Ị Pụrụ Ịtachi Obi Ruo Ọgwụgwụ
“Ka anyị werekwa ntachi obi gbaa ọsọ ahụ e debere anyị n’ihu.”—NDỊ HIBRU 12:1.
1, 2. Gịnị ka ịtachi obi pụtara?
“NTACHI obi dị unu mkpa,” ka Pọl onyeozi degaara ndị Hibru bụ́ ndị Kraịst na narị afọ mbụ. (Ndị Hibru 10:36) N’imesi ike ịdị mkpa nke àgwà a, Pita onyeozi gbakwara ndị Kraịst ume, sị: ‘Nyezuokwanụ ntachi obi n’okwukwe unu.’ (2 Pita 1:5, 6) Ma gịnị kpọmkwem bụ ntachi obi?
2 Otu akwụkwọ na-akọwa okwu Grik na Bekee na-akọwa ngwaa Grik e ji mee ihe maka “tachie obi” dị ka “nọgide kama ịgba ọsọ . . . mmadụ ịkwụsi ike n’ebe ọ kwụ, ịkwụrụ chịm.” Banyere mkpọaha Grik e ji mee ihe maka “ntachi obi,” otu akwụkwọ na-ekwu, sị: “Ọ bụ mmụọ nke pụrụ idi ihe, ọ bụghị nnọọ ná nkụda aka, kama site n’olileanya na-egbukepụ egbukepụ . . . Ọ bụ àgwà nke na-eme ka mmadụ guzo n’ụkwụ ya ma na-elepụ anya n’ihu. Ọ bụ àgwà ọma nke pụrụ ịgbanwe ule kasị sie ike ịghọ ebube n’ihi na ọ na-ahụ ihe mgbaru ọsọ gabiga ihe mgbu ahụ.” Mgbe ahụ, ntachi obi na-enyere mmadụ aka ịkwụrụ chịm ma nọgide na-enwe olileanya mgbe ihe mgbochi na ihe isi ike chere ya ihu. Olee ndị àgwà a dị mkpa karịsịa?
3, 4. (a) Olee ndị ntachi obi dị mkpa? (b) N’ihi gịnị ka anyị na-aghaghị iji tachie obi ruo ọgwụgwụ?
3 N’ụzọ ihe atụ, ndị Kraịst nile na-agba ọsọ nke chọrọ ntachi obi. N’ihe dị ka afọ 65 O.A., Pọl onyeozi degaara onye ọrụ ibe ya na onye kwesịrị ntụkwasị obi nke ya na ya so mee njegharị bụ́ Timoti okwu ndị a na-emesi obi ike, bụ́: “Agbasịwo m mgba ọma ahụ, agbasịwo m ọsọ ahụ, edebesịwo m okwukwe ahụ.” (2 Timoti 4:7) Site n’okwu ahụ bụ́ “agbasịwo m ọsọ ahụ,” Pọl ji ndụ ya dị ka onye Kraịst na-atụnyere ọsọ, nke nwere ụzọ a na-agba na ebe a na-akwụsị. N’oge ahụ, Pọl ji mmeri na-eru ngwụsị nke ọsọ ahụ, o jikwa obi ike na-elepụ anya n’ihu maka ịnata ụgwọ ọrụ. “Nke fọdụrụ,” ka ọ gara n’ihu ikwu, “bụ na e debeworo m okpueze nke ezi omume ahụ, nke Onyenwe anyị, bụ́ Onye ezi omume n’ikpe ikpe, ga-enyeghachi m n’ụbọchị ahụ.” (2 Timoti 4:8) Pọl ji n’aka na ọ ga-enweta ụgwọ ọrụ ahụ n’ihi na ọ tachiwo obi ruo ọgwụgwụ. Gịnị banyere anyị?
4 Iji gbaa ndị maliteworo ọsọ ahụ ume, Pọl dere, sị: “Ka anyị werekwa ntachi obi gbaa ọsọ ahụ e debere anyị n’ihu.” (Ndị Hibru 12:1) Dị ka ndị Kraịst, anyị na-amalite ọsọ ntachi obi a mgbe anyị raara onwe anyị nye Jehova Chineke site na Jisọs Kraịst. Ọ dị mkpa ịmalite n’ụzọ dị mma n’ọsọ ịbụ onye na-eso ụzọ, ma ihe ka mkpa bụ anyị ịgbaru ọsọ ahụ n’isi. Jisọs kwupụtara, sị: “Onye weere ntachi obi nọgide ruo ọgwụgwụ ihe nile, onye ahụ ka a ga-azọpụta.” (Matiu 24:13) Ndụ ebighị ebi bụ ihe mgbata n’ọsọ nke na-echere ndị nwere ihe ịga nke ọma n’ịgbaru ọsọ ahụ n’isi! N’ihi ya, n’ịbụ ndị bu ihe mgbaru ọsọ n’uche, anyị aghaghị ịtachi obi ruo ọgwụgwụ. Gịnị ga-enyere anyị aka iru ihe mgbaru ọsọ ahụ?
Nri Kwesịrị Ekwesị—Ihe Bụ Iwu
5, 6. (a) Gịnị ka anyị na-aghaghị ilebara anya iji nọgide n’ọsọ ndụ ahụ? (b) Ndokwa ime mmụọ ndị dị aṅaa ka anyị na-aghaghị iji mee ihe, ọ bụkwa n’ihi gịnị?
5 Ebe a nọ mee Egwuregwu Isthmus ahụ wuru ewu n’oge ochie bụ ebe dị nso n’obodo Kọrint, Gris. Obi abụọ adịghị ya na Pọl maara na ụmụnna ndị Kọrint maara asọmpi egwuregwu ndị a na-eme n’ebe ahụ nke ọma. N’iji ihe ha maara mee ihe, o chetaara ha ọsọ ndụ ha na-agba, sị: “Ùnu amataghị na ndị na-agba ọsọ n’ebe ọsọ, ha nile na-agba ọsọ, ma ọ bụ otu onye na-agbata ihe ọsọ? Na-agbanụ otú a, ka unu wee gbata.” Pọl mesiri ike mkpa ọ dị ịnọgide na-agba ọsọ ahụ, gbagidekwa ya ruo ná ngwụsị. Ma gịnị ga-enyere ha aka ime otú ahụ? “Mmadụ ọ bụla nke na-agbasi mgba ike ịka ibe ya n’egwu unu na-ejidekwa onwe ya n’ihe nile,” ka ọ gbakwụnyere. Ee, ndị sọrọ mpi n’egwuregwu oge ochie nyere onwe ha ọzụzụ siri ike, kpachapụ nnọọ anya n’ihe ndị ha na-eri ma na-aṅụ, ma na-achịkwa ihe omume ha nile iji merie.—1 Ndị Kọrint 9:24, 25.
6 Gịnị banyere ọsọ ndị Kraịst maliteworo ịgba? “Ị ghaghị ilebara nri ime mmụọ gị anya ma ọ bụrụ na ị ga-anọgide n’ọsọ ndụ ahụ,” ka otu onye okenye nke nọ n’otu ọgbakọ nke Ndịàmà Jehova kwuru. Tụlee nri ime mmụọ Jehova, bụ́ “Chineke nke ntachi obi,” nyeworo anyị. (Ndị Rom 15:5) Okwu ya, bụ́ Bible, bụ ebe bụ́ isi anyị si enweta nri ime mmụọ. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịnọgide na-enwe usoro ọgụgụ Bible dị mma? Jehova esiwokwa n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” na-ewepụta akwụkwọ ndị na-abịa n’oge ha bụ́ Ụlọ Nche na Teta! nakwa mbipụta ndị ọzọ dabeere na Bible. (Matiu 24:45) Iji ịdị uchu na-amụ ha ga-ewusi anyị ike n’ụzọ ime mmụọ. Ee, anyị aghaghị iwepụta oge—‘na-azụchapụta oge’—maka ọmụmụ ihe onwe onye.—Ndị Efesọs 5:16.
7. (a) Gịnị mere na afọ ekwesịghị iju anyị n’ịmara nanị ozizi ndị bụ́ isi nke ndị Kraịst? (b) Ànyị pụrụ isi aṅaa “ruo n’itozu okè”?
7 Iji nọgide n’ụzọ nke ịbụ onye na-eso ụzọ Kraịst, ọ dị anyị mkpa ịgabiga “okwu nke mmalite” ma “ruo n’itozu okè.” (Ndị Hibru 6:1) Ya mere anyị aghaghị ịzụlite mmasị ‘n’ihe bụ́ obodobo na ogologo na ịdị elu na omimi’ nke eziokwu ahụ ma na-enweta ihe na-edozi ahụ site ná “nri siri ike [bụ́] nke ndị tozuru okè.” (Ndị Efesọs 3:18; Ndị Hibru 5:12-14) Were dị ka ihe atụ, ihe ndekọ anọ ahụ a pụrụ ịdabere na ha banyere ndụ Jisọs n’elu ala—Oziọma Matiu, Mak, Luk, na Jọn. Site n’iji nlezianya na-amụ ihe ndekọ Oziọma ndị a, ọ bụghị nanị na anyị ga-amata ọrụ ndị Jisọs rụrụ na ụdị onye ọ bụ kamakwa anyị ga-aghọta ụzọ iche echiche nke kpaliri ihe ndị o mere. Mgbe ahụ anyị pụrụ ‘inwe uche nke Kraịst.’—1 Ndị Kọrint 2:16.
8. Nzukọ ndị Kraịst si aṅaa enyere anyị aka ịtachi obi n’ọsọ ndụ ahụ?
8 Pọl dụrụ ndị kwere ekwe ibe ya ọdụ, sị: “Ka anyị na-atụgharịtakwa uche n’ahụ ibe anyị ịkpasu ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche; ka anyị gharakwa ịhapụ nzukọ nke onwe anyị, dị ka ụfọdụ na-eme, kama ka anyị na-adụsi ndị ọzọ ọdụ ike; ka anyị mee karịakwa otú a, n’ụzọ hà otú unu na-ele ụbọchị ahụ anya ka ọ na-abịaru nso.” (Ndị Hibru 10:24, 25) Lee isi iyi nke agbamume nzukọ ndị Kraịst bụ! Leekwa ka o si bụrụ ihe na-enye ume ọhụrụ ịnọnyere ụmụnna nwoke na ndị nwanyị na-ahụ n’anya bụ́ ndị nwere mmasị n’ebe anyị nọ, ndị chọkwara inyere anyị aka ịtachi obi ruo ọgwụgwụ! Anyị agaghị achọ iji onyinye ịhụnanya a sitere n’aka Jehova gwurie egwú. Ka anyị ‘bụrụ ndị tozuru okè n’uche’ site n’ịdị uchu n’ọmụmụ ihe onwe onye nakwa n’ịgachi nzukọ anya.—1 Ndị Kọrint 14:20.
Ndị Nkiri Ga-akwali Gị
9, 10. (a) Olee otú ndị nkiri pụrụ isi bụrụ isi iyi nke agbamume n’ọsọ ntachi obi? (b) Gịnị bụ ‘oké ìgwè ndị àmà gbara anyị gburugburu dị ka igwe ojii’ bụ́ nke e hotara ná Ndị Hibru 12:1?
9 Otú ọ dị, n’agbanyeghị ókè onye na-agba ọsọ meruru njikere, ihe ụfọdụ pụrụ ime n’ụzọ ma mee ka ọ sụọ ngọngọ. “Unu na-agbarị ọsọ nke ọma; ònye gbochiri unu, ka unu ghara ikwenyere eziokwu ahụ?” ka Pọl jụrụ. (Ndị Galetia 5:7) Ihe àmà na-egosi na ụfọdụ ndị Kraịst bụ́ ndị Galetia dabara ná mkpakọrịta ọjọọ, n’ihi ya kwa, a dọpụrụ uche ha n’ọsọ ndụ ahụ. N’aka nke ọzọ, nkwado na agbamume sitere n’aka ndị ọzọ pụrụ ime ka ịtachi obi n’ọsọ ahụ dị mfe karị. Nke a yiri nnọọ mmetụta ndị na-ekiri egwuregwu pụrụ inwe n’ahụ ndị na-eme egwuregwu. Ìgwè mmadụ ọ dị ọkụ n’obi na-eme ka mmasị nke na-eme ka ndị na-eme egwuregwu nwee mkpali site ná mmalite ruo ná ngwụsị, sikwuo ike. Mkpu nkwado nke ndị nkiri ahụ, nke a na-agụnyekarị egwú na ịkụ aka na-ada ụda, pụrụ inyekwu ndị ahụ na-eme egwuregwu ihe mkpali dị ha mkpa ka ha na-eru ná ngwụsị. N’ezie, ndị nkiri na-enye nkwado pụrụ inwe mmetụta dị mma n’ahụ ndị na-agba ọsọ.
10 Olee ndị na-ekiri ọsọ ndụ ndị Kraịst na-agba? Mgbe Pọl depụtasịrị ndị àmà Jehova kwesịrị ntụkwasị obi tupu oge ndị Kraịst, dị ka e dekọrọ ná Ndị Hibru isi nke 11, o dere, sị: “Ya mere ka anyị onwe anyị, ebe anyị nwere oké ìgwè ndị àmà dị otú a ndị gbara anyị gburugburu dị ka igwe ojii, . . . ka anyị werekwa ntachi obi gbaa ọsọ ahụ e debere anyị n’ihu.” (Ndị Hibru 12:1) N’iji okwu ihe atụ ahụ bụ́ igwe ojii mee ihe, Pọl ejighị okwu Grik na-akọwa igwe ojii nke e kwuru kpọmkwem otú ọ haruru na otú ọ dị, mee ihe. Kama nke ahụ, o ji nke onye na-ede akwụkwọ ọkọwa okwu bụ́ W. E. Vine kọwara dị ka nke “na-egosi igwe ojii na-enweghị ọdịdị bụ́ nke na-ekpuchi eluigwe.” N’ụzọ doro anya, Pọl bu n’uche oké igwe ndị àmà—ndị dị nnọọ ọtụtụ nke na ha dị ka igwe ojii.
11, 12. (a) Olee otú ndị àmà kwesịrị ntụkwasị obi tupu oge ndị Kraịst pụrụ isi na-etiri anyị mkpu nkwado, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, iji jiri ntachi obi na-agba ọsọ ahụ? (b) Ànyị pụrụ isi aṅaa rite uru zuru ezu karị site n’aka ‘oké ìgwè ndị àmà dị ka igwe ojii’?
11 Ndị àmà kwesịrị ntụkwasị obi tupu oge ndị Kraịst hà pụrụ ịbụ ndị nkiri n’oge a n’ụzọ nkịtị? Ọ dịghị ma ọlị. Ha nile nọ n’ụra ọnwụ, na-echere mbilite n’ọnwụ. Otú ọ dị, ha onwe ha bụ ndị nwere ihe ịga nke ọma n’ọsọ ahụ mgbe ha nọ ndụ, ihe nlereanya ha ka dịkwa n’ime Bible. Ka anyị na-amụ Akwụkwọ Nsọ, anyị pụrụ iji anya nke uche anyị hụ ndị a kwesịrị ntụkwasị obi, ha pụkwara itiri anyị mkpu nkwado, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ka anyị wee gbaruo ọsọ ahụ n’isi.—Ndị Rom 15:4.a
12 Dị ka ihe atụ, mgbe ohere ndị e nwere n’ụwa nwara anyị ọnwụnwa, ịtụle otú Mosis si jụ ebube nke Ijipt ọ́ gaghị akwali anyị ịnọgide n’ọsọ ahụ? Ọ bụrụ na ule na-eche anyị ihu yiri ihe tara akpụ, icheta ule ahụ tara akpụ Abraham chere ihu mgbe a gwara ya ka ọ chụọ nwa ya bụ́ Aịsak n’àjà ga-agba anyị ume n’ezie ịnọgidesi ike na mgba nke okwukwe ahụ. Ókè ‘oké igwe ojii’ nke ndị àmà a na-akwaliru anyị n’ụzọ dị otú a na-adabere n’otú anyị si eji anya nke nghọta anyị ahụ ha nke ọma.
13. N’ụzọ dị aṅaa ka Ndịàmà Jehova nke oge a si etiri anyị mkpu nkwado n’ọsọ ndụ ahụ?
13 Oké ìgwè Ndịàmà Jehova nke oge a gbakwara anyị gburugburu. Lee ihe nlereanya magburu onwe ya ndị Kraịst e tere mmanụ nakwa ndị ikom na ndị inyom so ‘n’oké ìgwè mmadụ’ ahụ setipụworo! (Mkpughe 7:9) Anyị pụrụ ịgụ akụkọ ndụ ha site n’oge ruo n’oge n’ime magazin a na akwụkwọ ndị ọzọ Watch Tower na-ebipụta.b Ka anyị na-atụle okwukwe ha, a na-agba anyị ume ịtachi obi ruo ọgwụgwụ. Leekwa ihe magburu onwe ya ọ bụ inwe nkwado nke ezi ndị enyi na ndị ikwu bụ́ ndị na-ejere Jehova ozi n’onwe ha n’ikwesị ntụkwasị obi! Ee, anyị nwere ọtụtụ ndị ga-akwali anyị n’ọsọ ndụ ahụ.
Jiri Amamihe Họrọ Ọ̀tụ̀tụ̀ Ọsọ Gị
14, 15. (a) Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị jiri amamihe họrọ ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ anyị? (b) N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji jiri ezi uche mee ihe n’isetipụ ihe mgbaru ọsọ?
14 Mgbe mmadụ na-agba ọsọ dị ogologo, dị ka ọsọ marathon, ọ ghaghị iji amamihe họrọ ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ ya. “Iji oké ọsọ malite pụrụ ime ka ị daa,” ka magazin bụ́ New York Runner na-ekwu. “Ihe o yikarịrị ka ọ ga-arụpụta bụ ma ọ́ bụghị iji oké ndọlị gbachaa mile ndị ikpeazụ ọ bụrụ ịkwụsị n’ụzọ.” Otu onye na-agba ọsọ marathon na-echeta, sị: “Onye ọkà okwu n’otu nzukọ ọmụmụ ihe m gara iji kwadebe maka ọsọ a dọrọ aka ná ntị nke ọma, sị: ‘Achụsola ndị ka gị agba ọsọ. Gbawa ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ nke gị. Ma ọ bụghị ya ike ga-agwụ gị, ọ pụkwara ime ka ị kwụsị n’ụzọ.’ Ịṅa ntị na ndụmọdụ a nyeere m aka ịgbaru ọsọ ahụ n’isi.”
15 Ndị ohu Chineke aghaghị ịgbasi mbọ ike n’ọsọ ndụ ahụ. (Luk 13:24) Otú ọ dị, Jemes onye na-eso ụzọ dere, sị: “Amamihe ahụ nke si n’elu bịa [nwere] . . . [ezi uche, NW].” (Jemes 3:17) Ọ bụ ezie na ezi ihe nlereanya nke ndị ọzọ pụrụ ịgba anyị ume imekwu ihe, ezi uche ga-enyere anyị aka isetipụ ihe mgbaru ọsọ ndị a pụrụ iru eru n’ikwekọ n’ikike na ọnọdụ anyị. Akwụkwọ Nsọ na-echetara anyị, sị: “Ka onye ọ bụla nwapụta ọrụ nke aka ya, mgbe ahụ ka ọ ga-enwekwa ihe ọ ga-anyara isi n’ebe nanị ya onwe ya nọ, ọ bụghịkwa n’ebe ibe ya nọ. N’ihi na mmadụ nile n’otu n’otu ga-ebu ibu nke aka ha.”—Ndị Galetia 6:4, 5.
16. Obi umeala si aṅaa enyere anyị aka n’isetipụ ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ anyị?
16 Na Maịka 6:8, a jụrụ anyị ajụjụ a na-akpali iche echiche: “Ọ̀ bụkwa gịnị ka Jehova na-achọ n’aka gị, ma ọ́ bụghị nanị . . . iji obi umeala soro Chineke gị na-eje ije?” Obi umeala na-agụnye ịmara adịghị ike anyị. Ọrịa ma ọ bụ ịka nká hà emewo ka ihe anyị pụrụ ime n’ozi Chineke belata? Ka anyị ghara ịda mbà. Jehova na-anabata mgbalị na àjà ndị anyị na-achụ ‘dị ka ihe ọ bụla anyị nwere si dị, ọ bụghị dị ka ihe anyị na-enweghị.’—2 Ndị Kọrint 8:12; tụlee Luk 21:1-4.
Lekwasị Anya n’Ihe Mgbata n’Ọsọ Ahụ
17, 18. Ilekwasị anya na gịnị nyeere Jisọs aka ịtachi obi n’osisi ịta ahụhụ?
17 N’ịkọwara ndị Kọrint bụ́ ndị Kraịst mkpa ọ dị ịtachi obi n’ọsọ ndụ ahụ, Pọl hotara akụkụ ọzọ nke Egwuregwu Isthmus ahụ bụ́ nke ha kwesịrị iburu n’uche. Pọl dere banyere ndị na-ekere òkè n’egwuregwu ndị ahụ, sị: “Ya mere, ndị ahụ [na-agba ọsọ] ịnata okpu mmeri nke pụrụ ire ure; ma anyị onwe anyị na-eme ya ịnata okpu mmeri nke na-apụghị ire ure. Ya mere mụ onwe m na-agba ọsọ otú a, dị ka onye na-adịghị agba n’eleghị anya ihe; otú a ka m na-esu ọkpọ, dị ka onye na-adịghị apịa ifufe.” (1 Ndị Kọrint 9:25, 26) Ihe a na-enye ndị meriri n’egwuregwu oge ochie ndị ahụ bụ okpu mmeri, ma ọ bụ okpu a kpara akpa bụ́ nke e ji akwụkwọ pine ma ọ bụ ihe ọkụkụ ndị ọzọ, ma ọ bụkwanụ ahịhịa celery ọhịa kpọrọ nkụ, mee—“okpu mmeri nke pụrụ ire ure” n’ezie. Otú ọ dị, gịnị na-echere ndị Kraịst tachiri obi ruo ọgwụgwụ?
18 N’izo aka n’ebe Onye Nlereanya anyị, bụ́ Jisọs Kraịst nọ, Pọl onyeozi dere, sị: “Onye n’ihi ọṅụ e debere n’ihu Ya na-atachi obi [n’osisi ịta ahụhụ, NW] Ya, na-elelị ihere anya, O wee nọdụ n’aka nri nke ocheeze Chineke.” (Ndị Hibru 12:2) Jisọs tachiri obi ruo ọgwụgwụ nke ndụ ya dị ka mmadụ site n’ilepụ anya gabiga osisi ịta ahụhụ ahụ ruo n’ụgwọ ọrụ ya, bụ́ nke gụnyere ọṅụ o nwere n’ikere òkè n’ido aha Jehova nsọ, n’ịgbapụta ezinụlọ mmadụ pụọ n’ọnwụ, nakwa n’ịchị achị dị ka Eze na Onyeisi Nchụàjà ka ọ na-eweghachi ụmụ mmadụ na-erube isi gaa ná ndụ na-enweghị ọgwụgwụ n’ụwa paradaịs.—Matiu 6:9, 10; 20:28; Ndị Hibru 7:23-26.
19. Gịnị ka anyị kwesịrị ilekwasị anya ka anyị na-agbaso ụzọ nke iso ụzọ Kraịst?
19 Tụlee ọṅụ e debere n’ihu anyị ka anyị na-agbaso ụzọ nke iso ụzọ Kraịst. Jehova enyela anyị ọrụ ahụ na-enye afọ ojuju dị ukwuu nke ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke na inye ndị ọzọ ihe ọmụma Bible bụ́ nke na-azọpụta ndụ. (Matiu 28:19, 20) Lee ihe ọṅụ ọ bụ ịchọta onye nwere mmasị n’ezi Chineke ahụ na inyere onye ahụ aka ịmalite ọsọ ndụ ahụ! N’agbanyeghịkwa mmeghachi omume nke ndị anyị na-emere nkwusa, ọ bụ ihe ùgwù ikere òkè n’ọrụ e jikọtara ya na ido aha Jehova nsọ. Mgbe anyị tachiri obi n’ozi ahụ n’agbanyeghị enweghị mmasị ma ọ bụ mmegide sitere n’aka ndị nọ n’ókèala anyị na-agba àmà na ya, anyị na-enwe ọṅụ nke ime ka obi Jehova ṅụrịa. (Ilu 27:11) Ndụ ebighị ebi bụkwa ụgwọ ọrụ dị ebube ọ na-ekwe anyị ná nkwa. Lee ọṅụ nke ahụ ga-abụ! Ọ dị anyị mkpa ilekwasị anya ná ngọzi ndị a ma nọgidesie ike n’ọsọ ahụ.
Ka Ọgwụgwụ Na-eru Nso Karị
20. Olee otú ọsọ ndụ ahụ pụrụ isi takwuo akpụ ka ọgwụgwụ ya na-eru nso karị?
20 N’ọsọ ndụ ahụ, anyị aghaghị ịgba mgba megide onye iro ukwu anyị, bụ́ Setan Ekwensu. Ka anyị na-eru ọgwụgwụ, ọ na-agbalịsi ike ime ka anyị sụọ ngọngọ ma ọ bụ daa mbà. (Mkpughe 12:12, 17) Ọ dịghịkwa mfe ịnọgidesi ike dị ka ndị nkwusa Alaeze na-ekwesị ntụkwasị obi bụ́ ndị raara onwe ha nye, n’ihi agha, ụnwụ nri, ọrịa na-efe efe, na ihe isi ike ndị ọzọ na-aka “mgbe ọgwụgwụ ihe ndị a” akara. (Daniel 12:4; Matiu 24:3-14; Luk 21:11; 2 Timoti 3:1-5) Ọzọkwa, mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ iyi ka ọgwụgwụ ahụ ọ dị nnọọ anya karịa otú anyị tụrụ anya ya, karịsịa ma ọ bụrụ na anyị malitere ọsọ ahụ ọtụtụ iri afọ gara aga. Ma, Okwu Chineke na-emesi anyị obi ike na ọgwụgwụ ahụ ga-abịa. Jehova kwuru na ọ gaghị anọ ọdụ. Ọgwụgwụ ahụ dị nso.—Habakuk 2:3; 2 Pita 3:9, 10.
21. (a) Gịnị ga-ewusi anyị ike ka anyị na-agba ọsọ ndụ ahụ? (b) Gịnị kwesịrị ịbụ mkpebisi ike anyị ka ọgwụgwụ na-eru nso karị?
21 Mgbe ahụ, iji nwee ihe ịga nke ọma n’ọsọ ndụ ahụ, anyị aghaghị inweta ume site n’ihe Jehova jiworo ịhụnanya nye maka ọzụzụ ime mmụọ anyị. Agbamume nile anyị pụrụ inweta site n’iso ndị kwere ekwe ibe anyị bụ́ ndị na-agbakwa ọsọ ndụ ahụ na-akpakọchi anya, dịkwa anyị mkpa. Ọ bụrụgodị na mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ na ihe ndapụta ndị e nwere n’ụzọ ahụ ga-eme ka ọsọ ahụ siere anyị ike karị, anyị pụrụ ịtachi obi ruo ọgwụgwụ n’ihi na Jehova na-enye “ọkịka nke ike ahụ.” (2 Ndị Kọrint 4:7) Lee ka o si bụrụ ihe na-emesi obi ike ịmara na Jehova chọrọ ka anyị gbaruo ọsọ ahụ n’isi na-enwekwa mmeri! Ná mkpebisi ike, “ka anyị were ntachi obi gbaa ọsọ ahụ e debere anyị n’ihu,” na-enwe obi ike zuru ezu na “anyị ga-eweta ihe ubi mgbe oge ya ruru, ma anyị adaghị mbà.”—Ndị Hibru 12:1; Ndị Galetia 6:9.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Maka ntụle nke Ndị Hibru 11:1–12:3, lee Ụlọ Nche nke October 15, 1987, peji nke 27-32; November 1, 1987, peji nke 21-26.
b A pụrụ ịhụ ihe atụ ụfọdụ nke ahụmahụ ndị dị otú ahụ na-agba ume bụ́ ndị a kọrọ n’oge na-adịbeghị anya n’Ụlọ Nche nke June 1, 1998, peji nke 28-31; September 1, 1998, peji nke 24-28; February 1, 1999, peji nke 25-29.
Ị̀ Na-echeta?
◻ N’ihi gịnị ka anyị na-aghaghị iji tachie obi ruo ọgwụgwụ?
◻ Olee ndokwa Jehova nke anyị na-ekwesịghị ileghara anya?
◻ Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị jiri amamihe họrọ ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ anyị?
◻ Olee ọṅụ e debere anyị n’ihu ka anyị na-anọgide n’ọsọ ahụ?
[Foto dị na peeji nke 18]
Nweta agbamume site ná nzukọ ndị Kraịst