Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb19 Ọgọst p. 8
  • Ọrụ Ọma Ndị A Na-agaghị Echefu Echefu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọrụ Ọma Ndị A Na-agaghị Echefu Echefu
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2019
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nke A Ọ̀ Pụrụ Ịbụ Ụzọ Ndụ Kasị Mma Nye Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ị̀ Pụrụ Iwepụta Onwe Gị?
    Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Iji Obi Ekele Na-elekwasị “Ụlọ Chineke” Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Òkù A Na-akpọ Mmadụ Niile!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2019
mwb19 Ọgọst p. 8
Ebe otu nwanna nwaanyị na-arụ n’ebe a na-esi nri na Betel

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ọrụ Ọma Ndị A Na-agaghị Echefu Echefu

Onye ọ bụla bụ́ onye Jehova nwere ike ịrụ ọtụtụ ọrụ ọma a na-agaghị echefu echefu n’ozi Chineke. Nna ọ bụla ụmụ ya na-eme nke ọma ga na-enwe obi ụtọ, ọ ga-ahụkwa ha n’anya. Otú ahụ ka Jehova dị. Ọ naghị echefu ọrụ ọma anyị na-arụrụ ya na ịhụnanya anyị na-egosi maka aha ya. (Mat. 6:20; Hib. 6:10) Nke bụ́ eziokwu bụ na ọnọdụ anyị dị iche iche, ike anyị ahaghịkwa otu. Ma, anyị mee ike anyị niile n’ozi Jehova, obi ga-adị anyị ụtọ. (Gal. 6:4; Kọl. 3:23) Kemgbe ọtụtụ afọ, ọtụtụ puku ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị ejeela ozi na Betel. Ị̀ ga-ewepụtali onwe gị ije ozi na Betel? Ọ bụrụ na ọ gaghị ekweli gị omume, ì nwere ike ịgba onye ọzọ ume ka o mee otú ahụ, ma ọ bụkwanụ gị enyere onye na-eje ozi na Betel aka ka ọ nọgide na-eje ozi a pụrụ iche?

LEENỤ VIDIO BỤ́ IHE NDỊ Ị GA-EME KA I NWEE IKE IRU ERU ỊNA-EJE OZI NA BETEL, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee ihe mmadụ kwesịrị ibu n’obi chọọ ije ozi na Betel?

  • Olee ngọzi ndị ụfọdụ kwuru na ha nwetara mgbe ha na-eje ozi na Betel?

  • Olee ihe a chọrọ n’aka mmadụ iji ruo eru ije ozi na Betel?

  • Olee otú ị ga-esi mee ka a mata na ị chọrọ ije ozi na Betel?

Ebe ụmụnna atọ na-arụ na Betel ji Kọmputa na-arụ ọrụ; ebe otu nwanna nwoke na-etinye akwụkwọ na katọn; ebe otu nwanna na-apụcha osisi na Betel

Ihe ndị ga-eme ka mmadụ ruo eru ije ozi na Betel

  • Inwe ezigbo ịhụnanya maka Jehova na nzukọ ya

  • Ịna-akpa àgwà ọma na inwe akọnuche dị ọcha n’anya Jehova

  • Ịna-eji ejiji kwesịịrị Onye Kraịst

  • Ịna-eji ihe e ji atụrụ ndụ kwesịịrị Onye Kraịst na-atụrụ ndụ

  • Onye ahụ ga-anọ n’agbata afọ iri na itoolu na iri atọ na ise

  • Ọ ga-enwe ezigbo ahụ́ ike, isi akpakọọkwa ya ọnụ

  • Ọ ga na-agụ, na-ede ma na-asụ asụsụ bụ́ isi a na-asụ n’alaka ụlọ ọrụ ha nke ọma

  • Ọ ga-enwekwa mmasị ije ozi na Betel ọ dịkarịa ala otu afọ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya