Ọhụụ Na-akpali Akpali Ndị Na-ewusi Okwukwe Ike
Isi Ihe Ndị Sitere ná Mkpughe
OHU Jehova bụ Jọn nọ n’agwaetiti ahụ dị nta nke Patmọs, n’ebe dịpụrụ adịpụ n’ebe ọdịda anyanwụ nke Asia Minor. N’ebe ahụ onyeozi nke a meworo agadi hụrụ ihe ndị dị ebube—ndị bụ ihe atụ, ndị na-abụkarị ihe ijuanya, na ndị dị mkpa n’ezie! E mere ka ọ nọrọ n’ụbọchị Onyenwe anyị, nke malitere site n’oge Jisọs nọkwasịrị n’ocheeze na 1914 ruo n’ọgwụgwụ Ọchịchị Narị Afọ Iri. Ọ bụ ezie na Jọn hụrụ ihe ndị ga-ewere ọnọdụ n’oge ihe a kpọrọ mmadụ nọ n’ọchịchịrị kasị ukwuu, lee ihe mara mma ọhụhụ o buru ụzọ hụ Ọchịchị Puku Afọ Kraịst bụ! Lee aha ngọzi ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi ga-enweta mgbe ahụ!
Jọn dekọrọ ọhụụ ndị a n’ime akwụkwọ Bible bụ Mkpughe. N’ịbụ nke e dere n’ihe dị ka 96 O.A., ọ pụrụ imesi okwukwe anyị nwere n’ebe Chineke nke amụma, bụ́ Jehova, na Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, nọ, ike.—Maka nkọwa zuru ezu, lee akwụkwọ ahụ bụ Revelation—Its Grand Climax At Hand!, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
Kraịst Enye Ndụmọdụ Ịhụnanya
Ná mmalite nke mkpughe ahụ Chineke nyere site n’aka Kraịst, a hụrụ akwụkwọ ozi ndị e degaara ọgbakọ asaa nke ndị ha na Jisọs na-eketakọ Alaeze. (1:1–3:22) N’ihe nile e kwuru na ha, akwụkwọ ozi ndị ahụ na-aja mma, na-achọpụta nsogbu, na-enye mgbazi olu na agbamume ma ọ bụ nke ọ bụla n’ime ha, na-ehotakwa ngọzi ndị na-abịa site n’iji ikwesị ntụkwasị obi na-erube isi. Ọ bụ ezie na ndị Efesọs atachiwo obi, ha enweghịzikwa ịhụnanya ahụ ha nwere na mbụ. A gbara ọgbakọ Smụana ahụ bara ọgaranya n’ime mmụọ ume ka ọ nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi n’agbanyeghị mkpagbu. Nsogbu emeribeghị ọgbakọ Pagamọm, ma ọ nabatawo ịrọ òtù. N’agbanyeghị mmụba nke ọrụ ndị Kraịst nọ na Taịataịra, mmetụta Jezebel dị n’ebe ahụ. Ọ dị ọgbakọ Sadis ahụ mkpa ịmụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ, a gbara nke ahụ nọ na Filadelfịa ume ka o jide nke o ji, ọgwụgwọ ime mmụọ dịkwa ndị Leọdisia ahụ dị ṅaraṅara mkpa.
Lee aha okwu ọma ndị a bụ maka iji nye ndị gaje ịbụ eze n’eluigwe ọzụzụ—n’ezie, nye ndị Kraịst nile! Dị ka ihe atụ, ọ̀ dịwo onye ọ bụla n’ime anyị nke ghọrọ onye dị ṅaraṅara? Mgbe ahụ mee ihe banyere ya! Ghọọ onye na-enye ume ọhụrụ dị ka otu iko mmiri juru oyi n’ụbọchị dị ọkụ ma malitekwa igosipụta ịnụ ọkụ n’obi dị ọkụ nye Jehova na ozi ya.—Tụlee Matiu 11:28, 29; Jọn 2:17.
Nwa Atụrụ ahụ Emeghee otu Akwụkwọ Mpịakọta
Ọzọ, a hụrụ Jehova ka ọ nọ n’ebube n’ocheeze ya. (4:1–5:14) Ndị okenye 24 na ihe anọ e kere eke dị ndụ gbara ya gburugburu. Otu akwụkwọ mpịakọta nke nwere akara asaa dị n’aka ya. Ònye pụrụ imeghe akwụkwọ mpịakọta ahụ? Ee, ọ bụ Nwa Atụrụ ahụ, Jisọs Kraịst, bụ onye ruru eru ime otú ahụ!
Ihe omume ndị na-akpali akpali malitere ịpụta ìhè ka Nwa Atụrụ ahụ meghere isii n’ime akara ndị ahụ. (6:1–7:17) Mgbe e meghere akara nke mbụ, Kraịst pụtara na-anọkwasị n’elu ịnyịnya ọcha nara otu okpueze (na 1914), ma na-aga n’ihu inwe mmeri. Ndị na-anọkwasị n’ịnyịnya na-akpata agha, oké ụnwụ, na ọnwụ nye ihe a kpọrọ mmadụ mgbe e meghere akara atọ ọzọ. Mgbe e meghere akara nke ise ahụ, ndị ahụ e gbuworo n’ihi okwukwe ha nwere na Kraịst tiri mkpu maka ịbọ ọ́bọ̀ nke ọbara ha, e nyekwara onye ọ bụla n’ime ha “uwe ọcha,” nke na-egosipụta ịnọ dị ka ndị a gụrụ ná ndị ezi omume, nke e jikọtara ya na mbilite n’ọnwụ ha ịghọ mmụọ e kere eke ndị na-adịghị anwụ anwụ, ndị nwere ihe ùgwù ịchị achị dị ka ndị eze. (Tụlee Mkpughe 3:5; 4:4.) Ụbọchị oké iwe nke Chineke na nke Nwa Atụrụ ahụ bụ nke a kpọsara site n’otu ala ọma jijiji mgbe e meghere akara nke isii. Ma “ifufe anọ nke ụwa,” nke bụ ihe nnọchianya nke mbibi, bụ nke e jidere ruo mgbe a kasịrị 144,000 ndị ohu Chineke akara. Mgbe e jiri mmụọ Chineke tee ha mmanụ ma nabatakwa ha dị ka ụmụ ime mmụọ ya, ha na-ebu ụzọ anata ihe ngosipụta—akara, ma ọ bụ nkwa e mesiri ike—nke ihe nketa eluigwe ha. Ọ bụ nanị mgbe a nwalesịrị ha ka akara ahụ na-aghọ nke na-adịgide adịgide. (Ndị Rom 8:15-17; 2 Ndị Kọrint 1:21, 22) Lee otú ọ na-aghaghị isiworị ju Jọn anya ịhụ “oké ìgwè mmadụ” ndị sitere ná mba nile—otu ìgwè nke nwere olileanya nke ndụ ebighị ebi n’ime paradaịs elu ala! Ha si “n’oké mkpagbu ahụ” pụta, bụ́ oge ihe isi ike na-enweghị atụ nye ihe a kpọrọ mmadụ.
Lee aha ihe omume ndị na-eju anya merenụ mgbe e meghere akara nke asaa! (8:1–11:14) Oge ịnọ jụụ dị otu ọkara hour, nke na-enye ohere ka a nụ ekpere ndị nsọ, bụ nke ihe sochiri ya bụ isite n’ebe ịchụaja tụda ọkụ n’elu ụwa. Mgbe ahụ ndị mmụọ ozi asaa kwadebere ịfụ opi ndị na-akpọsa ihe otiti Chineke gaje iti Krisendọm. A na-afụ opi ndị ahụ n’oge nile nke ọgwụgwụ ahụ ruo n’oké mkpagbu ahụ. Opi anọ kpọsara ihe otiti dị iche iche n’elu ụwa, n’oké osimiri, n’isi iyi mmiri dị iche iche, nakwa n’anyanwụ, ọnwa, na kpakpando. Ịfụ opi nke ise kpọpụtara igurube nke sere onyinyo ndị Kraịst e tere mmanụ ka ha na-enupụta ibu agha malite na 1919 gaa n’ihu. Site n’ụda opi nke isii, mwakpo nke usuu ndị agha weere ọnọdụ. Ná mmezu, ndị e tere mmanụ, bụ́ ndị e mere ka ha siwanye ike kemgbe 1935 site ná mwebata nke “oké ìgwè mmadụ” ahụ, na-akpọsa ozi ikpe ọmụma na-agbakasị ahụ megide ndị ndú okpukpe Krisendọm.
Ọzọ, Jọn ripịara otu obere akwụkwọ mpịakọta, nke na-egosipụta na ndị ahụ e tere mmanụ naara ihe omume ha ma nweta ihe na-edozi ahụ site n’akụkụ nke Okwu Chineke nwere okwu ikpe ọmụma Chineke ndị ha na-akpọsa megide Krisendọm. E nyere onyeozi ahụ iwu ka ọ tụọ ebe nsọ nke ụlọ nsọ ahụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀, na-egosipụta mmezu e ji n’aka nke nzube nile nke Jehova banyere ndokwa ụlọ nsọ ahụ, na ndị ahụ e jikọrọ ha na ya ga-eme ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ nile nke Chineke. Mgbe ahụ ‘ndị àmà abụọ’ Chineke e tere mmanụ buru amụma n’ákwà mkpe, e gburu ha, ma e mere ka ha bilite n’ọnwụ. Nke a zoro aka gaa na 1918-1919, mgbe ndị iro mere ka ọrụ nkwusa ha fọdụ nke nta ka ọ nwụọ, ma e mere ka ndị ohu Jehova dịghachi ndụ n’ụzọ ọrụ ebube maka ije ozi ha.
A Mụwo Alaeze ahụ!
Ịfụ opi nke asaa ahụ kpọsara ọmụmụ nke Alaeze ahụ. (11:15–12:17) N’eluigwe otu nwanyị ihe atụ (nzukọ eluigwe Jehova Chineke) mụpụtara otu nwa nwoke (Alaeze Chineke nke nwere Kraịst dị ka Eze), ma dragọn ahụ (Setan) gbalịrị ibibi ya, ma o nweghị ihe ịga nke ọma. Iji weta agha ahụ a lụrụ n’eluigwe n’isi njedebe mgbe a mụsịrị Alaeze ahụ na 1914, Maịkael (Jisọs Kraịst) ahụ nke na-enwe mmeri chụdara dragọn ahụ na ndị mmụọ ozi ya n’elu ụwa. N’ebe ahụ dragọn ahụ anọgidewo na-ebu agha megide ihe fọdụrụ ná ndị e tere mmanụ nke mkpụrụ nwanyị eluigwe ahụ.
Ọzọ, Jọn hụrụ otu anụ ọhịa nke e mebeere otu ihe oyiyi bụ ihe arụ. (13:1-18) Anụ ọhịa ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke a nke nwere isi asaa na mpì iri, bilitere site “n’oké osimiri,” nke bụ ihe a kpọrọ mmadụ na-amagharị dị ka mmiri ebe ọchịchị ụmụ mmadụ na-esi ebilite. (Tụlee Daniel 7:2-8; 8:3-8, 20-25.) Olee ebe ihe e kere eke ihe atụ nke a si enweta ikike ya? Ee, ọ bụghị ebe ọzọ ma e wezụga n’aka Setan bụ́ dragọn ahụ! Cheedị nnọọ echiche! A hụrụ ka anụ ọhịa nwere mpì abụọ (Alaeze Ụwa England na America), meere oké njikọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke a “ihe oyiyi,” nke a maara ugbu a dị ka òtù United Nations. A na-amanye ụfọdụ ndị ife anụ ọhịa ahụ ofufe ma nara “akara” ya site n’ime ihe n’ụzọ o si chọọ na ikwere ka ọ na-achịkwa ndụ ha. Ma Ndịàmà Jehova na-ajụ akara ndị mmụọ ọjọọ nke anụ ọhịa ahụ n’ụzọ siri ike!
Ndị Ohu Jehova Emee Ihe
A na-ahụ ndị ohu dị iche iche nke Chineke ka ha na-eme ihe mgbe a na-awụpụ ọkwa asaa nke oké iwe ya. (14:1–16:21) Gee ntị! N’Ugwu Zaịọn nke eluigwe, Jọn pụrụ ịnụ ka 144,000 ahụ na-abụ abụ dị ka ọ bụ abụ ọhụrụ. Otu mmụọ ozi nke na-efe n’etiti eluigwe nwere ozi ọma ebighị ebi ịkpọsara ndị bi n’elu ụwa. Gịnị ka nke a na-egosi? Na Ndịàmà Jehova nwere enyemaka ndị mmụọ ozi n’ịkpọsa ozi Alaeze ahụ.
Ọ ghaghị iju Jọn anya ịhụ ka e were ihe ubi mkpụrụ vine nke ụwa, e wee gwepịa mba nile ka a zọchara ebe nzọcha mkpụrụ vine nke iwe Chineke. (Tụlee Aịsaịa 63:3-6; Joel 3:12-14.) Mgbe Jehova nyere iwu, ndị mmụọ ozi asaa gara n’ihu ịwụpụ ọkwa asaa nke oké iwe Chineke. O metụtara elu ụwa, oké osimiri, na isi iyi mmiri dị iche iche, tinyekwara anyanwụ, ocheeze nke anụ ọhịa ahụ, na Osimiri Yufretis, mgbe a na-awụpụ ọkwa isii ndị mbụ. Cheedị echiche banyere mkpali Jọn nwere mgbe ọ hụrụ na mkpọsa ndị mmụọ ọjọọ na-akpọsa na-achịkọta ndị eze bụ mmadụ gaa n’agha Chineke nke Ha–Magedọn. Ihe ndị si na nke ahụ pụta bụ mbibi ka a wụpụrụ ọkwa nke asaa ahụ n’ime ikuku.
Ụmụ Nwanyị Abụọ nke Ihe Atụ
N’ezie, Jọn nwere mkpali ịhụ ọgwụgwụ nke Babilọn Ukwu ahụ, bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, na ịhụ ihe omume ndị na-enye ọṅụ ndị sochiri mbibi ya. (17:1–19:10) N’ịbụ onye ọbara nke ndị nsọ bara n’anya, a hụrụ ka ọ na-anọkwasị n’elu anụ ọhịa na-acha uhie uhie nke nwere isi asaa na mpì iri (òtù League of Nations na nke nọchiri ya, bụ́ United Nations). Ah, lee aha mbibi o nwetara ka mpì ndị ahụ tụgharịrị megide ya!
A nụrụ ụda olu ndị sitere n’eluigwe ka ha na-eto Jaa maka mbibi nke Babilọn Ukwu ahụ. Leekwa aha otuto dara oké ụda e ji kpọsaa alụmdi na nwunye nke Nwa Atụrụ ahụ na nwanyị ọ na-alụ ọhụrụ, bụ́ ndị ahụ e tere mmanụ si n’ọnwụ bilie!
Kraịst Emerie, Na-achịkwa
Ọzọ, Jọn hụrụ Eze nke ndị eze nile ka ọ na-edu ndị agha eluigwe ná mbibi nke usoro ihe Setan. (19:11-21) Ee, Jisọs, bụ́ “Okwu Chineke,” na-ebu agha megide mba nile. Onyeozi ahụ hụrụ anụ ọhịa ahụ (nzukọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị Setan) na onye amụma ụgha ahụ (Alaeze Ụwa England na America) ka a na-atụba ha n’ime “ọdọ ọkụ ahụ,” bụ́ ihe atụ nke mkpochapụ ebighị ebi.
Gịnị ọzọ? Ee, Jọn hụrụ ntụba a tụbara Setan n’ime abyss. Ihe sochiri nke ahụ bụ ọhụụ nke Ọchịchị Puku Afọ nke Kraịst, bụ́ oge Jisọs Kraịst na ndị ọchịchị ibe ya si n’ọnwụ bilite ga-ekpe ihe a kpọrọ mmadụ ikpe, na-ebuli ndị na-erube isi gaa n’izu okè mmadụ! (20:1-10) Ugbu a bụ oge maka ule ikpeazụ. Mgbe e si n’ime abyss ahụ tọpụ ya, Setan ga-apụ iduhie ihe a kpọrọ mmadụ zuru okè, ma mbibi ga-eweta ọrụ nke ndị mmụọ ọjọọ nile na ndị mmadụ nupụrụ isi megide Chineke n’isi njedebe.
N’ịlaghachi azụ n’oge, lee otú Jọn na-aghaghị isiworị bụrụ onye nwere mkpali ịhụ ndị nile nọ n’ọnwụ, Hedis (ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ) na oké osimiri ka ha si n’ọnwụ bilie, bụrụkwa ndị e kpere ikpe n’ihu Chineke, onye nọkwasịrị n’elu oké ocheeze dị ọcha! (21:11-15) Leekwa oké nnwere onwe ndị ziri ezi ga-enweta mgbe a tụbara ọnwụ na Hedis n’ime ọdọ ọkụ ahụ, ọ dịghị mgbe ha ga-egbukwa ndị mmadụ ọzọ!
Ka ọhụụ Jọn na-abịa n’isi njedebe, ọ hụrụ Jerusalem Ọhụrụ. (21:1–22:21) A hụrụ obodo ahụ ga-achị ọchịchị ka ọ na-agbadata site n’eluigwe, na-ewetakwara ndị mba nile ìhè. Ihe si na Jerusalem Ọhụrụ ahụ na-erupụta bụ “osimiri nke mmiri nke ndụ,” nke na-ese onyinyo eziokwu Akwụkwọ nsọ na ndokwa ndị ọzọ nile Jehova nyere, ndị dabeere n’àjà Jisọs maka ịgbapụta ndị mmadụ na-erube isi site ná mmehie na ọnwụ na inye ha ndụ ebighị ebi. (Jọn 1:29; 17:3; 1 Jọn 2:1, 2) N’akụkụ ọ bụla nke osimiri nke a, Jọn hụrụ osisi ndị nwere akwụkwọ ndị na-agwọ ọrịa, nke na-ese onyinyo akụkụ nke ndokwa Jehova maka inye ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi ndụ ebighị ebi. Ozi mmechi ndị sitere n’aka Chineke na Kraịst bụ nke ọkpụkpọ òkù sochiri. Lee otú o si bụrụ ihe dị ebube ịnụ ka mmụọ nsọ na nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-akpọ onye ọ bụla akpịrị na-akpọ nkụ òkù ‘ịbịa nara mmiri nke ndụ n’efu’! Mgbe anyị na-agụkwa okwu ndị ikpeazụ dị ná Mkpughe, obi abụọ adịghị ya na anyị na-enweta ihe mkpali nke nkwupụta Jọn: “Amen: Bịa, Onyenwe anyị Jisọs.”
Igbe/Foto dị na peeji nke 21]
Mụrụ Anya: N’ime okwu amụma ndị e kwuru banyere agha Chineke nke Ha–Magedọn (Amagedọn) e kwuru, sị: “Lee, ana m [Jisọs Kraịst] abịa dị ka onye ohi. Ngọzi [“obi ụtọ,” NW] na-adịrị onye na-eche nche, na-edebekwa uwe ya, ka ọ ghara ijegharị n’ọtọ, ha wee hụ ihere ya.” (Mkpughe 16:15) Nke a pụrụ ịbụ ịkpọtụ aha n’ebe ibu ọrụ ndị nlekọta, ma ọ bụ ndị isi, nke ọnụ ụzọ ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem, nọ. N’oge ịnọ na nche ndị ahụ, ọ gabigara ụlọ nsọ ahụ ịhụ ma ndị nche ya bụ ndị Livaị hà mụ anya ka hà na-ehi ụra n’ebe e kenyere ha ọrụ. A na-eji osisi eti onye nche ọ bụla a hụrụ na ọ na-ehi ụra, a pụrụ ịgba uwe elu ya ọkụ dị ka ihe ntaramahụhụ na-eme ihere. Ebe ọ bụ na Amagedọn dị nso ugbu a, ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ nke “òtù ndị nchụaja bụkwa eze,” ma ọ bụ “ụlọ nke mmụọ nsọ,” ekpebisiwo ike ịmụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ. Otú ahụ ka ndị na-eso ha, bụ́ “oké ìgwè mmadụ” ahụ, bụ́ ndị nwere olileanya elu ala, na-aghaghị ịmụrụ anya n’ihi na ha onwe ha na-ejekwara Chineke ozi dị nsọ n’ụlọ nsọ ahụ. (1 Pita 2:5, 9; Mkpughe 7:9-17) Karịsịa ndị nlekọta bụ́ ndị Kraịst kwesịrị ịnọ na nche megide mbilite nke ọnọdụ ndị dị njọ n’ọgbakọ. N’ihi na ha na-amụ anya, ndị nile na-eguzosi ike n’ihe n’ife ofufe n’ụlọ nsọ ime mmụọ Chineke na-ejigide “uwe” ha, nke na-egosipụta ozi dị ebube ha na-eje dị ka Ndịàmà nke Jehova.