Ị̀ Pụrụ Iwepụta Onwe Gị?
1 Otu ihe dị ịrịba ama mere n’afọ 778 T.O.A. N’ọhụụ, Aịzaịa onye amụma hụrụ “[Jehova] ka Ọ na-anọkwasị n’ocheeze dị elu nke e buliwokwara elu.” Aịzaịa nụziri ka ndị seraf na-ekwu banyere ebube Jehova, na-asị: “Nsọ, nsọ, nsọ, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha dị.” Lee ihe na-emenye ụjọ nke ahụ na-aghaghị ịbụworị! N’ọnọdụ ahụ, Jehova jụrụ otu ajụjụ siri ike ọzịza, sị: “Ònye ka M ga-eziga, ònye ga-ejekwara anyị?” A kọwaghị ụdị ọrụ ọ bụ ma ọ bụ ma onye wepụtara onwe ya n’afọ ofufo ọ̀ ga-erite uru na ya. Ma, n’alaghị azụ, Aịzaịa zara, sị: “Lee m; ziga m.” (Aịsa. 6:1, 3, 8) Ị̀ dị njikere iji ụdị mmụọ inye onwe onye n’afọ ofufo ahụ zaghachi dị ka Aịzaịa?
2 E nwere mkpa ugbu a maka ụmụnna nwoke ndị ga-eje ozi na Betel. Nke a na-achọ ka ha nwee ọchịchọ siri ike nke ibute ihe ndị metụtara Alaeze ahụ ụzọ na ịdị njikere ime ihe ọ bụla a chọrọ iji kwadoo ọrụ nkwusa zuru ụwa ọnụ. (Mat. 6:33) N’ezie, ije ozi dị ka otu onye n’ime ndị òtù ezinụlọ Betel na-enye mmadụ ohere iji obi ya dum jeere Jehova ozi. N’ụzọ dị aṅaa?
3 Ụdị Ọrụ Dịgasị Iche Iche: Ọrụ a na-ekenye ndị òtù ezinụlọ Betel na-adịgasị iche iche. Na Brooklyn na n’ọtụtụ alaka ndị ọzọ, ụmụnna na-arụ ọrụ n’ebe obibi akwụkwọ, na-ahụ maka ígwè e ji ebi akwụkwọ bụ́ ndị na-ebipụta Bible, akwụkwọ ukwu, magazin, broshuọ, na traktị maka ikesa ha n’ụwa nile. Ndị ọzọ na-ekere òkè n’ijikọta Bible na akwụkwọ ukwu, ebe ọrụ ndị ọzọ na-arụ na-agụnye ibuga akwụkwọ ndị a n’ọgbakọ dị iche iche gburugburu ụwa. A na-ekenye ọtụtụ n’ime ha ọrụ ilekọta ngwá ọrụ na ihe owuwu dị iche iche. N’Ebe Obibi Betel, ilekọta ezinụlọ ahụ bụ ọrụ buru ibu. Dị ka ihe atụ, n’alaka Nigeria, a na-enye ihe dị ka mmadụ 500 nri ụtụtụ na minit 20. Tụkwasị na nke ahụ, ndị na-edozi ụlọ na-ahụ na e nwere ụkpụrụ ịdị ọcha dị elu n’ebe obibi ndị ahụ ma na-ahụkwa maka ọtụtụ ọrụ ndị ọzọ dị mkpa.
4 Ịrụzu ọrụ a nile bụ nnukwute ọrụ ma ha bụ ọrụ na-enye afọ ojuju n’ụzọ ime mmụọ. Ịmata na anyị ji ike na ume anyị nile na-akwado ọrụ nkwusa na izi ihe na-ewetara anyị ọṅụ dị ukwuu. Ozi Betel na-enyere anyị aka ịmatakwu nzukọ Jehova nke ọma karị. A na-echetara anyị na onye ọbụ abụ ahụ gbara ndị Izrel ume ka ha matakwuo nke ọma ebe ọchịchị Chineke hiwere isi n’elu ala n’oge ha.—Ọma 48:12, 13.
5 Ngọzi Ndị Na-abịa Site n’Ozi Betel: Olee ihe ndị na-eje ozi na Betel na-eche banyere ihe ùgwù ije ozi ha? Rịba ihe ndị na-esonụ ama bụ́ ihe ndị òtù ezinụlọ Betel dị iche iche ma ndị na-akatabeghị ahụ́ ma ndị kataworo ahụ́ kwuru. Otu onye òtù ezinụlọ Betel bụ́ onye jeworo ozi na Betel ruo afọ atọ kwuru, sị: “Ịnọ na Betel emewo ka mmekọrịta mụ na Jehova sikwuo ike. Ka m nọkwu na-eje ozi ebe a ka m na-amụtakwu otú e si eme ihe na Betel, otú a ka ọ na-akụzikwuru m ụdị onye Jehova bụ. Ozi Betel emewo ka m bịa mara na Jehova na-eji ndị mmadụ eme ihe—ụdị mmadụ nile. Ọ bụghị iwu na ị ga-abụ onye zuru okè tupu ị bụrụ onye ọ ga-anakwere.”
6 Otu nwanna nwoke bụ́ nwa okorobịa na-echeta, sị: “M na-echeta mgbe m na-eche n’onwe m, sị, ‘Lee ihe magburu onwe ya ọ ga-abụ ịba n’ime ụwa ọhụrụ ma gwa ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie na m ji ndụ m nile jee ozi na Betel, ọ bụghị ịnọ n’èzí na-achụ ego.’”
7 Otu nwanna nwanyị na-eche banyere ngọzi ndị o nwetaworo ka ọ dị ugbu a: “Usoro ihe omume ime mmụọ e nwere n’ebe a akụziworo m ihe dị ukwuu karị banyere Jehova na otú m pụrụ isi ṅomikwuo ya n’echiche, mmetụta, na omume m. N’ihi na ọzụzụ ahụ bụ ihe na-aga n’ihu, a na-anọgide na-enweta ngọzi.”
8 Otu nwanna nwoke nke tinyeworo afọ 59 n’ozi oge nile, bụ́ nke o ji ihe karịrị afọ 43 n’ime ya jee ozi na Betel, na-ekwu, sị: “Betel adịghị ka ebe obibi ndị mọnk, dị ka ụfọdụ pụrụ iche. Anyị na-arụzu ihe dị ukwuu n’ihi ụzọ ndụ anyị a haziri ahazi. . . . Ọ dịbeghị ụbọchị m bịara ọrụ ma ghara ịnụ ụtọ ihe m rụrụ. N’ihi gịnị? N’ihi na mgbe anyị ji mkpụrụ obi anyị dum were onwe anyị nye Jehova, anyị na-enwe afọ ojuju ịmara na ‘ihe anyị meworo bụ ihe anyị kwesịrị ime.’”—Luk 17:10.
9 Nwanna nwoke ọzọ, bụ́ onye jeworo ozi na Betel ruo afọ 62 kwuru, sị: “Ekwenyesiri m ike na Betel bụ ebe kachasị mma n’elu ala ugbu a tupu Paradaịs elu ala ahụ na-abịanụ abịa. Akwatụbeghị m ụta ma ọlị na m jiri ozi oge nile mere aka ọrụ m ná ndụ. Lee nnọọ ihe ọṅụ ọ bụ ịhụ nakwa ikere òkè ná mmụba dị ukwuu nke nzukọ Jehova nke elu ala! Ọ bụ mkpebi m siri ike, site n’enyemaka Jehova, ịnọgide na-eme Betel ebe obibi m, na-etinyekwa mkpụrụ obi m nile n’ịkwalite ihe ndị metụtara Alaeze ahụ.”
10 Ndị òtù ezinụlọ Betel ndị a hotara nanị ole na ole n’ime ọtụtụ ngọzi ị pụrụ inweta ma ọ bụrụ na i wepụta onwe gị maka ozi Betel. Ma dịkwa ka ọ dị banyere inweta ihe ùgwù ije ozi ọ bụla, ị gaghị ibu ụzọ ruo ihe ndị a chọrọ. Olee ụfọdụ n’ime ihe ndị a chọrọ iji jee ozi dị ka otu n’ime ndị òtù ezinụlọ Betel?
11 Ihe Ndị A Chọrọ Maka Ozi Betel: E gosiri ihe ndị bụ́ isi a chọrọ n’aka ndị na-etinye akwụkwọ maka ozi na Betel n’igbe ya na isiokwu a so. Tụkwasị na nke ahụ, ọ dị mkpa na ha ga-adị njikere ịrụsi ọrụ ike, ọ bụghị ịbụ “ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya.” (2 Tim. 3:4; 1 Kọr. 13:11) Ndị òtù ezinụlọ Betel kwesịrị ịbụ ndị ikom na ndị inyom ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe, ndị zụliteworo ezi àgwà nke inwe ọmụmụ ihe onwe onye, ndị zụwokwara ikike nghọta ha “ịmata ọdịiche dị n’ihe ziri ezi na ihe ọjọọ.” (Hib. 5:14) Ha kwesịrị igosipụtaworị ntozu okè Ndị Kraịst ha n’akụkụ nile nke ndụ, gụnyere uwe ha, ejiji ha na ụdị egwu na ntụrụndụ ha na-ahọrọ. Ndị òtù ezinụlọ Betel na-eji obi ha eje ozi n’ebe ọ bụla a chọrọ ha. A na-ekenye ndị òtù ezinụlọ na-akatabeghị ahụ́ ọrụ ndị chọrọ ike ọkpụkpụ aka, nke gụnyere ibi akwụkwọ, ịkwadebe na ibupụ akwụkwọ, ọrụ nlekọta, idozi ụlọ, ihichasị ihe, ịsa ákwà na ịkwadebe nri. (Ilu 20:29) Otú ọ dị, n’adịghị ka ọrụ ego, ọrụ nke ọ bụla na-eweta afọ ojuju dị ukwuu n’ihi na ọ bụ ozi dị nsọ nke na-ewetara Jehova otuto.—Kọl. 3:23.
12 Ndị a kpọrọ ije ozi na Betel ga-anọ otu afọ na Betel ma ọ dịkarịa ala. Nke a na-eme ka e nwee ike ịzụ ha ịghọ ndị ọrụ na-arụpụta ihe. Olileanya anyị bụ na ha ga-enwe ike ime Betel ebe obibi ha. Ọ bụ ịhụnanya maka Jehova na-akpali ndị òtù ezinụlọ Betel ibute ọrụ Alaeze ahụ ụzọ tupu ọdịmma onwe ha, nke bụ́ ihe na-atọ Jehova ụtọ.—Mat. 16:24.
13 Mkpa Ndị E Nwere Ugbu A: N’ihi ụdị ọrụ a na-arụ na Betel, mkpa anyị nwekarịsịrị ugbu a bụ maka ụmụnna nwoke na-alụbeghị nwunye. Ọ bụ ezie na ọ bụghị ihe a chọrọ, a na-ahọrọkarị ndị ọsụ ụzọ oge nile, ebe ọ bụ na ha abanyewo abanye n’ozi oge nile. Mgbe ụfọdụ, a pụrụ inwe ohere maka ụmụnna nwanyị na-alụbeghị di na ndị di na nwunye nọ n’agbata afọ 19 na 35, bụ́ ndị pụrụ inwe nkà ụfọdụ a chọrọ na Betel. Ọzọkwa, a na-agba ụfọdụ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ndị ji ntakịrị ihe gafee afọ 35 ma nwee nkà na ọzụzụ pụrụ iche bụ́ nke a pụrụ iji mee ihe na Betel ume ka ha tinye akwụkwọ. Dị ka ihe atụ, ha gụnyere ndị dọkịta ezé, ndị dọkịta, ndị nhazi ego, ndị na-atụpụta ụkpụrụ ụlọ, ndị injinia, ndị nọọsụ gọọmenti nyere ikike, ndị na-edozi ụgbọala, ma ọ bụ ndị na-arụzi ígwè electronic, ka anyị kpọọ nanị ole na ole. Otú ọ dị, anyị adịghị agba ndị mmadụ n’otu n’otu ume inweta agụmakwụkwọ ma ọ bụ ọzụzụ pụrụ iche n’echiche nke na nke ahụ ga-emekwu ka a kpọọ ha na Betel. Ndị nwetaworo ọzụzụ pụrụ iche, ikekwe tupu ha anata eziokwu, pụrụ idepụta iru eru ha ma gbakwụnye ya na fọm ndejupụta ha maka ozi Betel.
14 Ọ bụrụ na i tinye akwụkwọ ma a kpọghị gị ije ozi na Betel, adala mbà. Ị pụrụ iche echiche ịdị na-etinye akwụkwọ otu ugboro kwa afọ. Ụfọdụ ụmụnna ewepụtawo onwe ha ije ozi afọ ofufo ruo nwa oge. Ha pụrụ itinye akwụkwọ maka ije ozi nwa oge na Betel site n’otu ọnwa ruo ọnwa atọ.
15 Isoro ụmụnna Kraịst na-ejere Jehova ozi n’ụzọ chiri anya bụ ihe ùgwù pụrụ iche nye ndị na-arụ ọrụ na Betel. Òtù Na-achị Isi nwere ekele maka mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà nke ndị nile wepụtara onwe ha ije ozi iji gboo mkpa nke òtù ụmụnna anyị zuru ụwa ọnụ ozi.—Fil. 2:20-22; 2 Tim. 4:11.
16 Ndị Na-eto Eto—Kwadebenụ Onwe Unu Ugbu A Maka Ozi Betel: Ime nkwadebe maka ozi Betel na-amalite ogologo oge tupu mmadụ eruo afọ ole kasị ala a chọrọ nke bụ́ afọ 19. Gịnị ka ndị na-eto eto nwere ike ime iji kwadebe onwe ha maka ozi Betel? Jizọs sịrị: “Ònye n’ime unu bụ́ onye chọrọ iwu ụlọ elu, nke na-adịghị ebu ụzọ nọdụ ala gbakọọ ihe ọ ga-efu?” (Luk 14:28) Ebe ọ bụ na ime nkwadebe na ime atụmatụ dị oké mkpa iji nwee ihe ịga nke ọma n’ọrụ ihe owuwu ọ bụla, lee otú o si dị mkpa ka ndị ntorobịa leba anya nke ọma n’otú ha si eme atụmatụ maka ọdịnihu ha n’ozi Jehova! A ghaghị ịtọ ntọala siri ike n’oge ná ndụ ka ha nwee ike iru ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ. Dị ka onye ntorobịa, olee otú ntọala ị na-atọ siruru ike? Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ije ozi na Betel, ọ ga-abara gị uru iji nlezianya tụlee ihe ndị na-esonụ.
17 “Mee Ohere” Maka Ihe Ùgwù Ije Ozi A Pụrụ Iche: Anyị na-agba ụmụnna anyị ndị nwoke ka na-eto eto ume iji ume ha na-achụso ozi oge nile n’oge ha na-enwebeghị ibu ọrụ ezinụlọ. Mgbe ahụ, ọ bụrụ na mgbe oge ụfọdụ gafeworo ha ekpebie ịlụ nwunye, ha ga-abụ ndị di ka mma n’ihi na ha enwetawo ahụmahụ dị ukwuu ná ndụ nakwa n’ozi Ndị Kraịst. Mgbe ha jeworo ozi na Betel ruo ọtụtụ afọ, ụfọdụ alụwo nwunye ma nwee ike ịnọgide na-eje ozi n’ebe ahụ dị ka di na nwunye. Ọ bụrụ na ha emesịa nweta ihe ùgwù ndị ọzọ, dị ka ọsụ ụzọ pụrụ iche ma ọ bụ ọrụ njegharị, n’ezie, ha adịghị akwa ụta n’oge ha wepụtara iji mee ohere maka ozi Betel.
18 Ekwela Ka Nchụso nke Ihe Onwunwe Dọpụ Uche Gị: Ọ ga-adị mma ka onye ọ bụla na-eto eto jụọ onwe ya, sị: ‘Ihe mgbaru ọsọ m mgbe m gụsịrị akwụkwọ ọ̀ bụ ịrụ ọrụ ego n’ụzọ zuru ezu ka ọ bụ ijere Jehova ozi oge nile?’ N’eziokwu, ijere Jehova ozi oge nile ga-achọ ịchụ ihe ụfọdụ n’àjà. Ma otú ahụ ka ọ dịkwa ịchụso ọrụ ego! N’ikpeazụ, olee ụzọ nke ga-arụpụta ihe na-adịte aka na ihe bara uru n’ezie? Jizọs nyere azịza doro anya. (Mat. 6:19-21) Ka obi anyị ghara iduga anyị n’ịchụso ọrụ ụwa ma ọ bụ ihe onwunwe kama iji mkpụrụ obi anyị dum na-ejere Jehova ozi.
19 Ndị Na-eje Ozi na Betel Aghaghị Ịbụ Ndị Dị Ọcha n’Omume: Ọbụ abụ ahụ jụrụ, sị: “Gịnị ka okorobịa ga-eji mee ka ụzọ ya dị ọcha?” Ọ zara, sị: “Ọ bụ n’ilezi ya anya dị ka okwu [Jehova] si dị.” (Ọma 119:9) Nke ahụ ga-agụnye izere ihe ọ bụla metụtara omume rụrụ arụ nke usoro ihe Setan. Ihe na-akpali agụụ mmekọahụ ndị dị n’Intanet, iso onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị na-akpa àgwà na-ezighị ezi, egwú na-emerụ emerụ, ntụrụndụ rụrụ arụ, na ndị na-etorubeghị ogo mmadụ ịṅụ mmanya na-aba n’anya bụ nanị ụfọdụ n’ime ọnyà ndị Setan na-eji egbochi ndị ntorobịa anyị iru ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ. Mkpebi siri ike dị mkpa iji gbanahụ ụzọ ndị a. Dị ka onye na-eto eto, ọ bụrụ na ị chọpụta na ị na-etinye aka na nke ọ bụla n’ihe ndị a, soro ndị okenye nọ n’ọgbakọ gị kwurịta ya ma dozie ọnọdụ ndị a tupu ị na-etinye akwụkwọ maka ozi Betel. Inwe akọ na uche dị ọcha dị oké mkpa iji na-ejere Jehova ozi n’ụzọ zuru ezu.—1 Tim. 1:5.
20 Mụta Otú Gị na Ndị Ọzọ Ga-esi Na-adị n’Udo: Otu ihe dị mkpa a chọrọ iji nwee ihe ịga nke ọma n’ozi Betel bụ́ ịmụta iso ndị ọzọ na-ebi n’udo. Ihe mejupụtara Betel bụ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị si n’ọnọdụ nile nke ndụ. Ọ bụ ezie na ụdị mmadụ a dịgasị iche iche na-atụnye ụtụ n’ịma mma nke Betel, mgbe ụfọdụ, ọ pụkwara iweta ihe isi ike. Ọ bụrụ na ị na-eche echiche maka ozi Betel, ọ ga-adị mma ka ị jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-ewe iwe ngwa ngwa ma ọ bụrụ na ndị ọzọ ekwetaghị n’echiche m? Ọ̀ na-adịrị ndị ọzọ mfe iso m na-emekọ ihe?’ Ọ bụrụ na ọ dị mkpa ka i meziwanye ihe n’akụkụ ndị a, malite ime ihe maka ha ugbu a. Ime otú ahụ ga-enyere gị aka ịgbanwe ngwa ngwa iji nwee ike iso ndị òtù ezinụlọ Betel na-ebi ma na-arụkọ ọrụ.
21 Ndị Nne na Nna, Zụọnụ Ụmụ Unu: Gịnị ka ndị nne na nna pụrụ ime iji gbaa ụmụ ha ume ịchụso ozi oge nile? Jizọs sịrị: “Onye ọ bụla a kụziiri ihe n’ụzọ zuru okè ga-adị ka onye nkụzi ya.” (Luk 6:40) Nwa akwụkwọ a kụziiri ihe nke ọma aghaghị igosipụta àgwà ọma nke onye nkụzi ya dị uchu. Ndị Kraịst bụ́ nne na nna kwesịrị iburu ụkpụrụ a n’uche ka ha na-agbalịsi ike iji ‘nsọpụrụ Chineke na-azụ ụmụ ha dị ka nzube ha.’ (1 Tim. 4:7) Ebe ọ bụ na ụmụaka na-eṅomikarị àgwà ndị mụrụ ha n’ihe banyere ihe ime mmụọ, ọ ga-adị mma ka ndị nne na nna jụọ onwe ha, sị: ‘Ànyị ji ọrụ a na-arụ na Betel iji na-akwalite ihe ndị metụtara ezi ofufe Jehova kpọrọ ihe n’onwe anyị? Ànyị na-ahụ ngọzi Jehova ná ndokwa nke ozi Betel? Ànyị kwetara na iji ndụ ha jeere Jehova ozi bụ nhọrọ kasị mma ụmụ anyị pụrụ ime n’ihe banyere ọrụ ha ga-arụ?’ Ekele si anyị onwe anyị n’obi banyere ozi Betel na ọrụ a na-arụ n’ebe ahụ ga-enyere anyị aka ịkụbanye ekele dị otú ahụ n’ime ụmụ anyị.
22 Elkana na Hana nwere ekele miri emi maka ezi ofufe. (Ọpụ. 23:17; 1 Sam. 1:3, 4, 9, 19; 2:19) Hana nwere ụdị mmasị ahụ di ya nwere maka ezi ofufe. Ọ maara nke ọma ibu ọrụ o nwere ikere òkè n’ịkwado ezi ofufe nke a na-efe n’ụlọikwuu ahụ. Hana kwere nkwa na ọ bụrụ na Jehova enye ya nwa nwoke, na ya ga-enye ya ka o jee ozi n’ụlọikwuu ahụ. (1 Sam. 1:11) Iwu Mozis nyere di ikike ịkagbu nkwa na-ezighị ezi nwunye ya kwere. (Ọnụ Ọgụ. 30:6-8) Otú ọ dị, o doro anya na Elkana kwadoro nkwa Hana kwere, na-egosi na ya onwe ya kwa kwadoro ihe nnọchiteanya ahụ nke ezi ofufe!—1 Sam. 1:22, 23.
23 Ekele na àgwà ọma ndị mụrụ ya gosipụtara ò nwere mmetụta dị mma n’ahụ́ nwa ha nwoke bụ́ Samuel? Ee, o nwere. Mgbe ọ bụ obere nwa, site n’obi ya Samuel ji ikwesị ntụkwasị obi na-arụ ọrụ ndị e kenyere ya, e nyekwara ya ọzụzụ maka ihe ùgwù ndị ọzọ magburu onwe ha n’ozi Chineke. Mmasị Elkana na Hana gosiri n’ozi Samuel na-eje n’ụlọikwuu ahụ akwụsịghị mgbe ọ malitere ịrụ ọrụ n’ebe ahụ. Ha nọgidere na-aga eleta ya mgbe nile iji nye ya agbamume na iji kwadoo ya ka ọ na-eje ozi oge nile.—1 Sam. 2:18, 19.
24 Lee ihe nlereanya magburu onwe ya Elkana na Hana setịpụụrụ ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst taa! Mgbe ụmụ anyị na-anụ okwu ekele ndị sitere anyị n’obi bụ́ ndị anyị na-ekwu maka ihe ùgwù nke ije ozi na Betel ma na-ahụ mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà nke anyị na-egosipụta n’ịkwalite ihe ndị metụtara Alaeze ahụ, ha onwe ha kwa ga-azụlite mmụọ nke ijere ndị ọzọ ozi. Ọtụtụ ndị nne na nna na-enwe ihe ịga nke ọma n’ịkụbanye ọchịchọ a dị mma n’ime ụmụ ha.
25 Ndị na-eto eto, chetanụ na “ụwa na-agabiga, otú ahụkwa ka ọ dị ọchịchọ ya, ma onye na-eme uche Chineke na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” (1 Jọn 2:17) Nọgidenụ na-achụso ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ, gụnyere ihe ùgwù pụrụ iche nke ije ozi na Betel. Ndị nne na nna, ṅomienụ ihe nlereanya nke ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’oge gara aga bụ́ ndị gbara ụmụ ha ume ịzụlite nsọpụrụ Chineke. (2 Pita 3:11) Ka anyị nile meekwa òkè nke anyị iji nyere ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị na-eto eto aka ijere Onye Okike Ukwu anyị ozi n’ụzọ zuru ezu ruo n’ókè o kwere mee, ebe nke a “nwere nkwa maka ndụ dị ugbu a na nke ahụ gaje ịbịa.”—1 Tim. 4:8; Ekli. 12:1.
Igbe dị na peeji nke 4]
Ihe Ndị Bụ́ Isi A Chọrọ Maka Ozi Betel
● Ịbụ onye e mere baptizim ma ọ dịkarịa ala otu afọ
● Onye ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe nke nwere ịhụnanya miri emi maka Jehova na nzukọ ya
● Onye nwere ezi ahụ́ ike ime mmụọ, nke uche, nke mmetụta, na nke anụ ahụ́
● Onye nwere ike ịgụ, ide, na ịsụ Bekee nke ọma
● Onye nọ n’agbata afọ 19 na 35