Nyezuokwanụ Ntachi Obi Unu Nsọpụrụ Chineke
“N’okwukwe unu nyezuokwanụ . . . ntachi obi, ná ntachi obi unu nsọpụrụ Chineke.”—2 PITA 1:5, 6, NW.
1, 2. (a) Na-amalite n’afọ ndị 1930, gịnị mere Ndịàmà Jehova n’ala dị iche iche ọchịchị Nazi na-achị, n’ihi gịnịkwa? (b) Olee otú ihe si gaara ndị Jehova n’okpuru mmeso ọjọọ a?
Ọ BỤ oge ọchịchịrị n’akụkọ ihe mere eme nke narị afọ nke 20. Na-amalite n’afọ ndị 1930, e jichiri ọtụtụ puku Ndịàmà Jehova n’ikpe na-ezighị ezi n’ala ndị Nazi na-achị ma tụba ha n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche. N’ihi gịnị? N’ihi na ha nwara ịnọpụ iche ma jụ na nzọpụta dịịrị Hitler. Olee otú e si mesoo ha? “Ọ dịghị ìgwè ndị mkpọrọ ọzọ . . . e kpughepụrụ nye mmeso obi ọjọọ nke ndị soja SS n’ụzọ e si kpughepụ Ndị Mmụta Bible [Ndịàmà Jehova]. Ọ bụ obi ọjọọ nke e ji usoro na-enweghị nkwụsị nke mmekpọ ọnụ n’elu ahụ na n’uche mara, nke a na-enweghị asụsụ dị n’ụwa a ga-eji kọwalie ụdị ya.”—Karl Wittig, onye na-arụburu gọọmenti Germany ọrụ.
2 Olee otú ihe si gaara Ndịàmà ahụ? N’akwụkwọ ya bụ́ The Nazi State and the New Religions: Five Case Studies in Non-Conformity, Dr. Christine E. King rịbara ama, sị: “Ọ bụ nanị n’ebe Ndịàmà nọ [ma e jiri ha tụnyere òtù okpukpe ndị ọzọ] ka gọọmenti na-enweghị ihe ịga nke ọma.” Ee, Ndịàmà Jehova n’ozuzu ha guzoro n’ụkwụ ha, ọ bụ ezie na nye ọtụtụ narị n’ime ha, nke a pụtara ịtachi obi ruo ọnwụ.
3. Gịnị nyewooro Ndịàmà Jehova aka ịtachi obi n’ọnwụnwa ndị siri ike?
3 Gịnị nyewooro Ndịàmà Jehova aka ịtachiri ọnwụnwa ndị dị otú ahụ obi, ọ bụghị nanị na Germany n’okpuru ọchịchị Nazi kama gburugburu ụwa dum? Nna ha nke eluigwe enyeworo ha aka ịtachi obi n’ihi nsọpụrụ ofufe Chineke ha. “Onyenwe anyị matara ịdọpụta ha n’ọnwụnwa, bụ́ ndị na-asọpụrụ Chineke,” ka Pita onyeozi na-akọwa. (2 Pita 2:9) Tupu nke a n’otu akwụkwọ ozi ahụ, Pita agwawo ndị Kraịst okwu ndụmọdụ, sị: “N’okwukwe unu nyezuokwanụ . . . ntachi obi, ná ntachi obi unu nsọpụrụ Chineke.” (2 Pita 1:5, 6, NW) Ya mere, e jikọrọ ntachi obi na nsọpụrụ Chineke n’ụzọ chiri anya. N’ezie, iji tachie obi ruo ọgwụgwụ, anyị aghaghị ‘ịgbaso nsọpụrụ Chineke’ ma gosipụta ya. (1 Timoti 6:11) Ma gịnị n’ezie bụ nsọpụrụ Chineke?
Ihe Nsọpụrụ Chineke Bụ
4, 5. Gịnị bụ nsọpụrụ Chineke?
4 A pụrụ ịsụgharị mkpọaha Grik maka “nsọpụrụ Chineke” (eu·seʹbei·a) n’ụzọ nkịtị dị ka “ịkwanye ùgwù nke ọma n’ụzọ ofufe.”a (2 Pita 1:6, Kingdom Interlinear) Ọ na-enye echiche nke mmetụta na-ekpo ọkụ nke sitere n’obi n’ebe Chineke nọ. Dị ka W. E. Vine si kwuo, ọkọwa aha bụ́ eu·se·besʹ, nke pụtara n’ụzọ nkịtị “ịkwanye ùgwù nke ọma n’ụzọ ofufe,” na-egosi “ume nke, site n’iji ya mee ihe n’egwu dị nsọ nke Chineke, na-apụta ìhè n’ihe omume nke e tinyere uche na ya.”—2 Pita 2:9, Int.
5 Ya mere, okwu ahụ bụ́ “nsọpụrụ Chineke” na-atụ aka ná nkwanye ùgwù ma ọ bụ nsọpụrụ n’ebe Jehova nọ nke na-akwali anyị ime ihe na-amasị ya. A na-eme nke a ọbụna n’ihu ọnwụnwa ndị siri ike n’ihi na anyị hụrụ Chineke n’anya site n’obi. Ọ bụ nrapagide onwe onye n’ebe Jehova nọ site n’iguzosi ike n’ihe, bụ́ nke a na-egosipụta n’ụzọ anyị si ebi ndụ anyị. A gbara ezi ndị Kraịst ume ikpe ekpere ka ha nwee ike “biri obi udo na nke dị nwayọọ n’ime nsọpụrụ Chineke nile.” (1 Timoti 2:1, 2) Dị ka ndị ọkà n’ide akwụkwọ ọkọwa okwu bụ́ J. P. Louw na E. A. Nida na-ekwu, “n’ọtụtụ asụsụ, a pụrụ ịsụgharị [eu·seʹbei·a] na 1 Tm 2.2 n’ụzọ kwesịrị ekwesị dị ka ‘ibi obi dị ka Chineke ga-achọ ka anyị bie’ ma ọ bụ ‘ibi obi dị ka Chineke gwaworo anyị na anyị kwesịrị ibi.’”
6. Gịnị jikọrọ ntachi obi na nsọpụrụ Chineke?
6 Anyị pụrụ ugbu a ịghọta karị ihe jikọrọ ntachi obi na nsọpụrụ Chineke. N’ihi na anyị na-ebi dị ka Chineke ga-achọ ka anyị bie—site ná nsọpụrụ Chineke—ụwa na-akpọ anyị asị, bụ́ nke na-aghaghị iweta ọnwụnwa nke okwukwe. (2 Timoti 3:12) Ma ọ dịghị ụzọ ọ bụla a ga-esi kwalie anyị ịtachi obi n’ọnwụnwa ndị dị otú ahụ ma ọ bụghị maka nrapara anyị rapagidere onwe anyị n’ebe Nna eluigwe anyị nọ. Ọzọkwa, Jehova na-azaghachi ná nsọpụrụ dị otú ahụ si n’ala ala obi. Cheedị nnọọ echiche ụzọ ọ na-aghaghị isi metụta ya isi n’eluigwe letuo anya wee hụ ndị, n’ihi ha ịsọpụrụ ya, na-agbalịsi ike ime ihe na-atọ ya ụtọ n’agbanyeghị ụdị mmegide nile. Ka a sịkwa ihe mere o ji achọ “ịdọpụta ha n’ọnwụnwa, bụ́ ndị na-asọpụrụ Chineke”!
7. N’ihi gịnị ka a ga-eji zụlite nsọpụrụ Chineke?
7 Otú ọ dị, a mụkọtaghị anyị na nsọpụrụ Chineke, anyị adịghịkwa enweta ya ozugbo site n’aka nne na nna ndị na-atụ egwu Chineke. (Jenesis 8:21) Kama nke ahụ, a ghaghị ịzụlite ya. (1 Timoti 4:7, 10) Anyị aghaghị ịrụ ọrụ inyezu okwukwe anyị na ntachi obi anyị nsọpụrụ Chineke. Nke a, ka Pita na-ekwu, na-ewe “ịnụ ọkụ n’obi.” (2 Pita 1:5) Mgbe ahụ, olee otú anyị pụrụ isi nweta nsọpụrụ Chineke?
Olee Otú Anyị Ga-esi Nweta Nsọpụrụ Chineke?
8. Dị ka Pita onyeozi kwuru, gịnị bụ ụzọ e si enweta nsọpụrụ Chineke?
8 Pita onyeozi kọwara ụzọ e si enweta nsọpụrụ Chineke. Ọ sịrị: “Ka e mee ka amara baara unu ụba, ya na udo, n’ime mmazu nke Chineke na nke Jisọs Onyenwe anyị; dị ka o ji bụrụ Chineke nyeworo n’aka anyị ihe nile dịịrị ndụ na nsọpụrụ Chineke n’efu, site ná mmazu [“ezi ihe ọmụma,” NW] nke onye ahụ onye ji ebube na ịdị mma nke aka ya kpọọ anyị.” (2 Pita 1:2, 3) Ya mere iji nyezuo okwukwe na ntachi obi anyị nsọpụrụ Chineke, anyị aghaghị ito eto n’ezi ihe ọmụma, ya bụ, ihe ọmụma juru eju, ma ọ bụ zuru ezu, nke Jehova Chineke na Jisọs Kraịst.
9. Olee otú a pụrụ isi nye ihe atụ nke na inwe ezi ihe ọmụma nke Chineke na Kraịst gụnyere ihe karịrị nanị ịmara ndị ha bụ?
9 Gịnị ka inwe ezi ihe ọmụma Chineke na Kraịst pụtara? N’ụzọ doro anya, ọ gụnyere ihe karịrị nanị ịmara ndị ha bụ. Iji maa atụ: Ị pụrụ ịmara onye onye agbata obi bi n’ọnụ ụlọ nke na-esote nke gị bụ, ọbụna nwee ike na-akpọ ya aha mgbe ị na-ekele ya. Ma ị̀ ga-ebinye ya ùkwù ego buru ibu? Ọ gwụla ma ị maara n’ezie ụdị onye ọ bụ. (Tụlee Ilu 11:15.) N’otu aka ahụ, ịmara Jehova na Jisọs n’ụzọ ziri ezi, ma ọ bụ zuru ezu, pụtara ihe karịrị nanị ikwere na ha dị adị ma mara ihe bụ aha ha. Iji dị njikere ịtachi obi n’ọnwụnwa dị iche iche maka ha ọbụna ruo ọnwụ, anyị aghaghị ịmara ha n’ezie n’ụzọ miri emi. (Jọn 17:3) Gịnị ka nke a gụnyere?
10. Olee ihe abụọ inwe ezi ihe ọmụma nke Jehova na Jisọs gụnyere, n’ihi gịnịkwa?
10 Inwe ezi ihe ọmụma, ma ọ bụ ihe ọmụma zuru ezu nke Jehova na Jisọs gụnyere ihe abụọ: (1) ịmara ha dị ka ndị—àgwà ha, mmetụta ha, na ụzọ ha dị iche iche—na (2) iṅomi ihe nlereanya ha. Nsọpụrụ Chineke gụnyere ịrapagide onwe onye n’ebe Jehova nọ site n’obi, a na-emekwa ka ọ pụta ìhè n’ụzọ anyị si ebi ndụ anyị. Ya mere, iji nweta ya anyị aghaghị ịmara Jehova n’onwe anyị ma marazuo uche ya na ụzọ ya nile ruo n’ókè mmadụ nwere ike ime. N’eziokwu ịmara Jehova, onye e kere anyị n’oyiyi ya, anyị aghaghị iji ihe ọmụma dị otú ahụ mee ihe ma gbalịsie ike ịdị ka ya. (Jenesis 1:26-28; Ndị Kọlọsi 3:10) Ebe ọ bụkwa na Jisọs ṅomiri Jehova n’ụzọ zuru okè n’ihe o kwuru ma mee, ịmarazu Jisọs bụ ihe enyemaka bara uru n’ịzụlite nsọpụrụ Chineke.—Ndị Hibru 1:3.
11. (a) Olee otú anyị pụrụ isi nweta ezi ihe ọmụma Chineke na Kraịst? (b) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ịtụgharị uche n’ihe anyị na-agụ?
11 Otú ọ dị, olee otú anyị pụrụ isi nweta ezi ihe ọmụma dị otú ahụ banyere Chineke na Kraịst? Site n’ịdị uchu n’ịmụ Bible na akwụkwọ ndị dabeere na Bible.b Otú ọ dị, ọ bụrụ na ọmụmụ Bible onwe onye anyị ga-eme ka anyị nweta nsọpụrụ Chineke, ọ dị mkpa ka anyị wepụta oge iji tụgharịa uche, ya bụ, cheghachi echiche, ma ọ bụ cheba echiche, n’ihe anyị na-agụ. (Tụlee Joshua 1:8.) N’ihi gịnị ka nke a ji dị mkpa? Cheta na nsọpụrụ Chineke bụ mmetụta na-ekpo ọkụ nke si n’obi n’ebe Chineke nọ. N’Akwụkwọ Nsọ, ugboro ugboro e jikọrọ ntụgharị uche na obi ihe atụ—mmadụ ime. (Abụ Ọma 19:14; 49:3; Ilu 15:28) Mgbe anyị ji ekele cheghachi echiche n’ihe anyị gụrụ, ọ na-agbadaru ala ruo mmadụ ime ahụ, si otú a na-akpalite mmetụta anyị, na-emetụta ọnọdụ uche anyị, ma na-akpa ike n’echiche anyị. Ọ bụ nanị mgbe ahụ ka ọmụmụ ihe pụrụ iwusiwanye nrapara onwe onye anyị n’ebe Jehova nọ ike ma kwalie anyị ibi obi n’ụzọ na-atọ Chineke ụtọ ọbụna n’ihu ọnọdụ ndị na-eweta ihe ịma aka ma ọ bụ ọnwụnwa ndị siri ike.
Igosipụta Nsọpụrụ Chineke n’Ụlọ
12. (a) Dị ka Pọl na-ekwu, olee otú onye Kraịst pụrụ isi gosipụta nsọpụrụ Chineke n’ụlọ? (b) N’ihi gịnị ka ezi ndị Kraịst ji elekọta nne na nna ha ndị meworo agadi?
12 E kwesịrị ibu ụzọ gosipụta nsọpụrụ Chineke n’ụlọ. Pọl onyeozi sịrị: “Ọ bụrụ na nwanyị ọ bụla di ya nwụrụ nwere ụmụ ma ọ bụ ụmụ ụmụ, ka ha buru ụzọ mụta ịsọpụrụ Chineke n’ahụ ndị ezinụlọ nke aka ha, na inyeghachi ndị mụrụ ha ihe: n’ihi na nke a bụ ihe a na-anara nke ọma n’ihu Chineke.” (1 Timoti 5:4) Ilekọta ndị nne na nna meworo agadi, dị ka Pọl rịbara ama, bụ ngosipụta nke nsọpụrụ Chineke. Ezi ndị Kraịst na-enye nlekọta dị otú ahụ ọ bụghị nanị n’ihi mmetụta nke ibu ọrụ kama n’ihi ịhụnanya maka nne na nna ha. Ma nke kanụ, ha na-aghọta otú Jehova si were mmadụ ilekọta ezinụlọ ya n’ihe dị mkpa. Ha matara nke ọma na ịgbakụta ndị mụrụ ha azụ n’oge mkpa ga-abụ ‘ịgọnarị okwukwe ndị Kraịst.’—1 Timoti 5:8.
13. Gịnị mere igosipụta nsọpụrụ Chineke n’ụlọ pụrụ iji bụrụ ezi ihe ịma aka, ma afọ ojuju dị aṅaa na-esite na mmadụ ilekọta ndị mụrụ ya?
13 Ee, ọ dịghị adị mfe mgbe nile igosipụta nsọpụrụ Chineke n’ụlọ. Ebe ndị òtù ezinụlọ bi pụrụ ịdị anya nke ukwuu. Ụmụaka ndị toworo eto pụrụ ịdị na-azụlite ezinụlọ nke aka ha ma na-agba mgba n’ụzọ ọnọdụ akụ na ụba. Ọdịdị ma ọ bụ ọ̀tụ̀tụ̀ nke nlekọta dị nne ma ọ bụ nna mkpa pụrụ iwe oké ihe n’ahụ ike elu ahụ, uche, na mmetụta uche nke ndị na-enye nlekọta ahụ. Ka o sina dị, a pụrụ inwe ezi afọ ojuju n’ịmara na mmadụ ilekọta nne na nna ya abụghị nanị ‘nnyeghachi ihe’ kama na ọ na-atọkwa Onye ahụ “e sitere na ya gụọ eriri nna nile ọ bụla n’eluigwe na n’elu ụwa aha” ụtọ.—Ndị Efesọs 3:14, 15.
14, 15. Kọọ ihe atụ nke nlekọta n’ụzọ Chineke n’akụkụ nke ụmụ nke otu nna.
14 Tụlee otu ihe atụ na-emetụ n’obi n’ezie. Ellis na ụmụnne ya ndị ikom na ndị inyom ise chere otu ihe ịma aka siri ike ihu n’ilekọta nna ha n’ụlọ. “Na 1986, nna m rịara ahụ mkpọnwụ, nke mere ka ọ daa ngwụrọ kpam kpam,” ka Ellis na-akọwa. Ụmụaka isii ahụ na-ekere òkè n’ịhụ maka mkpa nna ha, malite n’ịsa ya ahụ ruo n’ịhụ na a tụgharịrị ya n’elu àkwà iji hụ na ọ maliteghị inwe ọnyá n’ahụ. “Anyị na-agụrụ ya akwụkwọ, na-ekwunyere ya okwu, na-akpọrọ ya egwu. Anyị ejighị n’aka ma ọ maara ihe na-eme gburugburu ya, ma anyị na-emeso ya dị ka à ga-asị na ọ mazuru ihe nile.”
15 N’ihi gịnị ka ụmụaka ahụ ji lekọta nna ha n’ụzọ ha si mee ya? Ellis na-aga n’ihu, sị: “Mgbe nne anyị nwụsịrị na 1964, nanị Papa zụlitere anyị. N’oge ahụ, anyị gbara malite afọ 5 ruo 14. Ọ na-ahụ maka anyị mgbe ahụ; ugbu a anyị na-ahụ maka ya.” O doro anya na ọ dịghị mfe inye nlekọta dị otú ahụ, ụmụaka ahụ na-enwekwa nkụda aka mgbe ụfọdụ. “Ma anyị matara na ọnọdụ nna anyị bụ nsogbu na-adịru nwa oge,” ka Ellis na-ekwu. “Anyị na-elepụ anya maka oge ahụ mgbe a ga-eweghachi nna anyị n’ezi ahụ ike, e nweekwa ike jikọghachi anyị na nne anyị.” (Aịsaịa 33:24; Jọn 5:28, 29) N’ezie, nlekọta dị otú ahụ e tinyere uche na ya maka nne ma ọ bụ nna aghaghị ime ka obi tọọ Onye ahụ nke nyere ụmụaka iwu ịsọpụrụ ndị mụrụ ha ụtọ!c—Ndị Efesọs 6:1, 2.
Nsọpụrụ Chineke na Ozi Ahụ
16. Gịnị kwesịrị ịbụ ihe bụ isi na-akpata ihe anyị na-eme n’ozi ahụ?
16 Mgbe anyị nabatara òkù Jisọs ‘ịnọgide na-eso ya,’ anyị na-anara ọrụ dị nsọ nke ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ na ime ndị na-eso ụzọ. (Matiu 16:24; 24:14; 28:19, 20) N’ụzọ doro anya, ikere òkè n’ozi ahụ bụ ibu ọrụ dịịrị ndị Kraịst na “mgbe ikpeazụ” ndị a. (2 Timoti 3:1) Otú ọ dị, ebumnobi anyị maka ime nkwusa na izi ihe aghaghị ịgabiga nanị mmetụta nke ọrụ ma ọ bụ ibu ọrụ. Ịhụnanya miri emi maka Jehova aghaghị ịbụ ihe bụ isi kpatara ihe anyị na-eme na ókè anyị na-eme n’ozi ahụ. “Ọnụ site n’ihe nke obi nwebigara ókè na-ekwu okwu,” ka Jisọs kwuru. (Matiu 12:34) Ee, mgbe obi anyi jubigara ókè n’ịhụnanya maka Jehova, ọ na-adị anyị ka a na-akwali anyị aka ịgbara ndị ọzọ àmà banyere ya. Mgbe ịhụnanya maka Chineke bụ ebumnobi anyị, ozi anyị bụ ngosipụta bara uru nke nsọpụrụ Chineke anyị.
17. Olee otú anyị pụrụ zụlite ebumnobi ziri ezi maka ozi ahụ?
17 Olee otú anyị pụrụ isi zụlite ebumnobi ziri ezi maka ozi ahụ? Jiri obi ekele cheghachi echiche n’ihe atọ Jehova nyeworo anyị maka ịhụ ya n’anya. (1) Anyị hụrụ Jehova n’anya n’ihi ihe o mewooro anyị. Ọ dịghị ịhụnanya kanụ ọ gaara egosiwo karịa n’inye ihe mgbapụta ahụ. (Matiu 20:28; Jọn 15:13) (2) Anyị hụrụ Jehova n’anya n’ihi ihe ọ na-emere anyị ugbu a. Anyị nwere nkwuwa okwu n’ebe Jehova nọ, bụ́ onye na-aza ekpere anyị. (Abụ Ọma 65:2; Ndị Hibru 4:14-16) Ka anyị na-edebe ọdịmma Alaeze n’ọnọdụ mbụ, anyị na-anụ ụtọ ihe ndị dị mkpa ná ndụ. (Matiu 6:25-33) Anyị na-anata nri ime mmụọ na-adịghị agwụ agwụ bụ́ nke na-enyere anyị aka ịnagide nsogbu ndị anyị na-eche ihu. (Matiu 24:45) Anyị nwekwara ngọzi nke ịbụ akụkụ nke òtù ndị Kraịst bụ́ ụmụnna zuru ụwa bụ́ nke na-esetịpụ anyị iche n’ezie n’ebe ndị ọzọ n’ụwa nọ. (1 Pita 2:17) (3) Anyị hụkwara Jehova n’anya n’ihi ihe ọ ka ga-emere anyị. N’ihi ịhụnanya ya, anyị ‘na-ejide ndụ ahụ nke bụ ndụ n’ezie’—ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu. (1 Timoti 6:12, 19) Mgbe anyị tụlere ịhụnanya Jehova n’isi anyị, n’ezie obi anyị ga-akwali anyị itinye uche anyị n’ikere òkè n’ịgwa ndị ọzọ banyere ya na nzube ya ndị dị oké ọnụ ahịa! Ndị ọzọ agajeghị ịgwa anyị ihe anyị ga-eme ma ọ bụ ókè anyị ga-eme n’ozi ahụ. Obi anyị ga-akwali anyị ime ihe anyị pụrụ ime.
18, 19. Ihe mgbochi dị aṅaa ka otu nwanna nwanyị meriri iji kere òkè n’ozi ahụ?
18 Ọbụna n’ihu ọnọdụ ndị na-ama aka, a ga-akwali obi nke nsọpụrụ Chineke kpaliri ikwu okwu. (Tụlee Jeremaịa 20:9.) E gosipụtara nke a n’ihe banyere Stella, nwanyị bụ́ onye Kraịst nke na-eme ihere nke ukwuu. Mgbe mbụ ọ malitere ịmụ Bible, o chere sị, ‘Apụghị m ịga site n’ụlọ ruo n’ụlọ!’ Ọ na-akọwa, sị: “M na-anọkarị duu. Apụghị m ijekwuru ndị ọzọ iji malite mkparịta ụka.” Ka ọ nọgidere na-amụ ihe, ịhụnanya ya maka Jehova rịrị elu, ọ zụlitere ọchịchọ na-ere ọkụ ịgwa ndị ọzọ banyere ya. “Echetara m ịgwa onye na-akụziri m Bible sị, ‘M chọsiri ike ikwu okwu, ma apụghị m nnọọ, ọ na-enyekwa m nsogbu n’obi nke ukwuu.’ M gaghị echezọ mgbe ọ bụla ihe ọ gwara m: ‘Stella, nwee obi ekele na ị chọrọ ikwu okwu.’”
19 N’oge na-adịghị anya, Stella hụrụ onwe ya ka ọ na-agbara onye bi n’ụlọ na-eso nke ya àmà. Mgbe ahụ o weere nzọụkwụ bụụrụ ya oké ihe—o keere òkè n’ozi ụlọ n’ụlọ nke mbụ ya. (Ọrụ 20:20, 21) Ọ na-echeta, sị: “Edeturu m okwu m edetu. Ma egwu ji m nke ukwuu nke na ọ bụ ezie na m ji ya n’ihu m, ahụ na-ama m jijiji nke ukwuu ileda anya n’ihe m deturu!” Ugbu a, ihe karịrị 35 afọ mgbe e mesịrị, Stella ka na-emekwa ihere dị ka ụdị mmadụ ya si dị. Ka o sina dị, ọ hụrụ ozi ubi n’anya ma nọgide na-ekere òkè pụtara ìhè na ya.
20. Olee ihe atụ na-egosi na ọbụna mkpagbu ma ọ bụ ịtụ mkpọrọ adịghị nke pụrụ ikpuchi ọnụ Ndịàmà Jehova tinyere uche ha n’ọrụ?
20 Ọbụnadị mkpagbu ma ọ bụ ịtụ mkpọrọ apụghị ikpuchi ọnụ Ndịàmà Jehova tinyere uche ha n’ọrụ. Tụlee ihe atụ nke Ernst na Hildegard Seliger nke Germany. N’ihi okwukwe ha, ha nọrọ ihe karịrị 40 afọ ma a gbakọta ya ọnụ n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche nke Nazi na ụlọ mkpọrọ ndị Kọmunist. Ọbụna n’ụlọ mkpọrọ, ha nọgidere na-agbara ndị mkpọrọ ndị ọzọ àmà. Hildegard na-echeta, sị: “Ndị ọrụ ụlọ mkpọrọ lere m anya dị ka onye dị ize ndụ karịsịa, n’ihi na, dị ka otu nwanyị na-eche nche kwuru, m na-ekwu banyere Bible ogologo ụbọchị dum. Ya mere e tinyere m ná nga dị n’okpukpu ala ụlọ.” Mgbe e mesịrị mee ka ha nwere onwe ha, Nwanna Nwoke na Nwanna Nwanyị Seliger tinyere oge ha nile n’ozi ndị Kraịst. Ha abụọ jere ozi n’ikwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ ha, Nwanna Nwoke Seliger na 1985 na nwunye ya na 1992.
21. Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji nyezuo ntachi obi anyị nsọpụrụ Chineke?
21 Site n’ịdị uchu n’ịmụ Okwu Chineke na iwepụta oge iji ekele tụgharịa uche n’ihe anyị na-amụ, anyị ga-eto n’ezi ihe ọmụma nke Jehova Chineke na Jisọs Kraịst. Nke a n’akụkụ nke ya, ga-eme ka anyị nweta n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ezu karị àgwà ahụ dị oké ọnụ ahịa—nsọpụrụ Chineke. Ma e nweghị nsọpụrụ Chineke, e nweghị ụzọ ọ bụla a ga-esi tachie obi n’ọnwụnwa dị iche iche na-abịara anyị dị ka ndị Kraịst. Ya mere ka anyị gbasoo okwu ndụmọdụ Pita onyeozi, na-anọgide ‘na-enyezu okwukwe anyị ntachi obi na ntachi obi anyị nsọpụrụ Chineke.’—2 Pita 1:5, 6.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Banyere eu·seʹbei·a, William Barclay rịbara ama, sị: “Ọ bụ akụkụ nke seb- [ntọala ya] nke okwu ahụ pụtara nkwanye ùgwù ma ọ bụ ofufe. Eu bụ okwu Grik maka nke ọma; ya mere, eusebeia bụ ofufe, nkwanye ùgwù e nyere nke ọma na n’ụzọ ziri ezi.”—New Testament Words.
b Maka ntụle nke otú e si amụ ihe iji mee ka ihe ọmụma anyị nke Okwu Chineke mie emi, lee Ụlọ Nche nke August 15, 1993, peji nke 12-17.
c Maka ntụle zuru ezu banyere otú e si egosipụta nsọpụrụ Chineke n’ebe nne na nna ndị meworo agadi nọ, lee Ụlọ Nche nke June 1, 1987, peji nke 13-18.
Gịnị Bụ Azịza Gị?
◻ Gịnị bụ nsọpụrụ Chineke?
◻ Gịnị jikọrọ ntachi obi na nsọpụrụ Chineke?
◻ Gịnị bụ ụzọ e si ihe dị n’inweta nsọpụrụ Chineke?
◻ Olee otú onye Kraịst pụrụ isi gosipụta nsọpụrụ Chineke n’ụlọ?
◻ Gịnị na-aghaghị ịbụ isi ihe na-akpata ihe anyị na-eme n’ozi ahụ?
[Foto dị na peeji nke 18]
Ndịàmà Jehova a tụrụ mkpọrọ n’ogige ịta ahụhụ ndị Nazi dị na Ravensbrück gosipụtara ntachi obi na nsọpụrụ Chineke