Iji Ntachi Obi Na-agba Ọsọ Ahụ
“Ka anyị werekwa ntachi obi gbaa ọsọ ahụ e debere anyị n’ihu.”—NDỊ HIBRU 12:1, “New World Translation.”
1. (a) Gịnị ka a na-edebe anyị n’ihu mgbe anyị raara onwe anyị nye Jehova Chineke? (b) Ụdị ọsọ dị aṅaa ka onye Kraịst kwesịrị ịkwadebe maka ya?
MGBE anyị raara onwe anyị nye Jehova site na Jisọs Kraịst, Chineke debere otu ọsọ n’ihu anyị, n’ikwu ya n’ụzọ ihe atụ. N’ọgwụgwụ nke ọsọ ahụ, a ga-enye ndị nile gbasịrị ya nke ọma ihe mgbata n’ọsọ. Gịnị bụ ihe mgbata n’ọsọ ahụ? Ọ bụ ndụ ebighị ebi! Iji rite ihe mgbata n’ọsọ nke a magburu onwe ya, ọ dị mkpa ka onye Kraịst na-agba ọsọ ahụ kwadebe onwe ya, ọ bụghị maka ịgbasi ọsọ ike ruo ebe dị nso, kama ọ bụ maka ịgba ọsọ ruo ebe dị anya. Ya mere, ọ ga-adị ya mkpa inwe ntachi obi. Ọ ga-atachi obi ma ná ndọgbu ọ ga-adọgbu onwe ya n’ọrụ ruo ogologo oge n’ọsọ ahụ ma n’ihe mkpọbi ụkwụ ndị na-apụta n’oge a na-agba ọsọ ahụ.
2, 3. (a) Gịnị ga-enyere anyị aka n’ịgbaru ọsọ ndị Kraịst ahụ n’isi? (b) Olee ụzọ ọṅụ si nyere Jisọs aka iji ntachi obi gbaa ọsọ ahụ?
2 Gịnị ga-enyere anyị aka ịgbaru ọsọ dị otú ahụ n’isi? Ọ dị mma, gịnị nyeere Jisọs aka inwe ntachi obi mgbe ọ bụ mmadụ n’elu ala? O nwetara ike nke dị n’ime site n’àgwà nke inwe ọṅụ. Ndị Hibru 12:1-3 [NW] na-agụ, sị: “Ya mere, ebe anyị nwere oké ìgwè ndịàmà dị otú a ndị gbara anyị gburugburu dị ka igwe ojii, ka anyị tụpụkwa ibu nile ọ bụla, ya na mmehie ahụ nke na-ekegidekarị anyị, ka anyị werekwa ntachi obi gbaa ọsọ ahụ e debere anyị n’ihu, ka anyị na-elegide Onye Isi na Onye Mmezu nke okwukwe anyị anya, bụ́ Jisọs. N’ihi ọṅụ e debere ya n’ihu, ọ tachiri obi n’osisi ịta ahụhụ ya, na-elelị ihere anya, ọ nọdụwokwa n’aka nri nke ocheeze Chineke. N’ezie, tụgharịanụ uche nke ọma n’onye ahụ nke tachiworo obi ná nkwugide dị otú a bụ́ nke ndị mmehie kwugidere ya megide ọdịmma nke onwe ha, ka ike ghara ịgwụ unu, unu wee daa mbà ná mkpụrụ obi unu.”
3 N’oge ije ozi ihu ọha ya dum, Jisọs nwere ike ịnọgide na-agba ọsọ ahụ n’ihi ọṅụ nke Jehova. (Tụlee Nehemaịa 8:10.) Ọṅụ ya nyeere ya aka ịtachi obi ọbụna n’ọnwụ mweda n’ala n’osisi ịta ahụhụ, bụ́ nke, mgbe ọ gasịrị, o nwetara ọṅụ ahụ a na-apụghị ịkọwa akọwa nke ibilite site n’ọnwụ wee rịgoo gaa n’aka nri nke Nna ya, bụ́ ebe ọ ga-anọ hụ ka a rụzuru ọrụ nke Chineke. Site ná ntachi obi ya dị ka mmadụ nke nọ n’akụkụ nke Chineke, o jigidesiri ihe ruuru ya nke bụ ndụ ebighị ebi aka ike. Ee, dị ka Luk 21:19 na-asị: “Ná ntachi obi unu unu ga-anata mkpụrụ obi unu.”
4. Ụdị ihe nlereanya dị aṅaa ka Jisọs setịpụụrụ ndị na-agba ọsọ ibe ya, ọ̀ bụkwa na gịnị ka anyị kwesịrị ịtụkwasị uche anyị?
4 Jisọs Kraịst setịpụụrụ ndị ọsọ ibe ya ihe nlereanya kachasị mma, ihe nlereanya ya na-emesikwa anyị obi ike na anyị pụkwara inwe mmeri. (1 Pita 2:21) Ihe Jisọs na-agwa anyị ka anyị mee bụ ihe anyị pụrụ ime. Dị ka o nwere ntachi obi, otú ahụ ka anyị pụkwara inwe. Ka anyị na-anọgidesikwa ike n’iṅomi ya, anyị aghaghị ịtụkwasị uche anyị n’ihe ndị mere anyị ga-eji nwee ọṅụ. (Jọn 15:11, 20, 21) Inwe ọṅụ ga-ewusi anyị ike iji nọgide n’ịgba ọsọ ahụ n’ozi Jehova ruo mgbe anyị nwetara ihe mgbata n’ọsọ ahụ dị ebube nke bụ ndụ ebighị ebi.—Ndị Kọlọsi 1:10, 11.
5. Olee ụzọ anyị pụrụ isi nwee ọṅụ, bụrụkwa ndị e wusiri ike maka ọsọ ahụ nke dị anyị n’ihu?
5 Iji nyere anyị aka ịnọgide n’ọsọ ahụ, Jehova na-enye anyị ike karịrị nke mmadụ efu. Mgbe a na-akpagbu anyị, ike ahụ na ịmara ihe mere anyị ji nwee ihe ùgwù nke ịbụ ndị a kpagburu na-ewusi anyị ike. (2 Ndị Kọrint 4:7-9) Ihe ọ bụla e zutere n’ihi inye aha Chineke otuto na ịkwalite ịbụ ọkaaka ya bụ ihe a ga-eji n’ihi ya nwee ọṅụ, nke onye ọ bụla na-apụghị ịnapụ anyị. (Jọn 16:22) Ọ bụ nke a mere na mgbe e ji n’ihi iwu nnọkọ ikpe Sanhedrin ndị Juu nyere tisịa ndị ozi ahụ ihe n’ihi ịgba àmà nye ihe ebube nile Jehova Chineke na-emezu n’ihe banyere Jisọs, ha ṅụrịrị ọṅụ “na a gụrụ ha ná ndị kwesịrị ka e mee ha ihe ihere n’ihi aha ahụ.” (Ọrụ 5:41, 42) Ọṅụ ha esiteghị ná mkpagbu ahụ n’onwe ya, kama o sitere n’afọ ojuju dị omimi nke ịmara na ha na-eme ihe na-atọ Jehova na Jisọs ụtọ.
6, 7. N’ihi gịnị ka onye Kraịst nke na-agba ọsọ pụrụ iji na-enwe ọṅụ ọbụna mgbe o nwere mkpagbu, gịnịkwa na-esi na ya apụta?
6 Ike ọzọ na-enye nkwado ná ndụ anyị bụ olileanya ahụ nke Chineke setịpụworo n’ihu anyị. Dị ka Pọl si kwuo ya: “[Ka] anyị na Chineke dị n’udo site n’aka Onyenwe anyị Jisọs Kraịst; onye anyị sitewokwara n’aka ya nwee mkpọbata anyị n’okwukwe anyị n’ime amara nke a anyị na-eguzo n’ime ya; anyị na-anyakwa isi, na-adabere n’olileanya nke otuto Chineke. Ma ọ bụghị nanị nke a, kama anyị na-anyakwa isi n’ime mkpagbu anyị nile: ebe anyị matara na mkpagbu na-arụta ntachi obi; ntachi obi ahụ na-arụtakwa ọnwụnwa [“ọnọdụ a nwapụtaworo,” NW]; ọnwụnwa ahụ na-arụtakwa olileanya: olileanya ahụ emeghịkwa ka ihere mee anyị.”—Ndị Rom 5:1-5.
7 Mkpagbu abụghị ihe ndị na-enye ọṅụ n’onwe ha, ma, ọ bụ mkpụrụ nke udo ndị ha na-amịpụta mgbe e mesịrị bụ ihe na-enye ọṅụ. Mkpụrụ ndị a bụ ntachi obi, ọnọdụ a nwapụtaworo, olileanya, na mmezu nke olileanya ahụ. Anyị inwe ntachi obi ga-eduje anyị n’inweta nnwapụta nke Chineke. Mgbe anyị nwere nnwapụta nke Chineke, anyị pụrụ iji obi ike nwee olileanya nke mmezu nke nkwa ndị ahụ o kweworo. Olileanya nke a na-eme ka anyị nọgide n’ụzọ ahụ nke kwesịrị ekwesị, na-agbakwa anyị ume mgbe anyị nọ ná mkpagbu ruo mgbe e mezuru olileanya ahụ.—2 Ndị Kọrint 4:16-18.
Obi Ụtọ Na-adịrị Ndị Na-atachi Obi!
8. N’ihi gịnị ka oge nchere nke a na-ejighị bụụrụ anyị igbu oge?
8 Mgbe anyị nọ na-echere oge ahụ Chineke kara aka maka ikesara ndị gbara ọsọ ahụ ihe mgbata n’ọsọ, ọ dị mgbanwe ndị anyị na-eme. Ndị a bụ mmeziwanye ihe n’ụzọ ime mmụọ ndị na-abịa site n’imeri ule, ha na-emekwa ka anyị nweta ihu ọma dị ukwuu n’ebe Chineke nọ. Ha na-anwapụta ihe anyị bụ n’ezie, na-enyekwa anyị ohere igosipụta otu ezi àgwà ndị ahụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie, karịsịa, nke Onye bụ ihe nlereanya anyị, bụ́ Jisọs Kraịst, gosipụtara. Jemes onye na-eso ụzọ sịrị: “Gụọnụ ya n’ọṅụ nile, ụmụnna m, mgbe ọ bụla unu dabara n’ọnwụnwa dị iche iche; ebe unu maara na nnwapụta nke okwukwe unu na-arụpụta ntachi obi. Ma ka ntachi obi rụzuo ọrụ ya, ka unu wee tozuo okè dịzuokwa mma, bụrụ ndị ọ dịghị ihe ọ bụla fọdụrụ nke unu na-enweghị.” (Jemes 1:2-4) Ee, anyị pụrụ ịtụ anya inweta ọtụtụ ọnwụnwa dị iche iche, ma ndị a ga-eme ka anyị na-azụlite àgwà ndị kwesịrị ekwesị. Anyị na-esi otú a na-egosipụta na anyị ga-anọgide n’ọsọ a ruo mgbe anyị nwetara ihe mgbata n’ọsọ ahụ, n’agbanyeghị ihe mgbochi ndị anyị zutere.
9, 10. (a) N’ihi gịnị ka ndị ahụ na-enwe ntachi obi n’ọnwụnwa ji enwe obi ụtọ, oleekwa ụzọ anyị kwesịrị isi chee ọnwụnwa ihu? (b) Òle ndị bụ ndị obi ụtọ nke oge gara aga, oleekwa ụzọ a pụrụ isi gụnye anyị n’etiti ha?
9 Ya mere, ka a sịkwa ihe mere Jemes ji kwuo, sị: “Ngọzi [“obi ụtọ,” NW] na-adịrị nwoke onye na-atachi obi n’ọnwụnwa: n’ihi na mgbe a nwapụtaworo ya, ọ ga-anata okpueze ahụ, bụ́ ndụ, nke Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] kwere nkwa inye ndị hụrụ ya n’anya”! (Jemes 1:12) Ka anyị nọgide na-eche ọnwụnwa dị iche iche ihu, jiri àgwà nsọpụrụ Chineke dị iche iche na-akwadebe onwe anyị, bụ́ ndị ga-ewusi anyị ike iji merie ha.—2 Pita 1:5-8.
10 Cheta na ụzọ Chineke si emeso anyị ihe abụghị ihe ọhụrụ ma ọ bụ nke a na-ahụtụbeghị mbụ. E mesoro “oké ìgwè ndịàmà” nke oge ochie ihe n’otu ụzọ ahụ ka ha na-egosipụta nguzosi ike ha n’ebe Chineke nọ. (Ndị Hibru 12:1, NW) E dekọrọ nnwapụta Chineke nwapụtara ha n’ime Okwu ya, anyị na-agụkwa ha ná ndị nwere obi ụtọ n’ihi na ha nọgidesiri ike n’okpuru ule. Jemes sịrị: “Ụmụnna m, natanụ ndị amụma ahụ, bụ́ ndị kwuru okwu n’aha Onyenwe anyị [“Jehova,” NW], dị ka ihe ilere anya nke ịhụju anya na nke ogologo ntachi obi. Lee, anyị na-akpọ ha ndị ngọzi [“obi ụtọ,” NW] dịịrị, bụ́ ndị tachiri obi: unu nụrụ ihe banyere ntachi obi nke Job, hụkwa ihe Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] zubere, na Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] bụ onye nwere ọmịiko hie nne, nweekwa obi ebere.” (Jemes 5:10, 11) E buru ya n’amụma na n’ime mgbe ikpeazụ ndị a dị oké egwu, a ga-enwe ụfọdụ ndị n’ụwa, bụ́ ndị ga-eji nguzosi ike n’ezi ihe na-ejere Jehova ozi, dị ka ndị amụma ahụ mere na narị afọ ndị oge ochie. Ọ̀ bụ na anyị enweghị obi ụtọ ịbụ ndị na-eme otú ahụ?—Daniel 12:3; Mkpughe 7:9.
Inweta Nkwado Site n’Okwu Jehova nke Na-agba Ume
11. Olee ụzọ Okwu Chineke pụrụ isi nyere anyị aka inwe ntachi obi, n’ihi gịnịkwa ka anyị na-ekwesịghị iji dị ka ebe nkume ahụ dị n’ilu Jisọs?
11 Pọl zoro aka n’ihe ọzọ na-enye aka inwe ntachi obi mgbe o kwuru na “site n’iji ndidi nwee ntachi obi, sitekwa n’agbamume e nwetara n’Akwụkwọ nsọ, anyị pụrụ ijigidesi olileanya anyị aka ike.” (Ndị Rom 15:4, The Twentieth Century New Testament) Eziokwu ahụ, bụ́ Okwu Chineke, aghaghị ịgbanyesi mkpọrọgwụ ike n’ime anyị ka o wee dọpụta n’ime anyị mmeghachi omume kwesịrị ekwesị mgbe nile. Anyị adịghị erite uru ọ bụla site n’ịdị ka ala nkume ahụ a kọwara n’ilu Jisọs banyere onye na-agha mkpụrụ: “Ndị a bụkwa ndị a na-agha n’ebe nkume ahụ, ndị, mgbe ọ bụla ha nụrụ okwu ahụ, ngwa ngwa ha weere ọṅụ jide ya; ma ha enweghị mkpọrọgwụ n’ime onwe ha, kama ha na-anọ nwa oge; e mesịa, mgbe mkpagbu ma ọ bụ nsogbu pụtara n’ihi okwu ahụ, ngwa ngwa ha ma n’ọnyà.” (Mak 4:16, 17) Eziokwu ahụ nke sitere n’Okwu Chineke adịghị agbami mkpọrọgwụ n’ime ndị dị otú ahụ; n’ihi ya, mgbe mkpagbu bịara, ha adịghị enwe ike inweta nkwado site na ya dị ka ezi isi iyi nke ume na olileanya.
12. Gịnị ka anyị na-ekwesịghị ịghọgbu onwe anyị banyere ya mgbe anyị na-anakwere ozi ọma ahụ?
12 Onye ọ bụla nke nakweere ozi ọma Alaeze ahụ ekwesịghị ịghọgbu onwe ya banyere ihe ga-esochi. Ọ na-amalite ịgbaso ụzọ ndụ nke ga-eweta nsogbu ma ọ bụ mkpagbu. (2 Timoti 3:12) Ma o kwesịrị ịgụ ya “n’ọṅụ nile” inwe ihe ùgwù nke izute ọnwụnwa dị iche iche n’ihi ijigidesi Okwu Chineke ike na ikwu okwu banyere ya gwa ndị ọzọ.—Jemes 1:2, 3.
13. N’ụzọ dị aṅaa, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka Pọl ji nwee ọṅụ n’ihi ndị Kraịst ahụ nọ na Tesalọnaịka?
13 N’ime narị afọ mbụ, ndị mmegide nọ na Tesalọnaịka kpaliri ọgba aghara n’ihi nkwusa nke Pọl. Mgbe Pọl jere Beria, ndị mkpagbu ahụ sooro ya jee n’ebe ahụ ka ha wee kpalitekwa nsogbu. Onyeozi ahụ a na-akpagbu degaara ndị kwesịrị ntụkwasị obi nọ na Tesalọnaịka ebe ahụ ọ hapụrụ akwụkwọ, sị: “Anyị ji ụgwọ ikele Chineke ekele mgbe nile banyere unu, ụmụnna anyị, dị ka o kwesịrị, n’ihi na okwukwe unu na-aba ụba nke ukwuu, ịhụnanya ahụ unu nile n’otu n’otu na-ahụrịta ibe unu na-ehikwa nne; ya mere anyị onwe anyị na-anya isi n’ahụ unu n’etiti nzukọ Chineke nile n’ihi ntachi obi unu na okwukwe unu n’ime nsogbu unu nile na n’ime mkpagbu nile unu na-anagide; nke bụ ihe na-eme ka ikpe ziri ezi nke Chineke pụta ìhè; ka e wee gụọ unu ná ndị kwesịrị alaeze Chineke, nke unu na-ahụkwa ahụhụ n’ihi ya.” (2 Ndị Tesalọnaịka 1:3-5) N’agbanyeghị ahụhụ ha na-ata n’aka ndị iro, ndị Kraịst bi na Tesalọnaịka bara ụba n’ịdị ka Kraịst nakwa n’ọnụ ọgụgụ. Olee otú nke ahụ si kwe omume? Ọ bụ n’ihi na ha nwetara ike site n’Okwu Chineke nke na-agba ume. Ha rubere isi n’ihe Onyenwe anyị nyere n’iwu, jirikwa ntachi obi gbaa ọsọ ahụ.—2 Ndị Tesalọnaịka 2:13-17.
Maka Nzọpụta nke Ndị Ọzọ
14. (a) N’ihi ihe dịgasị aṅaa ka anyị na-eji eji ọṅụ anọgide n’ije ozi ahụ n’agbanyeghị ihe isi ike? (b) Gịnị ka anyị na-ekpe ekpere maka ya, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
14 N’ụzọ bụ isi, ka e wee wepụ Chineke n’ụta, anyị na-eji ikwesị ntụkwasị obi na emeghị mkpesa na-anagide ihe isi ike na mkpagbu. Ma e nwere ihe ọzọ nke na-abụghị ịchọ ọdịmma onwe onye nanị nke na-eme anyị ji ekwere izute ihe ndị dị otú ahụ: ka anyị wee mee ka ndị ọzọ nụkwa ozi Alaeze ahụ, ka e wee nwee ike inweta ọtụtụ ndị nkwusa Alaeze Chineke ndị ọzọ, ime ‘nkwupụta ruo nzọpụta.’ (Ndị Rom 10:10) Ndị ahụ na-arụ ọrụ n’ijere Chineke ozi kwesịrị ikpe ekpere ka Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ gọzie ọrụ ha site n’ime ka e nwekwuo ndị nkwusa Alaeze. (Matiu 9:38) Pọl degaara Timoti akwụkwọ, sị: “Ihe nile ị nụkwara n’ọnụ m site n’etiti ọtụtụ ndịàmà, nye ihe ndị a n’aka mmadụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi idebe, bụ́ mmadụ ndị ọ ga-ekwekwa izi mmadụ ibe ha ihe ndị a. Soo m hụjukọọ anya, dị ka onye agha ọma nke Kraịst Jisọs.”—2 Timoti 2:2, 3.
15. N’ihi gịnị ka anyị na-aghaghị iji duzie onwe anyị dị ka ndị agha ma ọ bụ ndị na-asọ mpì ‘n’ịgba mgba’?
15 Onye agha na-ekewapụ onwe ya n’ebe ndụ a na-akparaghị ókè karị nke onye nkịtị na-abụghị onye agha dị. N’otu aka ahụ, anyị ekwesịghị iji ihe omume nke ndị ahụ na-anọghị n’usuu ndị agha Onyenwe anyị tụhịa onwe anyị, ndị nọ n’ezie, n’akụkụ nke ndị iro. Otú a, Pọl gara n’ihu idere Timoti, sị: “Ọ dịghị onye agha ọ bụla na-atụhị onwe ya n’ihe nke ibi obi a mgbe ọ na-ebu agha; ka o wee mee ihe ga-atọ onye dere aha ya n’akwụkwọ dị ka onye agha. Ma ọ bụrụkwa na onye ọ bụla na-agba mgba, e kpughị ya okpu mmeri, ma ọ bụrụ na ọ gbaghị mgba otú ọ dị n’iwu.” (2 Timoti 2:4, 5) Ná mgbalị ha inwe mmeri n’ọsọ ahụ a na-agba iji nweta “okpueze ahụ, bụ́ ndụ,” ndị na-agba ọsọ aghaghị itinye njide onwe onye n’ọrụ, zerekwa ibu na ihe ntụhị nile ndị na-abaghị uru. N’ụzọ dị otú a, ha pụrụ ịtụkwasị uche ha n’iwegara ndị ọzọ ozi ọma ahụ nke nzọpụta.—Jemes 1:12; tụlee 1 Ndị Kọrint 9:24, 25.
16. Gịnị ka a na-apụghị ike agbụ, ọ̀ bụkwa n’ihi abamuru òle ndị ka anyị ji enwe ntachi obi?
16 N’ihi na anyị hụrụ Chineke n’anya, hụkwa ndị ahụ yiri atụrụ, bụ́ ndị na-achọ ịchọta ya, anyị na-eji obi ụtọ anagide ọtụtụ ihe ka anyị wee jiri ozi ọma nke nzọpụta ahụ rute ndị ọzọ. Ndị iro pụrụ ike anyị agbụ maka ikwusa Okwu Chineke. Ma a pụghị ike Okwu Chineke agbụ, a pụghịkwa iji agbụ kechie ikwusa ya maka nzọpụta nke ndị ọzọ. Pọl kọwaara Timoti ihe mere o ji dị njikere otú ahụ izute ule: “Na-echeta Jisọs Kraịst, dị ka onye e meworo ka o si ná ndị nwụrụ anwụ bilie, onye isi ná mkpụrụ Devid pụta, dị ka ozi ọma m si dị: nke m na-ahụju anya n’ime ya ruo agbụ, dị ka onye na-arụ ọrụ ọjọọ; ma e keghị okwu Chineke agbụ. N’ihi nke a ka m nwere ntachi obi n’ihe nile n’ihi ndị a họpụtara, ka ha onwe ha wee ruokwa nzọpụta nke dị n’ime Kraịst Jisọs, ya na ebube ebighị ebi.” (2 Timoti 2:8-10) Taa, anyị bu n’uche, ọ bụghị nanị obere ihe ahụ fọdụrụ nke ndị gaje iketa Alaeze eluigwe ahụ, kamakwa oké ìgwè mmadụ nke atụrụ ọzọ ahụ nke Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst, bụ́ oké ìgwè mmadụ ndị ga-eketa Paradaịs elu ala n’okpuru Alaeze Kraịst.—Mkpughe 7:9-17.
17. N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị iji hapụ ọsọ ahụ tupu a gbasịa ya, gịnịkwa ka a na-arụpụta ma ọ bụrụ na anyị anọgide n’ọsọ ahụ ruo ọgwụgwụ?
17 Ọ bụrụ na anyị bụ ndị na-ahapụ ọrụ ha, anyị agaghị enyere onwe anyị ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ aka iru nzọpụta. Site n’ịnọgide n’ọsọ ndị Kraịst ahụ, n’agbanyeghị ihe mgbochi ndị e zutere, anyị na-anọgide na-edebe onwe anyị n’ọnọdụ inweta ihe mgbata n’ọsọ ahụ, anyị pụkwara inyere ndị ọzọ aka kpọmkwem iru nzọpụta, ka anyị nọkwa na-abụ ezi ihe nlereanya nke ike nye ndị ọzọ. N’agbanyeghị ihe bụ olileanya anyị, ma ọ bụ nke eluigwe ma ọ bụ nke elu ala, àgwà Pọl nke ‘ịnọgide na-agba ọsọ iji ruo ihe mgbata n’ọsọ ahụ’ bụ ezi ihe nlereanya anyị kwesịrị iṅomi.—Ndị Filipaị 3:14, 15.
Ịnọgidesi Ike Na-aga n’Ihu n’Ọsọ ahụ
18. Inweta ihe mgbata n’ọsọ ahụ dabeere na gịnị, ijikwa nọgide ruo ọgwụgwụ, gịnị ka a na-aghaghị izere?
18 Ịgbazu ọsọ ndị Kraịst anyị n’ụzọ nwere mmeri iji wetara Jehova otuto nakwa iji nweta ihe mgbata n’ọsọ ahụ nke o debeere anyị na-adabere n’anyị ịnọgidesi ike na-aga n’ihu n’ime ogologo oge dum a na-agba ọsọ ahụ. Ya mere, anyị apụghị inwe ntachi obi ruo ọgwụgwụ ma ọ bụrụ na anyị ejiri ihe ndị na-adịrịghị ezi omume bogbuo onwe anyị. Ọbụna mgbe a napụsịworo anyị ihe ndị dị otú ahụ, ihe a chọrọ anyị n’aka ka sikwara ike nke na ọ ga-achọ ike nnagide ihe nile anyị pụrụ inweta iji mee ya. N’ihi ya, Pọl nyere ndụmọdụ, sị: “Ka anyị tụpụkwa ibu nile ọ bụla, ya na mmehie ahụ nke na-ekegidekarị anyị, ka anyị werekwa ntachi obi gbaa ọsọ ahụ e debere anyị n’ihu.” (Ndị Hibru 12:1, NW) Dị ka Jisọs, anyị ekwesịghị ikwubiga okwu ókè banyere ahụhụ ndị a ga-anagide, kama anyị kwesịrị ile ha anya dị ka ọnụ ahịa dị nta a ga-akwụ maka ihe mgbata n’ọsọ ahụ na-enye ọṅụ.—Tụlee Ndị Rom 8:18.
19. (a) Obi ike dị aṅaa ka Pọl gosipụtara mgbe ọ nọ nso ọgwụgwụ nke ndụ ya? (b) Ka anyị na-eru nso ọgwụgwụ nke ọsọ ahụ, obi ike dị aṅaa ka anyị kwesịrị inwe banyere ụgwọ ọrụ ahụ e kwere ná nkwa?
19 Mgbe ọgwụgwụ nke ndụ ya na-eru nso, Pọl nwere ike ikwu, sị: “Agbasịwo m mgba ọma ahụ, agbasịwo m ọsọ ahụ, edebesịwo m okwukwe ahụ: nke fọdụru bụ na e debeworo m okpueze nke ezi omume ahụ.” (2 Timoti 4:7, 8) Anyị nọ n’ọsọ ntachi obi nke a iji nweta ihe mgbata n’ọsọ ahụ nke bụ ndụ ebighị ebi. Ọ bụrụ na ntachi obi anyị adanyụọ nanị n’ihi na ọsọ ahụ dịtụ anya karịa otú anyị chere mgbe anyị malitere ya, anyị ga-ada mgbe anyị nọ nso inweta ụgwọ ọrụ ahụ e kwere ná nkwa. Ị pụrụ ijide nke a n’aka. Ọ dịghị ajụjụ ọ bụla dị ya na ụgwọ ọrụ ahụ dị adị.
20. Gịnị kwesịrị ịbụ mkpebi anyị siri ike ruo mgbe e ruru ọgwụgwụ nke ọsọ ahụ?
20 Ya mere, ka ike ghara ịgwụ anya anyị ilepụ anya maka mmalite nke mkpagbu ukwu ahụ, na-eweta mbibi, nke mbụ nye Babilọn Ukwu ahụ, e mesịa nye ihe fọdụrụ ná nzukọ Ekwensu. (2 Pita 3:11, 12) N’iburu ihe àmà nile gbara anyị gburugburu n’uche, ka anyị jiri okwukwe na-elepụ anya n’ihu. Ka anyị kee ájị̀ n’ume nke ntachi obi anyị, ka anyị jirikwa ike gaa n’ihu n’ọsọ ahụ nke Jehova Chineke setịpụworo anyị n’ihu, ruo mgbe e ruru ọgwụgwụ, nwetakwa ihe mgbata n’ọsọ ahụ nke na-enye ọṅụ, iji wetara Jehova otuto site na Jisọs Kraịst.
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?
◻ Ụdị ịgba ọsọ dị aṅaa ka onye Kraịst na-aghaghị ịkwadebe maka ya?
◻ N’ihi gịnị ka ọṅụ ji dị oké mkpa n’ịgba ọsọ ahụ?
◻ Isi ihe dịgasị aṅaa na-eme ka anyị nọgide n’ije ozi ahụ n’agbanyeghị ihe isi ike?
◻ N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị ịhapụ ọsọ ahụ nke Chineke debeworo n’ihu anyị?
[Foto dị na peeji nke 15]
Dị ka à ga-asị na ọ bụ n’ọsọ a na-agba ruo ebe dị anya, ndị Kraịst aghaghị inwe ntachi obi
[Foto dị na peeji nke 17]
Iji wee ruo eru maka “okpueze ahụ, bụ́ ndụ,” ndị na-agba ọsọ aghaghị itinye njide onwe onye n’ọrụ