Iji Obi Ekele Na-elekwasị “Ụlọ Chineke” Anya
“OTU ihe ka m rịọworo n’aka Jehova, nke ahụ ka m na-achọ; ọ bụ ka m biri n’ụlọ Jehova ụbọchị nile nke ndụ m, ịhụ ịdị ụtọ Jehova, na ịjụta ihe [iji obi ekele na-elekwasị ụlọ nsọ ya anya, NW].”—Abụ Ọma 27:4.
Eze Devid nwere obi ekele ji obi ụtọ, ma ọ bụ ọṅụ, lee ụlọ nsọ Jehova anya. Ị̀ na-enwe mmetụta yiri nke ahụ banyere ebe ndị a na-anọ na-efe ezi ofufe taa? Ihe karịrị 95 ebe obibi Betel n’alaka ụlọ ọrụ ndị nke Watch Tower Society so n’ụlọ ndị e jikọrọ ha na ofufe Jehova n’oge anyị.
“Ileghachi anya azụ n’ọtụtụ afọ m nke ije ozi Betel na-eme ka m jupụta n’obi ekele dị omimi nke ukwuu, bụ́ nke rịworo elu site n’afọ ruo n’afọ,” ka Helga na-akọwa, bụ́ onye malitere ọrụ n’ebe obibi ahụ na Germany na 1948. Helga bụ otu n’ime 13,828 ndị ọrụ Betel na-enwe ọṅụ gburugburu ụwa bụ́ ndị, n’afọ ije ozi 1993, ‘hụrụ ịdị ụtọ Jehova.’ Gịnị kpọmkwem ka aha ahụ bụ Betel pụtara? Olee otú Onyeàmà Jehova ọ bụla, ma ọ̀ na-ejere Chineke ozi n’ime Betel ma ọ bụ n’èzí, pụrụ isi jiri obi ekele lee ndokwa a anya?
Aha nke Na-achọ Nsọpụrụ
“Betel” bụ aha kwesịrị nnọọ ekwesị, ebe ọ bụ na okwu Hibru ahụ bụ́ Behth-ʼElʹ pụtara “Ụlọ Chineke.” (Jenesis 28:19, ntụaka ala peji, NW) Ee, Betel yiri ụlọ a haziri nke ọma, ma ọ bụ ‘ụlọ e ji amamihe wuo,’ na-enwe Chineke na uche ya dị ka ihe ndị e lekwasịrị anya. (Ilu 24:3) “Ọ bụ dị ka ibi n’ime otu ezinụlọ. Anyị nwere usoro ime ihe kwa ụbọchị nke a haziri nke ọma,” ka Herta ji obi ekele na-ekwu. Ọ nọwo na-eje ozi n’otu Betel ahụ Helga nọ na ya ruo ihe karịrị 45 afọ. Onye ọ bụla n’ezinụlọ a buru ibu nwere ọrụ ya na ọnọdụ ya, na-enye ya ohere inwe obi ụtọ na nchebe. N’ikwekọ n’aha ahụ bụ Betel, ndokwa dị mma na nhazi ka e ji mara ngalaba nke ọ bụla. Nke a na-akwalite udo, na-eme ka nkwusa dị irè nke ozi ọma kwe omume, ma na-enye ọgbakọ nile ezi ihe mere ha ga-eji na-enye “Ụlọ Chineke” nkwanye ùgwù kasị elu.—1 Ndị Kọrint 14:33, 40.
N’ihi gịnị ka ihe owuwu ndị dị otú ahụ ji dị mkpa? Dị ka ihe atụ, e mepụtara magazin nke a n’ebe a na-ebi akwụkwọ na Betel. Nkwusa nke ozi Alaeze na nkesa nke nri ime mmụọ, ndị Jisọs Kraịst bu ụzọ hụta ha abụọ, na-eme ka ndokwa nhazi ndị dị ka Betel bụrụ ihe a na-aghaghị inwe—bụrụ nke ndị ọrụ afọ ofufo na-akwado ma bụrụ nke ndị nile na-efe Jehova ji kpọrọ oké ihe.—Matiu 24:14, 45.
Ị̀ ga-achọ ịmụtakwu ihe banyere usoro ọrụ kwa ụbọchị n’ebe a? N’ebe Helga na Herta bi, otu mgbịrịgba na-ada ụda olu ụtọ na-akụ n’ụlọ obibi nile n’elekere anya 6:30 ụtụtụ, ọ bụ ezie na ọtụtụ n’ime ihe karịrị 800 ndị ọrụ ahụ bi ebi na-ebili ọbụna n’oge karị iji kwadebe maka ụbọchị ahụ. Mgbe 7:00 ụtụtụ na-akụ, Monday ruo Saturday, ezinụlọ ahụ na-ezukọ n’ụlọ nri maka ntụle nke ihe mmụta dịịrị ụbọchị, ma ọ bụ ofufe ụtụtụ. Nri ụtụtụ na-edozi ahụ na-esochi. Ụbọchị ọrụ nke ọ bụla na-amalite na 8:00 ụtụtụ, nọgidekwa ruo hour asatọ, bụrụ nke nanị oge izu ike iri nri ehihie kwụsịtụrụ. (Ezinụlọ ahụ na-arụkarị ọrụ ọkara ụbọchị na Saturday.) Ma ọ̀ bụ na kichin, ebe obibi akwụkwọ, ebe ịsa ákwà, ọfịs, ebe ọrụ nkà dị iche iche, ebe mpịakọta akwụkwọ, ma ọ bụ ná ngalaba ọ bụla ọzọ, e nwere ọtụtu ihe ime.
N’oge uhuruchi na ná ngwụsị izu, ndị ezinụlọ ahụ na-esonyere ọgbakọ ha dị iche iche ná nzukọ na ná nkwusa ihu ọha. Ọtụtụ ụmụnna nwoke na Betel bụ ndị okenye ma ọ bụ ndị ohu na-eje ozi n’ọgbakọ ndị a. Ndịàmà nọ na ha na-enwe obi ụtọ maka nrụkọ ọrụ ọnụ nke a, ìgwè abụọ ahụ na-arụkọ ọrụ ọnụ dị ka otu ìgwè, na-akwanyerịtara ibe ha ugwu, na-aghọtarịtakwa ibe ha. (Ndị Kọlọsi 2:19) Onye ọrụ Betel nke ọ bụla maara na ọrụ ya ‘n’Ụlọ Chineke’ na-ebute ihe omume ọ bụla ọzọ ụzọ. Otú ọ dị, ịnụ ọkụ n’obi maka ime nkwusa na ịdị na-eso ọgbakọ emekọ ihe, tinyere àgwà a haziri nke ọma, na-ewusi ọnọdụ ime mmụọ nke onye ọrụ Betel ọ bụla ike, na-amụba ọṅụ ya, na-emekwa ka ọ bụrụ onye òtù ezinụlọ ahụ nke na-arụpụta ihe karị. Lee ka àgwà ndị a si dị oké mkpa mgbe a na-arụ ọrụ ‘n’ụlọ’ nke e jikọrọ aha ya na nsọpụrụ sitere n’obi dum!
Ime Ije Ozi Betel Ihe Na-aga nke Ọma
Gịnị nyewooro ọtụtụ Ndịàmà Jehova aka inwe ihe ịga nke ọma n’ije ozi Betel? Ndị òtù ezinụlọ Betel dị na France nweworo ahụmahụ ọtụtụ afọ na-ekwu ihe ndị na-esonụ: “Ịhụnanya maka Jehova. Inwe mkpebi siri ike ịtachi obi n’ebe ọ bụla o debere anyị; obi umeala, ido onwe n’okpuru, na nrubeisi nye nduzi Society na-enye anyị.” (Denise) “Ahụtawo m ụzọ o si dị mkpa ịkwanyere ụkpụrụ ahụ Pọl kpọtụrụ uche ná Ndị Rom 12:10 ùgwù: ‘N’akụkụ nsọpụrụ unu, na-acharanụ ibe unu ụzọ.’ Akụkụ akwụkwọ nsọ nke a na-egosi anyị ịdị mkpa nke ịghara ịdị na-esi ọnwụ na a ga-anakwere echiche onwe onye anyị, kama nke ahụ, ịtụle echiche ndị ọzọ. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ọ bụghị ịdị na-achọ ibute ụzọ.” (Jean-Jacques) “A pụrụ imebi nkwanye ùgwù anyị maka ije ozi Betel ma ọ bụrụ na anyị ana-ele ihe anya site n’ụzọ ile ihe anya nke anụ ahụ, nke mmadụ,” ka Barbara na-ekwu, “n’ihi na nke a pụrụ iduba anyị n’ichefu eziokwu ahụ bụ na Jehova na-eduzi nzukọ ya. A pụrụ ịtụfu nkwanye ùgwù dị otú ahụ ma ọ bụrụ na anyị asụọ ngọngọ n’ihi ezughị okè nke ndị ọzọ.”
Onye ọ bụla na Betel ezughị okè, ya mere mkpakọrịta na-achọ iji nlezianya chee echiche. Ndị na-eto eto ma ọ bụ ndị bịara ọhụrụ ga-eme nke ọma ịghara ịkpara mmekọrịta ha ókè ka ọ bụrụ nanị ha na ndị ọgbọ ha. Ndị pụrụ igosipụta mmụọ ime mkpesa ma ọ bụ iche echiche na-adịghị mma abụghị mkpakọrịta na-ewuli elu na Betel ma ọ bụ n’ime ọgbakọ. N’aka nke ọzọ, iṅomi “amamihe ahụ nke si n’elu bịa,” nke a kọwara na Jemes 3:17, na-eweta ọtụtụ ngọzi. Nke a “buru ụzọ dị ọcha, e mesịa ọ dị n’udo, nwee obi ọma, na-ekwenye okwu nke ọma, jupụta n’ebere na ezi mkpụrụ, na-enweghị obi abụọ, na-enweghị ihu abụọ.” Àgwà ndị dị otú ahụ, tinyere ogologo ntachi obi na obi ọma, na-apụta ìhè ‘n’Ụlọ Chineke,’ na-eme ka ọnụnọ mmadụ n’ebe ahụ tọọ ụtọ ma na-akpali akpali. Ọbụna ndị nleta na-abụghị Ndịàmà na-ekwukarị okwu inwe mmasị maka ezi akparamagwa, omume enyi, na mmụọ ọṅụ nke ndị ọrụ ndị ahụ.
Anny, onye karịrị 70 afọ bụrụkwa onye òtù nke ezinụlọ Betel na Germany eri 1956, na-akọwa ụzọ o si nọgide na-adị njikere ije ozi: “Maka ọdịmma ime mmụọ m, m na-etinye mgbalị dị ukwuu iji na-agụ akwụkwọ ọhụrụ nile nke Society, iji na-aga nzukọ mgbe nile, na iji na-ekere òkè mgbe nile n’ime nkwusa. M na-agbalịkwa ịnọ n’ọnọdụ ahụ ike dị mma site n’imega ahụ kwa ụtụtụ, site n’ịhapụ iji ígwè mbugo na-eme ihe ọtụtụ oge, na site n’ịdị na-aga ije ọtụtụ mgbe dị ka m nwere ike, karịsịa n’ije ozi ubi.”
Ọtụtụ ndị nweworo ahụmahụ ná ndụ Betel ga-ekwenyere Anny. Ha adịghị akwụsị ịmụ ihe, ha adịghị akwụsị ịrụ ọrụ. Ahụ ike anụ ahụ na-achọ ka ha hie ụra nke ọma, nweekwa mmega ahụ ụfọdụ ma na-egosi imeru ihe n’ókè n’iri nri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ. Nke kasị ha nile mkpa, ha adịghị eleghara ekpere na ọmụmụ Bible onwe onye anya.
Nkwanye Ùgwù Dị Elu Maka Ije Ozi Dị Nsọ na Betel
“Olee ebe ị na-arụ?” bụ ajụjụ a na-ajụkarị ndị ezinụlọ Betel. Ọrụ a na-arụ dịgasị iche iche, ma nke ọ bụla kwesịrị ka onye ọ bụla were ya n’ihe dị elu. N’ihi gịnị? N’ihi na ọrụ nke ọ bụla—ma ọ̀ bụ iji ígwè ọrụ nke na-ebi nri ime mmụọ eme ihe, ịsa ákwà, isi nri na ime nhicha maka ezinụlọ ahụ, ma ọ bụ ịrụ ọrụ ọfịs—mejupụtara ije ozi dị nsọ. Dị ka e kwuru n’elu, ndị Kraịst adịghị akpa ókè ọ bụla nke ile mmadụ anya n’ihu. Buru n’uche na ọrụ nile dị mkpa nke ndị nchụàjà na ndị Livaị rụrụ n’ụlọ nsọ, n’ogige ebe obibi ya, na n’ụlọ iri nri ya nile, e lere ha nile anya dị ka ije ozi dị nsọ nye Jehova. Nke ahụ gụnyere igbu na ịkwadebe anụmanụ maka ịchụ àjà, ịgbajughachi oriọna mmanụ ọkụ, ọbụna ihichasị ihe na ịrụ ọrụ ndị nche. N’otu aka ahụ, ọrụ nke ọ bụla na Betel bụ ihe omume na-enye afọ ojuju na nke bara uru ‘n’ọrụ Onyenwe anyị,’ ya mere bụrụ ihe ùgwù pụrụ iche.—1 Ndị Kọrint 15:58.
Tụlee ná mkpirikpi otu àgwà nke pụrụ igbochi anyị iji obi ekele na-elekwasị “Ụlọ Chineke” anya. Ndị Kraịst ma na Betel ma n’èzí nwere mkpa ịnọ ná nche megide ekworo, ndị bụ “ire ure nke ọkpụkpụ nile.” (Ilu 14:30) Ọ dịghị onye nwere ihe mere ọ ga-eji na-ekwo ekworo maka ihe ùgwù ije ozi nke ndị ọrụ Betel. Ọzọkwa, e nweghị ohere ọ bụla n’ime ezinụlọ Betel maka ekworo, nke bụ́ otu n’ime ọrụ nile nke anụ ahụ. Jiri obi umeala chere—nke ahụ bụ ndụmọdụ dị mma maka onye ọ pụrụ iyi ya ka e legharawo ya anya ebe a na-enye ndị ọzọ ihe ùgwù ije ozi ndị ka elu. Ọzọkwa, ndị nwere ọdịiche ndị dị ukwuu n’ọnọdụ akụ̀ na ụba bikọrọ nnọọ ọnụ na Betel. Lee ka o si na-eweta nkoropụ obi ma ọ bụrụ na mmadụ ana-ele ọnọdụ ya anya dabere “n’ebe ibe ya nọ”! Inwe afọ ojuju ‘n’ihe oriri na ihe igbokwasị n’ahụ’ enyeworo ọtụtụ ndị aka ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi ruo ọtụtụ iri afọ ‘n’Ụlọ Chineke.’—Ndị Galetia 5:20, 26; 6:4; 1 Timoti 6:8.
Ndịàmà Jehova na ọtụtụ nde ndị ọzọ na-erite oké uru site n’ije ozi ndị a na-adịghị akwụ ụgwọ a na-eje na Betel—ọrụ a na-arụ n’achọghị ọdịmma onwe onye site n’ịhụnanya maka Chineke na ndị agbata obi. A na-eji onyinye afọ ofufo na-enye ego maka ebe obibi Betel na ebe obibi akwụkwọ nile nke Watch Tower Society, dị ka ihe owuwu ndị ọzọ nke ọchịchị Chineke. (2 Ndị Kọrint 9:7) Dị ka Eze Devid na ndị isi nile nke Israel, anyị pụrụ igosipụta nkwanye ùgwù anyị na obi ekele maka “Ụlọ Chineke” site n’inye Society nkwado agbamume na nke ego. (1 Ihe Emere 29:3-7) Ka anyị lee ugbu a ụzọ o si kwe omume “ịhụ ịdị ụtọ Jehova” na Betel.
Ngọzi Nile ‘n’Ụlọ Chineke’
Mgbe ị na-aga mgbakọ, ị̀ na-enwe afọ ojuju dị omimi, na-abụ onye ndị ji obi ụtọ na-efe Jehova gbara gburugburu? Cheedị nnọọ echiche, onye ọrụ Betel nwere ihe ùgwù nke ijere Jehova ozi n’etiti ìgwè ụmụnna kwa ụbọchị! (Abụ Ọma 26:12) Lee ohere ndị magburu onwe ha maka uto ime mmụọ nke ahụ na-enye! Otu nwanna kwuru na ya mụtakwuru ihe ga-enyere ya aka ịkpụzi ụdị mmadụ ya n’ime otu afọ na Betel karịa ka ọ mụtara n’afọ atọ n’ebe ọzọ. N’ihi gịnị? N’ihi na e nweghị ebe ọzọ o nwere ohere ịhụ na iṅomi okwukwe nke ọtụtụ ọdịdị ndị Kraịst bụ́ ndị tozuru okè.—Ilu 13:20.
Na Betel ndị ndụmọdụ nwere ahụmahụ gbara nnọọ mmadụ gburugburu dị ka a pụrụ ikwu ya. Ọzọkwa, e nwere abamuru nke ịnụ okwu ndị a kwadebere nke ọma n’oge ofufe ụtụtụ na n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche nke ezinụlọ Betel na mgbe a na-ege ntị n’okwu ndị a na-ekwu n’uhuruchi Monday. Ndị bịara ọhụrụ na-enweta ntụziaka n’Ụlọ Akwụkwọ Betel Maka Ndị Ọhụrụ, a na-enyekwa ha ọrụ ịgụzu Bible dum n’ime ọnwa 12 mbụ.
Akụkọ na ahụmahụ dị iche iche site n’ọnụ ndị nleta sitere ná mba ndị ọzọ na-enyekwu agbamume. Ọzọkwa, ndị nọ n’Òtù Na-achị Isi ma ọ bụ ndị nnọchiteanya ha na-eleta alaka ụlọ ọrụ dị iche iche. “Ọ bụ ezie na ha nwere ọtụtụ ihe ime,” ka Helga na-atụgharị n’uche, “ụmụnna ahụ na-achọtakarị oge maka okwu ịbụenyi ma ọ bụ ịmụmụ ọnụ ọchị.” Lee ka o si bụrụ ihe na-agba ume ịhụ n’onwe gị àgwà na-enye ume ndụ na nke imeru ihe n’ókè nke ndị ikom dị otú a na-eguzosi ike n’ihe!
Na Betel karịsịa ka mmadụ pụrụ ịhụta nke ọma ụzọ nzukọ Chineke si na-arụ ọrụ na ụzọ mmụọ nsọ ya si na-akpali obi na aka ndị wepụtara onwe ha ịrụ ọrụ. “Na Betel mmadụ na-enwe mmetụta nke ịnọ nso karị ‘n’etiti ebe isi ọrụ ahụ,’” ka otu nwanna nwoke na-akọwa, bụ́ onye nọworo na-eje ozi na Betel dị na France eri 1949. Ọ gara n’ihu ikwu: “Apụrụ m ikwu n’eziokwu na nye m Betel bụ ụdị ije ozi oge nile nke na-enye m ohere itinye ọ̀tụ̀tụ̀ oge na ume kasị elu n’ije ozi Jehova na ijere ọnụ ọgụgụ kasịnụ nke ụmụnna ozi.” Nke ahụ ọ̀ bụghịkwa nzube anyị bụ ezie nke ndụ—ime uche Chineke? Na Betel mmadụ pụrụ “inye ngọzi ogologo ụbọchị dum.” Lee aha ngọzi ọ bụ!—Abụ Ọma 44:8, NW.
Dị ka anyị chọpụtaworo, onye na-arụ ọrụ n’ebe obibi Betel pụrụ ịhụ ịdị ụtọ Jehova ma chọta ụdị dị iche iche nke ngọzi. (Ndị Hibru 6:10) Ije ozi ‘n’Ụlọ Chineke’ ọ̀ pụrụ ịbụ ihe bara uru nye gị? Ndị so ná Ndịàmà Jehova bụ́ ndị gbaworo ma ọ dịkarịa ala afọ 19, bụ́ ndị nwere ọnọdụ ime mmụọ dị mma na ezi ahụ ike, bụ́ ndị, dị ka Timoti, ‘ụmụnna na-agbara ezi àmà’ pụrụ itinye akwụkwọ ije ozi na Betel. (Ọrụ 16:2) Ọtụtụ emewo ije ozi Betel ọrụ ha ga-arụ ná ndụ, dị ka ndị e hotara n’elu. Nye ha ọchịchọ dị omimi nke onye ọbụ abụ ahụ—‘ibi n’ụlọ Jehova ụbọchị nile nke ndụ ya’—abụrụwo eziokwu.
Ndịàmà Jehova nwere nkwanye ùgwù dị ukwuu maka mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà nke ụmụnna nwoke na nwanyị ha na-egosipụta na Betel, bụ́ ndị na-arụ ọrụ ma site n’ọchịchọ obi ha ma n’ọṅụ. Ma ànyị na-ejere Jehova ozi na Betel ma ọ bụ n’ebe ọzọ, onye ọ bụla n’ime anyị nwere ezi ihe mere ọ ga-eji nwee mmetụta dị ka Eze Devid nwere—iji obi ekele, ma ọ bụ obi ụtọ, na-elekwasị “Ụlọ Chineke” anya.
[Foto dị na peeji nke 31]
Ndị Kraịst ndị a enwewo obi ụtọ n’ije ozi dị nsọ na Betel dị na Germany ruo ọtụtụ iri afọ