Isi nke 32
E Mezuo Iwe Chineke
1. Gịnị ga-emeworị mgbe a ga-awụpụsịworị ọkwa asaa ahụ, oleekwa ajụjụ ndị na-ebilite ugbu a banyere ọkwa ndị ahụ?
JỌN agwaworị anyị banyere mmụọ ozi ndị ahụ e nyere ọrụ ịwụpụ ọkwa asaa ndị ahụ. Ọ gwara anyị na ndị a ‘bụ ndị nke ikpeazụ, n’ihi na n’ime ha ka ọnụma Chineke gwụrụ.’ (Mkpughe 15:1; 16:1) A ghaghị ịwụpụ ihe otiti ndị a ruo ọgwụgwụ, bụ́ ndị na-ekpughe ikpe Jehova megide ajọ omume dị n’ụwa. Mgbe ha gabigasịrị, a ga-emezuworị ihe Chineke kpere n’ikpe. Ụwa Setan agaghị adịkwa ọzọ! Gịnị ka ihe otiti ndị a na-agba àmà ya nye ihe a kpọrọ mmadụ, nyekwa ndị ọchịchị nke ajọ usoro ihe dị ugbu a? Olee ụzọ ndị Kraịst pụrụ isi zere iso ụwa nke a ikpe mara natakọọ ihe otiti? Ndị a bụ ajụjụ ndị dị mkpa, a gajekwa ịza ha ugbu a. Ndị nile nwere olileanya maka mmeri nke ezi omume ga-enwe oké mmasị n’ihe ọzọ Jọn hụrụ.
Ọnụma Jehova Megide “Ụwa”
2. Gịnị na-apụta site ná mmụọ ozi nke mbụ ahụ ịwụsị ọkwa ya n’ime ụwa, gịnịkwa ka “ụwa” na-anọchi anya ya?
2 Mmụọ ozi nke mbụ wee malite ime ihe! “Mmụọ ozi mbụ wee jee, wụsịa ọkwa ya n’ime ụwa; ajọ ọnyá jọgburu onwe ya wee pụta n’ahụ mmadụ nile ndị nwere akara anụ ọhịa ahụ, ndị na-akpọkwa isiala nye ihe oyiyi ya.” (Mkpughe 16:2) Dị ka ọ dịrị mgbe a nụrụ ụda opi nke mbụ ahụ, n’ebe a, “ụwa” na-ese onyinyo usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke yiri ihe guzosiri ike, nke Setan malitere iwulite n’elu ala ebe a laa azụ n’oge Nimrọd, ihe karịrị 4,000 afọ gara aga.—Mkpughe 8:7.
3. (a) Olee ụzọ ọchịchị dị iche iche siworo chọọ ihe a pụrụ ịkpọ ofufe site n’aka ndị ha na-achị? (b) Gịnị ka mba nile guzobeworo dị ka ihe e ji edochi anya Alaeze Chineke, mmetụta dị aṅaa ka o nwekwara n’ahụ ndị na-efe ya ofufe?
3 N’oge ikpeazụ ndị a, ọtụtụ ọchịchị dị iche iche achọwo n’aka ndị ha na-achị, ihe yiri ofufe, na-arụgide na a ghaghị ibuli Obodo elu karịa Chineke ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ mmadụ kwesịrị ido onwe ya n’okpuru ya. (2 Timoti 3:1; tụlee Luk 20:25; Jọn 19:15.) Kemgbe 1914, a na-ahụ n’ebe nile ka mba dị iche iche na-anwụde ndị ha na-eto eto n’ike ka ha wee jee agha, ma ọ bụ ka ha dị njikere ije agha, bụ́ ụdị ibu agha mgbukpọ nke meworo ka akụkọ ihe mere eme nke oge a jupụta n’ọbara. N’ime ụbọchị Onyenwe anyị ahụ, mba nile ewepụtawo, dị ka ihe a ga-eji dochie anya Alaeze Chineke, ihe oyiyi nke anụ ọhịa ahụ—òtù League of Nations na nke nọchiri ya, bụ́ United Nations. Lee nnọọ aha nkwutọ ọ bụ ịkpọsa, dị ka ụfọdụ ndị popu meworo n’oge na-adịghị anya gara aga na òtù nke a mmadụ guzobere bụ nanị olileanya mba nile nwere maka udo! Ọ bụ ihe pụtara ìhè n’imegide Alaeze Chineke. Ndị na-efe ya ofufe na-aghọ ndị na-adịghị ọcha n’ụzọ ime mmụọ, ndị ọnyá takasịrị n’ahụ, dị nnọọ ka ndị Ijipt ahụ dị, bụ́ ndị megidere Jehova n’oge Mosis, e wee tie ha ihe otiti nke ọnyá nkịtị.—Ọpụpụ 9:10, 11.
4. (a) Gịnị ka ihe ndị dị n’ime ọkwa nke mbụ ahụ nke ọnụma Chineke na-emesi ike? (b) Olee ụzọ Jehova si ele ndị na-anara akara nke anụ ọhịa ahụ anya?
4 Ihe dị n’ime ọkwa nke a na-emesi ya ike nhọrọ nke na-eche ihe a kpọrọ mmadụ ihu. Ha aghaghị ịta ahụhụ n’ihi ịkpọasị nke ụwa ma ọ bụkwanụ n’ihi ọnụma nke Jehova. A nọwo na-arụgide ihe a kpọrọ mmadụ ịnara akara nke anụ ọhịa ahụ, ná nzube nke bụ “ka onye ọ bụla gharakwa ịpụ ịzụta ahịa ma ọ bụ ire ihe, ma ọ bụghị onye nwere akara ahụ, bụ́ aha nke anụ ọhịa ahụ ma ọ bụ ọnụ ọgụgụ aha ya.” (Mkpughe 13:16, 17) Ma e nwere ụgwọ a na-akwụ maka nke a! Jehova na-ele ndị naara akara ahụ anya dị ka ndị e jiri “ajọ ọnyá jọgburu onwe ya” tie ihe otiti. Kemgbe afọ 1922, e mewo ka a mara ha n’ihu ọha dị ka ndị jụrụ Chineke ahụ dị ndụ. Atụmatụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ha nile adịghị aga nke ọma, ha nọkwa n’oké ahụhụ. N’ụzọ ime mmụọ, ha bụ ndị na-adịghị ọcha. Ọ gwụla ma hà mere nchegharị, “ajọ” ọrịa nke a ga-egbu ha egbu, n’ihi na ugbu a bụ ụbọchị ikpe ikpe nke Jehova. E nweghị ọnọdụ nnọpụiche dị n’etiti ịbụ akụkụ nke usoro ihe dị n’ụwa ugbu a na ijere Jehova ozi n’akụkụ Kraịst ya.—Luk 11:23; tụlee Jemes 4:4.
Oké Osimiri Aghọọ Ọbara
5. (a) Gịnị mere mgbe a wụpụrụ ọkwa nke abụọ ahụ? (b) Olee ụzọ Jehova si ele ndị na-ebi n’ime osimiri ihe atụ ahụ anya?
5 Oge eruwo ugbu a ka a wụpụ ọkwa nke abụọ nke ọnụma Chineke. Gịnị ka ọ ga-apụtara ihe a kpọrọ mmadụ? Jọn na-akọrọ anyị, sị: “Mmụọ ozi nke abụọ wee wụsịa ọkwa ya n’ime oké osimiri; o wee ghọọ ọbara dị ka nke mmadụ nwụrụ anwụ; mkpụrụ obi nile ọ bụla nke dị ndụ wee nwụọ, bụ́ ihe dị n’oké osimiri.” (Mkpughe 16:3) Dị ka ụda opi nke abụọ ahụ, ọkwa nke a chere ihu megide “oké osimiri”—bụ́ ìgwè ihe a kpọrọ mmadụ na-enupụ isi ndị e kewapụrụ n’ebe Jehova nọ, ndị nọkwa n’ọgba aghara. (Aịsaịa 57:20, 21; Mkpughe 8:8, 9) N’anya Jehova, “oké osimiri” nke a yiri ọbara, nke na-adịghị mma ka ihe e kere eke biri n’ime ya. Ọ bụ ya mere ndị Kraịst agaghị abụ akụkụ nke ụwa. (Jọn 17:14) Mwụpụ a ga-awụpu ọkwa nke abụọ nke ọnụma Chineke na-ekpughe na ihe nile a kpọrọ mmadụ ndị bi n’oké osimiri nke a bụ ndị nwụrụ anwụ n’anya Jehova. N’ihi mmehie e nwekọtara ọnụ, ikpe oké mwụfu ọbara nke ndị na-emeghị ihe ọjọọ mara ihe a kpọrọ mmadụ. Mgbe ụbọchị iwe Jehova bịarutere, ha ga-anwụ n’aka ndị ahụ na-emezu ihe o kpere n’ikpe.—Mkpughe 19:17, 18; tụlee Ndị Efesọs 2:1; Ndị Kọlọsi 2:13.
Inye Ha Ọbara Ka Ha Ṅụọ
6. Gịnị mere mgbe a wụpụrụ ọkwa nke atọ ahụ, oleekwa okwu ndị a nụrụ site n’ọnụ otu mmụọ ozi, sitekwa n’ebe ịchụàjà ahụ?
6 Ọkwa nke atọ nke ọnụma Chineke, dị ka ụda opi nke atọ ahụ, nwere mmetụta n’ebe isi iyi nile nke mmiri dị mma dị. “Mmụọ ozi nke atọ wee wụsịa ọkwa ya n’ime osimiri nile na isi iyi nile nke mmiri nile; mmiri ahụ wee ghọọ ọbara. M wee nụ mmụọ ozi mmiri nile ka ọ na-asị, Onye ezi omume ka ị bụ, gị Onye na-adị adị, Onye dịkwararịị, onye dị ọcha n’obi, n’ihi na i kpere ikpe ndị a: n’ihi na ha wụsiri ọbara ndị nsọ na ndị amụma, ọbara ka i nyewokwara ha ka ha ṅụọ: ha bụ ndị kwesịrị ekwesị. M wee nụ ebe ịchụàjà ahụ ka ọ na-asị, Ee, Onyenwe anyị Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, ikpe gị nile bụ eziokwu na ikpe ziri ezi.”—Mkpughe 16:4-7.
7. Gịnị ka “osimiri nile na isi iyi nile nke mmiri nile” na-ese onyinyo ya?
7 “Osimiri nile na isi iyi nile nke mmiri nile” ndị a na-ese onyinyo ebe ndị ahụ a sị na ezi nduzi na amamihe si apụta, bụ́ ndị ụwa nke a nakwere, dị ka ọkà nchepụta echiche ndọrọ ndọrọ ọchịchị, akụ na ụba, nke ọkà mmụta sayensi, nke mmụta akwụkwọ, nke ọha mmadụ na nke okpukpe, ndị na-eduzi ihe omume na mkpebi nile nke ihe a kpọrọ mmadụ. Kama ilegara Jehova anya, bụ́ Isi Iyi nke ndụ, maka eziokwu nke na-enye ndụ, ụmụ mmadụ ‘egwuwaworo onwe ha olulu mmiri dị iche iche,’ wee ṅụọkwa “amamihe nke ụwa nke a [nke] bụ ihe nzuzu n’ebe Chineke nọ.”—Jeremaịa 2:13; 1 Ndị Kọrint 1:19; 2:6; 3:19; Abụ Ọma 36:9.
8. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka ihe a kpọrọ mmadụ siworo nweta ikpe ọmụma ọbara?
8 “Mmiri” dị otú a ndị e metọrọ emetọ edugawo ụmụ mmadụ n’ịbụ ndị ikpe ọbara mara, dị ka ihe atụ, n’ịgba ha ume ịwụfu ọbara n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu n’agha, bụ́ ndị tara isi ihe karịrị otu narị nde mmadụ na narị afọ gara aga. Karịsịa n’ime Krisendọm, bụ́ ebe agha ụwa abụọ ndị ahụ si tiwapụ, ndị mmadụ ‘emewo ngwa ịwụsi ọbara na-emeghị ihe ọjọọ,’ nke a agụnyewokwa ọbara nke ndịàmà nke Chineke. (Aịsaịa 59:7; Jeremaịa 2:34) Ihe a kpọrọ mmadụ enwetawokwa ikpe ọmụma ọbara site n’iji ọtụtụ ọbara dị ukwuu mee ihe na-ezighị ezi iji mịnye ọbara n’ahụ mmadụ, n’imebi iwu ezi omume nile nke Jehova. (Jenesis 9:3-5; Levitikọs 17:14; Ọrụ 15:28, 29) N’ihi nke a, ha enwetaworị dị ka ihe ubi oké iru újú, site ná mmụba nke ọrịa AIDS, ịba ọcha n’anya, na ọrịa ndị ọzọ site ná mmịnye ọbara. N’oge na-adịghị anya, ụgwọ ọrụ zuru ezu nke ikpe ọmụma ọbara ga-abịa mgbe ndị na-emebi iwu ga-akwụ ụgwọ ahụ kasị ukwuu, ịbụ ndị a zọpịara n’ime “ebe nzọcha mkpụrụ vine ahụ, nke dị ukwuu, bụ́ nke ọnụma Chineke.”—Mkpughe 14:19, 20.
9. Gịnị ka mwụpụ nke ọkwa nke atọ ahụ gụnyere?
9 N’oge Mosis, mgbe e mere ka Osimiri Naịl ghọọ ọbara, ndị Ijipt nwere ike ịdị ndụ site n’ịchọta ebe ndị ọzọ e si enweta mmiri. (Ọpụpụ 7:24) Ma, n’oge a, n’oge ihe otiti ime mmụọ ahụ, e nweghị ebe ọ bụla n’ime ụwa nke Setan ebe ụmụ mmadụ pụrụ ịchọta mmiri ndị na-enye ndụ. Mwụpụ nke ọkwa nke atọ a gụnyere ịkpọsa na “osimiri nile na isi iyi nile nke mmiri nile” nke ụwa nke a dị ka ọbara, nke na-eweta ọnwụ ime mmụọ nye ndị nile na-aṅụ ha. Ọ gwụla ma ụmụ mmadụ hà chigharịkwutere Jehova, ha ga-enweta ajọ ikpe ọmụma ya.—Tụlee Ezikiel 33:11.
10. Gịnị ka “mmụọ ozi mmiri” ahụ na-eme ka a mara, akaebe dịkwa aṅaa ka “ebe ịchụàjà” ahụ na-atụkwasị?
10 “Mmụọ ozi mmiri nile” ahụ, ya bụ, mmụọ ozi nke wụnyere ọkwa ahụ n’ime mmiri ndị ahụ, na-eto Jehova dị ka Onyeikpe Eluigwe na Ala, onye ikpe ezi omume ya na-enweghị mgbanwe. N’ihi ya, o kwuru banyere mkpebi ikpe nke a, sị: “Ha bụ ndị kwesịrị ekwesị.” Ihe ịrụ ụka adịghị ya na mmụọ ozi ahụ ji anya ya hụ mwụfu ọbara na oké obi ọjọọ ndị e meworo n’ime ọtụtụ puku afọ site n’ozizi na nchepụta ụgha nile nke ụwa ajọ omume nke a. N’ihi ya, ọ maara na mkpebi ikpe Jehova ziri ezi. Ọbụna “ebe ịchụàjà” nke Chineke na-ekwuwa okwu. Ná Mkpughe 6:9, 10, e kwuru na mkpụrụ obi nke ndị ahụ e gbuworo n’ihi okwukwe ha dị n’okpuru ebe ịchụàjà ahụ. Ya mere “ebe ịchụàjà” ahụ na-agbakwa àmà siri ike banyere ikpe ziri ezi na ezi omume nke mkpebi nile nke Jehova.a N’ezie, ọ bụ nnọọ ihe kwesịrị ekwesị na ndị ahụ wụfuworo ọbara, jirikwa ya mee ihe na-ezighị ezi n’ụzọ dị ukwuu otú a ka a ga-amanye n’onwe ha ịṅụ ọbara, dị ka ihe atụ nke ikpe ọnwụ Jehova mara ha.
Iji Ọkụ Chagbuo Ụmụ Mmadụ
11. N’ole ebe ka a wụkwasịrị ọkwa nke anọ nke ọnụma Chineke, gịnị na-emekwa mgbe a wụpụrụ ya?
11 Ebe a wụkwasịrị ọkwa nke anọ nke ọnụma Chineke bụ n’anyanwụ. Jọn na-akọrọ anyị, sị: “Mmụọ ozi nke anọ wee wụsịa ọkwa ya n’elu anyanwụ; e wee nye ya ike iji ọkụ chagbuo mmadụ. E wee were oké okpomọkụ chagbuo mmadụ: ha wee kwuluo aha Chineke ahụ onye nwere ike ịchị ihe otiti ndị a isi; ha echegharịghịkwa inye ya otuto.”—Mkpughe 16:8, 9.
12. Gịnị bụ “anyanwụ” nke ụwa nke a, gịnịkwa ka e nyere anyanwụ ihe atụ nke a ike ime?
12 Taa, n’oge ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a, ụmụnna ime mmụọ Jisọs ‘na-enwupụ dị ka anyanwụ n’alaeze nke Nna ha.’ (Matiu 13:40, 43) Jisọs n’onwe ya bụkwa “anyanwụ nke ezi omume.” (Malakaị 4:2) Otú ọ dị, ihe a kpọrọ mmadụ nwere “anyanwụ” nke ha, bụ́ ndị ọchịchị nke ha ndị na-agbalị inwupụ enwupụ n’ụzọ na-emegide Alaeze Chineke. Ụda opi nke anọ ahụ kpọsara na ‘anyanwụ, ọnwa, na kpakpando’ ndị dị n’eluigwe nke Krisendọm bụ n’ezie ebe e si enweta ọchịchịrị, ọ bụghị ìhè. (Mkpughe 8:12) Ugbu a, ọkwa nke anọ nke ọnụma Chineke na-egosi na “anyanwụ” nke ụwa nke a ga-emesịa dị ọkụ nke ukwuu n’ụzọ a na-apụghị ịnagide ya. Ndị ahụ e lekwasịrị anya dị ka ndị ndú yiri anyanwụ ‘ga-achagbu’ ihe a kpọrọ mmadụ. A ga-enye anyanwụ ihe atụ ahụ ike ime nke a. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, Jehova ga-ekwe ka nke a mee dị ka akụkụ nke ikpe ọmụma ya na-ere ka ọkụ megide ihe a kpọrọ mmadụ. N’ụzọ dị aṅaa ka nchagbu nke a siworo were ọnọdụ?
13. N’ụzọ dị aṅaa ka ndị ọchịchị ụwa yiri anyanwụ siworo “chagbuo” ihe a kpọrọ mmadụ?
13 Mgbe agha ụwa mbụ gasịrị, ndị ọchịchị ụwa nke a guzobere òtù League of Nations ná mgbalị iweta ịnọ ná ntụkwasị obi nke ụwa, ma ọ dara ada na nke ahụ. N’ihi ya, a nwalere ụdị ọchịchị ndị ọzọ dị iche iche, dị ka ọchịchị aka ike ndị Fascist na nke ndị Nazi. Ọchịchị kọmunism nọgidere na-agbasapụ. Kama ime ka ọnọdụ ụmụ mmadụ dịwanye mma, ndị ọchịchị ahụ yiri anyanwu n’usoro ọchịchị ndị a malitere ‘iji oké okpomọkụ chagbuo ndị mmadụ.’ Agha obodo ndị a lụrụ na Spain, Etiopia, na Manchuria dujere n’agha ụwa nke abụọ. Akụkọ ihe mere eme nke oge a dekọrọ na Mussolini, Hitler, na Stalin, dị ka ndị ọchịchị o kwusịa ọ gwụ, sitere n’ụzọ pụtara ìhè ma ọ bụ n’ụzọ ndị na-apụtachaghị ìhè kpata ọnwụ nke ọtụtụ iri nde mmadụ, gụnyere ọtụtụ ndị nke mba ha dị iche iche. N’oge na-adịbeghị oké anya, mburịta agha nke mba na ndị dị iche iche ‘achagbuwo’ ụmụ mmadụ ná mba ndị dị ka Vietnam, Kampuchea, Iran, Lebanon, na Ireland, tinyekwara ná mba ndị dị na Latin America na Africa. Tụkwasị na nke a, nsọrịta mpi ahụ nọgidere na-aga n’ihu n’etiti mba ndị ahụ bụ dike, ndị ngwá agha nuklia na-eyi egwu ha kwakọbara nwere ike irechapụ ihe nile a kpọrọ mmadụ n’ọkụ. N’ime mgbe ikpeazụ ndị a, e kpughewo ụmụ mmadụ nye “anyanwụ” na-achagbu achagbu n’ezie, bụ́ ndị ọchịchị ajọ omume ha. Mwụpụ nke ọkwa nke anọ nke ọnụma Chineke egosipụtawo eziokwu ndị a, ndị Chineke akpọsawokwa ha gburugburu ụwa.
14. Gịnị ka Ndịàmà Jehova nọgideworo na-akụzi na ọ bụ nanị ngwọta dịịrị nsogbu nile nke ihe a kpọrọ mmadụ, gịnịkwa bụ mmeghachi omume nke ihe a kpọrọ mmadụ n’ozuzu ha?
14 Ndịàmà Jehova anọgidewo na-ezi na nanị ngwọta dịịrị nsogbu ụmụ mmadụ bụ Alaeze Chineke, nke Jehova ga-eji doo aha ya nsọ. (Abụ Ọma 83:4, 17, 18; Matiu 6:9, 10) Otú ọ dị, n’ozuzu ha, ihe a kpọrọ mmadụ agbakụtawo ụzọ ngwọta nke a azụ. Ọtụtụ ndị na-ajụ Alaeze ahụ ekwuluwokwa aha Chineke, ọbụna dị ka Fero mere mgbe ọ jụrụ ịnakwere ịbụ ọkaaka nke Jehova. (Ọpụpụ 1:8-10; 5:2) Ebe ha na-enweghị mmasị ọ bụla n’Alaeze Mesaịa ahụ, ndị mmegide ndị a họọrọ ịnọgide n’ahụhụ n’okpuru “anyanwụ” ha nke na-enye oké okpomọkụ nke ọchịchị nchịgbu mmadụ.
Ocheeze nke Anụ Ọhịa Ahụ
15. (a) Na gịnị ka a wụsịrị ọkwa nke ise ahụ? (b) Gịnị bụ “ocheeze nke anụ ọhịa ahụ,” gịnịkwa ka ịwụsị ọkwa ahụ n’elu ya gụnyere?
15 N’elu gịnị ka mmụọ ozi nke ọzọ wụsara ọkwa ya? “Mmụọ ozi nke ise wee wụsịa ọkwa ya n’elu ocheeze nke anụ ọhịa ahụ.” (Mkpughe 16:10a) “Anụ ọhịa ahụ” bụ usoro ọchịchị nke Setan. Ọ dịghị ocheeze nkịtị o nwere, dịkwa ka anụ ọhịa ahụ n’onwe ya na-abụghị anụ ọhịa nkịtị. Otú ọ dị, eziokwu ahụ bụ́ na a kpọtụrụ ocheeze aha na-egosi na anụ ọhịa ahụ enwewo ike ọchịchị n’elu ihe a kpọrọ mmadụ; nke a kwekọrọ n’eziokwu ahụ nke bụ́ na okpueze na-adịkwasị n’isi nke ọ bụla nke anụ ọhịa ahụ. N’eziokwu, “ocheeze nke anụ ọhịa ahụ” bụ ntọala, ma ọ bụ isi iyi nke ike ọchịchị ahụ.b Bible na-ekpughe ọnọdụ bụ́ ezie nke ike ọchịchị nke anụ ọhịa ahụ mgbe o kwuru na ‘dragọn ahụ nyere anụ ọhịa ahụ ike ya, na ocheeze ya, na oké ịchịisi.’ (Mkpughe 13:1, 2; 1 Jọn 5:19) Otú a, mwụpụ nke ọkwa ahụ n’elu ocheeze nke anụ ọhịa ahụ metụtara mkpọsa nke na-ekpughe ihe bụ ezie Setan meworo, nọgidekwa na-eme n’ịkwado, na n’ịkwalite anụ ọhịa ahụ.
16. (a) Ònye ka mba nile na-ejere ozi, ma hà maara ya ma ọ bụ na ha amaghị? Kọwaa. (b) Olee ụzọ ụwa si na-egosipụta ụdị onye Setan bụ? (ch) Olee mgbe a ga-akwatu ocheeze anụ ọhịa ahụ?
16 Olee ụzọ e si na-akwado mmekọrịta nke a dị n’etiti Setan na mba nile? Mgbe Setan nwara Jisọs ọnwụnwa, o gosiri ya alaeze nile nke ụwa n’ọhụụ, wee kwe ya nkwa inye ya “ike a nile, na ebube ha.” Ma ọ dị ihe ọ chọrọ ka e buru ụzọ meere ya—Jisọs aghaghị ibu ụzọ daa kpọọ isiala n’ihu Setan. (Luk 4:5-7) Ànyị pụrụ iche na ọchịchị nile nke ụwa na-anata ike ha nile site n’ime ihe dị nta karị nke ahụ? Ọ dịghị ma ọlị. Dị ka Bible si kwuo, Setan bụ chi nke oge a, ya mere, ma mba nile hà maara ma ọ bụ na ha amaghị, ha na-efe ya ofufe. (2 Ndị Kọrint 4:3, 4)c A na-egosipụta ọnọdụ nke a n’ihe mejupụtara usoro ihe dị ugbu a, bụ́ nke e wukwasịrị n’ịkpa ókè nke ịhụ mba n’anya, ịkpọasị, na ịchọ ọdịmma onwe onye. A haziri ya n’ụzọ Setan si chọọ ya—iji mee ka o nwee ike ịdị na-achịkwa ụmụ mmadụ. Mmerụ nile dị n’ọchịchị, oké ọchịchọ inweta ike ọchịchị, mmekọrịta mba na mba nke dabeere n’okwu ụgha, ịsọrịta mpi mkpụpụta ngwá agha—ihe ndị a nile na-egosipụta otú Setan si rụọ arụ. Ụwa na-anakwere ụkpụrụ nile nke Setan ndị na-abụghị nke ezi omume, wee si otú a na-eme ka ọ bụrụ chi ya. A gaje ịkwatu ocheeze nke anụ ọhịa ahụ mgbe e bibiri anụ ọhịa ahụ n’onwe ya, Mkpụrụ nke nwanyị Chineke wee mesịa tụbakwa Setan n’onwe ya n’ime abyss.—Jenesis 3:15; Mkpughe 19:20, 21; 20:1-3.
Ọchịchịrị na Oké Ihe Mgbu
17. (a) Njikọ dị aṅaa dị n’etiti mwụpụ nke ọkwa nke ise ahụ na ọchịchịrị ime mmụọ nke nọgideworo na-ekpuchigide alaeze nke anụ ọhịa ahụ? (b) Olee ụzọ ụmụ mmadụ si meghachi omume ná mwụpụ nke ọkwa nke ise ahụ nke ọnụma Chineke?
17 Alaeze nke anụ ọhịa nke a anọwo n’ime ọchịchịrị ime mmụọ kemgbe ọ malitere ịdị adị. (Tụlee Matiu 8:12; Ndị Efesọs 6:11, 12.) Ọkwa nke ise ahụ na-emesiwanye ike ịma ọkwa ihu ọha banyere ọchịchịrị nke a. Ọbụna ọ na-eme ka a hụ onyinyo otú ọ ga-adị, n’ihi na a wụkwasịrị ọkwa nke a nke ọnụma Chineke kpọmkwem n’elu ocheeze nke anụ ọhịa ihe atụ ahụ. “E wee mee ka alaeze ya gbaa ọchịchịrị; ha wee tabie ire ha site n’ahụ ụfụ, ha wee kwuluo Chineke nke eluigwe site n’ahụ ụfụ nile ha na ọnyá nile ha; ha echegharịghịkwa isi n’ọrụ nile ha pụta.”—Mkpughe 16:10b, 11.
18. Nkwekọrịta dị aṅaa dị n’etiti ụda opi nke ise ahụ na ọkwa nke ise nke ọnụma Chineke?
18 Ụda opi nke ise ahụ abụchaghị nnọọ otu ihe kpọmkwem ya na ọkwa nke ise ahụ nke ọnụma Chineke, ebe ọ bụ na ụda opi ahụ mara ọkwa ihe otiti nke igurube. Ma, rịba ama na mgbe a tọhapụrụ ihe otiti ahụ nke igurube, e mere ka anyanwụ na ikuku gbaa ọchịchịrị. (Mkpughe 9:2-5) Ọzọkwa, n’Ọpụpụ 10:14, 15, anyị na-agụ banyere igurube ndị ahụ Jehova ji tie Ijipt ihe otiti, sị: “Ha dị arọ nke ukwuu; tupu ha ọ dịghị igurube dị otú a, dị ka igurube ahụ, mgbe ha gasịrị ọ gaghị adịkwa igurube otú a. Ha wee kpuchie ihu ala ahụ nile, ala wee gbaa ọchịchịrị.” Ee, ọ gbara ọchịchịrị! Taa, ọchịchịrị ime mmụọ dị n’elu ụwa apụtawo nnọọ ìhè n’ihi ọfụfụ nke opi nke ise ahụ na mwụpụ nke ọkwa nke ise ahụ nke ọnụma Chineke. Ozi ahụ na-agba agba nke ìgwè igurube nke oge a na-akpọsa na-ewetara ndị ajọ omume ahụ ihe otiti, bụ́ ndị ‘hụworo ọchịchịrị n’anya kama ìhè ahụ.’—Jọn 3:19.
19. N’ikwekọ ná Mkpughe 16:10, 11, gịnị ka mkpughe e kpughere Setan n’ihu ọha dị ka chi nke oge a kpatara?
19 Dị ka onye ọchịchị ụwa, Setan akpatawo oké enweghị obi ụtọ na ịta ahụhụ. Ụnwụ nri, agha, ime ihe ike, imempụ, iji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, ndụ na-adịghị ọcha, ọrịa mmekọahụ, emeghị ihe n’eziokwu, ihu abụọ nke ndị okpukpe—ndị a na ọtụtụ ihe ndị ọzọ ka e ji mara usoro ihe nke Setan. (Tụlee Ndị Galetia 5:19-21.) Ọbụna otú ahụ, mkpughe e kpugheworo Setan n’ihu ọha dị ka chi nke oge a akpatawo ihe mgbu na ihe ihere nye ndị ahụ na-adị ndụ dị ka ụkpụrụ ya nile si dị. “Ha wee tabie ire ha site n’ahụ ụfụ,” karịsịa n’ime Krisendọm. Ọ na-akpasu ọtụtụ ndị iwe na eziokwu ahụ na-ekpughe ụzọ ndụ ha. Ụfọdụ na-ahụ ya dị ka ihe na-eyi ha egwu, ha wee na-akpagbu ndị ahụ na-ekwusa ya. Ha na-ajụ Alaeze Chineke wee na-ekwulu aha nsọ Jehova. E kpughewo ọnọdụ ha nke ịbụ ndị nọ n’ọrịa n’ụzọ okpukpe, ndị ọnyá jukwara n’ahụ, nke mere ka ha na-ekwulu Chineke nke eluigwe. Ee e, ha ‘adịghị echegharị n’ọrụ ha nile.’ Ya mere, anyị apụghị ịtụ anya nchegharị ìgwè mmadụ tupu ọgwụgwụ usoro ihe nke a.—Aịsaịa 32:6.
Osimiri Yufretis Atakọọ
20. Olee ụzọ ma ụda opi nke isii ahụ na mwụpụ nke ọkwa nke isii ahụ si metụta osimiri Yufretis?
20 Ụda opi nke isii mara ọkwa ntọhapụ nke “ndị mmụọ ozi anọ ahụ ndị e keworo agbụ n’osimiri ukwu Yufretis.” (Mkpughe 9:14) Dị ka akụkọ ihe mere eme gosiri, Babilọn bụ obodo ukwu ahụ nke na-anọkwasị n’osimiri Yufretis. N’afọ 1919, e jikọtakwara ntọhapụ nke mmụọ ozi anọ ihe atụ ndị ahụ na ọdịda dị ukwuu nke Babilọn Ukwu ahụ. (Mkpughe 14:8) Ya mere, ọ bụ ihe e kwesịrị ịrịba ama na ọkwa nke isii nke ọnụma Chineke metụtakwara osimiri Yufretis: “Mmụọ ozi nke isii wee wụsịa ọkwa ya n’elu osimiri ukwu ahụ, bụ́ Yufretis; mmiri ya wee tasịa, ka e wee dozie ụzọ ndị eze ahụ ndị si n’ọwụwa anyanwụ bịa.” (Mkpughe 16:12) Nke a bụkwa akụkọ ọjọọ nye Babilọn Ukwu ahụ!
21, 22. (a) Olee otú mmiri osimiri Yufretis ahụ nke na-echebe Babilọn si takọọ n’afọ 539 T.O.A.? (b) Gịnị bụ “ọtụtụ mmiri” ahụ nke Babilọn Ukwu ahụ na-anọkwasị n’elu ya, oleekwa ụzọ mmiri ihe atụ ndị ahụ si na-atakọ ọbụna ugbu a?
21 N’oge Babilọn ochie ka nọ n’ọkwá ọchịchị, mmiri buru ibu nke osimiri Yufretis ahụ bụ otu akụkụ bụ́ isi nke usoro nchebe ya. N’afọ 539 T.O.A., mmiri ndị ahụ takọrọ mgbe onyendú ndị Peasia bụ́ Saịrọs chegharịrị ha ihu pụọ n’ebe ha si na-asọfebu. Otú a, e meghere ụzọ nye Saịrọs onye Peasia na Daraịọs onye Midia, bụ́ ndị eze sitere “n’ọwụwa anyanwụ bịa,” ịbata na Babilọn wee merie ya. N’oge a nọ n’oké mkpa, osimiri Yufretis ahụ dara ada n’ịbụ ihe nchebe nye obodo ukwu ahụ. (Aịsaịa 44:27–45:7; Jeremaịa 51:36) Ihe yiri nke a gaje ime Babilọn nke oge a, bụ́ usoro ihe zuru ụwa ọnụ nke okpukpe ụgha.
22 Babilọn Ukwu ahụ “na-anọkwasị n’ọtụtụ mmiri.” Dị ka Mkpughe 17:1, 15 gosiri, mmiri ndị a sere onyinyo “ndị dị iche iche, na ìgwè mmadụ, na mba dị iche iche, na asụsụ dị iche iche”—ìgwè ndị na-eso ụzọ ya ndị o leworo anya dị ka ihe nchebe. Ma “mmiri” ndị ahụ na-atakọsị ugbu a! N’Ọdịda Anyanwụ Europe, ebe o nweburu oké mmetụta n’ahụ ndị mmadụ, ọtụtụ narị nde mmadụ agbakụtawo okpukpe azụ n’ụzọ pụtara ìhè. Ná mba ụfọdụ, ruo ọtụtụ afọ, e nwere ụkpụrụ ime ihe ndị e kwupụtaworo ekwupụta iji nwaa ibibi mmetụta okpukpe nwere n’ahụ ụmụ mmadụ. Ìgwè ndị bi n’ala ndị ahụ emebeghị ihe ọ bụla iji chebe ya. N’otu aka ahụ, mgbe oge bịara maka ibibi Babilọn Ukwu ahụ, ọnụ ọgụgụ ndị òtù ya nke na-atalata atalata agaghị abụrụ ya ihe nchebe ọ bụla. (Mkpughe 17:16) Ọ bụ ezie na ọ na-ekwu na ya nwere ọtụtụ puku nde ndị òtù, Babilọn Ukwu ahụ ga-ahụ onwe ya dị ka onye nọ n’enweghị nchebe ọ bụla megide “ndị eze ahụ ndị si n’ọwụwa anyanwụ bịa.”
23. (a) Olee ndị bụ ndị eze ahụ si “n’ọwụwa anyanwụ” bịa na 539 T.O.A.? (b) Olee ndị bụ “ndị eze ahụ ndị si n’ọwụwa anyanwụ bịa” n’ụbọchị Onyenwe anyị, hà ga-esikwa aṅaa bibie Babilọn Ukwu ahụ?
23 Olee ndị bụ ndị eze ndị a? N’afọ 539 T.O.A. ha bụ Daraịọs onye Midia na Saịrọs onye Peasia, ndị Jehova jiri mee ihe imeri obodo Babilọn ochie ahụ. N’ime ụbọchị Onyenwe anyị nke a, ndị ọchịchị bụ mmadụ ga-ebibikwa usoro okpukpe ụgha nke Babilọn Ukwu ahụ. Ma ọzọkwa, nke a ga-abụ ikpe sitere n’aka Chineke. Jehova Chineke na Jisọs Kraịst, bụ́ “ndị eze ahụ ndị si n’ọwụwa anyanwụ bịa,” ga-etinyeworị n’obi ndị ọchịchị bụ mmadụ ‘echiche’ ichigharị megide Babilọn Ukwu ahụ wee bibie ya kpam kpam. (Mkpughe 17:16, 17) Mwụpụ nke ọkwa nke isii ahụ na-akpọsa n’ihu ọha na oge adịwo nso maka imezu ihe nke a e kpere n’ikpe!
24. (a) Olee ụzọ e siworo kpọsaa ihe dị n’ime ọkwa isii ndị mbụ nke ọnụma Jehova, gịnịkwa si na ya pụta? (b) Tupu ọ na-akọrọ anyị banyere ọkwa ikpeazụ ahụ nke ọnụma Chineke, gịnị ka akwụkwọ Mkpughe na-egosipụta?
24 Ọkwa isii ndị mbụ nke a nke ọnụma Jehova nwere ozi na-eme ka ahụ daa mmadụ jii. Ndị ohu Chineke nọ n’elu ala, site ná nkwado nke ndị mmụọ ozi, anọwo n’ọrụ n’ikwusa ihe dị n’ozi ndị ahụ gburugburu ụwa. N’ụzọ dị otú a, e nyewo akụkụ nile nke usoro ihe Setan dị n’ụwa ezi ịdọ aka ná ntị, Jehova enyewokwa ụmụ mmadụ n’otu n’otu ohere ịgbanwe gaa n’ezi omume ka ha wee nọgide na-adị ndụ. (Ezikiel 33:14-16) Ma, a ka nwere otu ọkwa nke ọnụma Chineke a na-awụpụbeghị. Ma tupu a gwa anyị ihe banyere ya, akwụkwọ Mkpughe gosiri otú Setan na ndị òtù ya nọ n’elu ala si na-anwa ime ihe ga-emegide mkpọsa nke ikpe nile nke Jehova.
Nchịkọta Bịa n’Amagedọn
25. (a) Gịnị ka Jọn na-agwa anyị banyere “ndị mmụọ” na-adịghị ọcha ndị yiri awọ? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka e siworo nwee mpụta na-asọ oyi nke “ndị mmụọ na-adịghị ọcha” n’ime ụbọchị Onyenwe anyị, gịnịkwa ka ọ kpataworo?
25 Jọn na-agwa anyị, sị: “M wee hụ ndị mmụọ atọ na-adịghị ọcha, dị ka awọ, ka ha na-esi n’ọnụ dragọn ahụ, sikwa n’ọnụ anụ ọhịa ahụ, sikwa n’ọnụ onye amụma ụgha ahụ, pụta: n’ihi na ha bụ mmụọ nke ndị mmụọ ọjọọ, na-eme ihe ịrịba ama dị iche iche; ndị na-apụkwuru ndị eze nke elu ụwa dum mmadụ bi, ime ka ha zukọọ ibu agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile.” (Mkpughe 16:13, 14) N’oge Mosis, Jehova wetaara Ijipt nke Fero na-achị ihe otiti na-asọ oyi nke awọ, nke mere na “ala ahụ wee na-esi ísì.” (Ọpụpụ 8:5-15) N’ime ụbọchị Onyenwe anyị, e nwewokwa ọbịbịa na-asọ oyi nke ihe ndị yiri awọ, ọ bụ ezie na ha sitere n’ebe ọzọ. Ihe mejupụtara ha bụ ‘mmụọ na-adịghị ọcha’ ndị nke Setan, ndị o doro anya na ha na-ese onyinyo mgbasa akụkọ ndị e dokwara iduru ndị ọchịchị bụ mmadụ bụ́ “ndị eze,” gaa n’ọnọdụ nke imegide Jehova Chineke. Setan si otú a na-eme ka o jide n’aka na mwụpụ nke ọkwa ndị ahụ nke ọnụma Chineke emeghị ka ha malite ichegharị echiche, kama ka ha guzosie ike n’akụkụ nke Setan mgbe “agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile” ga-amalite.
26. (a) N’ebe atọ dịgasị aṅaa ka mgbasa akụkọ Setan na-esi abịa? (b) Gịnị bụ “onye amụma ụgha ahụ,” ànyị sikwa aṅaa mara?
26 Mgbasa akụkọ ahụ sitere n’ọnụ “dragọn ahụ” (Setan) na “n’ọnụ anụ ọhịa ahụ” (usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke Setan guzobere n’elu ala), bụ́ ihe okike ndị anyị nụworo banyere ha mbụ n’akwụkwọ Mkpughe. Ma, gịnị bụ “onye amụma ụgha ahụ”? Nke a bụ onye ọhụrụ nanị n’aha. Tupu ugbu a, e gosiri anyị otu anụ ọhịa nke nwere mpi abụọ, nke yiri atụrụ ma na-eme oké ihe ịrịba ama dị iche iche n’ihu anụ ọhịa ahụ nwere isi asaa. Anụ ọhịa nduhie nke a na-emere anụ ọhịa ahụ dị ka onye amụma. Ọ na-akwalite ofufe nke anụ ọhịa ahụ, ọbụna na-eme ka e wuoro ya ihe oyiyi. (Mkpughe 13:11-14) Anụ ọhịa nke a nke nwere mpi abụọ nke yiri nwa atụrụ aghaghị ịbụ otu ihe ahụ ya na “onye amụma ụgha ahụ” a kpọtụrụ aha n’ebe a. N’ịkwado nke a, anyị mesịrị gụọ na onye amụma ahụ, dị ka anụ ọhịa ihe atụ ahụ nwere mpi abụọ, “na-eme ihe ịrịba ama ahụ n’ihu [anụ ọhịa ahụ nwere isi asaa], bụ́ nke o ji duhie ndị natararịị akara nke anụ ọhịa ahụ, na ndị na-akpọ isiala nye ihe oyiyi ya.”—Mkpughe 19:20.
27. (a) Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa nke bịara n’ezi oge ka Jisọs Kraịst n’onwe ya nyere? (b) Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka Jisọs nyere mgbe ọ nọ n’elu ala? (ch) Olee ụzọ Pọl onyeozi si kwupụtaghachi okwu ịdọ aka ná ntị ahụ nke Jisọs?
27 Ebe e nwere oké mgbasa akụkọ Setan jupụtara ebe nile otú a, okwu ndị ọzọ Jọn dekọrọ pụtara n’ezi oge n’ezie: “Lee, ana m abịa dị ka onye ohi. Ngọzi na-adịrị onye na-eche nche, na-edebekwa uwe ya, ka ọ ghara ijegharị n’ọtọ, ha wee hụ ihere ya.” (Mkpughe 16:15) Ònye na-abịa “dị ka onye ohi”? Ọ bụ Jisọs n’onwe ya, mgbe ọ na-abịa n’oge a na-amaghị ọkwa ya dị ka Onye Na-emezu ihe Jehova kpere n’ikpe. (Mkpughe 3:3; 2 Pita 3:10) Mgbe ọ ka nọ n’elu ala, Jisọs jikwara ọbịbịa ya tụnyere nke onye ohi, na-asị: “Ya mere, na-echenụ nche: n’ihi na unu amataghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa. N’ihi nke a, unu onwe unu bụrụkwa ndị e doziworo: n’ihi na n’oge hour nke unu na-echeghị ka Nwa nke mmadụ ga-abịa.” (Matiu 24:42, 44; Luk 12:37, 40) N’ikwughachi okwu ịdọ aka ná ntị nke a, Pọl onyeozi sịrị: “Dị ka onye ohi na-abịa n’abalị, otú a ka ụbọchị nke [Jehova, NW] na-abịa. Mgbe ha na-asị, Udo na ntụkwasị obi dị, mgbe ahụ na mberede ka mbibi na-abịakwasị ha.” Ọ bụ Setan na-akpali ndị mmadụ ime mkpọsa ụgha ọ bụla dị otú ahụ nke “Udo na ntụkwasị obi”!—1 Ndị Tesalọnaịka 5:2, 3.
28. Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka Jisọs nyere banyere iguzogide nrụgide nile nke ụwa, gịnị bụkwa “ụbọchị ahụ” nke ndị Kraịst na-achọghị ka ọ bịakwasị ha “dị ka ọnyà”?
28 Jisọs dọkwara aka ná ntị banyere ụdị nrụgide nke ụwa nke a, nke jupụtara ná mgbasa akụkọ ụgha dị iche iche, ga-ekpokwasị ndị Kraịst. Ọ sịrị: “Ma na-ezenụ onwe unu, ka a ghara iwere imebiga ajọ ihe ókè, na ịṅụbiga mmanya ókè, na nchegbu nke ndụ a, bogbuo obi unu ma eleghị anya, ụbọchị ahụ wee bịakwasị unu na mberede dị ka ọnyà. . . . Ma mụrụnụ anya n’oge ọ bụla, na-arịọ arịrịọ, ka unu wee ka n’ike ịgbanarị ihe nile ndị a nke gaje ime, na iguzo n’ihu Nwa nke mmadụ.” (Luk 21:34-36) “Ụbọchị ahụ” bụ “oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile.” (Mkpughe 16:14) Ka “ụbọchị ahụ” nke iwepụ ịbụ ọkaaka Jehova n’ụta na-abịaru nso, ọ na-abụ ihe na-esiwanye ike ịnagide nchegbu nile nke ndụ. Ọ dị mkpa ka ndị Kraịst nọrọ na nche, mụrụ anya ruo mgbe ụbọchị ahụ ga-abịaru.
29, 30. (a) Gịnị ka ịdọ aka ná ntị ahụ nke Jisọs pụtara nke bụ na a ga-emenye ndị a hụrụ ka ha na-ehi ụra ihere site n’ịbụ ndị “uwe” ha fụnarịrị? (b) Gịnị ka uwe na-egosi na onye yi ya bụ? (ch) Olee ụzọ mmadụ pụrụ isi tụfuo uwe ihe atụ ya, gịnịkwa ka ọ ga-akpata?
29 Ma, gịnị ka ọ pụtara bụ́ ịdọ aka ná ntị ahụ nke bụ na ndị e zutere mgbe ha na-ehi ụra ga-enweta ihe ihere n’ihi ịbụ ndị ‘uwe’ ha funarịrị? N’Israel oge ochie, onye nchụàjà ma ọ bụ onye Livaị ọ bụla nọ n’ọrụ nche n’ụlọ nsọ ahụ nwere ibu ọrụ dị ukwuu. Ndị na-akọ akụkọ banyere ndị Juu na-agwa anyị na ọ bụrụ na e jide onye ọ bụla ka ọ na-ehi ụra mgbe ọ nọ n’ọrụ dị otú ahụ, a pụrụ iyipụsị ya uwe ya ma suo ha ọkụ, ka e wee menye ya ihere n’ihu ọha.
30 N’ebe a, Jisọs na-adọ aka ná ntị na ihe dị otú ahụ pụkwara ime taa. Ndị nchụàjà na ndị Livaị sere onyinyo ụmụnna Jisọs e tere mmanụ. (1 Pita 2:9) Ma ịdọ aka ná ntị nke Jisọs metụtakwara oké ìgwè mmadụ ahụ. E zoro aka n’uwe ahụ iji mee ka a mara onye ọ bụla yi ya dị ka Onyeàmà Jehova nke na-eso ụzọ Kraịst. (Tụlee Mkpughe 3:18; 7:14.) Ọ bụrụ na ndị ọ bụla ekwere ka nrụgide nile sitere n’ụwa Setan mee ka ha malite ihi ụra ma ọ bụ kwụsị ịrụ ọrụ, o yiri ka uwe nke a aghaghị ifunarị ha—ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ịdị ọcha nke e ji mara ha dị ka ndị Kraịst ga-efunarị ha. Ọnọdụ dị otú ahụ ga-abụ ihe ihere. Ọ ga-etinye mmadụ n’ihe ize ndụ nke ịbụ onye ihe nile funarịrị.
31. (a) Olee ụzọ Mkpughe 16:16 si mesie ike mkpa ọ dị ka ndị Kraịst mụrụ anya? (b) Nchepụta echiche dịgasị aṅaa ka ndị ndú okpukpe meworo banyere Amagedọn?
31 Mkpa nke ndị Kraịst ịnọgide na nche na-apụtawanye ìhè dị ka ihe dị oké mkpa ka amaokwu na-esonụ nke akwụkwọ Mkpughe na-abịaru mmezu ya nso: “Ha [mmụọ nke ndị mmụọ ọjọọ ahụ] wee mee ka ha [ndị eze ụwa ma ọ bụ ndị ọchịchị] zukọọ n’ebe ahụ nke a na-akpọ n’asụsụ Hibru Ha–Magedọn.” (Mkpughe 16:16) Aha nke a, nke a na-akpọkarị Amagedọn, pụtara nanị otu ebe n’ime Bible. Ma ọ kpaliwo echiche nke ihe a kpọrọ mmadụ nke ukwuu. Ndị ndú ụwa adọwo aka ná ntị banyere Amagedọn nke agha nuklia nke e chere na ọ pụrụ ime eme. E jikọtawokwa Amagedọn na obodo ochie ahụ bụ Megido, bụ́ ebe a nọrọ buo ọtụtụ agha ndị siri ike n’oge Bible. N’ihi nke a, ụfọdụ ndị ndú okpukpe echewo na agha ikpeazụ a ga-alụ n’elu ala ga-ewere ọnọdụ n’ebe ahụ dị nta. Na nke a, ha anọtụghị eziokwu ahụ nso ma ọlị.
32, 33. (a) Kama ịbụ ebe nkịtị, gịnị ka aha ahụ bụ Ha–Magedọn, ma ọ bụ Amagedọn, nọchiri anya ya? (b) Okwu ndị ọzọ dịgasị aṅaa dị na Bible yiri “Amagedọn” ma ọ bụ nwere njikọ n’etiti ha na ya? (ch) Olee mgbe oge ga-eru ka mmụọ ozi nke asaa wụpụ ọkwa nke ikpeazụ nke ọnụma Chineke?
32 Aha ahụ bụ Ha–Magedọn pụtara “Ugwu nke Megido.” Ma, kama ịbụ ebe nkịtị, ọ nọchiri anya ọnọdụ zuru ụwa ọnụ nke a na-achịbata mba nile n’ime ya imegide Jehova Chineke, bụkwa ọnọdụ nke ọ ga-anọ na ya wetara ha nile mbibi ikpeazụ. Nke a metụtara elu ala nile. (Jeremaịa 25:31-33; Daniel 2:44) O yiri “ebe nzọcha mkpụrụ vine ahụ, nke dị ukwuu, bụ́ nke ọnụma Chineke” na “ndagwurugwu mkpebi ikpe,” ma ọ bụ “ndagwurugwu Jehoshefat,” bụ́ ebe a chịkọtara mba nile ka Jehova wee bibie ha. (Mkpughe 14:19; Joel 3:12, 14) E jikọtakwara ya na “ala Israel” bụ́ ebe a ga-anọ bibie usuu ndị agha Setan nke Gọg onye Megọg, nakwa ebe ahụ dị “n’etiti oké osimiri nile na ugwu nsọ ahụ mara mma,” bụ́ ebe eze ugwu ahụ ga-anọ wee ‘bịaruo ọgwụgwụ ya’ n’aka Maịkael onyeisi ukwu ahụ.—Ezikiel 38:16-18, 22, 23; Daniel 11:45–12:1.
33 Mgbe e duuru mba nile banye n’ọnọdụ nke a site n’ajọ mgbasa akụkọ ahụ nke sitere n’ebe Setan na ndị ọrụ ya nọ n’elu ala dị, oge ga-eru ka mmụọ ozi nke asaa wụpụ ọkwa nke ikpeazụ ahụ nke ọnụma Chineke.
“E Mewo Ya”
34. N’elu gịnị ka mmụọ ozi nke asaa ahụ wụpụrụ ọkwa nke ya, mkpọsa dị aṅaa sitekwara ‘n’ụlọ nsọ ahụ na n’ebe ocheeze ahụ dị’ dapụta?
34 “Mmụọ ozi nke asaa wee wụsịa ọkwa ya n’elu mbara eluigwe; oké olu wee si n’ụlọ nsọ ahụ dapụta, si n’ebe ocheeze ahụ dị, na-asị, E mewo ya.”—Mkpughe 16:17.
35. (a) Gịnị bụ ‘ikuku’ nke Mkpughe 16:17? (b) N’ịwụpụ ọkwa ya n’elu ikuku, gịnị ka mmụọ ozi nke asaa ahụ na-egosipụta?
35 ‘Ikuku’ bụ ihe ikpeazụ e ji akwado ndụ nke a ga-eti ihe otiti. Ma nke a abụghị ikuku efu. Ọ dịghị ihe ọ bụla metụtara ikuku efu nke mere ka o kwesị ịnata ajọ ikpe ọmụma Jehova, dịkwa ka elu ala nkịtị, osimiri, ebe e si enweta mmiri dị ọcha, ma ọ bụ anyanwụ na-ekwesịghị ịnata ahụhụ ikpe ọmụma sitere n’aka Jehova. Kama nke ahụ, nke a bụ ‘ikuku’ ahụ nke Pọl na-ekwu okwu banyere ya mgbe ọ kpọrọ Setan “onyeisi nke ike nke mbara eluigwe.” (Ndị Efesọs 2:2) Ọ bụ ‘ikuku’ Setan ahụ nke ụwa na-ekuru taa, bụ́ mmụọ nke mkpali echiche zuru ebe nile, nke e ji mara usoro ihe ajọ omume nke a, ụdị echiche Setan nke jupụtara n’akụkụ nile nke ndụ n’ebe ndị na-adịghị n’ime nzukọ Jehova. Ya mere, n’ịwụpụ ọkwa ya n’ikuku, mmụọ ozi nke asaa na-egosipụta ọnụma Chineke megide Setan, nzukọ ya, na ihe nile nke na-akpali ụmụ mmadụ ịkwado Setan n’iguzogide ịbụ ọkaaka nke Jehova.
36. (a) Gịnị ka ihe otiti asaa ahụ mejupụtara? (b) Gịnị ka nkwupụta okwu Jehova gosiri, nke bụ: “E mewo ya”?
36 Nke a na ihe otiti isii ndị bu ya ụzọ na-enye nchịkọta nke ikpe ọmụma Jehova megide Setan na usoro ihe nke ya. Ha bụ mkpọsa nke ndakpọ nye Setan na mkpụrụ ya. Mgbe a wụpụrụ ọkwa nke ikpeazụ nke a, Jehova n’onwe ya na-ekwupụta, sị: “E mewo ya.” Ọ dịghị ihe ọzọ fọdụrụ ikwu. Mgbe a kpọsazuru ihe ndị dị n’ọkwa ndị ahụ nke ọnụma Chineke ruo otú Jehova chọrọ ya, a gaghị egbu oge ọ bụla n’imezu ihe ndị o kpere n’ikpe, bụ́ ndị a kpọsara n’ozi ndị a.
37. Olee ụzọ Jọn si kọwaa ihe mere mgbe a wụpụsịrị ọkwa nke asaa nke ọnụma Chineke?
37 Jọn gara n’ihu, sị: “Àmụ̀mà, na olu, na égbè eluigwe, wee soo; oké ala ọma jijiji sokwara, nke ala ọma jijiji dị otú a [na-adịbeghị] mgbe ọ bụla site na mgbe mmadụ pụtara n’elu ụwa, ala ọma jijiji dị ukwuu otú a, oké ala ọma jijiji dị otú a. E wee kewaa obodo ukwu ahụ ụzọ atọ, obodo nile nke mba nile wee daa: e wee cheta Babilọn Ukwu ahụ n’ihu Chineke, inye ya iko nke mmanya nke ọnụma nke iwe ya. Agwaetiti nile ọ bụla wee gbalaga, a hụghịkwa ugwu nile ọzọ. Oké akụ mmiri igwe, nke hà ka talent n’arọ n’otu n’otu, na-esikwa n’eluigwe rịdata n’ahụ mmadụ: mmadụ wee kwuluo Chineke site n’ihe otiti nke akụ mmiri igwe ahụ; n’ihi na ihe otiti ya dị ukwuu hie nne.”—Mkpughe 16:18-21.
38. Gịnị ka ihe ndị a sere onyinyo ha (a) “oké ala ọma jijiji”? (b) eziokwu ahụ nke bụ na “obodo ukwu ahụ,” bụ́ Babilọn Ukwu ahụ, kewara “ụzọ atọ”? (ch) eziokwu ahụ nke bụ na ‘agwaetiti nile ọ bụla gbalagara, a hụghịkwa ugwu nile ọzọ’? (d) “ihe otiti nke akụ mmiri igwe ahụ”?
38 Ọzọkwa, Jehova na-eme ihe pụtara ìhè n’ebe ụmụ mmadụ nọ, “àmụ̀mà, na olu, na égbè eluigwe” na-egosipụtakwa nke a. (Tụlee Mkpughe 4:5; 8:5.) A ga-eme ka ihe a kpọrọ mmadụ mee mkpatụ n’ụzọ a na-emebeghị ya mbụ, dị ka à ga-asị na ọ bụ site n’ala ọma jijiji nke na-ebibi ihe. (Tụlee Aịsaịa 13:13; Joel 3:16.) Oké ime mkpatụ nke a ga-eme ka “obodo ukwu ahụ,” bụ́ Babilọn Ukwu ahụ, dakpọsịa nke mere na e kewara ya “ụzọ atọ”—bụ́ ihe na-ese onyinyo ndakpọ ya gaa ná mbibi a na-apụghị imekwata emekwata. Ọzọkwa, “obodo nile nke mba nile” ga-ada. “Agwaetiti nile ọ bụla” na “ugwu nile”—òtù na nzukọ nile ndị yiri ihe na-adịgide adịgide n’ime usoro ihe nke a—ga-agabiga. “Oké akụ mmiri igwe,” bụ́ nke dị ukwuu karị ndị ahụ mekpara Ijipt ahụ n’oge ihe otiti nke asaa ahụ, nke nke ọ bụla n’ime ha haruru ka otu talent n’ịdị arọ, ga-eti ihe a kpọrọ mmadụ ihe otiti n’ụzọ na-eweta ihe mgbu.d (Ọpụpụ 9:22-26) Mwụpụ nke a na-enye ahụhụ nke mmiri kpụkọrọ akpụkọ yiri ka ò sere onyinyo okwu ikpe ọmụma Jehova ndị siri oké ike, ndị na-ama ọkwa na ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a abịaruwo n’ikpeazụ! Jehova pụkwara iji akụ mmiri igwe nkịtị mee ihe n’ọrụ mbibi ya.—Job 38:22, 23.
39. N’agbanyeghị mwụpụ nke ihe otiti asaa ahụ, ụzọ dị aṅaa ka ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ ga-agbaso?
39 Otú a, ụwa Setan ga-ezute ikpe ezi omume nke Jehova. Ruokwa ọgwụgwụ, ihe ka ọtụtụ n’ihe a kpọrọ mmadụ ga-anọgide na-eguzogide, na-ekwulukwa Chineke. Dị ka ọ dị n’ihe banyere Fero nke oge ochie, a gaghị eme ka obi ha dị nro site n’ihe otiti ndị a nọgidere na-abịa ma ọ bụ site ná ngwụsị na-eweta ọnwụ nke ihe otiti ndị ahụ. (Ọpụpụ 11:9, 10) A gajeghị inwe mgbanwe obi nke ìgwè mmadụ mgbe ọ fọrọ nke nta ka oge gabiga. Ha ga-eji ọbụna ume ikpeazụ ha na-eku kwuluo Chineke, bụ́ onye na-ekwupụta, sị: “Ha ewee mara na mụ onwe m bụ Jehova.” (Ezikiel 38:23) Otú ọ dị, a ga-ewepụworị ịbụ ọkaaka nke Jehova Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile n’ụta.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Maka ihe atụ dị iche iche nke ihe ndị na-adịghị ndụ ịnọ dị ka ihe àmà ma ọ bụ ịgba akaebe, tụlee Jenesis 4:10; 31:44-53; Ndị Hibru 12:24.
b E jikwa okwu ahụ bụ́ “ocheeze” mee ihe n’ụzọ dị otú a n’okwu ahụ a gwara Jisọs n’ụzọ amụma: ‘Chineke bụ ocheeze gị ruo mgbe nile ebighị ebi.’ (Abụ Ọma 45:6) Jehova bụ isi iyi, ma ọ bụ ntọala nke ike ọchịchị Jisọs.
c Leekwa Job 1:6, 12; 2:1, 2; Matiu 4:8-10; 13:19; Luk 8:12; Jọn 8:44; 12:31; 14:30; Ndị Hibru 2:14; 1 Pita 5:8.
d Ọ bụrụ na ihe Jọn bu n’uche bụ talent nke ndị Grik, nke ọ bụla n’ime akụ mmiri igwe ahụ ga-eru ihe dị ka 20 kilogram n’ịdị arọ. Ọ ga-abụ mwụpụ akụ mmiri igwe ga-akpata oké mbibi.
Igbe dị na peeji nke 221]
“N’ime Ụwa”
Òtù Jọn ahụ akpọsawo ọnụma Jehova megide elu “ụwa” site n’okwu ndị dị ka ndị a:
“Mgbe ọtụtụ narị afọ nke ime mgbalị gasịworo, òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị iche iche egosipụtawo na ha enweghị ike idozi ọnọdụ ndị dị ugbu a ma gboo mkpa ndị na-enye ụmụ mmadụ nsogbu. Ndị ọkà n’ihe banyere akụ na ụba na ndị ọchịchị, ndị ji ezi nlezianya na-atụle okwu ahụ, na-achọpụta na ọ dịghị ihe ọ bụla ha nwere ike ime.”—Millions Now Living Will Never Die, 1920, peji nke 61.
“E nweghị ọchịchị ọ bụla dị n’elu ala taa nke na-egbo mkpa akụkụ buru ibu nke ndị bi n’elu ụwa. Ndị ọchịchị aka ike na-achị ọtụtụ mba. A pụrụ nnọọ ikwu na ụwa dum adakpọwo.”—A Desirable Government, 1924, peji nke 5.
“Iweta ọgwụgwụ nke usoro ihe dị iche iche nke a . . . bụ nanị ụzọ a ga-esi wezụgasịa ihe ọjọọ n’ụwa wee mee ka ọnọdụ dịrị udo na ezi omume ịba ụba.”—“Ozi Ọma nka nke Ala-Eze,” 1955, peji nke 24.
“Ndokwa ụwa nke ugbu a emewo ka a rịba ya ama site n’ịmụba mmehie, ajọ omume na nnupụisi megide Chineke na uche ya. . . . O nweghị mmezite. N’ihi ya, ọ ghaghị ịpụ!”—Ụlọ Nche, May 15, 1982, peji nke 6.
Igbe dị na peeji nke 223]
“N’ime Oké Osimiri”
Ihe ndị na-esonụ bụ nanị ole na ole n’okwu ndị òtù Jọn ahụ bipụtara n’afọ ndị gara aga, na-akpọsa ọnụma Chineke megide “oké osimiri” nọ n’ọgba aghara, nke na-enupụ isi, nke ihe a kpọrọ mmadụ na-adịghị asọpụrụ Chineke, ndị gbakụtara Jehova azụ:
“Akụkọ nke mba ọ bụla na-egosi na ọ bụwo mburịta agha n’etiti òtù dị iche iche. Ọ bụwo nke mmadụ ole na ole megide ọtụtụ ndị. . . . Agha ndị a akpatawo ọtụtụ mgbanwe ọchịchị, oké ahụhụ, na mwụfu ọbara dị ukwuu.”—Government, 1928, peji nke 244.
N’ụwa ọhụrụ ahụ, “‘oké osimiri’ ihe atụ ahụ nke mmadụ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke, ndị nọ n’ọgba aghara ma na-enupụ isi, ndị anụ ọhịa ihe atụ ahụ sitererịị n’etiti ha rịgoo eri ogologo oge gara aga ka Ekwensu wee jiri ya mee ihe, ga-apụ n’anya.”—Ụlọ Nche [Bekee], September 15, 1967, peji nke 567.
“Ọha mmadụ dị ugbu a nọ n’ọrịa ime mmụọ. Ọ dịghị onye n’ime anyị pụrụ ịzọpụta ya, n’ihi na Okwu Chineke gosiri na ọrịa ya ga-eduje n’ọnwụ ya.”—True Peace and Security—From What Source?, 1973, peji nke 131.
Igbe dị na peeji nke 224]
“N’ime Osimiri Nile na Isi Iyi Nile”
Ihe otiti nke atọ ekpughewo “osimiri nile na isi iyi nile nke mmiri nile” site n’okwu ndị dị ka ndị na-esonụ:
“Ndị ụkọchukwu, ndị na-asị na ha na-akụzi ozizi [Kraịst], edowo agha nsọ, meekwa ka ọ bụrụ ihe dị nsọ. Ọ tọwo ha ụtọ ịhụ ka e guzobere ihe osise na ihe ọkpụkpụ ha n’akụkụ nke ndị dike n’agha.”—Ụlọ Nche [Bekee], September 15, 1924, peji nke 275.
“Ihe mmụọ [mgbaasị] bụ nke e guzobere n’otu nnukwute okwu ụgha bụ́ na mmadụ na-adịgide ndụ mgbe ọ nwụsịrị na nke anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi mmadụ.”—What Do the Scriptures Say About “Survival After Death?,” 1955, peji nke 51.
“Nkà ihe ọmụma ụmụ mmadụ, ndị ọkà ná nchepụta ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndị nhazi nke ọha mmadụ, ndị na-atụ aro n’okwu akụ na ụba na ndị na-akwado omenala okpukpe ewetabeghị ume ọhụrụ na-enye ndụ n’ezie . . . Mmiri ndị dị otú ahụ eduruwo ndị na-aṅụ ha ọbụna gaa n’imebi iwu Onye Okike ahụ banyere ịdị nsọ nke ọbara nakwa n’itinye aka ná mkpagbu okpukpe.”—Nkwupụta okwu nke a nabatara ná Mgbakọ Mba Nile nke “Ozi Ọma Ebighị Ebi,” 1963.
“Ọ bụghị nzọpụta nke ọkà ihe ọmụma, kama mbibi nke agbụrụ mmadụ bụ ihe a na-atụ anya ya site n’aka mmadụ n’onwe ya. . . . Anyị apụghị ile anya n’ebe ndị ọkà n’akparamagwa mmadụ na ndị dibịa na-agwọ ọrịa uche nke ụwa nọ ịgbanwe ụzọ iche echiche nke ihe a kpọrọ mmadụ . . . Anyị apụghị ịdabere n’òtù ndị uwe ojii nke mba nile nke a gaje iguzobe . . . ime ka ala nke a bụrụ ebe dị n’udo nke a ga-ebi n’ime ya.”—Izọputa Àb̧urù Madu n’Uzọ Ala-Eze, 1972, peji nke 5.
Igbe dị na peeji nke 225]
“N’elu Anyanwụ”
Ebe “anyanwụ” nke ọchịchị mmadụ ‘chagbuworo’ ihe a kpọrọ mmadụ n’ime ụbọchị Onyenwe anyị, òtù Jọn ahụ ejiriwo okwu ndị yiri ndị a dọrọ uche gaa n’ihe na-emenụ:
“Taa, Hitler na Mussolini, ndị ọchịchị aka ike na-eme otú masịrị ha, na-eyi udo nke ụwa dum egwu, Ndị Isi Roman Katọlik na-enyekwa ha nkwado zuru ezu ná mbibi ha na-ebibi nnwere onwe.”—Fascism or Freedom, 1939, peji nke 12.
“N’akụkọ ihe mere eme dum, ụkpụrụ nke ndị ọchịchị aka ike bụ́ mmadụ gbasoworo abụwo, Chịa ma ọ bụ bibie! Ma iwu nke Eze Chineke dokwasịworo n’ocheeze, bụ́ Jisọs Kraịst, ga-eji mee ihe ugbu a banyere elu ala dum bụ, Kwere ka a chịa gị, ma ọ bụ e bibie gị.”—When All Nations Unite Under God’s Kingdom, 1961, peji nke 23.
‘Eri 1945, ihe karịrị nde mmadụ 25 abụrụwo ndị e gburu n’ime 150 agha ndị a lụworo na gburugburu ụwa.’—Ụlọ Nche, July 15, 1980, peji nke 6.
“Mba nile nke ụwa . . . adịghị elebara ihe ha kwesịrị ime n’ụwa ma ọ bụ ụkpụrụ omume ọma anya. Iji wee mezuo ọchịchọ ha, mba ụfọdụ na-eche na o ziri ezi ha iji ụzọ ọ bụla ha chere na ọ dị mkpa mee ihe—mgbukpọ ndị nkịtị, igbu ndị ọchịchị n’ike, ijichi ụgbọ elu, ịtụgbusị ndị mmadụ na bọmbụ, na ihe ndị ọzọ . . . Ruo ole mgbe ka mba nile ga-anagiderịta onwe ha n’ụdị omume nzuzu dị otú a?”—Ụlọ Nche, August 15, 1985, peji nke 4.
Igbe dị na peeji nke 227]
“N’elu Ocheeze nke Anụ Ọhịa Ahụ”
Ndịàmà Jehova ekpughewo ocheeze nke anụ ọhịa ahụ, kpọsaakwa ọmụma ikpe Jehova megide ya site n’okwu ndị dị ka ndị a:
“Ndị isi na ndị ndú nke mba nile nọ n’okpuru ike ọjọọ karịrị mmadụ elu ndị na-achị ha aga igbu onwe ha n’agha mkpebi ikpe nke Amagedọn.”—Ha–Magedon Gasia—Uwa Ọhu nke Chineke, 1956, peji nke 7.
“‘Anụ ọhịa’ ahụ, ya bụ ọchịchị mmadụ guzobere ọ bụghị Chineke, natara ike ya na ịbụ isi ya na ocheeze ya n’aka Dragọn ahụ. Ya mere ọ ghaghị irube isi nye ụkpụrụ Dragọn ahụ tụọrọ ya.”—Ha–Magedon Gasia—Uwa Ọhu nke Chineke, 1956, peji nke 15.
“Mba ndị Jentaịl pụrụ ịchọta onwe ha nanị . . . n’akụkụ nke Onyeiro Bụ Isi nke Chineke, Setan bụ́ Ekwensu.”—Nkwupụta okwu nke a nabatara ná Mgbakọ Mba Nile nke “Mmeri Chineke,” 1973.
Igbe dị na peeji nke 229]
“Mmiri Ya Wee Tasịa”
Ọbụna ugbu a, nkwado a na-enye okpukpe Babilọn na-atakpọsị n’ọtụtụ ebe, na-egosi ihe ga-emenụ mgbe “ndị eze ahụ ndị si n’ọwụwa anyanwụ bịa” ga-ebuso ya agha.
“Nnyocha e mere na gburugburu mba nke a chọpụtara na 75 pasent nke ndị bi n’ebe ndị mepere emepe [nke Thailand] adịghị aga n’ụlọ nsọ ndị Buddha ije nụrụ okwuchukwu, ebe ọnụ ọgụgụ ndị bi n’ime obodo ndị na-eje n’ụlọ nsọ ndị ahụ ka nọgidekwara na-adalata ruo ihe dị ka pasent iri ise.”—Bangkok Post, September 7, 1987, peji nke 4.
“Okpukpe Tao enwekwaghị ike anwansị n’ala [China] ebe a malitere ya ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga. . . . Ebe ha na-enwekwaghị ihe anwansị nke ha na ndị bu ha ụzọ ji nweta ọtụtụ ndị òtù, ndị ụkọchukwu na-ahụ na e nweghị ndị ga-anọchi ha, na-eche ihu ngwụchapụ nke okpukpe Tao dị ka otu n’ime okpukpe ndị bụ́ isi a haziri ahazi.”—The Atlanta Journal and Constitution, September 12, 1982, peji nke 36-A.
“Japan . . . nwere otu n’ime ọnụ ọgụgụ kasị elu n’ụwa nke ndị ozi ala ọzọ, ihe chọrọ iru 5,200, ma . . . ihe na-erughị 1% nke ndị bi na ya bụ ndị Kraịst. . . . Otu ụkọchukwu òtù Francis nke na-arụ ọrụ ebe ahụ kemgbe afọ ndị 1950 . . . chere na ‘ụbọchị nke ozi ala ọzọ na Japan agwụsịwo.’”—The Wall Street Journal, July 9, 1986, peji nke 1.
N’England n’ime iri afọ atọ gara aga, “e mechiwo ihe chọrọ iru 2,000 n’ime 16,000 chọọchị Anglikan n’ihi e jikwaghị ha eme ihe. Ọnụ ọgụgụ ndị na-aga chọọchị adalatawo ruo ná ndị kasị ala ná mba ndị sị na ha bụ ndị Kraịst. . . . ‘England abụghịzi mba e ji Iso Ụzọ Kraịst mara,’ [ka Bishọp nke Durham] sịrị.”—The New York Times, May 11, 1987, peji nke A4.
“Mgbe ọtụtụ hour nke oké ịrụ ụka gasịrị, Nzukọ Ome Iwu [nke Gris] kwadoro iwu ahụ taa, na-enye Ọchịchị Socialist ikike iweghara mbara ala dị ukwuu nke Chọọchị Greek Orthodox nwebu . . . E wezụgakwa nke ahụ, iwu ahụ mere ka ndị na-abụghị ndị ụkọchukwu na-eduzi kansụl na kọmitii chọọchị ndị ọ bụ ọrụ ha ilekọta ihe ndị chọọchị ji enweta ego bụ́ ndị gụnyere họtel, ebe ndị a na-agbarisị nkume na ọtụtụ ọfis.”—The New York Times, April 4, 1987, peji nke 3.
[Foto ndị dị na peeji nke 222]
Ọkwa anọ ndị mbụ nke ọnụma Chineke wetara ihe otiti ndị yiri ndị ahụ sitere n’ụda opi anọ ndị ahụ
[Foto dị na peeji nke 226]
Ọkwa nke ise ahụ na-ekpughe na ocheeze nke anụ ọhịa ahụ bụ ike Setan nyeworo anụ ọhịa ahụ
[Foto ndị dị na peeji nke 231]
Mgbasa akụkọ sitere n’ọnụ ndị mmụọ ọjọọ na-achịkọta ndị ọchịchị ụwa bịa n’ọnọdụ ahụ e lekwasịrị anya, bụ́ Ha–Magedọn, ebe a ga-anọ wụkwasị ha ikpe ọmụma Jehova
[Foto dị na peeji nke 233]
Ndị ‘ikuku’ e merụrụ emerụ nke Setan na-eduzi aghaghị inwe ahụhụ nke ịnata mmezu nke ikpe ezi omume Jehova