Na-Agbasonụ Ihe Nlereanya Jisọs Nke Nsọpụrụ Chineke
“Ọ bụkwa ihe a na-ekwupụta na ọ dị ukwuu, bụ́ ihe omimi nke nsọpụrụ Chineke; Onye ahụ [Jisọs] nke e mere ka ọ pụta ìhè n’anụ ahụ.”—1 TIMOTI 3:16.
1. (a) Ajụjụ dị aṅaa ka a na-azaghị aza ruo ihe karjrị 4,000 afọ? (b) Ọ̀ bụ n’ole mgbe, n’ụzọ dịkwa aṅaa ka e si nye azịza ya?
Ọ BỤ ajụjụ nke a na-azaghị aza ruo ihe karịrị 4,000 afọ. Kemgbe nwoke mbụ ahụ, bụ́ Adam, dara n’ikwesị ntụkwasi obi, ajụjụ bụ: Olee otú a pụrụ isi gosipụta nsọpụrụ Chineke n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ? N’ikpeazụ, n’ime narị afọ mbụ O.A., site n’ọbịbịa nke Ọkpara Chineke bịara n’elu ụwa, e nyere azịza ahụ. N’iche echiche, okwu, na n’omume nile, Jisọs Kraịst gosipụtara mmekọrịta ya onwe ya nwere n’ebe Jehova nọ. O si otú a kpughee ‘ihe omimi dị nsọ nke nsọpụrụ Chineke,’ na-egosipụta ụzọ ndị mmadụ raara onwe ha nye ga-esi nwee nsọpụrụ dị otụ́ a.--1 Timoti 3:16.
2. N’ịgbasọ nsọpụrụ Chineke, n’ihi gịnị ka anyj ga-eji tụlee ihe nlereanya Jisọs nke ọma?
2 N’ịgbaso nsọpụrụ Chineke dị ka ndị Kraịst meworo nraranye, ndị e mekwara baptism, ọ ga-adị mma ka anyi ‘tụgharịa uche’ n’ihe nlereanya nke Jisọs. (Ndị Hibru 12:3) N’ihi gịnị? N’ihi ihe abụọ. Na nke mbụ, ihe nlereanya Jisọs pụrụ inyere anyị aka ịzụlite nsọpụrụ Chineke. Jisọs maara nna ya nke ọma karịa onye ọ bụla ọzọ. (Jọn 1:18) Jisọs ṅomikwara ụzọ na àgwà nile nke Jehova nke ọma nke na ọ pụrụ ikwu, sị: “Onye hụworo m anya ahụwo Nna m anya.” (Jọn 14:9) Ya mere, site ná ndụ na ije ozi Jisọs, anyị pụrụ inwe nghọta dị omimi karị banyere àgwà Jehova ndị dị nro, si otú a na-eme ka mmekọrịta anyị na Onye Okike anyi na-ahụ n’anya nwere siwanye ike. Nke abụọ, ihe nlereanya Jisọs pụrụ inyere anyị aka n’igosipụta nsọpụrụ Chineke. O setipụrụ ihe nlereanya zuru okè nke omume na-egosipụta nsọpụrụ Chineke. Otú a ọ ga-adị mma anyị ịtụle ụzọ anyị pụrụ isi ‘yikwasị Kraịst,’ ya bụ, were ya dị ka ihe atụ, na-eṅomi ihe nlereanya ya.—Ndị Rom 13:14.
3. Gịnị ka usoro ihe omume ọmụmụ Bible onwe anyị kwesịrị ịgụnye, n’ihi gịnịkwa?
3 Ọ bụghị ihe nile Jisọs kwuru ma mee ka e deturu n’akwkwọ. (Jọn 21:25) Ya mere, ihe ndị ahụ e dekọrọ n’ike Chineke kwesirị ịdọrọ mmasị anyị karịsịa. Ya mere usoro ọmụmụ ihe onwe onye kwesiri ịgụnye ịgụ ihe ndekọ nke Oziọma banyere ndụ Jisọs mgbe nile. Ma, ka ịgụ ihe dị otú ahụ wee nyere anyị aka ná nchụso anyị na-achụso nsọpụrụ Chineke, anyi aghaghi iwepụta oge iji tụgharịa uche n’ụzọ na-egosi inwe ekele n’ihe ndị anyị na-agụta. Anyi aghaghikwa ịnọ na nche ile anya gabiga ihe pụtara ìhè.
Ọkpara nke Na-eme Ka Nna Ya
4. (a) Gịnị na-egosi na Jisọs bụ onye obi ọma na onye nwere mmetụta dị omimi? (b) Ná mmeso o mesoro ndị ọzọ, gịnị ka Jisọs mere n’echereghị ka a kpọọ ya akpọ?
4 Tụlee otu ihe atụ. Jisọs bụ nwoke nwere obi ọma na mmetụta dị omimi. Rịba ama site na Mak 10:1, 10, 13, 17, na 35 na ndị mmadụ nọ n’afọ ndụ dị iche iche ma nwee àgwà dị iche iche hụrụ ya dị ka onye a pụrụ ịbịakwute. N’ịhe karịrị otu oge, o kuuru ụmụaka n’aka ya. (Mak 9:36; 10:16) N’ihi gịnị ka ahụ ji eru ndị mmadụ ala, ọbụna ụmụaka, mgbe ha na Jisọs nọ? Ọ bụ n’ihi ezi mmasị o nwere n’ebe ha nọ, nke aghụgho na-adịghị n’ime ya. (Mak 1:40, 41) Nke a pụtara ìhè n’ihi na ọtụtụ mgbe ọ na-agakwuru ndị ọzọ bụ́ ndị chọrọ enyemaka n’ebughị ụzọ chere ka a kpọọ ya akpọ. Otú a, anyị na-agụ na ọ “hụrụ” nwanyị onye Nain nke di ya nwụrụ anwụ bụ́ onye a na-ebupụ ozu nwa ya. O wee “bịaruo nso” ma kpọlịte nwa ahụ n’ọnwụ, ọ dịghịkwa ebe e kwuru na onye ọ bụla rịọrọ ya ka o mee otú ahụ. (Luk 7:13-15) Ọzọkwa, n’echeghị ka a rịọ ya ka o mee otú ahụ, o wepụtara onwe ya ịgwọ otu nwanyị dara ngwụrọ na otu nwoke nwere ọrịa ahụ mmiri. —Luk 13:11-13; 14:1-4.
5. Gịnị ka ihe ndekọ ndị a banyere ije ozi Jisọs na-akuziri anyị banyere àgwà na ụzọ nile nke Jehova?
5 Mgbe ị na-agụ banyere ihe omume dị otú ahụ, kwụsị ma jụọ onwe gị, sị: ‘Ebe ọ bụ na Jisọs ṅomiri Nna ya n’ụzọ zuru okè, gịnị ka ihe ndekọ ndị a na-agwa m banyere àgwà na ụzọ nile nke Jehova?’ Ha kwesịrị imesi anyi obi ike na Jehova bụ Chineke nke nwere obi ọma na mmetụta dị omimi. Oké mmasị o nwere n’ebe ezinụlọ nke mmadụ nọ akpaliwo ya isoro ha na-emekọ ihe n’echeghị ka a rịọ ya arịọ. A rụgideghị ya arụgide ka o wee nye Ọkpara ya “ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” (Matiu 20:28; Jọn 3:16) Ọ na-achọ ohere dị iche iche iji mee ka ihe nke ndị na-ejere ya ozi site n’ịhụnanya wee dị ya “ezị ụtọ.” (Deuterọnọmi 10:15) Dị ka Bible kwuru: “Anya [Jehova] na-ejegharị n’ụwa nile, igosi onwe ya onye dị ike n’akụkụ ndị obi ha zuru okè n’ebe ọ nọ.”—2 Ihe Emere 16:9.
6. Gịnị na-esi na ya apụta mgbe anyị tụgharịrị uche n’obi ọma na mmetụta dị omimi nke Jehova dị ka e gosipụtara ya site n’aka Ọkpara ya?
6 Ịtụgharị uche n’ụzọ dị otú a banyere obi ọma na mmetụta dị omimi nke Jehova, dị ka e gosipụtara ya site n’aka Ọkpara ya, ga-emetụta obi gị, na-eme ka o jupụta n’ekele dị ukwuu maka àgwà Ya ndị dị nro ma na-adọrọ adọrọ. Nke a ga-emekwa ka i ruo ya nso. A ga-akpali gị ịgwa ya okwu n’ekpere n’oge nile na n’okpuru ọnọdụ nile n’enweghi ihe mgbochi. (Abụ Ọma 65:2) Ọ ga-eme ka mmekọrịta i nwere n’ebe ọ nọ sie ike.
7. Mgbe ị tụgharisịri uche n’obi ọma na mmetụta dị omimi nke Jehova, gịnị ka i kwesịrị ịjụ onwe gị, n’ihi gịnịkwa?
7 Otú ọ dị, cheta na nsọpụrụ Chineke gụnyere ihe kariri inwe nanị ọchịchọ ife ofufe. Dị ka onye mmụta Bible bụ́ R. Lenski si kwuo, ọ “gụnyere nkwanye ùgwù anyi nile, àgwà ife ofufe nakwa ọrụ ndị na-esi na ya aputa.” (Ọ bụ anyi dere okwu ndị ahụ n’ụdị dị iche.) Ya mere mgbe ị tụgharịsịrị uche n’obi ọma na mmetụta dị omimi nke Jehova dị ka Jisọs mere ihe atụ ya, jụọ onwe gị, sị: ‘Olee otụ́ m pụrụ isi yie Jehova kari n’akụkụ nke a? Àbụ m onye na-enye ndị ọzọ ihu?’ Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, ị ghaghị ịbụ onye ụmụ gị ga-enwe ike irute nso. Ọ bụrụkwa na ị bụ onye okenye ọgbakọ, n’ezie i kwesịrị ịbụ onye ndị ọzọ ga-enwe ike ịkparute nso. Mgbe ahụ, gịnị ga-eme ka ị bụrụ onye ndị ọzọ na-akparutekarị nso n’ebe ọ nọ? Obi ọma na inwe mmetụta dị omimi. Ị ghaghị ịzụlite ezi mmasị sitere n’obi n’ebe ndị ọzọ nọ. Mgbe ị na-enwe nchegbu banyere ndị ọzọ ma dịkwa njikere iwepụta onwe gị imere ha ihe, ha ga-achọpụta nke a ma nwee mmetụta ịbịaru gị nso.
8. (a) Gịnị ka i kwesịrị iburu n’uche mgbe ị na-agụ ihe ndekọ Bible banyere Jisọs? (b) Gịnị ka anyị na-amụta banyere Jehova site n’ihe ndekọ ndị e hotara na ntụaka ala ala peji?
8 Ya mere mgbe ị na-agụ ihe ndekọ Bible banyere Jisọs, buru n’uche na ị pụrụ ịmụta ọtụtụ ihe banyere Jehova dị ka onye site n’ihe ndị Jisọs kwuru ma mee.a Mgbe ekele i nwekwara n’ebe àgwà Chineke, dị ka Jisọs Kraist gosipụtara ya, kpaliri gị ịgbalị ịdị ka Ya, ị na-enye ihe àmà nke nsọpụrụ Chineke gị.
Itinye Nsopụrụ Chineke n’Ọrụ n’Ebe Ndị Òtù Ezinụlọ Nọ
9, 10. (a) Olee otú Jisọs si gosipụta ịhụnanya na nchegbu o nwere maka nne ya, bụ́ Meri, na nwa obere oge tupu ọ nwụọ? (b) Gịnị ka ihe àmà gosiri na ọ bụ ya mere Jisọs ji tinye nlekọta nke Meri n’aka Jọn onyeozi kama itinye ya n’aka otu n’ime ụmụnne anụ ahụ ya?
9 Ndụ na ije ozi Jisọs kpughere ọtụtụ ihe banyere otú e kwesịrị isi gosipụta nsọpụrụ Chineke. E dekọrọ otu ihe atụ na-emetụ n’obi na Jọn 19:25-27, ebe anyị na-agụ, sị: “Ma nne ya, na nwanne nne ya nke nwanyị, Meri nwunye Klopas, na Meri Magdalini, na-eguzo [osisi ịta ahụhụ, NW] Jisọs nso. Ya mere mgbe Jisọs hụrụ nne ya, na onye ahụ nke na-eso ụzọ ya [bụ́ Jọn], onye ọ hụrụ n’anya, ka ọ na-eguzo nso, ọ sị nne ya, Nwanyị, lee, nwa gị nwoke! Mgbe ahụ ọ sị onye ahụ nke na-eso ụzọ ya, Lee, nne gị! Site n’oge awa ahụ onye ahụ nke na-eso ụzọ ya wee kuru ya laa n’ụlọ nke aka ya.”
10 Cheedị echiche banyere nke ahụ! Nanị na nwa obere oge tupu o kubie ume, ịhụnanya na nchegbu Jisọs nwere kpaliri ya itinye nlekọta nke nne ya, bụ́ Meri, (onye o doro anya na di ya anwụwo n’oge a) n’aka Jọn onyeozi ahụ ọ hụrụ n’anya. Ma n’ihi gịnị ka o ji bụrụ Jọn ma ọ bụghị otu n’ime ụmụnne anụ ahụ Jisọs? Ọ bụ n’ihi na Jisọs nwere nchegbu ọ bụghị nanị ná mkpa anụ ahụ na mkpa ihe onwunwe nke Meri kama karịsịa banyere ọdịmma ime mmụọ ya. Jọn onyeozi (ma eleghị anya nwa nwanne Jisọs) egosipụtawokwa okwukwe ya, ebe a na-enweghị ihe ọ bụla na-egosi na ụmụnne anụ ahụ Jisọs bụ ndị kwere ekwe n’oge ahụ. —Matiu 12:46-50; Jọn 7:5.
11. (a) Dị ka Pọl onyeozi si kwuo, olee otú onye Kraịst pụrụ isi tinye nsọpụrụ Chineke n’ọrụ n’ime ezinụlọ nke aka ya? (b) N’ihi gịnị ka ezi onye Kraịst ji eme ndokwa maka ndị mụrụ ya meworo agadi?
11 Ugbu a, olee otú nke a si bụrụ ngosipụta nke nsọpụrụ Chineke? Pọl onyeozi kọwara, sị: “Na-asọpụrụ ndị inyom di ha nwụrụ, bụ́ ndị nọ n’ezie n’ọnọdụ ndị inyom di ha nwụrụ. Ma ọ bụrụ na nwanyị ọ bụla di ya nwụrụ nwere ụmụ ma ọ bụ ụmụ ụmụ, ka ha buru ụzọ mụta ịsọpụrụ Chineke n’ahụ ndị ezinụlọ nke aka ha, na inyeghachi ndị mụrụ ha ihe: n’ihi na nke a bụ ihe a na-anara nke ọma n’ihu Chineke.” (1 Timoti 5:3, 4) Mmadụ isọpụrụ ndị mụrụ ya site n’inye ha nkwado n’ụzọ ihe onwunwe mgbe nke ahụ dị mkpa bụ, dị ka Pọl kwuru, ngosipụta nke nsọpụrụ Chineke. N’ụzọ dị aṅaa? Jehova, bụ́ Onye malitere ndokwa ezinụlọ, na-enye ụmụaka iwu ka ha na-asọpụrụ ndị mụrụ ha. (Ndị Efesọs 3:14, 15; 6:1-3) Otụ́ a, ezi onye Krajst na-amata na ilekọta ibu ọrụ ezinụlọ dị otú ahụ anaghị egosi na ịhụnanya mmadụ nwere n’ebe ndị mụrụ ya nọ kamakwa ọ na-egosipụta nkwanye ùgwù nye Chineke na nrubeisi nye iwu ya nile.—Tụlee Ndị Kọlọsi 3:20.
12. Olee otú ị pụrụ isi tinye nsọpụrụ Chineke n’ọrụ n’ebe ndị mụrụ gị meworo agadi nọ, ginịkwa kwesịrị ịbụ ebumnuche gị?
12 Mgbe ahụ, olee otú ị pụrụ isi tinye nsọpụrụ Chineke n’ọrụ n’ebe ndị òtù ezinụlọ nọ? Nke a ga-agụnye n’ezie ime ndokwa ilekọta mkpa ihe ime mmụọ na ihe onwunwe nke ndị mụrụ ụmụ meworo agadi, dị ka Jisọs mere. Ịda mbà n’ime otú ahụ ga-ekpughe enweghị nsọpụrụ Chineke. (Tụlee 2 Timoti 3:2, 3, 5.) Onye Kraist nke raraworo onwe ya nye na-akwado ndị mụrụ ya nọ ná mkpa ọ bụghị nanị n’ihi obi ebere ma ọ bụ ibu ọrụ kama n’ihi na ọ hụrụ ezinụlọ ya n’anya, ma na-aghọta otú Jehova si were ibu ọrụ nlekọta dị otú ahụ n’ihe dị oké mkpa. Otú a, nlekọta ọ na-elekọta ndị mụrụ ya meworo agadi bụ ngosipụta nke nsọpụrụ Chineke.b
13. Olee otú onye Kraịst bụ nna ga-esi tinye nsọpụrụ Chineke n’ọrụ n’ebe ezinụlọ ya nọ?
13 A pụrụ itinye nsọpụrụ Chineke n’ọrụ n’ụlọ n’ụzọ ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, onye Kraịst bụ nna nwere ibu ọrụ nke ịkwado ezinụlọ ya n’ụzọ ihe onwnwe, mmetụta uche, na ime mmụọ. Ya mere, tụkwasị n’inye nkwado n’ụzọ ihe onwunwe, ọ na-eji ịhụnanya na-eme ndokwa maka ọmụmụ Bible ezinụlọ nke oge nile. Ọ na-ahazi oge ikere ọ̀kè n’oge nile n’ozi ubi ya na ezinụlọ ya. O nwere ezi nguzo, na-amata mkpa ha nwere maka izu ike nakwa ịtụrụ ndụ. Ọ na-ejikwa amamihe na-esetịpụ ihe ndị ka ibe ha mkpa, n’ekweghị ka ibu ọrụ ọgbakọ mee ka o leghara ezinụlọ ya anya. (1 Timoti 3:5, 12) N’ihi gịnị ka o jị na-eme ihe ndị a nile? Ọ bụghị nnọọ n’ihi echiche nke ibu ọrụ o nwere kama n’ihi ịhụnanya o nwere maka ezinụlọ ya. Ọ na-amata ka Jehova si were mmadụ ilekọta ezinụlọ ya anya dị ka ihe dị mkpa. Site n’isi otú a na-emezu ibu ọrụ ya dị ka di na nna, ọ na-etinye nsọpụrụ Chineke n’ọrụ.
14. Olee otú onye Kraịst bụ nwunye ga-esi gosipụta nsọpụrụ Chineke n’ụlọ?
14 Ndị Kraist bụ nwunye nwekwara ibu ọrụ itinye nsọpụrụ Chineke n’ọrụ n’ụlọ. N’ụzọ dị aṅaa? Bible kwuru na onye bụ nwunye kwesịri ‘ido onwe ya n’okpuru’ di ya, o kwesịkwara inwe “nsọpụrụ dị omimi [NW]” n’ebe ọ nọ. (Ndị Efesọs 5:22, 33) Ọbụna ma ọ bụrụ na di ya abụghị onye kwere ekwe, ọ ‘ga-edo onwe ya n’okpuru’ ya. (1 Pita 3:1) Onye Kraịst bụ nwanyi na-egosipụta ịnọ n’okpuru dị otú ahụ dị ka onye bụ nwunye site n’ịkwado di ya ná mkpebi ndị ọ na-eme ma ọ bụrụhaala na mkpebi ndị a emegideghi iwu Chineke. (Ọrụ 5:29) N’ihi gịnịkwa ka o ji anakwere ọrụ nke a? Ọ bụghị nani n’ihi na ọ hurụ di ya n’anya kama karịsịa n’ihi na ọ matara na ‘o kwesịrị ekwesi n’ime Onyenwe anyi’—ya bụ, ọ bụ ndokwa Chineke maka ezinụlọ ahụ. (Ndị Kọlọsi 3:18) Ịdị njikere ọ dị ido onwe ya n’okpuru di ya si otú a bụrụ ngosipụta nke nsọpụrụ Chineke ya.
“Ọ Bụ Ime Nke a Ka M Pụtara”
15. Olee ụzọ pụtara ìhè Jisọs si gosipụta nsọpụrụ Chineke?
15 Otu n’ime ụzọ pụrụ iche Jisọs si gosipụta nsọpụrụ Chineke bụ site ‘n’ikwsa ozi ọma alaeze Chineke.’ (Luk 4:43) Mgbe o mesịrị baptism na Jọdan na 29 O.A., Jisọs jiri afọ atọ na ọkara na-esonụ mee ihe n’ụzọ dị ukwuu n’ịrụ ọrụ nke a kasị dị mkpa. “N’ihi na ọ bụ ime nke a ka m pụtara,” ka ọ kọwara. (Mak 1:38; Jọn 18:37) Ma olee otú nke a si bụrụ ngosipụta nke nsọpụrụ Chineke o nwere?
16, 17. (a) Gịnị kpaliri Jisọs itinye onwe ya nke ukwuu n’ọrụ ime nkwusa na izi ihe? (b) N’ihi gịnị ka ije ozi Jisọs nke ime nkwusa na izi ihe ji bụrụ ngosipụta nke nsọpụrụ Chineke ya?
16 Cheta na nsọpụrụ Chineke metụtara ibi ndụ n’ụzọ na-atọ Chineke ụtọ n’ihi na ị hụrụ ya n’anya ma nwee ekele miri emi n’àgwà ya ndị dị oké ọnụ ahịa. Mgbe ahụ, gịnị kpaliri Jisọs iji afọ ndị ikpeazụ ya n’elu ụwa mee ihe n’ụzọ dị ukwuu ịrụ ọrụ ime nkwusa na izi ihe? Ọ̀ bụ nanị n’ihi echiche nke ibu ọrụ nke o nwere? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na o nwere nchegbu n’ebe ndị mmadụ nọ. (Matiu 9:35, 36) Ọ ghọtakwara n’ụzọ zuru ezu na otite e ji mmụọ nsọ tee ya mmanụ họpụtara ma nye ya ọrụ nke ije ozi ya. (Luk 4:16-21) Ma, ebumnuche ya kariri nke ahụ.
17 “Ana m ahụ Nna m n’anya,” ka Jisọs gwara ndị ozi ya hoo haa n’abalị ikpeazụ nke ndụ elu ala ya. (Jọn 14:31) Ịhụnanya ahụ dabeere n’ihe ọmụma dị ezi omimi, siekwa ike nke o nwere n’ebe àgwà nile nke Jehova dị. (Luk 10:22) Site n’ịbụ onye obi nke jupụtara n’ekele miri emi kpaliri, Jisọs nwetara ọṅụ n’ime uche Chineke. (Abụ Ọma 40:8) Ọ bụ “nri” ya—bụ́ nke dị oké mkpa maka ndụ, dịkwa ụtọ nke ukwu. (Jọn 4:34) O setipụrụ ihe nlereanya zuru okè ‘n’ibu ụzọ chọọ alaeze Chineke’ kama ibu ụzọ chọọ ọdịmma onwe ya. (Matiu 6:33) Ya mere ọ bụghị nanị ihe o mere ma ọ bụ ọbụna ókè hà aṅaa o mere kama ihe mere o ji mee ya bụ ya mere ije ozi ya nke ime nkwsa na izi ihe ji bụrụ ngosipụta nke nsọpụrụ Chineke ya.
18. N’ihi gịnị ka ikeretụ òkè n’ozi ji ghara ịbụcha ngosipụta nke nsọpụrụ Chineke?
18 Olee ụzọ anyị pụrụ isi gbasoo “ihe ilereanya” ahụ, bụ́ Jisọs, n’ihe’ banyere nke a? (1 Pita 2:21) Ndị nile zaghachiri n’ọkpụkpọ òkù Jisọs ahụ bụ́ ‘ibịa soo ụzọ ya’ nwere ọrụ Chineke nyere ha ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ na ime ndị na-eso ụzọ. (Luk 18:22; Matiu 24:14; 28:19, 20) Nke a ọ̀ pụtara na site n’ikere òkè n’ikwusa ozi ọma ahụ, na anyị na-agbaso nsọpụrụ Chineke? Ọ bụchaghị ya kpọmkwem. Ọ bụrụ na anyị ga-eje ozi ahụ iji zara aha ma ọ bụ iji mezuo iwu, ma ọ bụ nanị iji mee ka obi na-atọ ndị òtù ezinụlọ anyị ma ọ bụ ndị ọzọ ụtọ, ọ ga-esi ike iwere ya dị ka ‘ọrụ nke nsọpụ-rụ Chineke.’—2 Pita 3:11.
19. (a) Olee ihe na-aghaghị ịbụ isi ihe dị n’ihe anyị na-eme n’ozi ahụ? (b) Gịnị na-esi na ya apụta mgbe a kpaliri anyj site n’ịhụnanya gbamiri mkpọrọgwụ anyj nwere n’ebe Chineke nọ?
19 Dị ka Jisọs, ebumnuche anyi aghaghị ịdị omimi karị. Jisọs kwuru, sị: “Ị ga-ahụkwa [Jehova, NW], bụ́ Chineke gị, n’anya, site n’obi gi dum [mmetụta uche nile, ọchịchọ nile, na mmetụta nke mmadụ ime], sitekwa ná mkpụrụ obi gi dum [ndụ gi na onwe gị nile], sitekwa n’uche gị dum [ọgụgụ isi gị nile], sitekwa n’ike gị dum.” Banyere nke a, otu onye odeakwụkwọ nwere nghọta kwkwara, sị: “Ọ kachasị àjà nsure ọkụ nile na àjà ọzọ nile nke ukwuu.” (Mak 12:30, 33, 34) Ya mere ọ bụghị nanị ihe anyị na-eme bụ ihe dị mkpa kamakwa ihe mere anyị ji na-eme ya. Ịhụnanya gbara mkpọrọgwụ dị omimi anyị nwere maka Chineke nke metụtara ike anyị nile aghaghị ịbụ isi ihe dị n’ihe anyị na-eme n’ije ozi ahụ. Mgbe ọ dị otú ahụ, afọ agaghị eju anyị n’ikere òkè iji mezuo iwu kama anyị ga-abụ ndị a kpaliri igosipụta ókè nke nsọpụrụ Chineke anyị site n’ime ókè anyị nwere ike. (2 Timoti 2:15) N’otu Oge ahụ, mgbe ịhụnanya maka Chineke bụ ebumnuche anyị, anyị agaghị abụ ndị nkọcha, na-eji ozi anyị na-eje na-atụnyere nke ndị ọzọ.—Ndị Galetia 6:4.
20. Olee ụzọ anyi pụrụ isi rite uru zuru ezu site n’ihe nlereanya Jisọs n’ịgbaso nsọpụrụ Chineke?
20 Lee obi ekele anyị pụrụ inwe na Jehova ekpugheworo anyị ihe omimi dị nsọ nke nsọpụrụ Chineke! Site n’iji nlezianya na-amụ ihe ndị Jisọs kwuru ma mee na site n’ịgba mbọ iṅomi ya, a ga-enyere anyị aka ịzụlite na igosipụta nsọpụrụ Chineke n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ezu karị. Jehova ga-agọzi anyị n’ụba ka anyị na-eṅomi ihe nlereanya Jisọs n’ịgbaso nsọpụrụ Chineke dị ka ndị Kraịst raraworo onwe ha nye, e mekwara baptism.—1 Timoti 4:7, 8.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Maka ụfọdụ ihe atụ ndị ọzọ, tụlee ihe anyị na-amụta banyere Jehova site n’ihe ndekọ ndị a sonụ: Matiu 8:2, 3; Mak 14:3-9; Luk 21:1-4; na Jọn 11:33-36.
b Maka nkọwa zuru ezu banyere ihe ọ gụnyere n’itinye nsọpụrụ Chineke n’ọrụ n’ebe ndị mụrụ ụmụ meworo agadi nọ, lee Ụlọ Nche, June 1, 1987, peji 13 ruo 18.
Ị Na-echeta?
◻ N’ịgbaso nsọpụrụ Chineke, gịnị mere anyị ga-eji tụlee ihe nlereanya Jisọs?
◻ Gịnị ka anyị na-amụta banyere Jehova site n’obi ọma na mmetụta nke Jisọs gosipụtara?
◻ Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta nsọpụrụ Chineke n’ebe ndị òtù ezinụlọ anyị nọ?
◻ Gịnị ka ebumnuche anyị na-aghaghị ịbụ ka ije ozi anyị wee bụrụ ngosipụta nke nsọpụrụ Chineke?
[Foto dị na peeji nke 21]
Onye Kraịst bụ nna nwere ibu ọrụ igbo mkpa ezinụlo ya n’ụzọ anụ ahụ, n’ụzọ mmetụta uche, na n’ụzọ ime mmụọ
[Foto dị na peeji nke 23]
‘Ma ọ buru na nwanyị ọ bụla di ya nwụrụ nwere ụmụ ma ọ bụ ụmụ ụmụ, ka ha . . . nyeghachi ndị mụrụ ha ihe.’