‘Obi Gị, Ò Ziri Ezi n’Ebe M Nọ?’
“Jesoo m, lee ekworo m na-ekworo Jehova.”—2 NDỊ EZE 10:16.
1, 2. (a) Olee otú ọnọdụ okpukpe Israel si jọwanye njọ? (b) Na 905 T.O.A., mgbanwe dịgasị aṅaa dị ịrịba ama na-aga iwere ọnọdụ n’Israel?
AFỌ ahụ bụ́ 905 T.O.A. bụ oge oké mgbanwe n’Israel. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 100 tupu mgbe ahụ, Jehova emewo ka e kewaa alaeze Israel dị n’otu n’ihi ndapụ n’ezi ofufe nke Solomọn. (1 Ndị Eze 11:9-13) Nwa Solomọn bụ́ Rehoboam chịrị alaeze ebe ndịda, bụ́ Juda mgbe ahụ, ebe alaeze ebe ugwu, bụ́ Israel, dị n’okpuru Eze Jeroboam, onye Efraim. N’ụzọ dị mwute, alaeze ebe ugwu ahụ nwere mmalite dị njọ. Jeroboam achọghị ka ndị ọ na-achị mee njem gaa n’alaeze ebe ndịda iji fee ofufe n’ụlọ nsọ, na-atụ egwu na ha ga-amalite iche echiche ịlaghachi n’ụlọ Devid. Ya mere, o guzobere ofufe nwa ehi n’Israel wee si otú ahụ guzobe ụkpụrụ ikpere arụsị dịtetụrụ aka n’akụkọ ihe mere eme nile nke alaeze ebe ugwu ahụ.—1 Ndị Eze 12:26-33.
2 Ihe kawanyere njọ mgbe Ehab, nwa Omri, ghọrọ eze. Nwunye ya si ala ọzọ, bụ́ Jezebel, kwalitere ofufe Beal ma gbuo ndị amụma Jehova. N’agbanyeghị ịdọ aka ná ntị ezoghị ọnụ nke Elaịja onye amụma, Ehab emeghị ihe ọ bụla igbochi ya. Otú ọ dị, na 905 T.O.A., Ehab nwụrụ, Jehoram, nwa ya, chịwakwara. Oge eruola ugbu a ime ka ala ahụ dị ọcha. Onye nọchiri Elaịja, bụ́ Elaịsha, gwara ọchịagha, bụ́ Jihu, na Jehova na-ete ya mmanụ ịbụ eze ọzọ nke Israel. Gịnị bụ ọrụ e nyere ya? Itida ụlọ Ehab na-eme mmehie na ịbọ ọ́bọ̀ ọbara ndị amụma Jezebel wụfuru!—2 Ndị Eze 9:1-10.
3, 4. Olee otú Jehonadab si gosi na obi ya ‘ziri ezi n’ebe obi Jihu dị’?
3 Ná nrubeisi nye iwu Chineke, Jihu mere ka e gbuo ajọ Jezebel ahụ, ka nke ahụ gasịkwara, ọ malitere ime ka Israel dị ọcha site n’itida ụlọ Ehab. (2 Ndị Eze 9:15–10:14, 17) Mgbe ahụ o zutere onye nkwado. “[O] wee hụta Jehonadab nwa Rikab, ka ọ na-abịa izute ya: ọ gọzie ya, sị ya, Obi gị, ò ziri ezi, dị ka obi m dị n’ebe obi gị dị? Jehonadab wee sị, Otú a ka ọ dị. Ọ bụrụ na ọ dị otú a, nye m aka gị. O wee nye ya aka ya; o wee mee ka ọ rịgoo n’ụgbọala ya. Ọ sị, Jesoo m, lee ekworo m na-ekworo Jehova. Ha wee mee ka ọ gaa ije n’ụgbọala ya.”—2 Ndị Eze 10:15, 16.
4 Jehonadab (ma ọ bụ, Jonadab) abụghị onye Israel. Ka o sina dị, n’ikwekọ n’aha ya (nke pụtara “Jehova Dị Njikere,” “Jehova Dị Mma,” ma ọ bụ “Jehova Na-emesapụ Aka”) ọ bụ onye na-efe Jehova. (Jeremaịa 35:6) N’ezie, o nwere mmasị a na-adịghị ahụkarị n’ịhụ ‘ekworo Jihu na-ekworo Jehova.’ Olee otú anyị si mara? Ọ dị mma, nzute o zutere eze Israel e tere mmanụ abụghị ihe ndabara. Jehonadab “na-abịa izute ya,” nke a bụkwa oge Jihu gbuwororị Jezebel na ndị ọzọ n’ụlọ Ehab. Jehonadab maara ihe na-eme mgbe ọ nakweere ịkpọ òkù Jihu ịrịgoro n’ụgbọala ya. N’ụzọ doro anya, ọ nọ n’akụkụ Jihu—na Jehova—n’ọgụ a dị n’etiti ofufe ụgha na ezi ofufe.
Jihu nke Oge A na Jehonadab nke Oge A
5. (a) Mgbanwe ndị dị aṅaa ga-ewere ọnọdụ n’isi nso nye ihe nile a kpọrọ mmadụ? (b) Ònye bụ Jihu ahụ Ka Ukwuu, olee ndị na-anọchitekwa anya ya n’ụwa?
5 Taa, ihe ga-agbanwe n’isi nso n’ụzọ dị ukwuu nye ihe nile a kpọrọ mmadụ dị ka ha gbanweere Israel laa azụ na 905 T.O.A. Oge dị nso ugbu a mgbe Jehova ga-eme ka ụwa dị ọcha pụọ n’ihe ọjọọ nile si ná mmetụta Setan pụta, gụnyere okpukpe ụgha. Ònye bụ Jihu nke oge a? Ọ dịghị onye ọzọ ma ọ bụghị Jisọs Kraịst, bụ́ onye a gwara okwu amụma ndị ahụ bụ́: “Kee mma agha gị n’úkwù gị, gị dike, ebube gị na ịma mma gị. N’ịma mma gị nọkwasị n’elu ịnyịnya gaa nke ọma, n’ihi eziokwu na umeala n’obi na ezi omume.” (Abụ Ọma 45:3, 4) “Israel nke Chineke,” ndị Kraịst e tere mmanụ “bụ́ ndị na-edebe ihe nile Chineke nyere n’iwu, ndị na-enwekwa àmà nke Jisọs,” na-anọchite anya Jisọs n’ụwa. (Ndị Galetia 6:16; Mkpughe 12:17) Kemgbe 1922, ụmụnna Jisọs ndị a e tere mmanụ adọwo aka ná ntị banyere ọbịbịa nke ọrụ ikpe Jehova n’atụghị egwu.—Aịsaịa 61:1, 2; Mkpughe 8:7–9:21; 16:2-21.
6. Olee ndị si ná mba dị iche iche pụta inyere ndị Kraịst e tere mmanụ aka, oleekwa otú ha siworo banye n’ụgbọala Jihu ahụ Ka Ukwuu, dị ka a pụrụ isi kwuo ya?
6 Ndị Kraịst e tere mmanụ anọghịrịị nanị ha. Dị nnọọ ka Jehonadab bịara izute Jihu, ọtụtụ ndị sitere ná mba dị iche iche abịawo ịkwado Jisọs, Jihu ahụ Ka Ukwuu, na ndị nnọchiteanya ya n’ụwa ná nguzo ha maka ezi ofufe. (Zekaraịa 8:23) Ndị Jisọs kpọrọ “atụrụ ọzọ” ya, a matara ha na 1932 dị ka ndị ha na Jehonadab oge ochie bụ otu ihe ahụ n’oge a, a kpọọkwa ha òkù ‘ịrịgo n’ụgbọala’ Jihu nke oge a. (Jọn 10:16) N’ụzọ dị aṅaa? Site ‘n’idebe ihe nile Chineke nyere n’iwu’ na isoro ndị ahụ e tere mmanụ na-ekere òkè ‘n’ịgbara Jisọs àmà.’ N’oge a, nke a na-agụnye ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke e guzobere n’okpuru Jisọs dị ka Eze. (Mak 13:10) Na 1935, a matara “Jonadab” ndị a dị ka “oké ìgwè mmadụ” nke Mkpughe 7:9-17.
7. Olee otú ndị Kraịst taa siworo gosi na ‘obi ha ka ziri ezi’ n’ebe obi Jisọs dị?
7 Kemgbe afọ ndị 1930, oké ìgwè mmadụ ahụ na ụmụnna ha e tere mmanụ ejiwo obi ike gosi nkwado ha nye ezi ofufe. N’ala ụfọdụ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ na n’Ebe Ọdịda Anyanwụ nke Europe, n’Ime Ime Ọwụwa Anyanwụ, na Africa, ọtụtụ n’ime ha anwụwo n’ihi okwukwe ha. (Luk 9:23, 24) N’ala ndị ọzọ, a tụwo ha mkpọrọ, wakpoo ha, ma ọ bụ kpagbuo ha n’ụzọ ndị ọzọ. (2 Timoti 3:12) Lee ihe ndekọ nke okwukwe ha nweworo! Akụkọ Afọ Ije Ozi 1997 na-egosikwa na ha ka kpebisiri ike ijere Chineke ozi, n’agbanyeghị ihe ọ bụla. ‘Obi ha ka ziri ezi’ n’ebe obi Jisọs dị. E gosipụtara nke a na 1997, mgbe ndị nkwusa Alaeze 5,599,931, ihe fọrọ nke nta ka ha nile bụrụ “Jonadab,” tinyere ngụkọta nke hour 1,179,735,841 n’ọrụ nke ịgbara Jisọs àmà.
Ha Ka Ji Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-eme Nkwusa
8. Olee otú Ndịàmà Jehova si egosipụta ịnụ ọkụ n’obi ha maka ezi ofufe?
8 A maara Jihu dị ka onye na-anya ụgbọala ya ọkụ ọkụ—ihe àmà nke ịnụ ọkụ n’obi ya ịrụzu ọrụ ya. (2 Ndị Eze 9:20) A kọwara Jisọs, bụ́ Jihu ahụ Ka Ukwuu, dị ka onye ịnụ ọkụ n’obi ‘ripịara.’ (Abụ Ọma 69:9) Mgbe ahụ, n’abụghị ihe ijuanya, e ji ịnụ ọkụ n’obi ezi ndị Kraịst mara ha taa. Ma n’ime ọgbakọ ma n’ihu ọha, ha ‘na-ekwusa okwu Ya n’oge kwesịrị, na n’oge na-ekwesịghị.’ (2 Timoti 4:2) Ịnụ ọkụ n’obi ha kasị pụta ìhè n’akụkụ mbụ nke 1997 mgbe otu isiokwu dị n’Ozi Alaeze Anyị gbara ọtụtụ ndị dị ka o kwere mee ume ikere òkè n’ozi ọsụ ụzọ inyeaka. Ná mba ọ bụla, e setịpụrụ ọnụ ọgụgụ mgbaru ọsọ ndị ọsụ ụzọ inyeaka. Gịnị bụ mmeghachi omume e nwetara? Ọ dị egwu! Ọtụtụ alaka gafere ọnụ ọgụgụ mgbaru ọsọ ahụ e setịpụrụ. Ecuador setịpụrụ ihe mgbaru ọsọ nke 4,000 ma, ha nyere akụkọ ozi ndị ọsụ ụzọ inyeaka dị 6,936 na March. Japan nyere ngụkọta akụkọ ozi dị 104,215 n’ime ọnwa atọ ndị ahụ. Na Zambia, ebe 6,000 bụ ihe mgbaru ọsọ, ndị ọsụ ụzọ inyeaka dị 6,414 nyere akụkọ ozi na March; 6,532 n’April; 7,695 kwa na May. N’ụwa nile, ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu nke ngụkọta ndị ọsụ ụzọ inyeaka na nke oge nile dị 1,110,251, bụ́ ịrị elu ji 34.2 pasent karịa nke 1996!
9. Tinyere ọrụ ụlọ n’ụlọ, n’ụzọ ndị ọzọ dị aṅaa ka Ndịàmà Jehova si achọta ndị mmadụ ịgwa ha ozi ọma ahụ?
9 Pọl onyeozi gwara ndị okenye sitere n’Efesọs, sị: “Otú egwu na-emeghị m ka m ghara ịkọrọ unu otu ihe n’ihe nile baara unu uru, na izi unu ihe n’ihu ọha mmadụ, n’ụlọ nke aka unu kwa n’otu n’otu.” (Ọrụ 20:20) Ndịàmà Jehova taa na-eṅomi ihe nlereanya Pọl ma na-eji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma ahụ site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Otú ọ dị, e nwere ike ọ gaghị adị mfe ịhụ ndị mmadụ n’ụlọ ha. N’ihi ya, “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” na-agba ndị nkwusa Alaeze ume ijekwuru ndị mmadụ n’ebe ndị ha na-achụ nta ego, n’okporo ámá, n’ụsọ mmiri, n’ogige ntụrụndụ ọha—ebe ọ bụla a pụrụ ịhụ ndị mmadụ. (Matiu 24:45-47) Ihe ndị ọ rụpụtara amagbuwo onwe ha.
10, 11. Olee otú ndị nkwusa nọ ná mba abụọ siworo gosi ezi uche n’ịchọta ndị a na-apụghị nnọọ inweta n’ụlọ?
10 Na Copenhagen, Denmark, otu ìgwè nta nke ndị nkwusa anọwo na-agba àmà n’okporo ámá ná mpụga ọdụ ụgbọ okporo ígwè. Malite na January ruo June, ha tinyere magazin 4,733, nwee mkparịta ụka ndị magburu onwe ha, meekwa ọtụtụ nletaghachi. Ọtụtụ ndị nkwusa n’ala ahụ eguzobewo ụzọ magazin n’ọtụtụ ụlọ ahịa. Otu obodo na-enwe otu ahịa ukwu kwa Friday, na-enwe ọtụtụ puku ndị ọbịa. Ya mere ọgbakọ ahụ ahaziwo ịgba àmà chiri anya n’ahịa. N’otu ebe, a na-eleta ụlọ akwụkwọ nile na-eji ngwugwu ihe ọmụma nwere mbipụta ndị kasị kwesị ndị nkụzi.
11 Na Hawaii kwa e mewo mgbalị iru ndị a na-apụghị ịhụ n’ụlọ. Ókèala pụrụ iche gụnyere ebe ọha na eze na-anọ (okporo ámá, ogige ntụrụndụ, ebe ndọba ụgbọala, na ebe bọs na-akwụsị), ebe ndị bụ isi n’obodo, ebe azụmahịa na ọdụ ụgbọelu, ịgba àmà telifon, usoro njem ọha na eze (ime nkwusa na bọs), na ogige mahadum. A na-akpachapụ anya iji hụ na e kenyere ọnụ ọgụgụ kwesịrị ekwesị nke Ndịàmà n’ógbè nke ọ bụla nakwa na a zụrụ ndị ahụ e kenyere ọrụ nke ọma. A na-enye akụkọ mgbalị a haziri nke ọma ndị yiri nke a n’ọtụtụ ala. N’ihi ya, a kpọtụworo ndị nwere mmasị bụ́ ndị ọ pụrụ ịbụ na a garaghị ahụ n’ozi ụlọ n’ụlọ.
Iguzosi Ike
12, 13. (a) Atụmatụ dị aṅaa ka Setan ji mee ihe megide Ndịàmà Jehova na 1997? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka mkpọsa ụgha si tụgharịa megide ihe e zubere n’otu mba?
12 N’ọtụtụ ala na 1997, e mere ajọ mkpọsa ụgha megide Ndịàmà Jehova, bụ́ nke e welitere n’ebumnobi pụtara ìhè nke ịgba ha akwụkwọ n’ụlọikpe. Ma ha adaghị mbà! (Abụ Ọma 112:7, 8) Ha chetara ekpere ọbụ abụ ahụ: “Ndị nganga etekpuwo m okwu ụgha dị ka ihe ntekpu: mụ onwe m ga-ewere obi m nile chebe ihe ịrịba àmà Gị nile.” (Abụ Ọma 119:69) Mkpọsa ụgha dị otú ahụ bụ nanị ihe àmà nke ezi ndị Kraịst ịbụ ndị a kpọrọ asị dị ka Jisọs buru n’amụma. (Matiu 24:9) N’oge ụfọdụkwa nke ahụ arụghị ihe ha zubere. Otu nwoke na Belgium gụrụ otu akụkọ ọjọọ banyere Ndịàmà Jehova n’ime otu akwụkwọ akụkọ kwa ụbọchị a ma ama. N’ịbụ onye nkwulu dị otú a wụrụ akpata oyi n’ahụ, o jere otu nzukọ n’otu Ụlọ Nzukọ Alaeze na Sunday na-esochi. O mere ndokwa isoro Ndịàmà ahụ mụọ Bible ma nọgide na-enwe ọganihu dị ngwa. Na mbụ, nwoke a so n’otu òtù ndị omekome. Ọmụmụ Bible ya nyeere ya aka ime ka ndụ ya dị ọcha, bụ́ ihe ndị mmadụ nọ ya gburugburu rịbara ama. N’ezie, onye dere isiokwu nkwulu ahụ ebughị n’uche ka ọ rụpụta ihe dị otú ahụ!
13 Ụfọdụ ndị nwere obi eziokwu na Belgium akatọwo mkpọsa ụgha ahụ. Otu n’ime ha bụ otu onye bụbu praịm minista, bụ́ onye kwetara na ihe Ndịàmà Jehova rụzuworo tụrụ ya n’anya nke ukwuu. Otu onye ome iwu dere, sị: “N’ụzọ megidere echiche dị iche iche a na-agbasa mgbe ụfọdụ, [Ndịàmà Jehova] adịghị m ka ha bụ ihe ize ndụ ọ bụla nye Gọọmenti. Ha bụ ndị amaala hụrụ udo n’anya, ndị akọ na uche na-achị, na-erubekwara ndị ọchịchị isi.” N’ezie, okwu Pita onyeozi bụ nke amamihe dị na ha: “Na-ebinụ obi unu nke ọma n’etiti ndị mba ọzọ; ka ha wee site n’ọrụ ọma nile unu, nke ha na-ele anya, nye Chineke otuto n’ụbọchị nleta ahụ n’ime ihe ahụ ha na-ekwutọ unu n’ime ya dị ka ndị na-eme ihe ọjọọ.”—1 Pita 2:12.
Otu Ememe Ncheta Dị Ịrịba Ama
14. Olee akụkọ ụfọdụ na-akpali akpali nke ndị bịara Ememe Ncheta na 1997?
14 O kwesịrị ekwesị na ndị na-agbara Jisọs àmà kwesịrị ile Ememe Ncheta ọnwụ ya anya dị ka ihe dị oké mkpa n’afọ ha. Na 1997, 14,322,226 nọ ya na March 23 ime ememe ahụ. Nke ahụ ji ihe karịrị 1,400,000 gafee nke 1996. (Luk 22:14-20) N’ọtụtụ ala ndị bịara Ememe Ncheta ahụ karịrị nnọọ ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa Alaeze, na-egosi atụmanya dị mma maka mmụba n’ọdịnihu. Dị ka ihe atụ, na Haiti, 1997 hụrụ ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị nkwusa dị 10,621, ebe 67,259 bịara Ememe Ncheta. Ị pụrụ ile akụkọ kwa afọ na peji nke 18 ruo 21 ma hụ mba ole ndị ọzọ nwere ọnụ ọgụgụ dị ukwuu dị otú ahụ nke ndị bịara ma e were ya tụnyere ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa.
15. N’ala ụfọdụ, olee otú ụmụnna anyị si merie nsogbu ndị siri ike iji mee Ememe Ncheta ahụ?
15 Nye ụfọdụ, ịbịa Ememe Ncheta adịghị mfe. N’Albania, e nwere iwu onye apụla èzí malite n’elekere 7:00 nke uhuruchi n’ihi ọgba aghara ndị obodo. N’ìgwè nta 115 gburugburu mba ahụ, Ememe Ncheta ahụ malitere n’elekere 5:45 nke uhuruchi. Anyanwụ dara n’elekere 6:08 nke uhuruchi, na-aka akara mmalite nke Nisan 14. E bugharịrị ihe nnọchianya ndị ahụ n’ihe dị ka n’elekere 6:15 nke uhuruchi. N’ihe ka n’ọtụtụ ebe, e kpere ekpere mmechi n’elekere 6:30 nke uhuruchi, ndị bịara jikwa ọsọ laa tupu oge iwu onye apụla èzí ahụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ndị bịara Ememe Ncheta ahụ dị 3,154, ma e were ya tụnyere ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị nkwusa 1,090. N’otu mba Africa, ọgba aghara obodo mere ka ịga Ụlọ Nzukọ Alaeze ghara ikwe omume, ya mere ndị okenye abụọ kpebiri izukọ n’ụlọ onye okenye nke atọ iji mee ndokwa ime ememe ahụ n’ìgwè ndị ka nta. Iji ruo n’ụlọ ahụ, ndị okenye abụọ ahụ aghaghị ịgafe otu ọwara mmiri. Otú ọ dị, a na-alụ ọgụ n’ógbè ahụ, ndị na-ezoro ezoro awakpo mmadụ na-agba onye ọ bụla nke na-anwa ịgafe ọwara ahụ égbè. Otu okenye gbafere n’enweghị ihe mere. Onye nke abụọ nọ na-agafe wee nụ ụda égbè. Ọ tụdara onwe ya n’ala ma gbere igbe gaa n’ebe na-adịghị ize ndụ ka mgbọ na-agafe n’elu isi ya. E mere nzukọ ndị okenye ahụ n’ụzọ gara nke ọma, e gbokwara mkpa ọgbakọ ahụ.
“Ndị Si ná Mba Nile Ọ Bụla, na Ebo Nile . . . na Asụsụ Nile, Pụta”
16. Olee otú òtù ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche siworo dokwaa ka a gbasaa ozi ọma ahụ n’etiti ìgwè asụsụ ndị dị nta?
16 Jọn onyeozi kwuru na oké ìgwè mmadụ ahụ ga-esi “ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile, pụta.” (Mkpughe 7:9) N’ihi ya, Òtù Na-achị Isi na-edokwa ka a na-ewepụta akwụkwọ n’ọtụtụ asụsụ karị—gụnyere ndị ebo ndị dịmiri adịmi na ìgwè ndị dị nta na-asụ. Dị ka ihe atụ, na Mozambique, e wepụtara traktị ahụ bụ́ Ndụ n’Ime Ụwa Ọhụrụ nke Udo n’asụsụ ise ọzọ. Na Nicaragua, e wepụtara broshuọ ahụ bụ́ Ịdị Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi! n’asụsụ Miskito—mbipụta mbụ nke Watch Tower Society n’asụsụ ahụ. Ọtụtụ ndị India na-asụ Miskito ji ọṅụ nakwere broshuọ ahụ ka ha hụrụ ihe e dere n’asụsụ nke aka ha. Na 1997, Society kwadoro ka e nwee akwụkwọ n’asụsụ 25 ọzọ ma bie ihe karịrị otu ijeri magazin.
17. Olee ìgwè asụsụ e nyeere aka na Korea, oleekwa otú tepụ vidio siworo nyere ndị so n’ìgwè a aka n’ụzọ dị ukwuu?
17 Na Korea e nyeere ìgwè asụsụ ọzọ aka. E nwere mgbakọ mbụ n’asụsụ ndị ogbi na ndị ntị chiri nke Korea n’afọ 1997. E nwere ọgbakọ asụsụ ndị ogbi 15 na Korea ndị nwere ndị nkwusa 543, ma 1,174 bịara mgbakọ ahụ, e mekwara 21 baptism. Iji nyere ndị ntị chiri aka, bụ́ ndị na-apụghị ịghọta okwu e kwuru ekwu ma ọ bụ nke e dere ede n’ụzọ dị mfe, a na-emepụta mbipụta dị iche iche na tepụ vidio n’asụsụ ndị ogbi 13 dị iche iche. E si otú a na-enyere ndị ntị chiri aka ‘ịgụ’ na ọbụna ịmụ ozi ọma ahụ, nke rụpụtaworo ihe ndị dị mma. Na United States, ọ pụrụ iwerubu ihe ruru afọ ise ka onye ntị chiri gaa n’ihu ruo n’ime baptism. Ugbu a, mgbe e nwere ọtụtụ vidio dị n’Asụsụ Ndị Ogbi na Ndị Ntị Chiri nke America, nye ụfọdụ ndị ogbi, e belatawo nke ahụ ruo ihe dị ka otu afọ.
‘Ịnọgide n’Ime Ụgbọala Ahụ’
18. Ka o zutesịrị Jehonadab, gịnị ka Jihu malitere ime?
18 Laa azụ na 905 T.O.A., ka Jehonadab sonyesịịrị ya, Jihu malitere ibibi ofufe ụgha. Ọ kpọrọ ndị nile na-efe Beal òkù: “Doonụ ụbọchị mgbochi nsọ nye Beal.” Mgbe ahụ, o zipụrụ ndị mmadụ n’ala nile ahụ iji hụ na ọ dịghị onye na-efe Beal ọ bụla a hapụrụ. Ka ìgwè mmadụ ahụ na-enuba n’ime oké ụlọ ukwu chi ụgha ahụ, e leziri anya ịhụ na o nweghị onye na-efe Jehova nọ n’ebe ahụ. N’ikpeazụ, Jihu na ndị agha ya gbuchapụrụ ndị ahụ na-efe Beal. “Jihu wee kpochapụ Beal n’Israel.”—2 Ndị Eze 10:20-28.
19. N’ihi ihe na-aga ịbịakwasị ihe a kpọrọ mmadụ, mmụọ dị aṅaa ka anyị kwesịrị igosi, ọrụ dịkwa aṅaa ka anyị kwesịrị iji ịdị uchu na-arụ?
19 Taa, ikpe ikpeazụ nke okpukpe ụgha nile dị nnọọ n’ihu. N’okpuru nduzi mmụọ ozi, ndị Kraịst na-akpọsa ozi ọma nye ihe nile a kpọrọ mmadụ, na-agba ha ume ịtụ egwu Chineke na ikewapụ onwe ha site n’okpukpe ụgha. (Mkpughe 14:6-8; 18:2, 4) A na-agba ndị dị umeala n’obi ume ido onwe ha n’okpuru Alaeze Chineke dị n’okpuru Eze Jehova mere ka ọ nọkwasị n’ocheeze, bụ́ Jisọs Kraịst. (Mkpughe 12:10) N’oge a na-akpali akpali, anyị agaghị ekwe ka ịnụ ọkụ n’obi anyị dajụọ ka anyị na-ewere nguzo anyị maka ezi ofufe.
20. Gịnị ka ị ga-ekpebisi ike ime n’afọ ije ozi 1998?
20 Otu oge, mgbe Eze Devid nọ n’oké nrụgide, o kpere ekpere, sị: “E doziwo obi m, Chineke, e doziwo obi m: m ga-abụ abụ, ee, m ga-abụ abụ ọma. M ga-ekele Gị n’etiti ndị nile dị iche iche, Onyenwe anyị.” (Abụ Ọma 57:7, 9) Ka anyị guzosiekwa ike. N’afọ ije ozi 1997, n’agbanyeghị ọtụtụ ihe isi ike, e tiri oké mkpu ọṅụ n’inye Jehova Chineke otuto. Ka a nụ mkpu yiri nke ahụ, ọbụna nke ka ukwuu, n’afọ ije ozi nke a. Ka nke a bụrụkwa eziokwu n’agbanyeghị ihe ọ bụla Setan pụrụ ịnwa ime iji kụda anyị obi ma ọ bụ megide anyị. Anyị ga-esi otú a gosi na obi anyị ziri ezi n’ebe Jihu ahụ Ka Ukwuu, bụ́ Jisọs Kraịst nọ, anyị ga-ejikwa mkpụrụ obi anyị dum zaghachi n’agbamume ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ: “Ṅụrịanụ ọṅụ na Jehova, tegharịakwanụ egwú ọṅụ, unu ndị ezi omume: tikwaanụ mkpu ọṅụ, unu nile ndị ziri ezi n’obi.”—Abụ Ọma 32:11.
Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?
◻ Olee mgbanwe ndị weere ọnọdụ n’Israel na 905 T.O.A.?
◻ Ònye bụ Jihu nke oge a, oleekwa otú “oké ìgwè mmadụ ahụ” siworo gosi na ‘obi ha ziri ezi’ n’ebe obi ya dị?
◻ Ndekọ ọnụ ọgụgụ dị aṅaa sitere n’akụkọ kwa afọ na-egosi ịnụ ọkụ n’obi nke Ndịàmà Jehova gosiri n’afọ ije ozi 1997?
◻ N’agbanyeghị ihe ọ bụla Setan pụrụ ime megide anyị, mmụọ dị aṅaa ka anyị ga-egosipụta n’afọ ije ozi 1998?
[Chaatị dị na peeji nke 18-21]
AKỤKỌ AFỌ IJE OZI 1997 NKE NDỊÀMÀ JEHOVA N’ỤWA NILE
(Lee Ụlọ Nche a nke e biri ebi)
[Foto dị na peeji nke 15]
Ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ndị bịara Ememe Ncheta na-egosi atụmanya dị mma maka uto n’ọdịnihu
[Foto dị na peeji nke 16]
Dị ka Jehonadab kwadoro Jihu, otú ahụ ka “oké ìgwè mmadụ” ahụ taa na-akwado Jihu ahụ Ka Ukwuu, bụ́ Jisọs Kraịst, na ụmụnna ya e tere mmanụ