onye ụgha. N’agbanyeghị ọnwụnwa ndị anyị na-ezute, ọ dịghị nke ọ bụla pụrụ ịha ka ihe mgbu na mweda n’ala nile Jisọs nwetara. Ya mere, ka anyị mụta ihe site n’aka Onye ahụ bụụrụ anyị ihe nlereanya. Dị ka Ndị Hibru 12:1, 2 gbara anyị ume, ka anyị jiri ntachi obi na-agba ọsọ ahụ, “na-elegide Jisọs anya, bụ́ onyendú na onye mmezu nke okwukwe anyị.” N’adịghị ka Adam, bụ́ onye dara mgbe a nwara ya n’ihe banyere nsọpụrụ Chineke, Jisọs ghọrọ otu onye nọ n’elu ala onye meriri ule nile n’ụzọ zuru okè. Ruo ọnwụ, o gosiri onwe ya ịbụ “onye dị ọcha n’obi, onye na-enweghị obi ọjọọ, onye a na-emerụghị emerụ, onye e kewapụworo n’etiti ndị mmehie.” (Ndị Hibru 7:26) N’ikwesị ntụkwasị obi na-enweghị ntụpọ, ọ pụrụ ịgwa ndị iro ya, sị: Ònye n’ime unu tụrụ m mmehie n’anya?” Jisọs zaghachiri ihe ịma aka Setan, na-asị: “Ọ dịghị ihe ọ bụla onyeisi nke ụwa nke a . . . nwere n’ime m.” N’imechikwa okwu ikpeazụ ya gwa ndị na-eso ụzọ ya tupu nraranye na njide ya, ọ gwara ha, sị: “Nweenụ obi ike; mụ onwe m emeriwo ụwa.”—Jọn 8:46; 14:30; 16:33.
6. (a) N’ihi gịnị ka Jisọs ji mara ụdị izu ike dị ihe a kpọrọ mmadụ mkpa? (b) Ruo ókè hà aṅaa ka Jisọs gosipụtara egwu Chineke?
6 Mgbe ọ nọ n’anụ ahụ n’elu ụwa, Jisọs hụtara ihe ọ dị ka ya ịbụ mmadụ, bụ́ onye e “mere ya ka ọ dịkarịa ndị mmụọ ozi ala nke nta.” (Ndị Hibru 2:7) Ọ ghọtara adịghị ike nile nke ụmụ mmadụ, n’ihi nke a, ọ bụ onye a kwadebere nke ọma ije ozi dị ka Eze na Onyeikpe nke ihe a kpọrọ mmadụ ruo otu puku afọ. Ọkpara Chineke nke a, onye sịrị, “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ, mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike,” maara ụdị izu ike dị ihe a kpọrọ mmadụ mkpa. (Matiu 11:28) Ndị Hibru 5:7-9 na-agwa anyị, si: “Onye n’ụbọchị nke ahụ ya, mgbe o weresịrị ákwá siri ike na anya mmiri chee ekpere na arịrịọ n’ihu Onye ahụ pụrụ ịzọpụta ya n’ọnwụ, mgbe a nụsịkwara olu ya n’ihi na ọ tụrụ egwu Chineke, ọ bụ ezie na ọ bụ Ọkpara, ma ọ mụtara ịṅa ntị ya site n’ahụhụ nile ọ hụrụ; ebe e mesịrị ya ka o zuo okè [ná nrubeisi], o wee ghọọrọ ndị nile na-aṅa ya ntị onye na-ewetara ha nzọpụta ebighị ebi.” Jisọs adaghị mbà, ọ bụ ezie na ọ dịrị mkpa ka ọ nọgide ná ntachi obi ruo n’ókè nke ịnwụ ọnwụ dị ka mmadụ iji wee nata ‘nchipịa n’ikiri ụkwụ’ site n’aka Agwọ ahụ nke kpọrọ ya asị. (Jenesis 3:15) Dị ka Jisọs, ka anyị nile nọgide na-egosipụta egwu Chineke ọbụna ruo ọnwụ ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa, na-enwe obi ike na Jehova Chineke ga-anụ arịrịọ anyị, nyekwa anyị nzọpụta.
‘Ịdị Ndụ n’Ebe Ezi Omume Dị’
7. Di ka 1 Pita 2:21-24, si kwuo, ihe ilereanya dị aṅaa ka Jisọs hapụụrụ anyị, oleekwa ụzọ ihe o mere kwesịrị isi metụta anyị?
7 Mgbe ọ pụtara ìhè n’anụ abụ, Jisọs ji ikwesị ntụkwasị obi kpughee ihe omimi nke nsọpụrụ Chineke. Anyị na-agụ na 1 Pita 2:21-24, sị: “N’ihi na Kraịst hụkwara ahụhụ n’ihi unu, na-ahapụrụ unu ihe ilereanya, ka unu wee soo ije ụkwụ ya nile: onye ọ dịghị mmehie ọ bụla o mere, a hụghịkwa aghụghọ n’ọnụ ya: onye, mgbe a na-ekwutọ ya, ọ dịghị ekwutọghachi ọzọ; mgbe ọ na-ahụ ahụhụ, ọ dịghị aba mbá; kama ọ raara onwe ya nye n’aka onye ahụ nke na-ekpe ikpe ziri ezi: onye ya onwe ya, dị ka àjà a chụrụ, buuru mmehie nile anyị n’ahụ ya n’elu osisi ahụ, ka anyị, ebe anyị nwụworo n’ebe mmehie nile dị, ka anyị wee dị ndụ n’ebe ezi omume dị.” Ka anyị na-atụgharị uche n’ụzọ ndụ Jisọs, lee ka ọ na-esi agba anyị ume ịgbaso ụzọ nke nsọpụrụ Chineke, ịnọgide n’ikwesị ntụkwasị obi, nakwa ịdị ndụ n’ebe ezi omume dị dị ka ọ dịrị!
8. N’ụzọ dị aṅaa ka anyị kwesịrị ịdị ndụ n’ebe ezi omume dị dị ka Jisọs dịrị?
8 Jisọs dịrị ndụ n’ezie n’ebe ezi omume dị. Abụ Ọma 45:7 buru amụma banyere ya, sị: “Ị hụwo ezi omume n’anya, wee kpọọ mmebi iwu asị.” N’iji okwu ahụ mee ihe banyere Jisọs, Pọl onyeozi kwuru ná Ndị Hibru 1:9, sị “Ị hụrụ ezi omume n’anya, wee kpọọ mmebi iwu asị.” N’ịdabere ná nghọta anyị nwere banyere ihe omimi ahụ dị nsọ nke nsọpụrụ Chineke, ka anyị yie Jisọs n’ịnọgide na-ahụ ezi omume n’anya, na-akpọkwa ihe ọjọọ asị. N’ihe banyere ụkpụrụ omume ndị Kraịst, bụ́ nke ụwa nke Setan na-ebuso agha dị oké njọ taa, nakwa n’ụzọ nile anyị si emeso ndị nọ n’ime nzukọ Chineke nakwa ndị nọ n’èzí, ka anyị kpebisie ike ịdị ndụ n’ebe ezi omume dị, na-akwado ezi ụkpụrụ nile nke Jehova. Ka anyị nọgidekwa na-azụ onwe anyị n’Okwu Chineke ka o wee kwe omume anyị inweta nghọta nke Chineke, bụ́ nke dị oké mkpa iji guzogide Ekwensu na ụzọ aghụghọ ya nile!
9. Gịnị tụkwasịrị ihe n’ịnụ ọkụ n’obi Jisọs nwere maka ozi ahụ, gịnịkwa ka nke a gụnyere n’ihe banyere ndị ọzụzụ atụrụ ụgha nke okpukpe?
9 Ọ dị ihe ọzọ kpaliri Jisọs inwe ịnụ ọkụ n’obi n’ije ozi ya. Gịnị bụ ihe ahụ? Na Matiu 9:36, anyị na-agụ, sị: “Mgbe ọ hụrụ ìgwè mmadụ nile, o nwere ọmịiko n’ahụ ha, n’ihi na a na-esogbu ha, na-achụsakwa ha, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.” Ya mere, Jisọs “wee malite izi ha ọtụtụ ihe.” (Mak 6:34) Ọ dịrị nnọọ mkpa na nke a aghaghị ịgụnye ikpughe ajọ omume na mmebi iwu nke ndị ọzụzụ atụrụ ụgha nke okpukpe. Dị ka Matiu 15:7-9 si kwuo, Jisọs gwara ụfọdụ n’ime ndị a, sị: “Ndị ihu abụọ, Aịsaịa buru amụma nke ọma banyere unu, sị, Ndị nke a na-asọpụrụ m n’egbugbere ọnụ ha; ma obi ha dị anya n’ebe m nọ. Ma ha na-ebiri m isiala n’efu, na-ezi ihe mmadụ nyere n’iwu ka ha bụrụ ozizi ha.”
Otu Ihe Omimi Jọgburu Onwe Ya
10. Taa, ole ndị ka “ihe omimi nke mmebi iwu” ahụ na-ezo aka n’ebe ha nọ, ọ̀ bụkwa ikpe gịnị mara ha?
10 Dị ka Jisọs kwuru okwu hoo ha megide ndị ndú okpukpe ụgha ahụ, otú ahụkwu ka anyị onwe anyị taa na-akatọ otu ihe omimi, bụ́ nke ọdịiche ya guzopụtara ìhè nke ọma n’ebe ihe omimi nke nsọpụrụ Chineke dị. Ná 2 Ndị Tesalọnaịka 2:7, Pọl kpọrọ ya “Ihe omimi nke mmebi iwu.” Ọ bu ihe omimi n’ime narị afọ mbụ O.A. n’ihi na agajeghị ikpughe ya ruo ogologo oge mgbe ndị ozi nile nwụsịrị. Taa, ọ na-ezo aka n’ebe ndị ụkọchukwu Krisensọm nọ, bụ́ ndị ihe na-amasị ha bụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị karịa ịkpọsa ozi ọma nke Alaeze ezi omume Chineke. Ihu abụọ jupụtara n’etiti ha. Ndị okwuchukwu telivishọn nke òtù Protestant dị iche iche nke Krisendọm bụ otu ihe atụ pụtara ìhè: ndị oké ọchịchọ ndị na-erigbu ìgwè ndị na-eso ha, na-akpakọta ọtụtụ nde naira, na-eso ndị akwụna rụrụ arụ na-enwe mmekọ, na-ebe ákwá na-esiteghị n’obi mgbe e kpughere ha onwe ha, nọgidekwa na-arịọ ego, mgbe nile ka e wetakwuo ego. Mba Vatican nke ndị Roman Katọlik na-egosikwa ihe atụ rụrụ arụ, ebe o nwere njikọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọjọọ dị iche iche, oké ngosipụta ihe onwunwe, na omume aghụghọ ndị metụtara ọru ụlọ akụ.
11. Gịnị gaje ime ndị ndú okpukpe Krisendọm na Babilọn Ukwu ahụ dum?
11 Ka a sịkwa ihe mere na a pụrụ ịkọwa òtù ndị ndú okpukpe Krisendọm dị ka “Onye ahụ na-emebị iwu”! (2 Ndị Tesalọnaịka 2:3) Akụkụ nke a ka ukwuu nke Babilọn Ukwu ahụ nke yiri nwanyị na-akwa iko ka a ga-ekpughe n’ụzọ zuru ezu, bibiekwa ya, ya na okpukpe ụgha nile ndị ọzọ. Dị ka anyị na-agụ ná Mkpughe 18:9-17, ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ndị eze ahịa (ha na ndị na-echekwara ha ego) ga-eti mkpu n’oge ahụ, sị: “Ahụhụ, ahụhụ, obodo ukwu ahụ.” A ga-ekpugheworị Babilọn Ukwu ahụ na ihe omimi ya nile, n’ụzọ dị nnọọ iche n’ihe nile nke na-enye ìhè n’ihe omimi ahụ nke nsọpụrụ Chineke dị nsọ.
12. Ịhụnanya Jisọs nwere n’ebe ezi omume dị dujere ya ime gịnị?
12 Ịhụnanya Jisọs nwere n’ebe ezi omume dị na ịkpọasị o nwere n’ebe mmebi iwu dị dujere ya n’ịdọgbu onwe ya n’ọrụ n’ụzọ dị ukwuu n’ihi ezi ofufe. N’ojije mbụ o jere Jerusalem dị ka Ọkpara Chineke e tere mmanụ, Kraịst chụpụsịrị ndị eze ahịa na ndị na-agbanwe ego n’ụlọ nsọ ahụ, na-ekwupụta, sị: “Chịpụnụ ihe ndị a n’ebe a; unu emela ụlọ Nna m ka ọ bụrụ ụlọ ahịa.” (Jọn 2:13-17) Mgbe o jeghachiri n’ụlọ nsọ ahụ mgbe ọzọ, Jisọs gwara ndị Juu na-emegide ya, sị: “Unu onwe unu sitere ná nna unu, bụ́ Ekwensu, o bụkwa ihe na-agụ nna unu ka unu na-achọ ime. Onye ahụ bụ ogbu mmadụ site na mbụ, o guzoghịkwa n’eziokwu, n’ihi na eziokwu adịghị n’ime ya. Mgbe ọ bụla ọ na-ekwu okwu ụgha, ọ na-ekwu ihe si n’ihe nke aka ya pụta: n’ihi na ọ bụ onye ụgha, bụrụkwa nna ya.” (Jọn 8:44) Lee nnọọ obi ike Jisọs gosipụtara n’ịgwa ndị okpukpe ahụ n’ihu na ihu na ha bụ ndị ụgha, bụrụkwa ụmụ Ekwensu!
13. (a) N’òle ebe karịsịa ka e gosipụtara ịkpọasị Jisọs nwere banyere mmebi iwu? (b) N’ihi gịnị ka ndị ndú okpukpe ahụ na-emebi iwu ji kweṣi inweta ikpe ọmụma yiri nke ahụ Jisọs kwupụtara megide ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii?
13 Ọ dịghị ebe ọzọ e gosipụtara ịkpọasị Jisọs kpọrọ mmebi iwu nke ọma karịa n’okwu nkatọ ahụ na-agba agba ọ gwara ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii ahụ yiri ajụala, dị ka e dekọrọ ya na Matiu isi 23. N’ebe ahụ, o kwupụtara “ahuhụ” dị okpukpu asaa, jiri ha na-atụnyere ‘ili e tere nzụ—ndị jupụtara n’ụdị adịghị ọcha, ihu abụọ na mmebi iwu nile.’ Lee ka o si gụsie Jisọs agụụ ike ịnapụta ndị ahụ a na-akpagbu site ná mmebi iwu ahụ! “Jerusalem, Jerusalem,” ka o tiri mkpu kwuo, “ọtụtụ mgbe ole ka m chọrọ ịchịkọ ụmụ gị, ọbụna dị ka nnekwu ọkụkọ na-achịkọta ụmụ ya n’okpuru nku ya abụọ, ma unu achọghị! Lee, a na-ahapụrụ unu ụlọ unu ka ọ tọgbọrọ n’efu.” (Amaokwa 37, 38) Ndị ndú okpukpe na-emebi iwu nke oge anyị a kwesịkwara ịnata otu ụdị ikpe ọmụma ahụ n’ihi na, dị ka 2 Ndị Tesalọnaịka 2:12 si kwuo, ha bụ “ndị na-ekweghị eziokwu, kama ajọ omume dịrị ha ezi mma.” Mmebi iwu ha bụ kpọmkwem ihe megidere nsọpụrụ Chineke nke Jisọs ji ikwesị ntụkwasị obi gosipụta mgbe ọ nọ n’elu ala ebe a.
Ịkpọsa Ihe Chineke Kpere n’Ikpe
14. Nghọta nke ihe omimi dị nsọ nke nsọpụrụ Chineke ahụ kwesịrị ịkapli anyị ime gịnị?
14 Nghọta anyị nwere banyere ihe omimi ahụ dị nsọ nke nsọpụrụ Chineke kwesịrị ịnọgide na-eduru anyị ịgbasochi nzọụkwụ Jisọs anya. Dị ka ya onwe ya, anyị kwesịrị ịbu ndị na-anụ ọkụ n’obi n’ikwusa ihe Aịsaịa 61:2 kọwara dị ka “afọ mgbe ihe mmadụ na-atọ Jehova ụtọ, na ụbọchị ịbọ ọbọ Chineke anyị nwere.” Ka anyị jirikwa ịnụ ọku n’obi mee òkè anyị ‘n’ịkasi ndị nile na-eru újú obị.’ Dị ka ọ dị n’oge Jisọs nọ n’ụwa, ọ chọrọ anyị inwe obi ike taa iji kwusaa ikpe ọmụma Jehova, gụnyere ozi ndị ahụ siri ike ndị na-adị n’isiokwu dị iche iche nke Ụlọ Nche ndị na-adịghị ezo ọnu nakwa n’akwụkwọ ahụ bụ Revelation—Its Grand Climax At Hand! Anyị aghaghị iji obi ike na akọ kwusaa ozi ọma, na-ahụ na okwu anyị nile bụ “ihe e ji nnú mee ka ọ dị ụtọ” ka o wee bụrụ ihe na-amasị ndị ahụ ọ na-agụ agụụ n’obi ime ezi omume. (Ndị Kọlọsi 4:6) Ebe anyị mụtaworo ihe site n’ihe nlereanya nsọpụrụ Chineke nke Jisọs, ka anyị nweekwa ike inye akụkọ mgbe oge ya ruru na anyị arụzuwo ọrụ Jehova nyere anyị ka anyị rụọ.—Matiu 24:14; Jọn 17:4.
15. N’ihe banyere ihe omimi dị nsọ nke Chineke, gịnị meworo kemgbe 1914?
15 Mgbe ọ pụtara ìhè n’anụ ahụ, lee ezi Onye a ga-eṅomi Jisọs bụrụ! Lee nnọọ ụzọ doro anya ihe omimi nke nsọpụrụ Chineke ahụ si bụrụ nke e meszuru n’ahụ ya! Lee nnọọ ka o si jiri anya ike bulie aha Jehova elu! Leekwa nnọọ ụzọ dị ebube Nna Jisọs si kwụghachi ya ụgwọ n’ihi ịnọgide n’ikwesị ntụkwasị obi! Ma a ka nwekwara ihe fọdụrụ n’ihe omimi ahụ dị nsọ nke Chineke. Kemgbe 1994, anyị anọwọ na-ebi n’ime “ụbọchị Onyenwe anyị.” (Mkpughe 1:10) Dị ka Mkpughe 10:7 na-ekwu, ọ bụ oge ‘a ga-eme ka ihe omimi nke Chineke zuo okè di ka o ziri ozi ọma ya.’ Olu ndị si n’elugigwe akpọsawo ugbu a, sị: “Alaeze nke ụwa aghọwo alaeze nke Onyenwe anyị [Jehova], na nke Kraịst ya: ọ ga-abụkwa eze ruo mgbe nile ebighị ebị.” (Mkpughe 11:15) Jehova eguzobewo Eze Mesaịa ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst n’elu ocheeze nke ebube ya ịbụ onye ya na Ya ga-eso chịa!
16. Olee ụzọ Eze ahụ nọkwasịrị n’ocheeze ọhụrụ, bụ́ Jisọs Kraist, si mee ihe ngwa ngwa n’igosi ọchịchọ o nwere maka nsọpụru Chineke n’eluigwe?
16 Dị ka onye ya na Chineke na-achị achị n’ime Alaeze ahụ a mụrụ ọhụrụ, a na-akpọkwa Jisọs Maịkeal (nke pụtara, “Ònye Dị Ka Chineke?”). Ọ dịghị onye nnupụisi ọ bụla nke pụrụ inwe ihe ịga nke ọma n’ịdị ka Chineke, Eze ahụ e chiri eze ọhụrụ gosipụtakwara nke a ngwa ngwa site n’ịtụdata Agwọ ochie ahụ, bụ́ Setan, na ndị mmụọ ozi ya n’elu ala. (Mkpughe 12:7-9) Ee, Jisọs chọrọ ka e nwee nsọpụrụ Chineke n’eluigwe, dịkwa ka o gosipụtara nsọpụrụ Chineke mgbe ọ nọ n’elu ala. Jisọs Kraịst ahụ e meworo ka ọ dị ebube agaghị ezu ike ruokwa mgbe o bibisịrị okpukpe ụgha nile, hichapụkwa nzukọ Setan, ma nke a na-ahụ anya ma nke a na-adịghị ahụ anya, kpam kpam.
17. Kemgbe 1914, gịnị nọworo na-eme ná mmezu nke Matiu 25:31-33?
17 Kemgbe 1914, mmezu nke amụma Jisọs buru n’onwe ya nke dị na Matiu 25:31-33 enyewo ihe omimi dị nsọ nke Chineke ìhè nke ukwuu. N’ebe ahụ, Jisọs kwuru, sị: “Ma mgbe ọ bụla Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube ya, ya na ndị mmụọ ozi nile, mgbe ahụ ka ọ ga-anọkwasị n’ocheeze nke ebube ya, ma n’ihu ya ka a ga-eme ka mba nile zukọọ: ọ ga-ekewapụtakwa ha, otu n’ahụ ibe ya, dị ka onye na-azụ atụrụ na-ekewapụta atụrụ n’ụmụ ewu: ọ ga-edebekwa atụrụ n’aka nri ya, ma ụmụ ewu n’aka ekpe.” Site n’ọnọdụ ya ka mma n’eluigwe, Eze nke a dị ebube, Onyeikpe, na Onye na-akwado nsọpụrụ Chineke ga-eweta ịbọ ọbọ, malite n’isi onye ahụ nke na-emebi iwu na n’akụkụ ndị ọzọ nke Babilọn Ukwu ahụ, e mesịa n’isi ihe nile fọdụrụ ná ndị ahụ yiri ewu, ndị na-akwado ajọ nzukọ elu ala nke Setan. Mgbe ahụ a ga-atụba Setan n’abyss. (Mkpughe 20:1-3) Ma “ndị ezi omume” ndị ahụ yiri atụrụ ga-apụ banye ná ndụ ebighị ebi. (Matiu 25:46) Ka nchụso ị na-achụso nsọpụrụ Chineke debekwa gị n’òtù ahụ nke ziri ezi!
18. Ihe ùgwù dị aṅaa nke na-enye ọṅụ ka anyị nwere n’ihe banyere ihe omimi dị nsọ nke nsọpụrụ Chineke?
18 Mkpughe 19:10 na-agba anyị ume ka anyị “kpọọ isiala nye Chineke.” Ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị? Akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “N’ihi na àmà nke Jisọs bụ mmụọ nke amụma.” Ọtụtụ n’ime amụma oge ochie ndị sitere n’ike mmụọ nsọ gbara àmà banyere Jisọs! Ebe ọ bụkwa na e mezuwo amụma ndị a, ihe omimi dị nsọ nke Chineke apụtawo ìhè nke ọma. Ya mere, anyị na-aṅụrị ọṅụ n’ịmara na ihe omimi dị nsọ nke nsọpụrụ Chineke nke a bụ nke e mezuru kpam kpam n’ahụ Jisọs. Ọ bụụrụ anyị ihe ùgwù di ebube iso nzọụkwụ ya dị ka ndị ozi dị umeala n’obi nke Alaeze Chineke. Ee, ọ bụụrụ anyị ihe ùgwù ikere òkè n’ịghọta na ịkpọsa ihe omimi dị nsọ nile nke Chineke dị ka ọ dị n’ozi ọma ahụ!
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaghachi?
◻ Gini ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe nlereanya nsọpuprụ Chineke nke Jisọs?
◻ Olee ụzọ anyị pụrụ isi dị ndụ n’ebe ezi omume dị dị ka Jisọs dịrị?
◻ Ihe omimi dị aṅaa ka ọdịiche ya guzopụtara ìhè nke ọma n’ebe ihe omimi nke nsọpụrụ Chineke dị?
◻ Ịghọta ihe omimi dị nsọ nke nsọpụrụ Chineke kwesịrị ịkpali anyị ime gịnị?
[Foto ndị dị na peeji nke 16]
Dị ka onye na-akwado nsọpụrụ Chineke, onye jikwa ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa Alaeze ahụ, Jisọs pụrụ ịgwa Paịlet, sị: ‘Abịara m n’ime ụwa ime ihe a, ka m wee gbaara eziokwu ahụ àmà’
[Foto ndị dị na peeji nke 18]
E gosipụtara nsọpụrụ Chineke nke Jisọs mgbe ọ katọrọ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii