Ịṅụrị Ọṅụ n’Ime Jehova n’Agbanyeghị Ọnwụnwa
DỊ KA GEORGE SCIPIO SI KỌỌ
Na December 1945, edina m n’ọnụ ụlọ ndị ọrịa n’ụlọ ọgwụ, ahụ m nile kpọnwụrụ akpọnwụ ma e wezụga aka m na ụkwụ m. Echere m na ọnọdụ m ga-adịru nwa oge, ma ndị ọzọ nwere obi abụọ ma m̀ ga-agakwa ije ọzọ. Lee ọnwụnwa nke ahụ bụụrụ onye gbasiri ike nke dị afọ 17! Ajụrụ m ịnabata ụdị atụmanya mgbake ahụ. Enwere m ọtụtụ atụmatụ, gụnyere iso onye were m n’ọrụ gaa England n’afọ na-esonụ.
ANA M arịa ọrịa poliomyelitis nke tiwapụworo n’ebe obodo anyị bụ́ àgwàetiti St. Helena. O gburu mmadụ 11, meekwa ka ọtụtụ ndị nwee nkwarụ. Ka m dina n’àkwà, enwere m oge hiri nne ịtụgharị uche ná ndụ m dị mkpirikpi nakwa n’ọdịnihu m. Ka m nọ na-eme nke ahụ, amalitere m ịghọta na, n’agbanyeghị nsogbu m, enwere m ihe mere m ga-eji ṅụrịa ọṅụ.
Mmalite Dị Nta
Na 1933 mgbe m dị afọ ise, nna m, bụ́ Tom, bụ́ onye uwe ojii na onye dikọn na Chọọchi Baptist, natara akwụkwọ ukwu ụfọdụ site n’aka Ndịàmà Jehova abụọ. Ha bụ ndị na-ezisa ozi ọma oge nile, ma ọ bụ ndị ọsụ ụzọ, bụ́ ndị bịara nọrọ n’àgwàetiti ahụ ruo mkpirikpi oge.
Aha otu n’ime akwụkwọ ndị ahụ bụ The Harp of God. Nna m ji ya soro ezinụlọ anyị na ụfọdụ ndị nwere mmasị na-amụ Bible. Ọ bụ ihe ọmụmụ siri ike, aghọtakwara m ihe dị nnọọ nta n’ime ya. Ma ana m echeta ịkatụ ihe n’akụkụ akwụkwọ nsọ ndị anyị tụlere n’ime Bible nke m. N’oge na-adịghị anya, nna m ghọtara na ihe anyị na-amụ bụ eziokwu ahụ nakwa na ọ dị iche n’ihe ọ na-ekwusa na Chọọchị Baptist. Ọ malitere ịgwa ndị ọzọ banyere ya na ịnọ n’elu ikpo okwu na-ekwusa na e nweghị Atọ n’Ime Otu, ọkụ ala mmụọ, na mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ. Nke a kpasuru ọtụtụ esemokwu na chọọchị ahụ.
N’ikpeazụ, ná mgbalị iji dozie esemokwu ahụ, a kpọrọ nzukọ chọọchị. A jụrụ ajụjụ bụ́, “Olee ndị kwụnyeere Baptist?” Ihe ka ọtụtụ kwụnyeere Baptist. Ajụjụ ọzọ bụ, “Olee ndị kwụnyeere Jehova?” Ihe dị ka mmadụ 10 ma ọ bụ 12 kwụnyeere Jehova. A gwara ha ka ha hapụ chọọchị ahụ.
Nke a bụ mmalite dị nta nke otu okpukpe ọhụrụ n’ime St. Helena. Nna m kpọtụụrụ isi ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị na United States ma rịọ maka ígwè okwu iji na-akpọrọ ọha na eze okwu Bible ndị e kwubanyere na tepụ. A gwara ya na ígwè ahụ buru ibu nke ukwuu izite ya na St. Helena. E zitere ígwè phonograph katụ nta, ụmụnna mesịkwara tụọ ọda maka abụọ ọzọ. Ha ji ụkwụ na ịnyịnya ibu gagharịa n’àgwàetiti ahụ, na-ewegara ndị mmadụ ozi ahụ.
Ka ozi ahụ na-agbasa, otú ahụ ka mmegide na-agbasa. N’ụlọ akwụkwọ m, ụmụntakịrị ga-abụ abụ, sị: “Bịanụ nụrụ, bịanụ nụrụ, ìgwè gramophone nke Tommy Scipio!” Nke a bụụrụ m ọnwụnwa siri ike, bụ́ nwa akwụkwọ nke chọrọ ka ndị ọgbọ ya nwee mmasị n’ebe ọ nọ. Gịnị nyeere m aka ịtachi obi?
Nnukwu ezinụlọ anyị—nke nwere ụmụaka isii—na-enwechi ọmụmụ Bible ezinụlọ anya. Anyị na-agụkọkwa Bible ọnụ kwa ụtụtụ tupu anyị erie nri ụtụtụ. Obi abụọ adịghị ya na nke a mere ihe n’inyere ezinụlọ anyị aka iji ikwesị ntụkwasị obi nọgide n’eziokwu ahụ eri ọtụtụ afọ. Enwere m ịhụnanya n’onwe m n’ebe Bible dị malite na nwata, n’ime ọtụtụ afọ kwa, anọgidewo m n’àgwà nke ịgụchi Bible anya. (Abụ Ọma 1:1-3) Ka ọ na-erule oge m gụsịrị akwụkwọ mgbe m dị afọ 14, eguzosiri m ike n’eziokwu, egwu Jehova dịkwa n’obi m. Nke a nyeere m aka ịṅụrị ọṅụ n’ime Jehova n’agbanyeghị ọnwụnwa ndị ahụ.
Ọnwụnwa na Ọṅụ Ndị Ọzọ
Ka m dina n’àkwà ọrịa ahụ na-eche echiche banyere afọ ndị mbụ ahụ na atụmanya ndị m nwere maka ọdịnihu, amaara m site n’ọmụmụ m mụrụ Bible m na ọrịa a m na-arịa abụghị ule ma ọ bụ ntaramahụhụ sitere n’aka Chineke. (Jemes 1:12, 13) Otú o sina dị, ọrịa poliomyelitis ahụ bụ ọnwụnwa dị mwute, mmetụta ya ga-adịgidekwa n’ahụ m ná ndụ m nile.
Ka m na-agbake, aghaghị m ịmụ ịga ije ọzọ. Enweghịkwa m ike iji uru ahụ ụfọdụ ndị dị n’ogwe aka m eme ihe. Apụghị m ịgụta ugboro ole m na-ada ada kwa ụbọchị. Ma, site n’ikpesi ekpere ike na ịnọgide na-agbalị, ka ọ na-erule 1947, enwere m ike iji mkpara na-aga ije.
N’oge ahụ, mụ na otu nwa agbọghọ, bụ́ Doris, bụ́ onye mụ na ya na-ekpe otu okpukpe, hụrụ onwe anyị n’anya. Anyị bụ nnọọ ụmụntakịrị ichewe echiche ọlụlụ, ma a kwaliri m inwekwu ọganihu n’ịga ije. Ahapụkwara m ọrụ m n’ihi na ụgwọ ọnwa a na-akwụ m ezughị iji lụọ nwanyị, emepekwara m ụlọ ime nnyocha ezé nke onwe m, bụ́ nke rụrụ ọrụ ruo afọ abụọ sochirinụ. Anyị lụrụ na 1950. Ka ọ na-erule oge ahụ, akpatala m ego zuru iji zụọ obere ụgbọala. Ugbu a apụrụ m iburu ụmụnna gaa nzukọ na ozi ubi.
Ọganihu Ọchịchị Chineke n’Àgwàetiti Ahụ
Na 1951 Society ziteere anyị onye nnọchiteanya mbụ ha. Nke a bụ Jacobus van Staden, bụ́ nwa okoro si South Africa. Anyị ka kwabasịrị n’otu ụlọ buru ibu, ya mere anyị pụrụ inye ya ebe obibi ruo otu afọ zuru ezu. Ebe ọ bụ na m na-arụrụ onwe m ọrụ, anyị ji oge buru ibu rụkọọ ọrụ nkwusa ọnụ, anatakwara m ọzụzụ dị ukwuu bara uru n’aka ya.
Jacobus, ma ọ bụ Koos dị ka anyị si akpọ ya, haziri ịdị na-enwechi nzukọ ọgbakọ anya, bụ́ ndị anyị nile ji obi aṅụrị gaa. Anyị nwere nsogbu ime njem n’ihi na n’ime ndị nile nwere mmasị ọ bụ nanị obere ụgbọala abụọ ka e nwere. Ala ebe ahụ adịghị larịị, bụrụkwa ugwu ugwu, e nwekwara ụzọ ole na ole dị mma n’oge ahụ. N’ihi ya, ọ bụ nnọọ ihe siri ike iburute onye ọ bụla ná nzukọ. Ụfọdụ na-amalite n’isi ụtụtụ were ụkwụ gawa. Ana m eburu mmadụ atọ n’obere ụgbọala m ma kwọsa ha n’ụzọ. Ha na-arịtu ma nọgide na-aga ije. Ana m atụgharị, buru mmadụ atọ ọzọ ruo n’ebe dịtụ anya, kwọsa ha, laghachikwa. N’ikpeazụ, mmadụ nile na-esi otú a bịarute nzukọ. Mgbe nzukọ gasịrị, anyị na-agbaso otu usoro ahụ iji bulaa onye ọ bụla n’ebe obibi ya.
Koos kụzikwaara anyị otú e si ekwusa ozi ọma n’ọnụ ụzọ ndị mmadụ n’ụzọ dị irè. Anyị nwere ọtụtụ ahụmahụ ọma na ụfọdụ na-adịchaghị mma. Ma ọṅụ anyị nwere n’ozi ubi karịrị ọnwụnwa nile nke ndị na-emegide ọrụ nkwusa anyị kpatara. Otu ụtụtụ, eso m Koos na-arụ ọrụ. Ka anyị bịarutere n’otu ọnụ ụzọ, anyị nụrụ olu n’ime ụlọ. Otu nwoke nọ na-agụ Bible n’olu dara ụda. Anyị pụrụ ịnụ nke ọma okwu ndị ahụ anyị maara nke ọma dị n’Aịsaịa isi nke 2. Mgbe ọ gụruru n’amaokwu nke 4, anyị kụrụ aka n’ọnụ ụzọ. Otu agadi nwoke nwere omume enyi kpọbatara anyị, anyị jikwa Aịsaịa 2:4 mee ihe iji kọwaara ya ozi ọma nke Alaeze Chineke. A maliteere ya ọmụmụ Bible ọ bụ ezie na o bi n’ebe na-adịghị nnọọ mfe ịgaru. Anyị aghaghị ime njem gbadaa otu ugwu, zọkwasị ụkwụ n’elu nkume wee gafee otu mmiri, rịgoo ugwu ọzọ, ma gbadazie n’ụlọ ya. Ma o ruru mgbalị e tinyeere ya. Agadi nwoke a dị umeala n’obi natara eziokwu ahụ, e mekwara ya baptism. Iji bịa nzukọ, ọ na-eji mkpara abụọ gara ije ruo ebe m pụrụ iji obere ụgbọala buruzie ya. Mgbe e mesịrị, ọ nwụrụ dị ka Onyeàmà kwesịrị ntụkwasị obi.
Kọmishọna ndị uwe ojii megidere ọrụ anyị, o yikwara egwu ugboro ugboro na ya ga-agbara Koos ụgbọ nwa mkpi. Otu ugbo n’ọnwa, ọ na-akpọ Koos òkù maka ịgba ya ajụjụ. Eziokwu bụ́ na Koos na-enyekarị ya azịza ndị gara kpọmkwem site na Bible mere ọbụna ka iwe ya dịkwuo ọkụ. N’oge nke ọ bụla, ọ na-adọ Koos aka ná ntị na ọ ghaghị ịkwụsị ime nkwusa, ma n’oge nke ọ bụla, a na-agbara ya àmà. Ọ nọgidere na-emegide ọrụ ahụ ọbụna mgbe Koos hapụsịrị St. Helena. Mgbe ahụ, kọmishọna ahụ, bụ́ nwoke gbara dimkpa, sie ike, dara ọrịa na mberede ma taa ahụ nke ukwuu. Ndị dọkịta apụghị ịchọpụta ihe na-eme ya. N’ihi ya, ọ hapụrụ àgwàetiti ahụ.
Baptism na Uto Na-aga n’Ihu
Mgbe Koos nọsịworo n’àgwàetiti a ruo ọnwa atọ, o chere na o kwesịrị ekwesị ikwu okwu baptism. Ịchọta ọdọ mmiri dị mma bụ nsogbu. Anyị kpebiri igwu nnukwu olulu, tee ya simenti, ma gbajuo ya mmiri. N’abalị fotere ụbọchị baptism ahụ, mmiri zoro, n’ụtụtụ echi ya kwa, anyị nwere obi ụtọ ịhụ na mmiri ejula n’olulu ahụ.
N’ụtụtụ Sunday ahụ Koos kwuru okwu baptism. Mgbe ọ gwara ndị ahụ na-achọ ka e mee ha baptism ka ha bilie ọtọ, anyị mmadụ 26 biliri ọtọ iji zaa ajụjụ ahụ a na-ajụkarị. Anyị nwere ihe ùgwù nke ịbụ Ndịàmà mbụ e mere baptism n’àgwàetiti a. Nke ahụ bụ ụbọchị kasị nye m obi ụtọ ná ndụ n’ihi na anọwo m na-echegbu onwe m mgbe nile na Amagedọn ga-abịa tupu e mee m baptism.
N’ikpeazu e guzobere ọgbakọ abụọ, otu na Levelwood, otu na Jamestown. Kwa izu, anyị mmadụ atọ ma ọ bụ anọ na-eme njem dị kilomita 13 gaa n’otu ọgbakọ iji duzie Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na Nzukọ Ije Ozi n’uhuruchi Saturday. Mgbe anyị gasịrị ozi ubi n’ụtụtụ Sunday, anyị na-alọghachi ma nwee otu nzukọ ahụ, nakwa Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche, n’ọgbakọ nke anyị n’ehihie na n’uhuruchi. Ya mere ngwụsị izu anyị na-ejupụta n’ọrụ ọchịchị Chineke na-enye ọṅụ. Ọ gụsiri m agụụ ike ịrụ ọrụ nkwusa ahụ oge nile, ma enwere m ezinụlọ ilekọta. Ya mere na 1952, alaghachiri m n’ọrụ gọọmenti dị ka dibia ezé na-arụ ọrụ oge nile.
Na 1955 ndị nnọchiteanya na-ejegharị ejegharị nke Society, bụ́ ndị nlekọta sekit, malitere ileta àgwàetiti a kwa afọ, ha na-anọkwa n’ụlọ m ruo ụbọchị ụfọdụ mgbe ha bịara. Ha bụụrụ ezinụlọ anyị mmetụta dị mma. N’ihe dị ka n’otu oge ahụ, enwekwara m ihe ùgwù nke ikere òkè n’igosi ihe nkiri atọ nke Society gburugburu àgwàetiti a.
Mgbakọ nke Ime Ihe Chineke Na-achọ nke Na-akpali Akpali
Na 1958, iji gaa Mgbakọ Mba Nile nke Ime Ihe Chineke Na-achọ e mere na New York, agbara m arụkwaghị m ọzọ n’ọrụ gọọmenti. Mgbakọ ahụ bụ otu ihe dị ịrịba ama ná ndụ m—ohere nke nyere m ihe dị ukwuu mere m ga-eji ṅụrịa ọṅụ n’ime Jehova. N’ihi enweghị usoro ịga njem mgbe nile n’àgwàetiti a, anyị nọ n’ụzọ ije ruo ọnwa ise na ọkara. Mgbakọ ahụ were ụbọchị asatọ, nnọkọ ndị ahụ bụkwa site n’elekere anya itoolu n’ụtụtụ ruo elekere anya itoolu n’abalị. Ma ọ dịghị mgbe ike gwụrụ m, atụkwara m anya maka ụbọchị nke ọ bụla. Enwere m ihe ùgwù nke ịnọchite anya St. Helena ruo minit abụọ n’usoro ihe omume ahụ. Ịgwa oké ìgwè mmadụ ahụ nọ n’Ámá Egwuregwu Yankee na Polo Grounds okwu bụ ahụmahụ na-emenye ụjọ.
Mgbakọ ahụ wusiri mkpebi m ike ịsụ ụzọ. Okwu ihu ọha bụ́, “Alaeze Chineke Na-achị—Ọgwụgwụ Ụwa Ọ̀ Dị Nso?,” gbara m ume karịsịa. Mgbe mgbakọ ahụ gasịrị, anyị letara isi ụlọ ọrụ Society dị na Brooklyn ma gagharịa n’ụlọ obibi akwụkwọ. Agwara m Nwanna Knorr, bụ́ onyeisi oche nke Watch Tower Society mgbe ahụ, banyere ọganihu nke ọrụ ahụ na St. Helena. O kwuru na ya ga-enwe mmasị ileta àgwàetiti ahụ otu ụbọchị. Anyị welatara tepụ e kwunyere okwu nile ahụ e kwuru tinyekwara ọtụtụ sinima nke mgbakọ ahụ iji soro ezinụlọ na ndị enyi anyị kerịta ha.
Eruo M Ihe Mgbaru Ọsọ nke Ozi Oge Nile
Mgbe m lọtara, e nyeghachiri m ọrụ mbụ m, ebe ọ bụ na e nweghị dibịa ezé ọzọ nọ n’àgwàetiti ahụ. Otú ọ dị, akọwara m na ezubere m ịbanye n’ozi oge nile. Mgbe ọtụtụ nkwurịta okwu gasịrị, e kwekọrịtara na m pụrụ ịrụ ọrụ ụbọchị atọ n’izu, ma na-akwụ m ụgwọ ọnwa katụ ukwuu karịa mgbe m na-arụ ọrụ ụbọchị isii n’izu. Okwu Jisọs bụ eziokwu: “Ma burunụ ụzọ chọọ alaeze Ya, na ezi omume Ya; a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a nile.” (Matiu 6:33) Iji ụkwụ m na-esichaghị ike eme njem n’ala ugwu ugwu nke àgwàetiti a anaghị adịrị m mfe mgbe nile. N’agbanyeghị nke ahụ, asụrụ m ụzọ ruo afọ 14, enwekwara ike inyere ọtụtụ ndị ibe m bi n’àgwàetiti a aka ịmụta eziokwu ahụ—ihe na-akpata oké ịṅụrị ọṅụ n’ezie.
Na 1961 gọọmenti chọrọ iziga m n’Àgwàetiti Fiji maka ọzụzụ ga-ewe afọ abụọ n’akwụghị ụgwọ ka m wee nwee ike ịghọ dibịa ezé ruru nnọọ eru. Ha kwekwara ọbụna izigakọ mụ na ezinụlọ m. Nke a bụ onyinye na-adọrọ adọrọ, ma mgbe m tụlesichara ya ike, ajụrụ m ịnara ya. Achọghị m ịhapụ ụmụnna ruo ogologo oge dị otú ahụ ma hapụ ihe ùgwù m nwere nke iso ha na-eje ozi. Onyeisi ọrụ na-ahụ banyere ahụ ike bụ́ onye haziworo njem ahụ were iwe nke ukwuu. O kwuru, sị: “Ọ bụrụ na i chere na ọgwụgwụ dị ezi nso, ị ka pụrụ iji ego ị ga-enweta mee ihe ugbu a.” Ma eguzosiri m ike.
N’afọ sochirinụ, a kpọrọ m òkù ịbịa South Africa iji gaa Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze, bụ́ ọzụzụ were otu ọnwa maka ndị nlekọta ọgbakọ. E nyere anyị ntụziaka bara uru nke nyeere anyị aka ilekọta ọrụ ndị e nyere anyị n’ọgbakọ n’ụzọ dị irè karị. Mgbe ụlọ akwụkwọ ahụ gasịrị, anatakwuru m ọzụzụ site n’isoro otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị rụọ ọrụ. Eletaziri m ọgbakọ abụọ ahụ dị na St. Helena ruo ihe karịrị afọ iri dị ka onye na-arụchitere onye nlekọta sekit ọrụ. Ka oge na-aga, e nwetara ụmụnna nwoke ndị ọzọ ruru eru, e jikwa usoro onye mee ibe ya emee, mee ihe.
Ka ọ dị mgbe ahụ, anyị esiwo Jamestown kwaga Levelwood, bụ́ ebe e nwere mkpa ka ukwuu, anyị nọkwara ebe ahụ ruo afọ iri. N’oge a, anọ m na-asụnye aka abụọ n’ọnụ otu mgbe—ịsụ ụzọ, ịrụrụ gọọmenti ọrụ ụbọchị atọ n’izu, na ilekọta ụlọ ahịa na-ere ihe e ji esi nri. Tụkwasị na nke a, ana m ahụ maka okwu ndị metụtara ọgbakọ, mụ na nwunye m na-elekọtakwa ezinụlọ nke nwere ụmụaka anọ na-etolite etolite. Iji lekọta ihe ndị a, ahapụrụ m ọrụ ụbọchị atọ m, ree ụlọ ahịa ahụ, kpọrọkwa ezinụlọ m dum gaa Cape Town, South Africa, maka ezumike ọnwa atọ. Anyị kwagaziri n’Àgwàetiti Ascension ma nọrọ ebe ahụ ruo otu afọ. N’oge ahụ, anyị nwere ike inyere ọtụtụ ndị aka inweta ezi ihe ọmụma nke eziokwu Bible.
Mgbe anyị lọtara St. Helena, anyị laghachiri na Jamestown. Anyị rụzigharịrị otu ụlọ a rụkọtara ya na Ụlọ Nzukọ Alaeze. Iji nweta ihe e ji azụ anụ ahụ, mụ na nwa m nwoke bụ́ John ji ụgbọala Ford mere ụgbọala e ji ere ice cream, anyị rekwara ice cream ruo afọ ise sochirinụ. Oge na-adịghị anya mgbe anyị malitesịrị achụmnta ego ahụ, eji m ụgbọala ahụ nwee ọdachi mberede. Ọ kpọgharịrị ma kpagide m n’ụkwụ. N’ihi ya, akwara ndị dị site n’ikpere m gbadaa kụnwụrụ, o wekwara m ọnwa atọ iji gbakee.
Ngọzi Ndị Bara Ụba n’Oge Gara Aga na n’Ọdịnihu
Eri ọtụtụ afọ gafeworonụ, anyị enwetawo ọtụtụ ngọzi—ihe ndị ọzọ na-akpata ịṅụrị ọṅụ. Otu n’ime ndị a bụ njem anyị mere gaa South Africa iji gaa otu mgbakọ mba e mere na 1985 na ileta ebe obibi ọhụrụ nke Betel, bụ́ nke a ka nọ na-ewu ewu. Ọzọ bụ ikere òkè dị nta, mụ na nwa m nwoke bụ́ John, n’iwu otu ọmarịcha Ụlọ Mgbakọ na nso nso Jamestown. Anyị nwekwara obi ụtọ na atọ n’ime ụmụ anyị ndị ikom na-eje ozi dị ka ndị okenye, otu nwa nwa anyị na-ejekwa ozi na Betel dị na South Africa. N’ezie, anyị enwetawokwa ọṅụ na afọ ojuju dị ukwuu site n’inyere ọtụtụ ndị aka inweta ezi ihe ọmụma nke Bible.
Ubi anyị na-eje ozi na ya dị obere, na-enwe nanị ihe dị ka mmadụ 5,000. Otu o sina dị, ịrụ otu ókèala ahụ ugboro ugboro arụpụtawo ihe ndị dị mma. Mmadụ ole na ole na-emeso anyị n’ụzọ obi ọjọọ. A maara St. Helena maka omume enyi ya, a ga-ekelekwa gị n’ebe ọ bụla ị gara—mgbe ị na-aga n’ụzọ ma ọ bụ mgbe ị na-akwọ ụgbọala gị. Ahụmahụ m abụrụwo na ka ị na-amata ndị mmadụ karị, otú a ka ọ na-adịkwu mfe karị ịgbara ha àmà. Anyị nwere ndị nkwusa 150 ugbu a, ọ bụ ezie na ọtụtụ akwagaala ofesi.
Ebe ụmụaka anyị nile toliteworo ma pụsịa, mụ na nwunye m nọzi nanị anyị ọzọ, mgbe afọ 48 nke alụmdi na nwunye gasịrị. Ezi ịhụnanya na nkwado ya eri ọtụtụ afọ enyeworo m aka ịnọgide jiri ọṅụ na-ejere Jehova ozi n’agbanyeghị ọnwụnwa dị iche iche. Ike ọkpụkpụ aka anyị na-ebelata ebelata, ma a na-eme ka ike ime mmụọ anyị dị ọhụrụ kwa ụbọchị. (2 Ndị Kọrint 4:16) Mụ na ezinụlọ m na ndị enyi m, na-elepụ anya maka ọdịnihu dị ebube mgbe a ga-eme ka m dịghachi mma ọbụna karịa otú m dị n’anụ ahụ mgbe m dị afọ 17. Ọchịchọ m kasịnụ bụ izu okè n’echiche nile na, karịsịa, ijere Chineke anyị na-ahụ n’anya, nke na-elekọtakwa anyị, bụ́ Jehova, na Eze ya na-achị achị, bụ́ Jisọs Kraịst, ozi ruo mgbe ebighị ebi.—Nehemaịa 8:10.
[Foto dị na peeji nke 26]
George Scipio na atọ n’ime ụmụ ya ndị ikom, bụ́ ndị na-eje ozi dị ka ndị okenye
[Foto dị na peeji nke 29]
George Scipio na nwunye ya, bụ́ Doris