“Ịkụ Azụ” ná Mmiri Nile nke Fiji
FIJI—aha ahụ na-akpalite n’echiche onyinyo nke paradaịs Oké Osimiri Ebe Ndịda nile. Mmiri ndị na-acha anụnụ anụnụ na akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ, mmiri ndị jupụtara ná nkume, osisi akụ bekee na-anyagharị anyagharị, ugwu ndị jupụtara n’ihe ọkụkụ, azụ ala okpomọkụ, mkpụrụ osisi na okooko osisi ndị magburu onwe ha. Ị pụrụ ịchọta ihe a nile n’ụba n’ìgwè agwaetiti nke 300 agwaetiti ihe dị ka 1,800 kilomita n’ebe ugwu nke New Zealand n’osimiri Ebe Ndịda Pacific. N’ihi ya, ị pụrụ ikweta na Fiji pụrụ ịbụ ihe onye ọ bụla na-arọ nrọ ya dị ka paradaịs ebe okpomọkụ.
Otú ọ dị, Fiji na-adọrọ mmasị n’ihe karịrị ịma mma ya sitere n’okike. Ee, dị nnọọ ka e nwere oké ụdị dị iche iche n’etiti azụ ndị e nwere ná mmiri ndị ahụ jupụtara ná nkume, a na-ahụkwa oké ụdị dị iche iche n’elu ala. Ndịrịta iche ndị dị ná ngwakọta agbụrụ ndị e nwere na Fiji bụ, ma eleghị anya, nke na-enweghị atụ n’agwaetiti Ebe Ndịda Pacific. Ìgwè abụọ kasị ibu n’etiti ihe chọrọ iru 750,000 ndị bi na ya bụ ụmụ amaala Fiji, bụ́ ndị sitere Melanesia, na ndị India a mụrụ na Fiji, ụmụ ndị ọrụ e si India kpọbata n’oge ọchịchị ndị Britain. Ma e nwekwara ndị Banaba, ndị China, ndị Europe, ndị Gilbert, ndị Rotuma, ndị Tuvalu, na ndị ọzọ.
N’ọha mmadụ nke a nke ọtụtụ ọdịnala, Ndịàmà Jehova ji ọrụ n’aka n’ọrụ “ịkụ azụ.” (Mak 1:17) Ọ bụ ihe ịma aka ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke n’ógbè nwegasịrị ọdịiche otú a. Nke mbụ, e nwere ihe mgbochi ndị nke asụsụ na ọdịnala a ga-emeri. Ọ bụ ezie na Bekee bụ asụsụ e ji eme ihe n’ọha, ọtụtụ mgbe a ghaghị iji asụsụ Fijian, Hindi, Rotuman, ma ọ bụ ndị ọzọ mee ihe.
A ghaghịkwa ịgbasọ ụzọ di iche iche iji soro ndị nwere nzụlite okpukpe dịgasị iche kwurịta okwu mee ihe. Ọtụtụ ụmụ amaala Fiji na ndị bi n’agwaetiti ndị ọzọ nọ n’òtù okpukpe ndị Kraịst dịgasị iche iche. Ihe mejupụtara ụba mmadụ nke ndị India bụ ndị Hindu, ndị Alakụba, na ndị Sikh, ebe ndị Hindu kasị n’ọnụ ọgụgụ. Chọọchị juru eju n’obodo ukwu na n’ime obodo dị iche iche, ma n’agwaetiti abụọ kasịnụ nke Fiji, ọtụtụ ụlọ nsọ ndị Hindu na ụlọ okpukpe ndị Alakụba na-eme ka e nwee ndịrịta iche.
Ọtụtụ Ndịàmà bi n’ebe ahụ etolitewo na-asụ asụsụ atọ ndị bụ isi—Bekee, Fijian, na Hindi. Inwe nkà nke a bụ oké ihe abamuru n’ọrụ “ịkụ azụ” ahụ. Mgbe ụfọdụ ọ na-eju ndị mmadụ anya ịnụ ka onye Fiji na-asụ Hindi werewere na onye Hindu ka ọ na-asụ Fijian werewere. N’inwe ndịrịta iche ọdịnala, okpukpe, na asụsụ ịnagide, ọ na-achọ ụzọ dịgasị iche iche isi jekwuru mmadụ iji bụrụ “onye na-enwekọ [ozi ọma ahụ].”—1 Ndị Kọrint 9:23.
“Ịkụ Azụ” n’Otu Ime Obodo Fiji
Ụmụ amaala Fiji bụ ndị nwere omume enyi, na-ele ọbịa nke ọma. O siri ike ikweta na n’ihe ji nke nta gafee otu narị afọ gara aga, agha agbụrụ nọ na-aga n’ihu. N’ezie, n’oge mbụ ha na ndị Europe zutere, a maara Fiji dị ka Agwaetiti Ndị Na-eri Mmadụ. E mesịa, site ná nrịgota nke otu oké chiifu na ntọghata ya ịbụ onye Kraịst, ịlụ ọgụ na iri anụ mmadụ nyụrụ ka ọkụ. Ndịrịta iche agbụrụ nọgidere nanị n’ọtụtụ olu asụsụ ndị a na-achọta ná mpaghara dị iche iche, ọ bụ ezie na a na-aghọta olu Bauan n’ọtụtụ ebe.
Tinyere Suva, bụ́ isi obodo, e nwere ọtụtụ obodo ukwu gburugburu Fiji. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị Fiji bi n’ógbè ndị dị n’ime obodo n’okpuru nchịkwa nke otu turaga ni koro, ma ọ bụ onye isi. Mgbe a na-abanye otu ime obodo “ịkụ azụ,” ọ bụ omenala ijekwuru nwoke a iji nata ikike ileta bure, ma ọ bụ ụlọ ndị obodo ahụ. Nanị mgbe ụfọdụ, nke na-abụkarị n’ihi mmegide ndị ụkọchukwu n’ime obodo ụfọdụ na-emegide Ndịàmà Jehova, ka a na-ajụ inye ikike. Gịnị ka ọ dị ka ya ịga n’ụlọ ndị Fiji?
N’ịbanye na bure ahụ, anyị na-anọdụ n’ala ụlọ gbakọọ ụkwụ. Okwu mmeghe e kwuziri nke ọma, dị ka nke a na-eji adọta mmasị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa, adịghị mkpa n’ebe a. A na-anabata onye ọ bụla bịara ikwu banyere Chineke. Mgbe a gwara ya, onye nwe ụlọ na-ebili ọtọ ozugbo ma, site n’ikwu “tulou” (ka m bịakwa), gbatịa aka gaa n’otu ebe ndebe akwụkwọ maka Bible n’asụsụ Fijian ma jiri ịnụ ọkụ n’obi gụọ akụkụ akwụkwọ nsọ dị iche iche onye ozi ahụ bịara nleta kpọtụrụ aha. Otú ọ dị, àgwà ile ọbịa na ịkwanye ùgwù nke ndị Fiji na-egosipụta na-eweta ihe ịma aka n’ụzọ dị iche. Nghọta na akọ dị ukwuu dị mkpa iji webata ndị nwe ụlọ ná nkwurịta okwu ahụ, iji gbaa ha ume isonye n’usoro echiche a na-agbaso, ma ọ bụ iji nyere ha aka ịhụ mkpa nke iji nkwenkwe ndị nke ha tụnyere nkụzi dị iche iche nke Bible.
Ndị Fiji nwe ụlọ na-enwekarị mmasị n’isiokwu ndị metụtara ozizi karịa n’ikwu banyere ọnọdụ ma ọ bụ isiokwu dị iche iche nke ọha mmadụ. N’ezie, ihe ka n’ihe karịrị 1,400 Ndịàmà Jehova na-arụsi ọrụ ike na Fiji malitere inwe mmasị n’eziokwu Bible dị ka ihe sitere ná ntụle nke ajụjụ ndị dị ka, Ụdị ebe dị aṅaa ka hell bụ? Olè ndị na-aga eluigwe? na À ga-ebibi ụwa? Otú ọ dị, isochi mmasị e gosipụtara na-achọ ịdị na-eme mgbanwe na ịtachi obi. N’ịlọghachite n’oge e kwekọrịtara, mmadụ na-achọpụtakarị na onye nwe ụlọ agaala teitei (ugbo) ma ọ bụ ebe ọ bụla ọzọ. Ee e, ọ bụghị na ha enweghị ekele maka nleta ahụ kama nanị na echiche ha banyere oge dị iche. Otú ọ dị, nye Ndịàmà bi n’obodo ahụ, nke a eyighị ihe ọhụrụ. Ha na-atachi obi site n’ime nleta n’oge ọzọ. E nweghị aha okporo ámá ma ọ bụ nọmba ụlọ ndị a ga-edetu, ya mere ike ncheta dị mma dị mmadụ mkpa mgbe a na-alaghachi ọzọ.
“Ịkụ Azụ” Ụzọ nke Ndị Polynesia
Ugbu a, ka anyị soro onye ozi na-agagharị agagharị, ma ọ bụ onye nlekọta sekit, gaa “ịkụ azụ” ka ọ na-eleta ọgbakọ nta dị na Rotuma. Ìgwè nke a nke agwaetiti ndị dị n’ugwu na-agbawa agbawa dị 500 kilomita n’ebe ugwu nke Fiji. Iji ruo ya, anyị ji ụgbọ elu na-ebu mmadụ 19 fega. Agwaetiti bụ isi dị nanị 50 square kilomita ná mbara, na-enwe ngụkọta ụba mmadụ nke ihe dị ka 3,000. Ụzọ uzuzu gabigara ụsọ osimiri ya, na-ejikọta ihe dị ka 20 obodo nta. Fiji na-achị Rotuma ma o nwere ọdịnala na asụsụ dị iche. Ebe o sitere na Polynesia, ndị ya dị iche n’ọdịdị site ná ndị Fiji si Melanesia. N’ụzọ okpukpe, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ bụ ndị Roman Katọlik ma ọ bụ ndị Metọdist.
Ka ụgbọ elu ahụ na-efedata ma nyagharịa iji ruo ala, anyị na-ahụ ihe ọkụkụ ndị na-acha nnọọ akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ nke agwaetiti ahụ. A pụrụ ịhụ igu akụ bekee ndị dị ka abụba n’ebe nile. Ìgwè mmadụ buru ibu nọ ya ịnabata ụgbọ elu ahụ na-abịa otu ugbo n’izu. N’etiti ha e nwere otu ìgwè Ndịàmà. E kelere anyị n’ụzọ na-ekpo ọkụ, e nyekwara anyị ọtụtụ nnukwute akụ bekee ndị na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ a ghụpuru “anya” ha iji dajụọ akpịrị ịkpọ nkụ anyị.
Mgbe njem dị mkpirikpi gasịrị, anyị rutere n’ebe e nyere anyị ụlọ. A kwadebewo nri e siri n’ite ọkụ dị n’al. A gbasara n’ihu anyị anụ ezi a mịrị amị, anụ ọkụkọ, azụ e ghere eghe, ịsha, na ihe ọkụkụ na-eru n’ime ala nke obodo ahụ, bụ́ taro. Lee aha oriri ọ bụ, leekwa ka o si bụrụ ọnọdụ paradaịs n’okpuru osisi akụ bekee nta ndị ahụ!
N’ụbọchị na-eso ya anyị letara ndị bi n’ime obodo ndị ahụ, ndị a na-akpọ ho’aga n’asụsụ Rotuman. Ka anyị na-erute n’ụlọ nke mbụ, nwa ezi nke siworo n’ụlọ ha gbapụ gbafere, na-ebe ụrịa ka ọ na-agafe. Onye nwe ụlọ ahụwo anyị ka anyị na-abịa wee mepee ụzọ na-amụmụ ọnụ ọchị, na-eji “Noya!” na-ekele anyị na Rotuman, wee kpọbata anyị ka anyị nọdụ ala. E debere n’ihu anyị otu efere unere chara acha, a kpọkwara anyị ịṅụrụ mmiri akụ bekee ụfọdụ na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ. Ile ọbịa na-ebute ụzọ na Rotuma.
E nweghị ndị ọ bụla ọ na-edoghị anya ma Chineke ọ̀ dị ma ọ bụ ndị evolushọn n’ebe a. Onye ọ bụla kwenyere na Bible. Isiokwu ndị dị ka nzube Chineke maka ụwa na-adọrọ mmasị ha ngwa ngwa. O juru onye nwe ụlọ anya ịmụta na a gaghị ebibi ụwa kama ndị ezi omume ga-ebi n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi. (Abụ Ọma 37:29) Ọ na-esonye nke ọma mgbe a na-agụpụta amaokwu Bible nke na-anwapụta isi ihe nke a, o jikwa ịnụ ọkụ n’obi nara akwụkwọ Bible anyị nyefere. Ka anyị na-akwadebe ịpụ, o kelere anyị n’ihi ịkpọtụrụ ya ma nyefee anyị akpa plastik jupụtara n’unere chara acha nke anyị pụrụ iri n’ụzọ. Ọ ga-adịrị mmadụ mfe ibu ibu site n’ime nkwusa n’ebe a!
Ikwekọ n’Ọnọdụ Ógbè Ndị India
Ọ bụ ezie na ọtụtụ mba agwaetiti ndị ọzọ nke osimiri Ebe Ndịda Pacific bụkwa ndị ọtụtụ agbụrụ mejupụtara, Fiji pụrụ iche n’akụkụ nke a. N’akụkụ ọdịbendị ndị Melanesia, Micronesia, na ndị Polynesia, ka e nwere otu e si Esia bubata. N’agbata 1879 na 1916, e si India bubata ndị ọrụ e so mee nkwekọrịta ka ha rụọ ọrụ n’ugbo shugaken dị iche iche. Ndokwa nke a, nke a na-akpọ girmit (nkwekọrịta), kpatara ọtụtụ puku ndị India ji bịa Fiji. Ụmụ ndị ọrụ ndị a mejupụtara akụkụ buru ibu nke ụba mmadụ bi ná mba ahụ. Ha ejigidewo ọdịbendị, asụsụ, na okpukpe ha.
N’akụkụ ebe ikuku na-eche ihu nke agwaetiti bụ isi nke Fiji ka e nwere obodo Lautoka. Nke a bụ ebe bụ isi nke ụlọ ọrụ shugaken na Fiji, ọ bụkwa ebe akụkụ buru ibu nke ndị India bi ná mba ahụ bi. Ọ dị mkpa ka ndị nọ n’ọgbakọ atọ nke Ndịàmà Jehova n’ebe a na-eme nnọọ mgbanwe n’ọrụ “ịkụ azụ” ha. Mgbe a na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ, mmadụ aghaghị ịdị njikere ịgbanwegharị isiokwu na-adabere n’agbụrụ na okpukpe nke onye nwe ụlọ. Ka anyị soro otu ìgwè nke Ndịàmà bi n’ebe a ka ha na-aga n’ụlọ ndị dịsasịrị adịsasị n’etiti ugbo shugaken ndị ahụ kpọmkwem ná mpụta Lautoka.
Ka anyị na-erute n’ụlọ nke mbụ, anyị hụtara okporo achara ndị dị ogologo e kekwasịrị ákwà na-acha ọbara ọbara n’elu elu ya n’akụkụ ihu èzí ahụ. Nke a na-eme ka a mata ezinụlọ ahụ dị ka ndị Hindu. E ji foto chi ha dị iche iche chọọ ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ụlọ ndị Hindu mma. Ọtụtụ nwere chi na-amasịkarị ha, dị ka Krishna, a na-enwekarịkwa obere ọgba arụsị.a
Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị Hindu kwetara na okpukpe nile dị mma ma bụrụ ụzọ dị iche iche isi fee ofufe. Otú a, onye nwe ụlọ pụrụ iji nkwanye ùgwù gee ntị, nara akwụkwọ ụfọdụ, nye ihe ntụrụndụ, ma chee na ya emewo ihe dịịrị ya. Iji welite ajụjụ ndị kwesịrị ekwesị iji dọrọ ndị nwe ụlọ banye ná mkparịta ụka ndị bara uru karị, ọ na-enyekarị aka ịmara ụfọdụ n’akụkọ ndị bụ akụkụ nke ihe ndị ha kwere. Dị ka ihe atụ, ịmara na akụkọ ha ụfọdụ na-egosi chi ha dị iche iche ka ha na-emikpu onwe ha n’omume dị iche iche ọtụtụ ndị ga-ele anya ọjọọ, anyị pụrụ ịjụ, sị: “Ị̀ ga-akwado nwunye (di) gị ime omume dị otú ahụ?” Azịza ya na-abụkarị: “Mba, ọ dịghị ma ọlị!” Mgbe ahụ, a pụrụ ịjụ onye ahụ ajụjụ, sị: “Mgbe ahụ, onye bụ chi ò kwesịrị ịkpa àgwà otú a?” Nkwurịta okwu ndị dị otú a na-emeghekarị ohere maka igosi uru nke Bible.
Nkwenye n’ịlọ ụwa, akụkụ ọzọ nke okpukpe Hindu, bụ isiokwu na-amị mkpụrụ maka mkparịta ụka. Otu nwanyị Hindu gụrụ akwụkwọ nke ọma, onye nna ya ka nwụnahụsịrị ka a jụrụ, sị; “Ị̀ ga-achọ ịhụ nna gị ọzọ kpọmkwem dị ka ọ dị na mbụ?” Ọ zara: “Ee, nke ahụ ga-amagbu onwe ya.” Site ná nzaghachi ya na nkwurịta okwu sochiri, o doro anya na afọ ejughị ya site ná nkwenkwe nke na nna ya nọ ndụ ugbu a n’ụdị ọzọ nakwa na ọ gajeghị ịma ya ọzọ. Ma nkuzi dị ebube nke Bible banyere mbilite n’ọnwụ metụrụ obi ya.
Ndị Hindu ụfọdụ na-enwe ajụjụ ma na-achọ azịza ndị na-eju afọ. Mgbe otu Onyeàmà gara n’otu ụlọ ndị Hindu, nwoke ahụ jụrụ, sị: “Gịnị bụ aha chi gị?” Onyeàmà ahụ gụụrụ ya Abụ Ọma 83:18 ma kọwaa na aha Chineke bụ Jehova nakwa na Ndị Rom 10:13 na-asị na iji nweta nzọpụta anyị aghaghị ịkpọku aha ahụ. Ọ masịrị nwoke ahụ, ọ chọkwara ịmụtakwu ihe. N’ezie, ọ dị ya ọkụ ịmụta ihe. Ọ kọwara na nna ya, onye tinyere obi ya dum n’ikpere arụsị ezinụlọ ha, dara ọrịa mgbe o fesịrị ofufe n’ihu ya ma nwụọ n’oge na-adịghị anya nke ahụ gasịrị. Otu ihe ahụ mekwara nwanne ya nwoke. Mgbe ahụ o kwukwasịrị: “Ihe oyiyi ahụ na-ewetara anyị ọnwụ, ọ bụghị ndụ. Ya mere a ghaghị inwe ihe na-ezighị ezi banyere ife ya ofufe. Ma eleghị anya Chi nke a, Jehova, pụrụ inyere anyị aka ịchọta ụzọ nke ndụ.” Ya mere a maliteere ya, nwunye ya, na ụmụ ya abụọ, ọmụmụ Bible. Ha nwere ọganihu dị ngwa, e meekwa ha baptism n’oge na-adịghị anya. Ha ahapụwo arụsi ha nile ma na-aga ije ugbu a n’ụzọ nke Jehova, Chineke nke ndụ.
Anyị ruteziri n’ụlọ otu ezinụlọ ndị Alakụba. A hụkwara otu mmụọ ahụ nke ile ọbịa, ngwa ngwa kwa anyị nọdụrụ ala na-aṅụ ihe ọṅụṅụ jụrụ oyi dị n’aka anyị. Anyị ahụghị foto okpukpe ọ bụla n’elu ájá e wezụga otu amaokwu e dere n’asụsụ Arabic nke e wuuru ọbọ. Anyị kwuru na e nwere njikọ dị n’etiti Bible na Koran, ya bụ nna ochie ahụ bụ́ Abraham, nakwa na Chineke kwere Abraham nkwa na site ná mkpụrụ ya a ga-agọzi mba nile. A gaje imezu nkwa nke a na Jisọs Kraịst, bụ́ Ọkpara Ya. Ụfọdụ ndị Alakụba agaghị ekwenye n’echiche nke na Chineke nwere nwa. N’ihi ya, anyị kọwara na dị nnọọ ka a na-akpọ nwoke mbụ ahụ, bụ́ Adam, nwa Chineke n’ihi na ọ bụ Chineke kere ya, n’otu ụzọ ahụ, Jisọs bụ Ọkpara Chineke. Ọ dịghị Chineke mkpa inwe nwunye nkịtị iji nweta ụmụ ndị dị otú ahụ. N’ihi na ndị Alakụba ekwenyeghị ná nkụzi Atọ n’Ime Otu, anyị jiri ihe a anyị nile kwetara gosi na Jehova Chineke bụ ọkaaka.
Ugbu a oge nri ehihie eruwo, ndị nọkwa n’ìgwè anyị na-alaghachite n’okporo ụzọ, site n’ugbo shugaken ndị ahụ, iji chere isoro bọs laghachi n’obodo. Ọ bụ ezie na ike gwụtụrụ anyị, obi dị mmadụ nile ụtọ n’ihi ọrụ “ịkụ azụ” ụtụtụ ahụ. Mgbalị e mere iji kwekọọ n’ọnọdụ dị iche iche na nkwenkwe ndị e zutere na-enyeghachi ụgwọ ọrụ ruru eru.
Mmiri na nkume mmiri nile nke Fiji jupụtara n’ọtụtụ ụdị azụ dị iche iche. Iji nwee ihe ịga nke ọma, ọ dị onye gonedau (ọkụ azụ) nke Fiji mkpa inwe nkà n’ọrụ ya. Otu ihe ahụ bụkwa eziokwu n’ihe banyere ọrụ “ịkụ azụ” nke Jisọs Kraịst kenyere ndị na-eso ụzọ ya. Ndị “ọkụ na-akụta mmadụ” bụ́ ndị Kraịst aghaghị inwe nkà, na-eme mgbanwe iji mee ka ụzọ ijekwu mmadụ ha na arụmụka ha kwesị nkwenkwe dị iche iche nke ụba mmadụ. (Matiu 4:19) A chọrọ nke a n’ezie na Fiji. A na-ahụkwa ihe na-esi na ya na-apụta ná mgbakọ Ndịàmà Jehova na-enwe kwa afọ, ebe ndị Fiji, India, Rotuma, na ndị sitere ná ngwakọta nke nzụlite agbụrụ dị iche iche na-efe Jehova Chineke n’ịdị n’otu. Ee, ngọzi ya dịkwasịrị ọrụ “ịkụ azụ” ahụ ná mmiri nile nke Fiji.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee akwụkwọ Mankind’s Search for God, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., na-ebipụta, peji nke 115-117.
[Map dị na peeji 23]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Viti Levu
Vanua Levu
Suva
Lautoka
Nandi
0 100 km
0 100 mi
18°
180°
[Foto dị na peeji nke 24]
Otu “bure,” ma ọ bụ ụlọ ndị obodo ahụ
[Foto dị na peeji nke 24]
Ụlọ nsọ ndị Hindu na Fiji
[Foto ndị dị na peeji nke 25]
“Ịkụ azụ” na-aga nke ọma maka ndị mmadụ na Fiji
[Ebe e si nweta foto Dị na peeji 24]
Fiji Visitors Bureau