Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 4/1 p. 19-23
  • Iso Nzukọ Jehova Na-eto Na South Africa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Iso Nzukọ Jehova Na-eto Na South Africa
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Nketa Ndị Kraịst
  • Azụmahịa Nwere Ihe Ịga nke Ọma
  • Ihe Mere M Ji Hapụ Akwụkwọ n’Oge
  • Ozi Betel na Ụlọ Akwụkwọ Gilead
  • Ozi M Nọgidere Na-eje
  • Ihe Mmụta Dị Ilu
  • Ngọzi Ndị Ọzọ
  • Ndụ n’Okpuru Ịkpa Ókè Agbụrụ
  • Mwusawanye Betel
  • M Ji Obi Ụtọ Jeere Jehova Ozi
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • Ị̀ Pụrụ Iwepụta Onwe Gị?
    Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Nke A Ọ̀ Pụrụ Ịbụ Ụzọ Ndụ Kasị Mma Nye Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Òkù A Na-akpọ Mmadụ Niile!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 4/1 p. 19-23

Iso Nzukọ Jehova Na-eto Na South Africa

Dị ka Frans Muller si kọọ

MGBE mụ na nwanne m nwoke bụ David rutere ụgbọ okporo ígwè ahụ anyị na-esokarị apụ site n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè dị na Cape Town, o juru anyị anya ịhụ ọkwa ahụ na-asị “Nanị Ndị Ọcha.” Òtù Nationalist Party emeriwo ná nhọpụta e mere na 1948, ha wee webatakwa ụkpụrụ iwu ịkpa ókè agbụrụ.

Otú ọ dị, a nọwo na-enwe nkewa n’ihi agbụrụ ruo ogologo oge na South Africa, dị ka ọ dịworo n’ihe ka ọtụtụ ná mba ndị dị n’Africa n’oge ọchịchị ndị mba ọzọ. Ma ugbu a a na-eji iwu na-etinye ya n’ọrụ, e kwekwaghị anyị ọzọ iso ndị ọzọ bụ́ ndị South Africa, bụ́ ndị nwere akpụkpọ ahụ dị ojii karị, nọkọọ n’otu nkeji ụgbọ. Ka 45 afọ gasịrị, a na-ewepụsị iwu ịkpa ókè agbụrụ.

N’oge nile nke ịkpa ókè agbụrụ site n’iwu, bụ́ nke wetara ihe ịma aka dị iche iche n’ije ozi anyị n’ụzọ anyị gaara achọ, ejere m ozi dị ka onye ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova. Ka ọ dị ugbu a, n’afọ ndụ 65, m pụrụ ileghachi anya azụ n’uto dị ịtụnanya nke nzukọ Jehova n’ebe ndịda Africa, enwekwara m ekele maka ihe ùgwù nke iso ya tokọọ.

Ihe Nketa Ndị Kraịst

Mgbe nna m bụ ntorobịa, n’isi ụtụtụ ọ bụla, a chọrọ ka ọ na-agụpụtara nna m ochie Bible. Mgbe oge na-aga, papa m zụlitere ịhụnanya miri emi maka Okwu Chineke. Mgbe a mụrụ m na 1928, nna m na-eje ozi na kansụl chọọchị nke Reformed Chọọchị nke Netherlands dị na Potgietersrus. N’afọ ahụ nwanne nna m nyere ya otu akwụkwọ bụ́ The Harp of God.

Otú ọ dị, papa m gwara mama m ka o suo akwụkwọ ahụ ọkụ, na-asị na o sitere n’otu ịrọ òtù. Ma o debere ya, otu ụbọchị kwa mgbe papa m tụtụụrụ ya, o mepere n’isiokwu bụ “Does God Torment Anyone?” (Chineke Ọ̀ Na-ata Onye Ọ Bụla Ahụhụ?) Ọ bụ ezie na o doro ya anya na Ndị Mmụta Bible, dị ka a na-akpọ Ndịàmà Jehova n’oge ahụ, ezighị ezi, ọchịchọ ya ịmata ihe jigidere ya, o wee malite ịgụ ya. Ọ pụghị idoru akwụkwọ ahụ ala. N’isi ụtụtụ, ka ọ na-arịkwasị n’elu àkwà, ọ sịrị: “Nne, o siiri m ike ikwere, ma ha nwere eziokwu ahụ.”

N’ụbọchị na-esonụ, papa m gbaara ígwè gaa 50 kilomita ịga nwetakwuo akwụkwọ site n’aka Onye Mmụta Bible nọ nso karịsịa. Mgbe mgbe ọ na-agụ akwụkwọ ruo ime abalị. Ọbụna na ọ nwara ime ka onye ozi Reformed Chọọchị nke Netherlands kweta eziokwu Bible ndị ọ na-amụta, na-enwe olileanya na chọọchị ahụ ga-eme mgbanwe ụfọdụ. Mgbalị ya nile arụpụtaghị ihe ọ bụla, ya mere ọ hapụrụ chọọchị ahụ wee malite ime nkwusa n’ịnụ ọkụ n’obi. Eziokwu Bible ghọrọ ihe kasị mkpa ná ndụ ya na n’ụlọ anyị. Ọ bụ n’ọnọdụ a ka m tolitere.

E mesịa, papa m ghọrọ onye ọsụ ụzọ, ma ọ bụ onye ozi oge nile. O mere njem ndị dị ogologo n’ụgbọ ochie Model T Ford iji mee nkwusa. Mgbe afọ ole na ole gasịrị, mkpa ndị e nwere n’ezinụlọ anyị na-ebuwanye ibu manyere ya ịkwụsị ịsụ ụzọ, ma ọ nọgidere na-arụsi ọrụ ike n’ọrụ nkwusa ahụ. Na Sunday ụfọdụ anyị ga-aga njem ihe ruru 90 kilomita iji soro ya mee nkwusa na Pietersburg.

Azụmahịa Nwere Ihe Ịga nke Ọma

Papa m mesịrị meghee obere ụlọ ahịa a na-ere ụmụ ngwongwo dị iche iche e ji ebi n’ụlọ. N’isi nso o buru ibu okpukpu abụọ, e meghekwara ụlọ ahịa nke abụọ. Ụfọdụ ndị ọrụ ugbo bara ọgaranya so papa m jikọọ aka n’azụmahịa, mgbe oge na-agakwa, ha jikọrọ aka na-elekọta otu ụlọ ahịa na-ere ihe n’ùgwù tinyere usoro ụlọ ahịa nregharị isii e hiwere n’ebe ndị dị iche iche.

Ụfọdụ ụmụnne m ndị ikom ndị tọrọ m sonyere n’ọrụ azụmahịa ahụ, nweekwa ugbu a olileanya nke ịba ọgaranya. Otú ọ dị, ọnọdụ ime mmụọ anyị malitere ịdalata. Anyị ghọrọ ndị ndị enyi na ndị agbata obi bụ́ ndị ụwa nakweere karị, bụ́ ndị na-akpọ anyị òkù ịbịa nnọkọ oriri ha dị iche iche. N’ihi ịhụ ihe ize ndụ ahụ, papa m kpọrọ nzukọ ezinụlọ wee kpebie ire azụmahịa ahụ wee kwafee na Pretoria ka anyị wee nwee ike ime ihe karị n’ije ozi Jehova. Ọ hapụrụ nanị otu ụlọ ahịa, bụ́ nke ndị ọrụ e goro ego na-elekọta.

Ụmụnne m ndị ikom bụ Koos na David malitere ịsụ ụzọ, si otú a na-esonyere nwanne m nwanyị nke tọrọ m, bụ́ Lina. N’ime otu ọnwa na 1942, ezinụlọ anyị nke mmadụ iri tinyere ngụkọta nke 1,000 hour n’ọrụ nkwusa. N’afọ ahụ, m mere ihe ngosi nke nrara m raara ndụ m nye Jehova site ná mmikpu n’ime mmiri.

Ihe Mere M Ji Hapụ Akwụkwọ n’Oge

Na 1944, ka Agha Ụwa nke Abụọ kpụ ọkụ n’ọnụ, Gert Nel, onye nlekọta na-ejegharị ejegharị nke Ndịàmà Jehova, jụrụ m ma m na-eme atụmatụ ịbanye n’òtù ndị ọsụ ụzọ. “Ee,” ka m zara, “n’ime afọ abụọ, mgbe m gasịrị kọleji.”

Ka ọ na-egosipụta echiche nke ọtụtụ Ndịàmà Jehova n’oge ahụ, ọ dọrọ aka ná ntị, sị: “Lezie anya ka Amagedọn ghara ịdakwasị gị ebe ị nọ n’oche ụlọ akwụkwọ.” Ebe m na-achọghị ka nke ahụ mee m, m hapụrụ ụlọ akwụkwọ wee banye n’ọrụ ọsụ ụzọ na January 1, 1945.

Ebe mbụ e kenyere m ọrụ bụ na Vereeniging, nso Johannesburg, ndị mụ na ha ga-arụkọ ọrụ bụkwa Piet Wentzel na Danie Otto. Ọtụtụ mgbe m ga-etinye ihe karịrị 200 hour n’ọnwa n’ime nkwusa. Ka oge na-aga, e kenyegharịrị Piet ọrụ n’obodo Pretoria, Danie kwa aghaghị ịkwụsị ịsụ ụzọ iji nyere nna ya meworo agadi aka n’ọrụ ugbo. Nke a hapụrụ nanị m ịbụ Onyeàmà e nwere nanị ya ilekọta 23 ọmụmụ Bible ebe obibi na Vereeniging.

Ngwa ngwa nke ahụ gasịrị, a natara m akwụkwọ ozi site n’alaka ụlọ ọrụ, bụ́ nke kenyere m ọrụ na Pretoria. Ọ bụ ezie aghọtaghị m ihe kpatara ọrụ ọhụrụ ahụ e kenyere m n’oge a, emesịrị m ghọta na ọ garaghị abụ ihe amamihe dị na ya ịhapụ nwa dị afọ 17 nke na-enweghị amamihe nanị ya. M ka nwekwara mkpa maka ọzụzụ buru ibu, m pụkwara inwe nkụda mmụọ.

Mgbe m jesịrị ozi na Pretoria, nwetakwa amamihe dị mkpa, akpọrọ m òkù ịbụ onye ọsụ ụzọ pụrụ iche. Mụ na Piet Wentzel mezịrị ndokwa inye ndị na-eto eto bịara Pretoria ịsụ ụzọ ọzụzụ ije ozi dị irè. Ka ọ dị mgbe ahụ e kenyewo Piet ọrụ ịbụ onye nlekọta na-ejegharị ejegharị n’ógbè ahụ. O mesịrị lụọ nwanne m nwanyị bụ́ Lina, ha na-ejekọkwa ozi ọnụ ugbu a n’alaka ụlọ ọrụ South Africa.

Martie Vos, otu nwa agbọghọ na-adọrọ adọrọ nke a zụlitere n’ezinụlọ bụ́ Ndịàmà, so ná ndị bịara Pretoria ịsụ ụzọ. Anyị dọọrọ mmasị ibe anyị n’ịhụnanya, ma anyị erubeghị iri afọ abụọ, bụrụ nwata nke ukwuu ịlụ di na nwunye. Otú ọ dị, mgbe e kenyere anyị ọrụ n’ebe ndị ọzọ, anyị nọgidere na-akpakọrịta site n’iderịta akwụkwọ.

Ozi Betel na Ụlọ Akwụkwọ Gilead

Na 1948, a kpọrọ m òkù ije ozi n’alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị na Cape Town. N’oge ahụ, e nweghị otu ụlọ obibi maka 17 n’ime anyị bụ́ ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ 3 a na-akwụ ụgwọ ha na otu obere ụlọ obibi akwụkwọ dị nso. E nyere ụfọdụ n’ime anyị ụlọ ibinyere ezinụlọ ụfọdụ, ndị ọzọ bikwa n’ụlọ ọtụtụ ndị na-ebi.

Kwa ụbọchị ọrụ ọ bụla, mmadụ 17 ahụ nke ezinụlọ Betel na-abịakọta ọnụ maka ofufe ụtụtụ n’ebe mgbanwe ákwà nke obere ụlọ obibi akwụkwọ ahụ. Ọtụtụ n’ime anyị aghaghị ime ndokwa maka nri ehihie anyị n’aka anyị. Mgbe ahụ, mgbe ọrụ ụbọchị zuru ezu gasịrị, anyị ga-ala n’ebe obibi anyị n’akụkụ dị iche iche nke Cape Town. Ọ bụ n’otu n’ime njem ndị a, dị ka e kwuworo na mbụ, ka mụ na nwanne m nwoke bụ́ David nwere ihe ijuanya site n’ọkwa ahụ na-asị, “Nanị Ndị Ọcha.”

Mgbe mbụ m rutere n’ụlọ ọrụ Cape Town, m chọpụtara na m ka nwere ihe dị ukwuu ịmụta, ya mere m jụrụ Nwanna Phillips, onye nlekọta alaka ụlọ ọrụ anyị, sị: “Gịnị ka m na-aghaghị ime iji mụta ihe ngwa ngwa?”

“Frans,” ka ọ zara, “enyela nsogbu banyere ịmụta ihe ngwa ngwa. Nanị nọgide!” Agbalịwo m mgbe nile ime nke ahụ, amụtawokwa m na site n’ịdị na-anọgide n’ihe nzukọ Jehova na-ewepụta dị ka nri ime mmụọ na nduzi, mmadụ ga-anọgide na-eso ya na-eto.

Na 1950, a kpọrọ m òkù ịbịa klasị nke 16 nke Watchtower Bible School of Gilead maka ọzụzụ ndị ozi ala ọzọ. Ụlọ akwụkwọ ahụ dị na South Lansing, New York, ihe dị ka 400 kilomita n’ebe ugwu Brooklyn, New York. Ka m na-arụ ọrụ nwa oge n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova na Brooklyn, m kiriri ebe bụ isi nke nzukọ Jehova a na-ahụ anya n’onwe m. Nnyefe onwe onye site ná mkpụrụ obi dum nke ndị na-edu ndu n’ebe ahụ mere ka m jupụta n’obi ekele miri emi maka nzukọ Jehova.

Ozi M Nọgidere Na-eje

Mgbe m lọghachiri na South Africa, a họpụtara m ije ozi dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị n’ebe ugwu Transvaal, bụ́ ebe m nọ tolite. Mgbe anyị derịtaworo akwụkwọ ruo afọ isii, mụ na Martie lụrụ di na nwunye na December 1952, o sonyekwara m n’ọrụ ngagharị. Ekele ụmụnna anyị ndị Kraịst nwere maka nleta anyị nile na-ekpo obi ọkụ.

Dị ka ihe atụ, otu mgbe ka m na-elekọta otu ọgbakọ n’ógbè ndị ọrụ ugbo, anyị binyeere otu ezinụlọ bụ́ ndị nwere mwute na ha enweghị mmiri ara ehi maka tii na kọfị. Anyị mesịrị mata na ha erewo otu nne ehi ha nwere nke na-agbapụtara ha mmiri ara ehi iji nwee ego ga-ezu ịzụta mmanụ ụgbọ ala iji buga anyị n’akụkụ ndị dị anya nke ókèala ahụ iji gbaara ndị ọrụ ugbo àmà. Lee aha ịhụnanya anyị nwere n’ebe ụmụnna dị otú ahụ nọ!

Mgbe ụfọdụ ọ na-adị m ka ọ bụ na erughị m eru maka ọrụ sekit, karịsịa mgbe m na-ahụ maka nsogbu ndị metụtara ndị meworo okenye karị. Otu mgbe m nwere nnọọ ndakpọ mmetụta uche nke na m gwara Martie ka ọ ghara iju ya anya ma e kenyeghachi anyị ọrụ ịsụ ụzọ n’ihi enweghị ahụmahụ m. O kwere m nkwa na ya ga-enwe obi ụtọ iso m jee ozi n’ọkwá ọ bụla ọ bụrụhaala na anyị ga-enwe ike ịnọgide n’ozi oge nile.

Cheedị echiche banyere ihe ijuanya ọ bụụrụ anyị mgbe anyị rutere n’ọgbakọ nke na-eso, akwụkwọ ozi anyị nwetara bụkwa nke ikenye anyị ọrụ ije ozi n’ọrụ distrikti! Ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ abụọ, anyị mere njem n’akụkụ nile nke South Africa na Namibia, nke a na-akpọ mgbe ahụ South-West Africa. Otú ọ dị, n’ihi usoro ịkpa ókè agbụrụ ahụ, ọrụ anyị na-esikarị ike. Ọtụtụ mgbe a dịghị ekwe inye anyị ikike ịbanye n’obodo ndị ojii, mgbe ụfọdụkwa a dịghị ekwe anyị nwee mgbakọ.

Na 1960, dị ka ihe atụ, anyị natara ikike inwe mgbakọ distrikti na Soweto. Ụmụnna anyị ndị ojii si n’ọgbakọ ndị dị anya azụtaworị tiketi ụgbọ okporo ígwè na bọs iji bịa, ma ndị gọọmenti nụrụ banyere atụmatụ anyị wee kagbuo ikike ahụ. N’ụzọ akọ, anyị jekwuuru otu onye nlekọta ndị uwe ojii bụ enyi n’otu obodo dịpụrụ 20 kilomita n’akụkụ nke ọzọ nke Johannesburg. O ji obi ọma nye anyị ọbụna ebe ka mma, anyị nwekwara mgbakọ magburu onwe ya, nke ihe karịrị 12,000 mmadụ bịara!

Lee ka ọnọdụ siworo gbanwee n’afọ ndị na-adịbeghị anya gara aga! Ugbu a, ka a na-ewepụsị iwu ịkpa ókè agbụrụ, anyị pụrụ izukọ n’ebe ọ bụla n’ógbè ndị ojii, ndị ọcha, ndị nne na nna si n’ebo dịgasị iche, ma ọ bụ nke ndị India. Onye ọ bụla, n’agbanyeghị agbụrụ, pụrụ ịnọkọ ọnụ n’oche ma nwee mkpakọrịta. Nanị ndịrịta iche n’asụsụ pụrụ ikpebi ebe mmadụ pụrụ ịchọ ịnọdụ.

Ihe Mmụta Dị Ilu

Laa azụ na 1947, nna m hiere ụzọ dị ukwuu. Ụlọ ahịa ya, nke dị ihe karịrị 200 kilomita site n’ebe ya na mama m bi, adịghịkwa eweta uru n’ihi ndị ọrụ na-adịghị eme ihe n’eziokwu, ya mere ọ laghachiri nanị ya iji lekọta ya n’onwe ya. Oge ndị dị ogologo nke ya na mama m na-anọkọghị mere ka ọ daba n’ọnwụnwa. N’ihi ya, a chụpụrụ ya n’ọgbakọ.

Nke a mere ka ọ gbaa mkpọrọgwụ miri emi n’obi m n’ụzọ dị ilu nye m kpọmkwem na ịnụ ọkụ n’obi maka eziokwu Bible ezughị ezu. Mmadụ nile aghaghị ịrapagidesi ike n’ụkpụrụ nile nke Bible. (1 Ndị Kọrint 7:5) Mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, a nabataghachiri papa m dị ka onye òtù nke ọgbakọ ndị Kraịst, o jekwara ozi n’ikwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ ya na 1970. Ezi nne m nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ ya na 1991.

Ngọzi Ndị Ọzọ

Na 1958, mụ na Martie gara mgbakọ kasị ukwuu Ndịàmà Jehova nwetụworo, na Yankee Stadium na Polo Grounds na New York. Obi anyị jupụtara n’aṅụrị n’ihi ịbụ akụkụ nke nzukọ Jehova dị ebube. Ịnọnyere ìgwè mmadụ ahụ buru ibu nke ihe karịrị 253,000 mmadụ n’ehihie Sunday bụ ahụmahụ ọ na-adịghị mgbe anyị ga-echezọ. N’ebe a, nye anyị e nwere ịdị adị nke ‘oké ìgwè mmadụ ahụ site ná mba nile’ ka ha na-ezukọ n’udo. (Mkpughe 7:​9, 10) Martie nọgidere na New York ịga Ụlọ Akwụkwọ Gilead, ma alọghachiri m n’ọrụ distrikti na South Africa.

Na 1959, mgbe Martie si klasị nke 32 nke Ụlọ Akwụkwọ Gilead lọta, a kpọrọ anyị òkù ịbịa jee ozi n’alaka ụlọ ọrụ South Africa, nke dị mgbe ahụ ná nso Elandsfontein, n’akụkụ ọwụwa anyanwụ Johannesburg. N’afọ ndị gafeworonụ, ahụwo m ọganihu nke nzukọ ahụ n’ọtụtụ ụzọ, karịsịa uto ya n’ịhụnanya na ọmịiko. Amụtawo m na Jehova na-eduzi nzukọ ya site na Jisọs Kraịst, ọ ga-ejikwa ndị nyefere onwe ha mee ihe.

Na 1962, alọghachiri m na Brooklyn, New York, ịga ọzụzụ ọnwa iri maka alaka ụlọ ọrụ. Nke a ghọrọ ihe enyemaka mgbe, na 1967, a họpụtara m dị ka onye nlekọta alaka nke South Africa. Na 1976, a họpụtara Kọmitii Alaka, ya mere ugbu a ibu ọrụ nke ime mkpebi ndị dị mkpa na South Africa dịkwasị n’ubu nke ndị okenye ise nke ndị Kraịst nweworo ahụmahụ.

Ndụ n’Okpuru Ịkpa Ókè Agbụrụ

Iwu nile nke ịkpa ókè agbụrụ metụtara ịrụ ọrụ nke alaka anyị. Mgbe e wuru Ebe Obibi Betel nke Elandsfontein na 1952, iwu ahụ chọrọ iwunye ụlọ ọzọ n’azụ ya ebe ụmụnna ndị ojii na ndị nne na nna ha si n’agbụrụ dịgasị iche ga-ebi. Iwu ahụ chọkwara ka ha na-eri nri n’ebe dịpụrụ iche site na nke ndị ọcha n’ebe a na-akpọ ógbè ndị Africa. E mesịa, e mere ndokwa ka ha na-eri nri na kichin Betel. Nke a bụ ndokwa iri nri e nwere mgbe anyị rutere Betel na 1959. Nkewa nke a ná ndabere nke agbụrụ na-agbakasị m ahụ n’akụkụ nile.

Mgbe oge na-aga, ndị gọọmenti napụrụ anyị ikike ka ụmụnna anyị ndị ojii nọrọ n’ụlọ ahụ n’azụ Ebe Obibi Betel bụ isi. Ụmụnna ndị a aghaghị ịnọ n’obodo ndị ojii nke dị ihe dị ka 20 kilomita site n’ebe ahụ. Ụfọdụ bi n’ebe obibi ndị a na-akwụ ụgwọ ha, ndị ọzọ kwa n’ụlọ ndị e nwere maka ndị ikom na-ejighị nwanyị. Ọnọdụ nke na-adịghị mma nọgidere ruo ọtụtụ afọ.

Mwusawanye Betel

Ka ọ dị mgbe ahụ, ọ dị mkpa iwusawanye Betel Elandsfontein. Mgbe a gbakwụnyeworo ya ihe ugbo atọ, anyị eruwo okere nke ala anyị. Òtù Na-achị Isi kwuru ka anyị chọta ala ọhụrụ n’ebe o yikarịrị ka ndị ọchịchị nwe mba a hà ga-ekwe ka anyị wuo usoro Betel ebe ụmụnna anyị ndị ojii pụrụ ibikwa. Kwa ụtụtụ ezinụlọ Betel ga-ekpe ekpere ka Jehova meghee ụzọ maka nke a.

Leekwa ụbọchị ịṅụrị ọṅụ ọ bụ mgbe, n’ikpeazụ, anyị chọtara otu ala dị mma ná mpụga Krugersdorp, n’ebe ọdịda anyanwụ Johannesburg! Otú ọ dị, a chọkwara ka anyị wuo ụlọ dị iche maka ụmụnna anyị ndị ojii. Anyị kwenyere ma anyị apụghị inweta ikike maka inye ihe karịrị 20 ndị ojii ụlọ n’ebe ahụ. Ọ bụ ihe obi ụtọ na ka ọ na-erule etiti afọ ndị 1980, ihe malitere ịgbanwe. Ndị gọọmentị selatatụrụ aka n’iwu ha ndị siri oké ike nke ịkpa ókè agbụrụ, a kpọkwara ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ụmụnna ndị ojii, ndị nne na nna ha si n’agbụrụ dịgasị iche, na ndị India ịbịa soro anyị na-eje ozi na Betel.

Ugbu a anyị nwere ezinụlọ Betel obi ụtọ nke dị n’otu, ebe ndị mmadụ, n’agbanyeghị agbụrụ ma ọ bụ ọcha akpụkpọ ahụ pụrụ ibi n’ebe ọ bụla ha họọrọ n’ụlọ ndị ahụ. Ọzọ, mgbe ọtụtụ afọ nke ịgba mgba gasịrị, e mesịrị nye anyị nnabata iwu dị ka òtù okpukpe. E hibewo njikọ iwu nke e debanyere aha ya dị ka “Ndịàmà Jehova nke South Africa.” Ugbu a anyị nwere ndị ọrụ agbamakwụkwọ nke anyị, n’ebe dị iche iche ndị ojii bikwa, Ụlọ Nzukọ Alaeze na-amụba n’ike n’ike.

Lee nnọọ ka nzukọ Jehova siworo nwee ọganihu eri ụbọchị ndị mbụ ahụ mgbe m jere ozi n’alaka ụlọ ọrụ Cape Town! Site n’ezinụlọ dị nta nke mmadụ 17 n’enweghị Ebe Obibi Betel, anyị etowo ugbu a ruo ezinụlọ Betel nke ihe karịrị 460 mmadụ, na-enwe usoro ihe owuwu Betel nke ọgbara ọhụrụ nwere kọmputa ndị bụ ọkpọka, ígwè na-ebi akwụkwọ ma na-apịachi ya, na Ebe Obibi Betel mara mma! Ee, enwewo m ihe ùgwù nke iso nzukọ Jehova na-eto na South Africa. Anyị amụbawo site n’ihe dị ka 400 ndị nkwusa Alaeze mgbe m malitere ije ozi n’ihe dị ka 50 afọ gara aga ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 55,000 taa!

Ana m ekele Jehova na m nwere, n’afọ 40 gara aga, nwunye dị otú a nke na-enye nkwado n’akụkụ m. “Iko m bụ inwebiga ihe ókè.” (Abụ Ọma 23:5) Mụ na Martie nwere ekele ịbụ akụkụ nke nzukọ Jehova mmụọ na-eduzi, anyị kpebisikwara ike ịnọgide na-ejere Jehova ozi n’ụlọ ya, na Betel, na ịnọgide na-eso nzukọ ya na-aga n’ihu n’ihu ụkwụ na ụkwụ.

[Map ndị dị na peeji 19]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

ANGOLA

ZAMBIA

ZIMBABWE

MOZAMBIQUE

BOTSWANA

NAMIBIA

SWAZILAND

SOUTH AFRICA

LESOTHO

MALAWI

TANZANIA

ZAIRE

● Pretoria

● Johannesburg

● Cape Town

● Port Elizabeth

SOUTH ATLANTIC OCEAN

INDIAN OCEAN

MOZAMBIQUE CHANNEL

[Foto dị na peeji nke 20]

Piet Wentzel na Frans Muller (n’aka ekpe) n’ọrụ ịsụ ụzọ na 1945

[Foto dị na peeji nke 23]

Frans na Martie Muller

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya