Adala Mbà n’Ọsọ nke Ndụ!
“Ka anyị werekwa ntachi obi gbaa ọsọ ahụ e debere anyị n’ihu.”—NDỊ HIBRU 12:1.
1, 2. Ihe omume ndị dị aṅaa na-akpali akpali meworo ka ndị ohu Jehova nwee obi ụtọ na mgbe ikpeazụ ndị a?
ANYỊ bi n’oge ndị na-akpali akpali ma na-ama aka. Ihe karịrị afọ 80 gara aga, na 1914, e mere ka Jisọs nọkwasị n’ocheeze dị ka Eze nke Alaeze eluigwe Chineke. ‘Ụbọchị Onyenwe anyị’ na “mgbe ọgwụgwụ” nke usoro ihe a malitere. (Mkpughe 1:10; Daniel 12:9) Kemgbe ahụ ọsọ nke ndụ onye Kraịst adịwanyela ngwa. Ndị ohu Chineke adọgbuwo onwe ha n’ọrụ nke ukwuu iji nọgide na-eso ụgbọ ịnyịnya eluigwe Jehova, nzukọ eluigwe ya, bụ́ nke na-aga n’akwụsịghị akwụsị imezu nzube Jehova.—Ezikiel 1:4-28; 1 Ndị Kọrint 9:24.
2 Ndị Chineke hà achọtawo ọṅụ ka ha ‘na-agba ọsọ’ gaa ná ndụ ebighị ebi? Ee, n’ezie! Ha enwewo obi ụtọ ịhụ nchịkọta nke ndị fọdụrụ n’ime ụmụnna Jisọs, ha na-enwekwa ọṅụ ịmata na ịka akara ikpeazụ nke ndị ahụ fọdụrụ n’ime 144,000 ahụ agamiwo. (Mkpughe 7:3, 4) Ọzọkwa, ha nwere obi ụtọ ịghọta na Eze Jehova họpụtara etinyewo mma ya iwe ‘ihe ubi nke ụwa.’ (Mkpughe 14:15, 16) Leekwa oké iwe ihe ubi ọ bụ! (Matiu 9:37) Ka ọ dị ugbu a, a chịkọbatawo ihe karịrị nde mmadụ ise—“oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile, pụta.” (Mkpughe 7:9) Ọ dịghị onye pụrụ ikwu otú ìgwè mmadụ ahụ ga-emesị hara n’ịdị ukwuu, ebe ọ bụ na ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịgụta ya ọnụ.
3. N’agbanyeghị gịnị ka anyị na-aghaghị ịgbalị mgbe nile ịzụlite mmụọ nke ọṅụ?
3 N’eziokwu, Setan na-anwa ime ka anyị kpọbie ụkwụ ma ọ bụ kwụsịtụ anyị ka anyị na-agbasi ọsọ ahụ ike. (Mkpughe 12:17) Ọ dịbeghịkwa mfe ịnọgide na-agbafe agha, ụnwụ nri, ọrịa na-efe efe, na ihe isi ike ndị ọzọ ndị na-aka oge ọgwụgwụ ahụ akara. (Matiu 24:3-9; Luk 21:11; 2 Timoti 3:1-5) N’agbanyeghị nke ahụ, obi anyị na-amali n’ọṅụ ka ọgwụgwụ ọsọ ahụ na-abịarukwu nso. Anyị na-agbalị igosipụta mmụọ nke Pọl gbara ndị Kraịst ibe ya ume n’ụbọchị ya inwe: “Na-aṅụrịnụ ọṅụ n’Onyenwe anyị mgbe nile: m ga-asị ọzọ, Na-aṅụrịnụ ọṅụ.”—Ndị Filipaị 4:4.
4. Ụdị mmụọ dị aṅaa ka ndị Filipaị bụ́ ndị Kraịst gosipụtara?
4 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndị Kraịst Pọl gwara okwu ndị ahụ na-enwe ọṅụ n’okwukwe ha, n’ihi na Pọl gwara ha, sị: “Na-aṅụrịnụ ọṅụ n’ime Onyenwe anyị.” (Ndị Filipaị 3:1, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ndị Filipaị bụ ọgbakọ na-emesapụ aka, na-ahụ n’anya, ndị ji ịdị uchu na ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi. (Ndị Filipaị 1:3-5; 4:10, 14-20) Ma ọ bụghị ndị Kraịst nile nke narị afọ mbụ nwere mmụọ ahụ. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ n’ime ndị Juu bụ́ ndị Kraịst Pọl degaara akwụkwọ Ndị Hibru bụ ihe na-akpata nchegbu.
‘Ṅabiga Ntị Ókè Karị’
5. (a) Mmụọ dị aṅaa ka ndị Hibru bụ́ ndị Kraịst nwere mgbe e guzobere ọgbakọ ndị Kraịst mbụ? (b) Kọwaa mmụọ nke ụfọdụ ndị Hibru bụ́ ndị Kraịst n’ihe dị ka 60 O.A.
5 Ndị Juu anụ ahụ na ndị na-eso ụzọ ndị Juu mejupụtara ọgbakọ ndị Kraịst mbụ n’akụkọ ihe mere eme nke ụwa, e guzobekwara ya na Jerusalem na 33 O.A. Ụdị mmụọ dị aṅaa ka o nwere? Mmadụ pụrụ ịgụ nanị isiakwụkwọ ndị mbụ nke akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi iji mata banyere ịnụ ọkụ n’obi na ọṅụ ya, ọbụna n’agbanyeghị mkpagbu. (Ọrụ 2:44-47; 4:32-34; 5:41; 6:7) Otú ọ dị, ka ọtụtụ iri afọ gafere, ihe gbanwere, ihe àmà gosiri na ọtụtụ ndị Juu bụ́ ndị Kraịst kwụsịlatara n’ọsọ nke ndụ. Otu akwụkwọ ntụaka na-ekwu nke a banyere ọnọdụ ha dị ka ọ dịrị n’ihe dị ka 60 O.A., sị: “Ọnọdụ nke umengwụ na ike ọgwụgwụ, nke olileanya dakpọrọ adakpọ, olileanya na-erubeghị aka, ọdịda a ma ụma daa na ekweghị ekwe pụtara ìhè. Ha bụ ndị Kraịst ma ha nwere nghọta dị nta banyere ebube nke ọkpụkpọ a kpọrọ ha.” Olee otú ndị Kraịst e tere mmanụ pụrụ isi baa n’ọnọdụ dị otú ahụ? Ntụle nke akụkụ ụfọdụ nke akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Hibru (e dere n’ihe dị ka 61 O.A.) na-enyere anyị aka ịza ajụjụ ahụ. Ntụle dị otú ahụ ga-enyere anyị nile aka taa izere imikpu n’ime ọnọdụ adịghị ike ime mmụọ yiri nke ahụ.
6. Olee ọdịiche ụfọdụ dị n’etiti ofufe n’okpuru Iwu Mosis na ofufe dabeere n’okwukwe na Jisọs Kraịst?
6 Ndị Hibru bụ́ ndị Kraịst si n’okpukpe ndị Juu pụta, usoro nke zọọrọ irube isi n’Iwu ahụ Jehova nyere site n’aka Mosis. O yiri ka Iwu ahụ ọ nọgidere na-adọrọ mmasị nke ọtụtụ ndị Juu bụ́ ndị Kraịst, ikekwe n’ihi na ruo ọtụtụ narị afọ ọ bụwo ụzọ e nwere nanị ya isi jekwuru Jehova, ọ bụkwa usoro ofufe na-adọrọ mmasị, na-enwe òtù ndị nchụàjà, ịchụàjà chiri anya, na ụlọ nsọ a ma ama n’ụwa na Jerusalem. Iso Ụzọ Kraịst dị iche. Ọ na-achọ anya ime mmụọ, dị ka nke Mosis, onye “wepụrụ anya ya lee nnyeghachi nke ụgwọ ọrụ ahụ [ka dị n’ihu]” ma ‘nọgidesie ike, dị ka ọ na-ahụ Onye ahụ Nke a na-apụghị ịhụ anya.’ (Ndị Hibru 11:26, 27) Dị ka ihe àmà na-egosi, ọtụtụ ndị Juu bụ́ ndị Kraịst enweghị anya ime mmụọ dị otú ahụ. Ha nọ na-arụgharị ụkwụ kama ịdị na-agba ọsọ dị ka ndị nwere nzube.
7. Olee otú usoro ihe nke anyị si na ya pụta pụrụ isi metụta otú anyị si agba ọsọ nke ndụ ahụ?
7 È nwere ọnọdụ yiri nke ahụ taa? Ihe adịchaghị otú ahụ. Ma, ndị Kraịst si n’usoro ihe nke na-etu ọnụ nke ukwuu pụta. Ụwa na-enye ohere ndị na-akpali akpali, ma n’otu oge ahụ, ọ na-achọ ihe dị ukwuu n’aka ndị mmadụ. Ọzọkwa, ọtụtụ n’ime anyị bi n’ala ebe inwe obi abụọ jupụtara na ebe ndị mmadụ nwere àgwà ichọ ọdịmma onwe onye nanị, nke nke m-godị. Ọ bụrụ na anyị ekwe ka usoro ihe dị otú ahụ metụta anyị, ọ pụrụ ime ka ‘anya obi anyị’ ghara ịhụ ụzọ nke ọma. (Ndị Efesọs 1:18) Olee otú anyị ga-esi gbaa ọsọ ndụ ahụ nke ọma ma ọ bụrụ na anyị enwekwaghị ike ịghọtacha ebe anyị na-aga?
8. Olee ụzọ ụfọdụ Iso Ụzọ Kraịst si karịa ofufe n’okpuru Iwu ahụ?
8 Iji kpalie ndị Juu bụ́ ndị Kraịst, Pọl chetaara ha banyere nkarị nke usoro ndị Kraịst karịrị Iwu Mosis. N’eziokwu, mgbe mba nke Israel anụ ahụ bụ ndị Jehova nọ n’okpuru Iwu ahụ, Jehova gwara ya okwu site n’ọnụ ndị amụma nwere ike mmụọ nsọ. Ma, ka Pọl na-ekwu, taa ọ na-ekwu okwu “n’ime Ọkpara, Onye O doro onye nketa nke ihe nile, Onye O sitekwara n’aka Ya mee ụwa nile.” (Ndị Hibru 1:2) N’ịgakwu n’ihu, Jisọs karịrị ndị eze nile n’usoro Devid, “ndị nketa ibe” ya. Ọbụna ọ dị elu karịa ndị mmụọ ozi.—Ndị Hibru 1:5, 6, 9.
9. N’ihi gịnị ka o ji dị anyị mkpa, dị ka ndị Juu bụ́ ndị Kraịst nke ụbọchị Pọl, “ịṅabiga ntị ókè karị” n’ihe Jehova na-ekwu?
9 Ya mere, Pọl dụrụ ndị Juu bụ́ ndị Kraịst ọdụ, sị: “Anyị aghaghị ịṅabiga ntị ókè karị n’ihe a nụrụ, ka a ghara ibupụ anyị n’ebe ha dị ma eleghị anya, dị ka mmiri na-ebupụ ụgbọ.” (Ndị Hibru 2:1) Ọ bụ ezie na ịmụta banyere Kraịst bụ ngọzi magburu onwe ya, a chọrọ ihe ka ukwuu. Ọ dị ha mkpa ịṅa ntị nke ọma n’Okwu Chineke iji guzogide mmetụta nke ụwa ndị Juu gbara ha gburugburu. Ọ dịkwa anyị mkpa “ịṅabiga ntị ókè karị” n’ihe Jehova na-ekwu n’ihi mkpọsa anyị na-anụ n’ụwa a mgbe nile. Nke a pụtara ịzụlite àgwà ịmụ ihe dị mma na ịnọgide na-enwe usoro ọgụgụ Bible dị mma. Dị ka Pọl mesịrị kwuo n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Hibru, ọ pụtakwara ịgachi nzukọ anya na ịkpọsa okwukwe anyị gwa ndị ọzọ. (Ndị Hibru 10:23-25) Ọrụ dị otú ahụ ga-enyere anyị aka ịnọgide na-amụrụ anya n’ime mmụọ ka anyị wee ghara ịtụfu olileanya anyị dị ebube. Ọ bụrụ na anyị ewere echiche Jehova mejupụta uche anyị, ihe ọ bụla nke ụwa a pụrụ ime anyị agaghị akarị anyị ike ma ọ bụ kwachapụ anyị.—Abụ Ọma 1:1-3; Ilu 3:1-6.
“Na-arịọrịtanụ Ibe Unu Arịrịọ”
10. (a) Gịnị pụrụ ime onye na-adịghị aṅabiga ntị ókè karị n’Okwu Jehova? (b) Olee otú anyị pụrụ isi nọgide ‘na-arịọrịta ibe anyị arịrịọ’?
10 Ọ bụrụ na anyị aṅaghị ntị nke ọma n’ihe ime mmụọ, nkwa Chineke pụrụ iyizi ihe na-agaghị eme eme. Nke a mere ọbụna na narị afọ mbụ mgbe ndị Kraịst e tere mmanụ mejupụtara ọgbakọ kpam kpam mgbe ụfọdụ ndị ozi ka nọkwa ndụ. Pọl dọrọ ndị Hibru aka ná ntị, sị: “Lezienụ anya, ụmụnna m, ka ajọ obi nke ekweghị ekwe ghara ịdị n’ime onye ọ bụla n’etiti unu ma eleghị anya, n’iwezụga onwe ya n’ebe Chineke dị ndụ nọ: kama na-arịọrịtanụ ibe unu arịrịọ kwa ụbọchị, n’ogologo oge a a na-akpọ ya Taa; ka obi onye ọ bụla n’etiti unu ghara ime etili site n’aghụghọ nke mmehie.” (Ndị Hibru 3:12, 13) Okwu Pọl bụ́ “lezienụ anya” na-emesi ike mkpa ọ dị ịmụrụ anya. Ihe ize ndụ dị! Enweghị okwukwe—“mmehie”—pụrụ ibilite n’ime obi anyị, anyị pụkwara iwezụga onwe anyị n’ebe Chineke nọ kama ịbịakwu ya nso. (Jemes 4:8) Pọl na-echetara anyị ka anyị ‘nọgide na-arịọrịta ibe anyị arịrịọ.’ Mkpakọrịta na-ekpo ọkụ nke ụmụnna dị anyị mkpa. “Ọchịchọ nke ya onwe ya na-achọsi ike ka onye na-ekewapụ onwe ya na-achọ, ọ bụ ezi nzube ihe nile ka ọ na-alụsosi ọgụ ike.” (Ilu 18:1) Mkpa maka mkpakọrịta dị otú ahụ na-akpali ndị Kraịst taa ịgachi nzukọ ọgbakọ na mgbakọ dị iche iche anya.
11, 12. N’ihi gịnị ka afọ na-ekwesịghị iji ju anyị n’ịmara nanị ozizi mmalite ndị bụ isi nke ndị Kraịst?
11 Ka e mesịrị n’akwụkwọ ozi ya, Pọl nyekwuru ndụmọdụ a bara uru: “Mgbe unu kwesịrị ịbụ ndị ozizi n’ihi oge, ọ dị unu mkpa ọzọ ka mmadụ zie unu ihe bụ ihe ozizi mbụ nke mmalite okwu si n’ọnụ Chineke pụta; unu aghọwokwa ndị mmiri ara dị mkpa, ọ bụghị nri siri ike. . . . Nri siri ike bụ nke ndị tozuru okè, ndị a nwaworo nghọta ha n’ihi omume ha na-eme mgbe dum ịtụle ihe ọma na ihe ọjọọ.” (Ndị Hibru 5:12-14) Dị ka ihe àmà na-egosi, ụfọdụ ndị Juu bụ́ ndị Kraịst agaghị n’ihu n’inwe nghọta. Ha adịghị ngwa n’ịnakwere ìhè mụbawanyere banyere Iwu ahụ na ibi úgwù. (Ọrụ 15:27-29; Ndị Galetia 2:11-14; 6:12, 13) Ụfọdụ ka pụrụ iji ememe ọdịnala ndị dị ka Sabat a na-eme kwa izu na ememe Ụbọchị Mkpuchi Mmehie kpọrọ oké ihe.—Ndị Kọlọsi 2:16, 17; Ndị Hibru 9:1-14.
12 N’ihi ya, Pọl na-asị: “Ka anyị hapụ okwu nke mmalite nke Kraịst, ka a na-eburukwa anyị ruo n’itozu okè.” (Ndị Hibru 6:1) Onye na-agba ọsọ marathon nke na-elezi ihe oriri ya anya nke ọma ga-enwe ike karị idi ogologo ọsọ ahụ na-agwụ ike. N’otu aka ahụ, onye Kraịst nke na-elezi anya n’ihe oriri ime mmụọ—n’akparaghị onwe ya ókè nanị n’ebe “okwu nke mmalite” ndị bụ isi dị—ga-enwe ike karị ịnọgide n’ọsọ ma gbazuo ya. (Tụlee 2 Timoti 4:7.) Nke a pụtara ịzụlite mmasị n’ebe “obodobo na ogologo na ịdị elu na omimi” nke eziokwu ahụ dị, si otú ahụ na-eru ntozu okè.—Ndị Efesọs 3:18.
“Ntachi Obi Dị Unu Mkpa”
13. Olee otú ndị Hibru bụ́ ndị Kraịst siworo gosipụta okwukwe ha n’oge ndị gara aga?
13 N’oge na-esochi nnọọ Pentikọst 33 O.A., ndị Juu bụ́ ndị Kraịst guzosiri ike n’agbanyeghị mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ. (Ọrụ 8:1) Ikekwe Pọl bu nke a n’uche mgbe o dere, sị: “Na-echetanụ ụbọchị mbụ ahụ, nke ọ bụ n’ime ha, mgbe e nyesịrị unu ìhè, ka unu tachiri obi n’oké ịgba mgba nke ahụhụ dị iche iche.” (Ndị Hibru 10:32) Iji ikwesị ntụkwasị obi na-atachi obi otú ahụ gosipụtara ihụnanya ha maka Chineke, nyekwa ha nkwuwa okwu n’ebe ọ nọ. (1 Jọn 4:17) Pọl na-adụ ha ọdụ ka ha ghara ịtụfu nke ahụ n’ihi enweghị okwukwe. Ọ gbara ha ume, sị: “Ntachi obi dị unu mkpa, ka ọ ga-abụ, mgbe unu meworo ihe Chineke na-achọ, ka unu wee nata nkwa ahụ. N’ihi na lee ka nwa oge nta fọdụrụ hà, Onye ahụ Nke na-abịa ga-abịa, Ọ gaghị anọkwa ọdụ.”—Ndị Hibru 10:35-37.
14. Eziokwu ndị dị aṅaa kwesịrị inyere anyị aka ịtachi obi ọbụna mgbe ọtụtụ afọ nke ijere Jehova ozi gasịrị?
14 Gịnị banyere anyị taa? Ọtụtụ n’ime anyị nwere ịnụ ọkụ n’obi mgbe mbụ anyị nụrụ eziokwu ndị Kraịst. Ànyị ka nwere ịnụ ọkụ n’obi ahụ? Ka ànyị ‘ahapụwo ịhụnanya ahụ anyị nwere na mbụ’? (Mkpughe 2:4) Ànyị adajụlatala, ikekwe na-enwe nkụda mmụọ ma ọ bụ ike ọgwụgwụ ichere Amagedọn? Otú ọ dị, kwụsị ma chee echiche. Eziokwu ahụ ebelatabeghị n’ịdị mma ya karịa ka ọ dị na mbụ. Jisọs ka bụ Eze anyị nke eluigwe. Anyị ka na-ele anya ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs, anyị ka nwekwara mmekọrịta anyị na Jehova. Echefukwala mgbe ọ bụla: “Onye ahụ Nke na-abịa ga-abịa, Ọ gaghị anọkwa ọdụ.”
15. Dị ka Jisọs, olee otú ndị Kraịst ụfọdụ siworo tachie obi ná mkpagbu ndị dị ilu?
15 N’ihi ya, okwu Pọl e dekọrọ ná Ndị Hibru 12:1, 2 (NW) dabara nnọọ adaba: “Ka anyị wezụgakwa ibu ọ bụla na mmehie ahụ [enweghị okwukwe] nke na-ekegide anyị n’ụzọ dị mfe, ka anyị jirikwa ntachi obi na-agba ọsọ ahụ e debere n’ihu anyị, ka anyị na-elegide anya n’ebe Onye Isi Ọrụ na Onye Mmezu nke okwukwe anyị nọ, bụ́ Jisọs. N’ihi ọṅụ e debere n’ihu ya, o diri osisi ịta ahụhụ, na-elelị ihere, ọ nọdụwokwa ala n’aka nri nke ocheeze Chineke.” E nwere ọtụtụ ihe ndị ohu Chineke tachiwooro obi na mgbe ikpeazụ a. Dị ka Jisọs, onye kwesịrị ntụkwasị obi ruo n’ọnụ ọnwụ ihe mgbu, ụfọdụ n’ime ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị anyị atachiwo obi ná mkpagbu ndị kasị ilu—ụlọ mkpọrọ, mmekpọ ọnụ, ndina n’ike, ọbụna ọnwụ. (1 Pita 2:21) Ọ̀ bụ na ịhụnanya adịghị ejupụta anyị n’obi maka ha mgbe anyị tụlere iguzosi ike n’ezi ihe ha?
16, 17. (a) Ihe ịma aka ndị dị aṅaa nye okwukwe ha ka ihe ka ọtụtụ n’ime ndị Kraịst na-agbaso mgba? (b) Icheta gịnị ga-enyere anyị aka ịnọgide n’ọsọ nke ndụ ahụ?
16 Otú ọ dị, okwu Pọl gara n’ihu ikwu metụtara ihe ka n’ọnụ ọgụgụ: “Unu aka-eguzogideghị ruo ọbara, n’ịgba mgba megide mmehie.” (Ndị Hibru 12:4) Otú o sina dị, n’usoro ihe a, ụzọ nke eziokwu ahụ adịghịrị onye ọ bụla n’ime anyị mfe. A na-akụda ụfọdụ obi site ná ‘nkwugide nke ndị mmehie’ n’ọrụ ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ, ha na-atachi obi n’ịkwa emo ma ọ bụ na-eguzogide nrụgide ime mmehie. (Ndị Hibru 12:3) Ọnwụnwa siri ike akwadawo mkpebisi ike nke ụfọdụ ndị ijigide ụkpụrụ dị elu nke Chineke. (Ndị Hibru 13:4, 5) Ndị si n’ezi ofufe dapụ emetụtawo nguzozi ime mmụọ nke ole na ole bụ́ ndị gere ntị ná mkpọsa ha na-egbu ka nsí. (Ndị Hibru 13:9) Ịdị iche n’ụdị onye mmadụ bụ anapụwo ndị ọzọ ọṅụ. Iji ntụrụndụ na ihe omume ntụsara ahụ kpọrọ ihe gabiga ókè emewo ka ụfọdụ ndị Kraịst daa mbà. Ihe ka n’ọtụtụ kwa na-enwe nrụgide site ná nsogbu nke ibi obi n’usoro ihe a.
17 N’eziokwu, ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ọnọdụ ndị a bụ ‘iguzogide ruo ọbara.’ A pụkwara ịchọpụta na ụfọdụ bụ n’ihi mkpebi na-ezighị ezi ndị anyị mere n’onwe anyị. Ma ha nile na-ewetara okwukwe anyị ihe ịma aka. Ọ bụ nke ahụ mere anyị kwesịrị iji lekwasị anya n’ihe nlereanya magburu onwe ya nke ntachi obi Jisọs. Ka anyị ghara ichefu mgbe ọ bụla otú olileanya anyị maruru ná mma. Ya adịla mgbe ọ bụla anyị ga-atụfu nkwenyesi ike anyị na Jehova “na-egosikwa Onwe ya Onye na-enyeghachi ndị na-achọ Ya ụgwọ ọrụ.” (Ndị Hibru 11:6) Mgbe ahụ, anyị ga-enwe ikike ime mmụọ ịnọgide n’ọsọ ndụ ahụ.
Anyị Pụrụ Ịtachi Obi
18, 19. Olee akụkọ ihe mere eme ndị na-enye echiche na ndị Hibru bụ́ ndị Kraịst nọ na Jerusalem ṅara ntị na ndụmọdụ Pọl sitere n’ike mmụọ nsọ?
18 Olee otú ndị Juu bụ́ ndị Kraịst si meghachi omume n’ebe akwụkwọ ozi Pọl dị? Ihe dị ka afọ isii e desịrị akwụkwọ ozi ahụ e degaara ndị Hibru, Judia banyere n’agha. Na 66 O.A., ndị agha Rom wakporo Jerusalem, na-emezu okwu Jisọs: “Mgbe ọ bụla unu ga-ahụ Jerusalem ka a chị usuu ndị agha nọgide ya gburugburu, mgbe ahụ maranụ na ịtọgbọrọ n’efu ya dị nso.” (Luk 21:20) Otú ọ dị, maka abamuru nke ndị Kraịst ga-anọ na Jerusalem n’oge ahụ, Jisọs sịrị: “Mgbe ahụ ndị nọ na Judia, ka ha gbalaga n’ugwu; ndị nọkwa n’etiti ya, ka ha si n’ime ya wezụga onwe ha; ndị nọkwa n’ala ọzọ, ka ha ghara ịba n’ime ya.” (Luk 21:21) Ya mere, agha ahụ ha na Rom lụrụ wetara ule: Ndị Juu ahụ bụ́ ndị Kraịst hà ga-agbahapụ Jerusalem, bụ́ ebe bụ isi maka ofufe ndị Juu na ebe ụlọ ukwu ahụ dị ebube dị?
19 Na mberede, n’enweghịkwa ihe a maara merenụ, ndị Rom lara. Eleghị anya, ndị Juu ji okpukpe kpọrọ ihe lere nke a anya dị ka ihe àmà na Chineke na-echebe obodo nsọ ha. Gịnị banyere ndị Kraịst? Akụkọ ihe mere eme na-agwa anyị na ha gbapụrụ. Mgbe ahụ, na 70 O.A., ndị Rom bịaghachiri ma bibie Jerusalem kpam kpam na-enwe ọtụtụ ndị nwụrụnụ. “Ụbọchị Jehova” nke Joel buru n’amụma abịakwasịwo Jerusalem. Ma ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi anọghịzi n’ebe ahụ. Ha ‘wepụgara onwe ha.’—Joel 2:30-32; Ọrụ 2:16-21.
20. Ịmara na oké “ụbọchị Jehova” dị nso kwesịrị ịkpali anyị n’ụzọ ndị dị aṅaa?
20 Taa, anyị ma na oké “ụbọchị Jehova” ọzọ ga-emetụta usoro ihe a nile n’isi nso. (Joel 3:12-14) Anyị amaghị mgbe ụbọchị ahụ ga-abịa. Ma Okwu Chineke na-emesi anyị obi ike na ọ ga-abịarịrị! Jehova na-asị na ọ gaghị anọ ọdụ. (Habakuk 2:3; 2 Pita 3:9, 10) N’ihi ya, ka anyị “ṅabiga ntị ókè karị n’ihe a nụrụ.” Zere enweghị okwukwe, “mmehie ahụ nke na-ekegide anyị n’ụzọ dị mfe.” Kpebisie ike ịtachi obi ruo oge nile ọ ga-ewe. Cheta, nzukọ eluigwe Jehova nke yiri ụgbọ ịnyịnya nọ na njem. Ọ ga-emezu nzube ya. Ya mere ka anyị nile nọgide na-agba ọsọ n’akwụsịghị akwụsị n’ọsọ nke ndụ ahụ!
Ị̀ Na-echeta?
◻ Ịṅa ntị na ndụmọdụ dị aṅaa nke Pọl nyere ndị Filipaị ga-enyere anyị aka ịtachi obi n’ọsọ nke ndụ ahụ?
◻ Gịnị ga-enyere anyị aka iguzogide ọchịchọ nke ụwa a na-achọ ịdọpụ uche anyị?
◻ Olee otú anyị pụrụ isi nyere ibe anyị aka ịtachi obi n’ọsọ ahụ?
◻ Olee ihe ụfọdụ pụrụ ịkwụsịlata onye Kraịst?
◻ Olee otú ihe nlereanya Jisọs pụrụ isi nyere anyị aka ịtachi obi?
[Foto dị na peeji nke 8, 9]
Ndị Kraịst, dị ka ndị na-agba ọsọ, ekwesịghị ikwe ka ihe ọ bụla dọpụ uche ha
[Foto dị na peeji nke 10]
Ọ dịghị ihe ga-egbochili oké ụgbọ ịnyịnya eluigwe Jehova imezu nzube Chineke