Isi nke 28
Ịlụso Ajọ Anụ Ọhịa Abụọ Ọgụ
Ọhụụ 8—Mkpughe 13:1-18
Isiokwu: Anụ ọhịa ahụ nwere isi asaa, anụ ọhịa ahụ nwere mpi abụọ na ihe oyiyi nke anụ ọhịa ahụ
Oge mmezu ya: Malite n’oge Nimrọd ruo oké mkpagbu ahụ
1, 2. (a) Gịnị ka Jọn kwuru banyere dragọn ahụ? (b) Olee ụzọ Jọn si were okwu ihe atụ kọwaa nzukọ a na-ahụ anya nke dragọn ahụ ji na-eme ihe?
A CHỤDATAWO dragọn ukwu ahụ n’ụwa! Ọmụmụ anyị na-amụ akwụkwọ Mkpughe mere ka o doo anya na ọ dịghị mgbe ọ bụla ọzọ a ga-ekwere ka Agwọ ahụ ma ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ na-eso ụzọ ya bataghachi n’eluigwe. Ma, ihe banyere “onye a na-akpọ Ekwensu na Setan, onye na-eduhie ụwa nile mmadụ bi” agwụchabeghị. Ihe ndekọ ahụ gara n’ihu ịkọwa n’ụzọ doro anya karị ihe Setan jiri mee ihe n’ịlụ ọgụ megide ‘nwanyị ahụ na mkpụrụ ya.’ (Mkpughe 12:9, 17) Jọn kwuru banyere dragọn ahụ yiri agwọ, sị: “O wee guzo n’ájá oké osimiri.” (Mkpughe 13:1a) Ya mere, ka anyị kwụsịtụ wee nyochaa ụzọ dragọn ahụ si arụ ọrụ.
2 Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya apụkwaghị inye nsogbu ọzọ n’eluigwe nke dị nsọ. A chụpụwo ajọ mmụọ ndị ahụ site n’eluigwe, wee kpaara ha ókè ịnọ na gburugburu elu ala. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ bụ nke a kpatara oké mmụba e nwere n’ihe omume mgbaasị n’oge a. Agwọ aghụghọ ahụ ka nọgidekwara na-enwe nzukọ ndị mmụọ e merụrụ emerụ. Ma, ọ̀ na-ejikwa nzukọ a na-ahụ anya na-eme ihe iji duhie ihe a kpọrọ mmadụ? Jọn kọọrọ anyị, sị: “M wee hụ anụ ọhịa ka ọ na-esi n’oké osimiri rịgopụta, na-enwe mpi iri na isi asaa, na-ekpukwa okpueze iri n’elu mpi ya, na-enwekwa aha ụfọdụ nke nkwulu Chineke n’elu isi ya. Anụ ọhịa nke m hụrụ yikwara agụ, ụkwụ ya dịkwa ka ụkwụ bear, ọnụ ya dịkwa ka ọnụ ọdụm: dragọn ahụ wee nye ya ike ya, na ocheeze ya, na oké ịchịisi.”—Mkpughe 13:1b, 2.
3. (a) Ajọ anụ ọhịa dịgasị aṅaa ka Daniel onye amụma hụrụ n’ọhụụ? (b) Gịnị ka nnukwu anụ ọhịa ndị ahụ ndị dị na Daniel 7 nọchiri anya ha?
3 Gịnị bụ anụ ọhịa nke a jọrọ njọ ile anya? Bible n’onwe ya na-enye azịza ya. Tupu ọdịda Babilọn n’afọ 539 T.O.A., onye Juu ahụ bụ Daniel onye amụma hụrụ ọhụụ ndị metụtara ajọ anụ ọhịa dị iche iche. Na Daniel 7:2-8, ọ kọwara anụ ọhịa anọ ndị si n’oké osimiri rịgopụta, nke mbụ yiri ọdụm, nke abụọ yiri bear, nke atọ yiri agụ, “ma lee, otu anụ, nke mere ha anọ, nke dị egwu, nwee ume, dịkarịsiri ike; . . . o nwekwara mpi iri.” Nke a yiri nnọọ anụ ọhịa ahụ Jọn hụrụ n’ihe dị ka afọ 96 O.A. Anụ ọhịa ahụ nwekwara akụkụ ahụ ndị yiri nke ọdụm, bear, na agụ, o nwekwara mpi iri. Gịnị bụ anụ ukwu ndị ahụ Daniel hụrụ? Ọ kọọrọ anyị, sị: “Anụ ukwu ndị a, . . . bụ eze anọ, ndị ga-esi n’ala bilie ọtọ.” (Daniel 7:17) Ee, anụ ndị ahụ nọchiri anya ‘ndị eze,’ ma ọ bụ ike ọchịchị dị iche iche dị n’elu ala.
4. (a) Na Daniel 8, gịnị ka ebulu na mkpi ahụ sere onyinyo ha? (b) Gịnị ka e gosiri mgbe a gbajiri mpi ukwu nke nwa mkpi ahụ, mpi anọ wee pụta n’ọnọdụ ya?
4 N’ọhụụ ọzọ, Daniel hụrụ otu ebulu nwere mpi abụọ nke ewu nwere otu nnukwute mpi sọdara n’ala. Mmụọ ozi bụ Gebriel kọwaara ya ihe ọ pụtara, sị: “Ebulu ahụ . . . bụ eze nke Midia na Peasia. Mkpi ahụ nke nwere ajị hie nne bụ eze [nke Gris, NW].” Gebriel gara n’ihu ibu amụma na a gaje itiji mpi ukwu ahụ nke mkpi ahụ, na mpi anọ ọzọ gajekwa ịnọchi anya ya. Nke a mere n’ezie n’ihe karịrị 200 afọ n’ikpeazụ mgbe Alexander Onye Ukwu ahụ nwụrụ e wee kewaa alaeze ya ịbụ alaeze anọ nke ndị ọchịagha ya anọ na-achị.—Daniel 8:3-8, 20-25.a
5. (a) Echiche dịgasị aṅaa ka okwu Grik ahụ e ji sụgharịta anụ ọhịa na-enye? (b) Gịnị ka anụ ọhịa ahụ nke Mkpughe 13:1, 2, ya na isi asaa ya, nọchiri anya ya?
5 N’ihi nke a, o doro anya na Onye Nwe Bible ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ na-ele ike ọchịchị ụwa anya dị ka anụ ọhịa dị iche iche. Ụdị anụ ọhịa dịgasị aṅaa? Otu onye na-enye nkọwa kpọrọ anụ ọhịa ahụ dị ná Mkpughe 13:1, 2 “ihe na-enweghị uche,” wee kwuokwa, sị: “Anyị nakweere ihe nile okwu ahụ bụ θηρίον [the·riʹon, okwu Grik ahụ maka “anụ ọhịa”] pụtara, dị ka nke anụ ọhịa nwere obi ọjọọ, na-ebibi ihe, na-atụ egwu, na-adọkasị adọkasị, nweekwa àgwà ndị ọzọ.”b Lee nnọọ ụzọ kwesịrị ekwesị nke a si kọwaa usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị jupụtara n’ọbara nke Setan jiworo na-achị ihe a kpọrọ mmadụ! Isi asaa nke anụ ọhịa nke a nọchiri anya alaeze ụwa isii ndị bụ isi ndị a kọrọ akụkọ ha n’ihe ndekọ Bible ruo n’oge Jọn—Ijipt, Asiria, Babilọn, Medo-Peasia, Gris, na Rom—na alaeze ụwa nke asaa nke e buru amụma na ọ gaje ịpụta mgbe oge gasịrị.—Tụlee Mkpughe 17:9, 10.
6. (a) Na gịnị ka isi asaa nke anụ ọhịa ahụ buteworo ụzọ? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka Jehova si jiri Rom mee ihe n’imezu ihe ya onwe ya kpere n’ikpe megide usoro ihe nke ndị Juu, oleekwa otú ihe si gaara ndị Kraịst nọ na Jerusalem?
6 N’ezie, e nwewo alaeze ụwa ndị ọzọ n’akụkọ ihe mere eme e wezụga asaa ndị ahụ—dị nnọọ ka anụ ọhịa ahụ Jọn hụrụ nwere ahụ, nweekwa isi asaa na mpi iri. Ma, isi asaa ahụ nọchiri anya alaeze asaa ndị bụ isi ndị nke ọ bụla n’ime ha buteworo ụzọ n’ịkpagbu ndị Chineke. N’afọ 33 O.A., mgbe Rom nọ n’ọkwa ọchịchị, Setan jiri isi anụ ọhịa nke ahụ mee ihe igbu Ọkpara Chineke. N’oge ahụ, Chineke gbakụtara usoro ihe ndị Juu ahụ na-enweghị okwukwe azụ, e mesịakwa, na 70 O.A., kwee ka Rom mezuo ihe o kpere n’ikpe n’ahụ mba ahụ. Ọ bụ ihe obi ụtọ ịhụ na nke bụ Israel nke Chineke n’ezie, bụ́ ọgbakọ ndị Kraịst e tere mmanụ, abụrụwo ndị e buru ụzọ dọọ aka ná ntị, ndị nọkwa na Jerusalem na Judia agbapụwokwa gaa ná nchebe n’ofe nke ọzọ nke Osimiri Jọdan.—Matiu 24:15, 16; Ndị Galetia 6:16.
7. (a) Gịnị ka oge ya ruru ka o mee mgbe ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a rutere, ụbọchị Onyenwe anyị wee malitekwa? (b) Gịnị ka e gosiri na ọ bụ isi nke asaa nke anụ ọhịa ahụ dị ná Mkpughe 13:1, 2?
7 Otú ọ dị, mgbe ọ na-erule ọgwụgwụ nke narị afọ nke mbụ O.A., ọtụtụ ndị nọ n’ọgbakọ mbụ nke a adapụwo site n’eziokwu ahụ, ndị bụkwa ezi ndị Kraịst dị ka ọka, bụ́ ‘ụmụ alaeze ahụ,’ abụrụwokwa ndị ata ahụ, bụ́ “ụmụ ajọ onye ahụ,” kpagburu n’ụzọ dị ukwuu. Ma mgbe oge ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a malitere, ndị Kraịst e tere mmanụ pụtaghachikwara ọzọ dị ka otu òtù a haziri ahazi. N’ime ụbọchị Onyenwe anyị, oge eruwo ka ndị ezi omume ‘nwupụ dị ka anyanwụ.’ N’ihi nke a, a haziri ọgbakọ ndị Kraịst ịrụ ọrụ. (Matiu 13:24-30, 36-43) N’oge ahụ, Alaeze Rom adịkwaghị ọzọ. Nnukwute Alaeze Britain, ya na mba United States of America ahụ dị oké ike, ji akụkụ bụ isi nke ọchịchị ụwa. Alaeze abụọ nke a na-emekọ ihe n’otu gosipụtara onwe ha ịbụ isi nke asaa nke anụ ọhịa ahụ.
8. Gịnị mere ọ gaghị abụ ihe ijuanya na e ji anụ ọhịa see onyinyo alaeze ụwa nke Anglo-America?
8 Ọ̀ bụ na ọ bụghị ihe na-anwụ ibubo n’ahụ iji anụ ọhịa see onyinyo ike ọchịchị dị iche iche? Nke ahụ bụ ihe ụfọdụ ndị mmegide kwuru n’oge Agha Ụwa nke Abụọ, mgbe a mara ọnọdụ Ndịàmà Jehova aka n’ụlọikpe dị iche iche gburugburu ụwa dị ka otu òtù, dịkwa ka ndị mmadụ n’otu n’otu. Ma cheretụ wee chee echiche! Ọ̀ bụ na mba ndị ahụ n’onwe ha adịghị anabata anụmanụ na anụ ọhịa dị iche iche dị ka ihe nnọchianya nke mba ha dị iche iche? Dị ka ihe atụ, e nwere ọdụm nke Britain, ugo nke America, na dragọn nke China. N’ihi nke a, gịnị mere onye ọ bụla ga-eji gbaa isi akwara ma ọ bụrụ na Chineke ahụ Onye Nwe Bible Nsọ ejirikwa anụ ọhịa mee ihe ise onyinyo ọchịchị ụwa dị iche iche?
9. (a) N’ihi gịnị ka mmadụ na-ekwesịghị ịjụ mgbe Bible kwuru na ọ bụ Setan nyere anụ ọhịa ahụ ikike ya dị ukwuu? (b) Olee otú e si kọwaa Setan n’ime Bible, ò sikwa aṅaa na-enwe ike n’ahụ ọchịchị dị iche iche?
9 Karịsịa, n’ihi gịnị ka onye ọ bụla ga-eji jụ ikwenye mgbe Bible kwuru na ọ bụ Setan nyere anụ ọhịa ahụ oké ike o nwere? Ọ bụ Chineke bụ Onye kwuru okwu ahụ, n’ihu ya, ‘mba nile dịkwa ka otu ntụ mmiri na-atụpụ n’ite mmiri, dịkwa ka uzuzu.’ Ọ ga-akara mba ndị ahụ mma ịchọ ihu ọma Chineke karịa ịbụ ndị a kpasuru iwe n’ihi otú Okwu amụma ya si kọwaa ha. (Aịsaịa 40:15, 17; Abụ Ọma 2:10-12) Setan abụghị onye dị n’akụkọ ifo, nke e nyere ọrụ ịta mkpụrụ obi ndị nwụrụ anwụ ahụhụ n’ọkụ hell. Ọ dịghị ebe ọ bụla dị otú ahụ dị adị. Kama nke ahụ, a kọwara Setan n’Akwụkwọ Nsọ dị ka “mmụọ ozi nke ìhè”—onyeọkà n’iduhie mmadụ, onye nwere ike dị ukwuu n’ihe omume ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ụwa dum.—2 Ndị Kọrint 11:3, 14, 15; Ndị Efesọs 6:11-18.
10. (a) Gịnị ka e gosiri site n’eziokwu ahụ bụ na okpueze na-adịkwasị na nke ọ bụla n’ime mpi iri ndị ahụ? (b) Gịnị ka mpi iri ndị ahụ na okpueze iri ahụ sere onyinyo ha?
10 Anụ ọhịa ahụ nwere mpi iri n’isi asaa ya. Ma eleghị anya isi anọ nwere otu mpi n’elu nke ọ bụla n’ime ha, atọ nweekwa abụọ n’elu nke ọ bụla. Karịsịa, o nwere okpueze iri n’elu mpi iri ya nile. N’akwụkwọ Daniel, a kọwara anụ ọhịa ndị na-eyi egwu n’ile anya, e kwesịkwara iwere ọnụ ọgụgụ mpi ha n’ụzọ efu. Dị ka ihe atụ, mpi abụọ nke dị n’isi otu ebulu nọchiri anya otu alaeze ụwa nke ndị òtù abụọ mejupụtara, bụ́ ndị Midia na Peasia, ebe mpi anọ dị n’isi otu ewu nọchiri anya alaeze anọ ahụ na-adịkọ ọnụ ndị si n’alaeze Grik nke Alexander Onye Ukwu ahụ topụta. (Daniel 8:3, 8, 20-22) Otú ọ dị, n’ihe banyere anụ ọhịa ahụ nke Jọn hụrụ, o yiri ka ọnụ ọgụgụ nke mpi iri ndị ahụ bụ ihe atụ. (Tụlee Daniel 7:24; Mkpughe 17:12.) Ha nọchiri anya ozuzu nke mba ndị na-achị onwe ha, ndị mejupụtara usoro ọchịchị dum nke Setan. Mpi ndị a nile bụcha ndị na-eme ihe ike, na-alụkwa ọgụ, ma, dị ka isi asaa ahụ gosiri, ọchịchị na-adị n’aka otu alaeze ụwa n’oge ọ bụla. N’otu aka ahụ, okpueze iri ahụ gosiri na mba dum ndị na-achị onwe ha ga-enwekọ ike ọchịchị n’otu oge, ha na mba nke na-achịkọta ha dum, ma ọ bụ alaeze ụwa nke dị n’oge ahụ.
11. Gịnị ka e gosiri site n’eziokwu ahụ bụ na anụ ọhịa ahụ ‘nwere aha ụfọdụ nke nkwulu Chineke n’elu isi ya’?
11 Anụ ọhịa ahụ nwere “aha ụfọdụ nke nkwulu Chineke” n’elu isi ya nile, na-edebe onwe ya n’ọnọdụ nke na-egosi oké enweghị nsọpụrụ nye Jehova Chineke na Kraịst Jisọs. O jiriwo aha Chineke na nke Kraịst mee ihe dị ka ihe aghụghọ iji ruo mgbaru ọsọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya; o sorowokwa okpukpe ụgha na-emekọrịta ihe, ọbụna na-ekwere ka ndị ndú okpukpe tinye aka ná ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Dị ka ihe atụ, ụlọ nzukọ House of Lords dị n’England gụnyere ndị bishọp. Ndị kadịnal nke okpukpe Katọlik ekerewo òkè dị ukwuu ná ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke France na Itali, n’oge ndị na-adịbeghịkwa anya, ndị ụkọchukwu anarawo ọkwa ọchịchị na Latin America. Gọọmentị dị iche iche na-ebipụta okwu okpukpe, ndị dị ka “ANYỊ TỤKWASỊRỊ CHINEKE OBI,” n’akwụkwọ ego ha, ná mkpụrụ ego ha dị iche iche ha na-azọrọkwa na Chineke na-akwado ndị ọchịchị ha, na-asị, dị ka ihe atụ, na e ji “amara Chineke” họpụta ndị a. N’ezie ihe ndị a nile bụ okwu nkwulu, n’ihi na ọ na-anwa ịdọrọ Chineke banye n’ọgbọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị e merụrụ emerụ nke mba nile.
12. (a) Gịnị ka e gosiri site n’eziokwu ahụ bụ na anụ ọhịa ahụ sitere “n’oké osimiri” rịgopụta, oleekwa mgbe ọ malitere ịpụta? (b) Gịnị ka e gosiri site n’eziokwu ahụ bụ na dragọn ahụ nyere anụ ọhịa ihe atụ ahụ oké ike ịchịisi ya?
12 Anụ ọhịa ahụ si “n’oké osimiri” rịgopụta, nke bụ ihe nnọchianya ziri ezi nke ụmụ mmadụ nọ n’ọgba aghara, bụ́ ebe ọchịchị mmadụ dị iche iche si ebilite. (Aịsaịa 17:12, 13) Anụ ọhịa nke a malitere isi n’oké osimiri nke ihe a kpọrọ mmadụ nọ n’ọgba aghara bilite laarị azụ n’oge Nimrọd (n’ihe dị ka narị afọ nke 21 T.O.A.), mgbe otu usoro ihe dị mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị, nke na-emegide Jehova, gosipụtara onwe ya nke mbụ ya. (Jenesis 10:8-12; 11:1-9) Ma, ọ bụ n’ime ụbọchị Onyenwe anyị ka nke ikpeazụ n’isi asaa ndị ahụ gosipụtaworo onwe ya n’ụzọ zuru ezu. Rịbakwa ama na ọ bụ dragọn ahụ ‘nyere ya ike ya na ocheeze ya na oké ịchịisi.’ (Tụlee Luk 4:6.) Anụ ọhịa ahụ bụ usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị Setan wepụtara n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ. Setan bụ n’ezie “onyeisi ụwa nke a.”—Jọn 12:31.
Ihe Otiti Na-eweta Ọnwụ
13. (a) Ihe ọjọọ dị aṅaa dakwasịrị anụ ọhịa ahụ ná mmalite ụbọchị Onyenwe anyị? (b) Olee otú o si bụrụ na o metụtara anụ ọhịa ahụ dum mgbe e tiri otu isi ya ihe otiti na-eweta ọnwụ?
13 Ná mmalite nke ụbọchị Onyenwe anyị, ihe ọjọọ dakwasịrị anụ ọhịa ahụ. Jọn kọrọ, sị: “M wee hụ otu n’etiti isi asaa ya, dị ka à ga-asị na e tigburu ya rịị ka ọ nwụọ; e wee mee ka ihe otiti ya ahụ nke na-eweta ọnwụ laa: o wee ju ụwa dum anya, ha wee soo anụ ọhịa ahụ n’azụ.” (Mkpughe 13:3) Amaokwu nke a kwuru na otu n’ime isi anụ ọhịa ahụ natara ihe otiti na-eweta ọnwụ, ma amaokwu nke 12 kwuru okwu dị ka à ga-asị na nke a metụtara anụ ọhịa ahụ dum. N’ihi gịnị ka o ji dị otú a? Dị ka ọ dị, ọ bụghị isi anụ ọhịa ahụ dum na-achị achị n’otu oge. Nke ọ bụla emewo ihe n’oge nke ya imegide ihe a kpọrọ mmadụ, karịsịa imegide ndị Chineke. (Mkpughe 17:10) Otú a, ka ụbọchị Onyenwe anyị na-amalite, e nwere nanị otu isi, bụ́ nke asaa, nke nọ dị ka alaeze na-achị ụwa dum. Iti isi nke ahụ ihe otiti na-eweta ọnwụ ga-ewetara anụ ọhịa ahụ dum oké ahụhụ.
14. Olee mgbe e tiri ihe otiti ahụ na-eweta ọnwụ, oleekwa otú otu onye ọchịagha si kọwaa mmetụta o nwere n’ahụ anụ ọhịa nke Setan?
14 Gịnị bụ ihe otiti ahụ na-eweta ọnwụ? Mgbe e mesịrị, a kpọrọ ya ogbugbu mma agha, mma agha bụkwa ihe na-ese onyinyo ibu agha. Ogbugbu mma agha nke a, nke e gburu ná mmalite ụbọchị Onyenwe anyị, aghaghị inwe ihe jikọrọ ya na agha ụwa mbụ ahụ, nke bibisịrị, napụsịakwa anụ ọhịa ndọrọ ndọrọ ọchịchị Setan ike ya. (Mkpughe 6:4, 8; 13:14) Onye odeakwụkwọ bụ Maurice Genevoix, onye bụ ọchịagha n’oge agha ahụ, kwuru banyere ya, sị: “Onye ọ bụla nwere nkwekọrịta n’ịghọta na n’akụkọ ihe mere eme nile nke ihe a kpọrọ mmadụ, ọ bụ nanị ụbọchị ole na ole ka ịdị mkpa ha ruru ka nke August 2, 1914. Na mbụ Europe, e mesịakwa n’oge na-adịghị anya, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ agbụrụ mmadụ dum chọtara onwe ha n’etiti ihe omume dị oké egwu. Nzukọ dị iche iche, nkwekọrịta, iwu ụkpụrụ omume, ntọala nile mara jijiji; site n’otu ụbọchị ruo n’ụbọchị ọzọ, a rụrụ ụka banyere ihe nile. Ihe mere eme n’ezie karịrị ihe nile ndị mmadụ chere na ọ ga-abụ site ná mkpali echiche na site n’uche ziri ezi. O buru ibu nke ukwuu, bibie ihe nke ukwuu, dịkwa egwu, ma ọ ka na-adọkpụrụ anyị na-aga.”—Maurice Genevoix, onye òtù nke Académie Française, nke e hotara n’akwụkwọ ahụ bụ Promise of Greatness (1968).
15. Olee otú isi nke asaa nke anụ ọhịa ahụ si nata ihe otiti ya na-eweta ọnwụ?
15 Agha ahụ bụụrụ isi nke asaa na-achị achị nke anụ ọhịa ahụ oké ọdachi. Gụnyere mba ndị ọzọ dị na Europe, Britain tụfuru ọnụ ọgụgụ na-eyi egwu nke ụmụ okorobịa ya. N’otu agha nanị, bụ́ Agha nke Osimiri Somme na 1916, e gburu ndị Britain 420,000 nakwa ihe dị ka ndị France 194,000 na ndị Germany 440,000—ihe karịrị 1,000,000 mmadụ bụ́ ndị agha riri! N’ụzọ akụ na ụba kwa, e tikpọrọ Britain—ya na akụkụ ndị ọzọ nke Europe. Oké ihe otiti ahụ kpara nnukwute Alaeze Britain ahụ aka ọjọ, ọ dịghịkwa mgbe ọ bụla ha nwetaghachiri onwe ha kpam kpam. N’eziokwu, agha ahụ, nke mba 28 ndị bụ́ isi tinyere aka na ya, tidara ụwa dum n’ala dị ka à ga-asị na ọ bụ site n’ihe otiti na-eweta ọnwụ. N’August 4, 1979, mgbe nanị 65 afọ gasịrị kemgbe mmalite Agha Ụwa Mbụ ahụ, magazin bụ́ The Economist, nke London, England, kwuru, sị: “Na 1914, ụwa kwụsịrị ime ihe n’usoro, bụ́ nke ọ na-enwetaghachibeghị kemgbe ahụ.”
16. N’oge agha ụwa mbụ ahụ, olee otú United States si gosi na ọ bụ otu akụkụ nke alaeze ụwa nwere akụkụ abụọ?
16 N’otu mgbe ahụ, Oké Agha ahụ, dị ka a kpọrọ ya n’oge ahụ, nyere ohere ka mba United States pụta ìhè dị ka akụkụ nke Alaeze Ụwa nke Anglo-America. N’afọ ndị mbụ nke agha ahụ, echiche ọha na eze mere ka United States ghara itinye aka n’agha ahụ. Ma, dị ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ Esmé Wingfield-Stratford dere, “ọ bụ ajụjụ metụtara ma Britain na United States hà ga-ewezụga ndịrịta iche ha nile wee jikọọ aka mee ihe n’ihi ịghọta oké ịdị n’otu [ha] na ọrụ ha jikọrọ aka nwee n’oge agha ụwa nke a nke oké ọgba aghara.” Dị ka ihe ndị mere eme si gosi, ha mere otú ahụ. Na 1917, United States tinyere ihe onwunwe na ndị mmadụ ha iji kwalite mgbalị nke òtù Allied na-eme n’agha ahụ. Otú a, isi nke asaa ahụ, nke jikọtara Britain na United States, nwere mmeri.
17. Gịnị mere usoro ihe elu ala nke Setan mgbe agha ahụ gasịrị?
17 Ụwa nke dịrị mgbe agha ahụ gasịrị dị nnọọ iche n’ihe ọ bụ na mbụ. Usoro ihe Setan dị n’elu ala, ọ bụ ezie na ihe otiti ahụ na-eweta ọnwụ bibiri ya, bilitekwara ọzọ wee nwee ike karịrị ka o nwere na mbụ, wee mee ka ndị mmadụ nwee mmasị n’ebe ọ nọ n’ihi ike mbiliteghachi ya.
18. Olee ụzọ a pụrụ isi kwuo na ụmụ mmadụ n’ozuzu ha ‘esowo anụ ọhịa ahụ n’azụ’?
18 Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Charles L. Mee, Jr. dere, sị: “Ndakpọ nke usoro ihe ochie ahụ [nke agha ụwa mbụ kpatara] bụ ihe dị mkpa nke na-eduga ná mgbasapụ nke mba dị iche iche ịchị onwe ha, ime ka mba ọhụrụ dị iche iche na òtù ndị mmadụ nwere onwe ha, na ntọhapụ nke inwere onwe ọhụrụ.” Isi nke asaa nke anụ ọhịa ahụ na-ebute ụzọ n’ihe ndị na-eme n’oge a mgbe agha ahụ gwụsịworo, bụ́ isi nke ọnyá ya laworo, nke United States of America na-ewerekwa ọkwa mbụ n’ime ya. Alaeze ụwa ahụ nke nwere akụkụ abụọ butere ụzọ n’ịkwado nguzobe nke ma League of Nations ma United Nations. Ka ọ na-erule afọ 2005, ike ọchịchị mba U.S. edugawo mba ndị nọ n’ọnọdụ ka mma iguzobe ụkpụrụ ịdị ndụ dị elu karị, ịlụso ọrịa ọgụ, na inwe ọganihu nkà na ụzụ. Ọbụna o mewo ka mmadụ 12 jee n’ọnwa. N’ihi nke a, ọ bụghị ihe ijuanya na ụmụ mmadụ ‘esowo anụ ọhịa ahụ n’azụ.’
19. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka ihe a kpọrọ mmadụ siworo mee ihe karịrị inwe mmasị n’ahụ anụ ọhịa ahụ? (b) N’arụghị ụka ọ bụla, ònye na-achị alaeze nile nke ụwa, ànyị sikwa aṅaa mara nke a? (ch) Olee ụzọ Setan si enye anụ ọhịa ahụ ikike, mmetụta dịkwa aṅaa ka o nwere n’ahụ ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ?
19 Ọbụna na ụmụ mmadụ emewo ihe karịrị inwe mmasị n’ebe anụ ọhịa ahụ nọ, dị ka Jọn gara n’ihu ikwu, sị: “Ha wee kpọọ isiala nye dragọn ahụ, n’ihi na o nyere anụ ọhịa ahụ ịchịisi ya; ha kpọkwara isiala nye anụ ọhịa ahụ, sị, Ònye yiri anụ ọhịa ahụ? Ònye pụkwara ibu agha megide ya?” (Mkpughe 13:4) Mgbe Jisọs nọ n’elu ala ebe a, Setan kwuru na ya nwere ikike n’elu alaeze nile nke ụwa. Jisọs arụghị ya ụka na nke a; n’eziokwu ya onwe ya kwuru banyere Setan dị ka onye na-achị ụwa, jụkwa ikere òkè na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke oge ahụ. Jọn mesịrị dee banyere ezi ndị Kraịst, sị: “Anyị matara na anyị bụ ndị si na Chineke pụta, ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19; Luk 4:5-8; Jọn 6:15; 14:30) Setan na-enye anụ ọhịa ahụ ike, ọ na-ejikwa ịhụ mba n’anya na-eme nke a. N’ihi ya, kama ịbụ ndị dị n’otu site n’ihe nkekọ nke ịhụnanya yiri nke Chineke, e kewasịwo ihe a kpọrọ mmadụ site n’ịdị iche iche nke agbụrụ, ụcha akpụkpọ ahụ, na mba. Dị ka ihe si na nke a pụta, ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ na-efe akụkụ anụ ọhịa ahụ nke nwere ikike ná mba nke ọ dabara na ha bi na ya. Akụkụ nile nke anụ ọhịa ahụ si otú a na-adọrọ mmasị na ofufe.
20. (a) N’echiche dị aṅaa ka ụmụ mmadụ na-efe anụ ọhịa ahụ ofufe? (b) N’ihi gịnị ka ndị Kraịst na-efe Jehova Chineke na-anaghị ekere òkè n’ofufe anụ ọhịa dị otú ahụ, ihe nlereanya ònye ka ha na-agbasokwa?
20 N’ụzọ dị aṅaa ka nke a si bụrụ ofufe? Ọ bụ n’echiche nke idebe ịhụ mba n’anya n’ọkwá dị elu karịa ịhụ Chineke n’anya. Ihe ka n’ọtụtụ mmadụ hụrụ mba ebe a mụrụ ha n’anya. Dị ka ezi ụmụ amaala, ezi ndị Kraịst na-asọpụrụkwa ndị na-achị achị na ihe nnọchianya nke mba ebe ha bi n’ime ya, ha na-erube isi n’iwu, na-enyekwa aka n’ụzọ ziri ezi maka ọdịmma nke ógbè ha na ndị agbata obi ha. (Ndị Rom 13:1-7; 1 Pita 2:13-17) Otú ọ dị, ha apụghị iji ịnụ ọkụ n’obi a na-akparaghị ókè rara onwe ha nye otu mba megide ndị ọzọ nile. “Mba nke anyị, ma ọ dị mma ma ọ dị njọ” abụghị ozizi ndị Kraịst. N’ihi nke a, ndị Kraịst na-efe Jehova Chineke apụghị ikere òkè n’inye akụkụ ọ bụla nke anụ ọhịa ahụ ofufe nke iji mpako hụ mba onwe onye n’anya, n’ihi na nke a ga-apụta ife dragọn ahụ ofufe—bụ́ ebe anụ ọhịa ahụ si enweta ikike ya. Ha apụghị iji mmasị jụọ, sị: “Ònye yiri anụ ọhịa ahụ?” Kama nke ahụ, ha na-agbaso ihe nlereanya nke Maịkael—onye aha ya pụtara “Ònye Dị Ka Chineke?”—ka ha na-akwado ọbụbụeze eluigwe na ala nke Jehova. N’oge Chineke kara aka, Maịkael nke a, bụ́ Kraịst Jisọs, ga-ebuso anụ ọhịa ahụ agha wee merie ya, ọbụna dị ka o meriri n’ịchụpụ Setan site n’eluigwe.—Mkpughe 12:7-9; 19:11, 19-21.
Ibuso Ndị Nsọ ahụ Agha
21. Olee otú Jọn si kọwaa nduzi Setan na-eduzi anụ ọhịa ahụ?
21 Setan onye aghụghọ ahụ nwere atụmatụ iji anụ ọhịa ahụ mee ihe imezu nzube ndị nke ya. Jọn kọwara nke a, sị: “E wee nye ya [anụ ọhịa ahụ nwere isi asaa] ọnụ nke na-ekwu oké ihe na nkwulu Chineke; e wee nye ya ike ime omume ya [iri ọnwa anọ] na abụọ. O wee saghee ọnụ ya ikwulu Chineke, ikwulu aha ya, na ụlọ ikwuu ya, bụ́ ndị bi n’eluigwe. E wee nye ya ike ibu agha megide ndị nsọ ahụ, na imeri ha: e nyekwara ya ike ịchị ebo nile ọ bụla na ndị nile ọ bụla na asụsụ nile ọ bụla na mba nile ọ bụla isi. Ndị nile ndị bi n’elu ụwa ga-akpọkwa isiala nye ya, onye ọ bụla a na-edeghị aha ya n’akwụkwọ nke ndụ nke Nwa Atụrụ ahụ onye e gbuworo site n’oge ịtọ ntọala nke ụwa.”—Mkpughe 13:5-8.
22. (a) N’ogologo oge dị aṅaa ka 42 ọnwa ahụ na-ezo aka? (b) N’ime 42 ọnwa ndị ahụ, olee ụzọ e si ‘merie’ ndị Kraịst e tere mmanụ?
22 Iri ọnwa anọ na abụọ ahụ a kpọtụrụ aha ebe a yiri ka ọ̀ bụ otu ogologo oge ahụ dị afọ atọ na ọkara bụ́ mgbe mpi ahụ nke pulitere n’isi otu n’ime anụ ọhịa ndị ahụ dị n’amụma Daniel mesoro ndị nsọ ahụ omume ọjọọ. (Daniel 7:23-25; leekwa Mkpughe 11:1-4.) N’ihi ya, malite ná ngwụsi afọ 1914 banye n’ime 1918, mgbe mba ndị ahụ na-eburịta agha nọ na-atagburita onwe ha dị ka anụ ọhịa, a rụgidere ndị bi ná mba ndị ahụ ife anụ ọhịa ahụ ofufe, itinye onwe ha n’okpukpe nke ịhụ mba ha n’anya, ọbụna ịdị njikere ịnwụrụ mba ha ọnwụ. Nrụgide dị otú ahụ wetaara ọtụtụ n’ime ndị ahụ e tere mmanụ oké ịta ahụhụ, bụ́ ndị chere na ha kwesịrị inwe nrubeisi ka elu nye Jehova Chineke na Ọkpara ya, bụ́ Kraịst Jisọs. (Ọrụ 5:29) Ọnwụnwa ha bịaruru ọnọdụ ya kasị elu na June 1918, mgbe ‘e meriri’ ha. Na United States, a tụrụ ndị nọ n’ọnọdụ dị mkpa na ndị nnọchianya ndị ọzọ nke Watch Tower Society mkpọrọ n’ụzọ na-ezighị ezi, e gbochikwara ọrụ nkwusa a haziri ahazi nke ụmụnna ha bụ́ ndị Kraịst n’ụzọ dị ukwuu. Ebe o nwere ikike ịchị “ebo nile ọ bụla na ndị nile ọ bụla na asụsụ nile ọ bụla na mba nile ọ bụla,” anụ ọhịa ahụ gbochiri ọrụ Chineke gburugburu ụwa.
23. (a) Gịnị bụ “akwụkwọ nke ndụ nke Nwa Atụrụ ahụ,” gịnị nọgidewokwara na-aga n’ihu iru mmezu ya kemgbe 1918? (b) N’ihi gịnị ka ihe ọ bụla yiri mmeri nzukọ Setan a na-ahụ anya nwere n’ebe “ndị nsọ ahụ” nọ ji bụrụ nanị ihe efu?
23 Nke a yiri mmeri nye Setan na nzukọ ya. Ma ọ gaghị ewetara ha abamuru ọ bụla na-adịte anya, ebe ọ na-adịghị onye ọ bụla ná nzukọ Setan a na-ahụ anya nke e dere aha ya n’ime “akwụkwọ nke ndụ nke Nwa Atụrụ ahụ.” N’ụzọ ihe atụ, akwụkwọ nke a nwere aha ndị ahụ ga-eso Jisọs chịa achị n’Alaeze eluigwe ya. E debara aha ndị mbụ n’ime ya na Pentikọst nke 33 O.A. N’ime afọ ndị dịkwa eri mgbe ahụ, e debanyewo aha ndị ọzọ n’ime ya. Kemgbe 1918, ịka ihe fọdụrụ n’ime 144,000 ndị nketa Alaeze ahụ akara anọgidewo na-aga n’ihu ruo mmezu ya. N’oge na-adịghị anya, a ga-edeba aha ha nile n’ụzọ a na-apụghị ihichapụ ya ehichapụ n’akwụkwọ nke ndụ nke Nwa Atụrụ ahụ. N’ihe banyere ndị mmegide ahụ, bụ́ ndị na-efe anụ ọhịa ahụ, ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha a ga-edeba aha ya n’akwụkwọ ahụ. N’ihi ya, mmeri ọ bụla o yiri ka ndị a nwere megide “ndị nsọ ahụ” ga-abụ ihe tọgbọrọ n’efu, nke na-adị nanị nwa oge.
24. Gịnị ka Jọn na-akpọ ndị ahụ nwere nghọta ịnụ, gịnịkwa ka okwu ndị ahụ a nụrụ pụtaara ndị Chineke?
24 Ugbu a, Jọn kpọkuru ndị nwere nghọta ka ha gezie ntị nke ọma: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ntị, ya nụ.” Mgbe ahụ ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Ọ bụrụ na ọ dịịrị onye ọ bụla ka a dọta ya n’agha, ọ bụ n’agha ka a ga-adọta ya: ọ bụrụ na onye ọ bụla ga-eji mma agha gbuo mmadụ, a ghaghị iji mma agha gbuo ya. N’ebe a ka ntachi obi na okwukwe nke ndị nsọ dị.” (Mkpughe 13:9, 10) Jeremaịa dere okwu ndị yiri nnọọ nke a n’afọ ndị ahụ bu 607 T.O.A. ụzọ, iji gosi na ihe Jehova kpere n’ikpe megide obodo Jerusalem ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi apụghị ịla azụ. (Jeremaịa 15:2; leekwa Jeremaịa 43:11; Zekaraịa 11:9.) N’oge ọ nọ n’oké ọnwụnwa, Jisọs mere ka ọ pụta ìhè na ndị na-eso ụzọ ya aghaghị iguzosi ike n’ekwenyereghị ihe ọjọọ, mgbe ọ sịrị: “Mmadụ nile ndị weere mma agha ga-ala n’iyi site ná mma agha.” (Matiu 26:52) N’otu aka ahụkwa, ugbu a n’ime ụbọchị Onyenwe anyị, ndị Chineke aghaghị ịnọgidesi ike n’ụkpụrụ Bible. A gaghị enwe nlanarị ikpeazụ nye ndị na-enweghị nchegharị, ndị na-efe anụ ọhịa ahụ ofufe. Ọ ga-adị anyị nile mkpa inwe ntachi obi, ya na okwukwe a na-apụghị imebi emebi, iji wee lanarị mkpagbu na ọnwụnwa ndị na-eche anyị n’ihu.—Ndị Hibru 10:36-39; 11:6.
Anụ Ọhịa ahụ Nwere Mpi Abụọ
25. (a) Olee otú Jọn si kọwaa anụ ọhịa ihe atụ ọzọ nke pụtara n’elu ụwa? (b) Gịnị ka mpi abụọ nke anụ ọhịa ọhụrụ nke a gosiri, ya na mpụta ọ pụtara site n’ala?
25 Ma ugbu a, otu anụ ọhịa ọzọ na-apụta n’ebe a ga-ahụ ya anya n’ụwa. Jọn kọrọ, sị: “M wee hụ anụ ọhịa ọzọ ka ọ na-esi n’ala rịgopụta; o nwekwara mpi abụọ yiri nke nwa atụrụ ahụ, ma ọ na-ekwu okwu dị ka dragọn ahụ. O wee na-achị isi nile nke anụ ọhịa mbụ ahụ n’ihu ya. Ọ na-emekwa ụwa na ndị bi n’ime ya ka ha kpọọ isiala nye anụ ọhịa mbụ ahụ, nke e mere ka ihe otiti ya nke na-eweta ọnwụ laa. Ọ na-emekwa oké ihe ịrịba ama dị iche iche, ka o wee mee ọbụna ọkụ ka o si n’eluigwe rịdata n’ụwa n’ihu mmadụ nile.” (Mkpughe 13:11-13) Anụ ọhịa nke a nwere mpi abụọ, nke na-egosi mmekọrịta nke òtù ọchịchị abụọ. A kọwakwara ya dị ka nke si n’ala na-arịgopụta, ọ bụghị site n’oké osimiri. Otú a, ọ na-esite n’usoro ihe elu ala nke Setan guzobewororịị. Ọ ghaghị ịbụ alaeze ụwa nke dị adị, nke ga-ewere ọnọdụ pụtara ìhè n’ime ụbọchị Onyenwe anyị.
26. (a) Gịnị bụ anụ ọhịa ahụ nwere mpi abụọ, oleekwa njikọ dị n’etiti ya na anụ ọhịa nke mbụ ahụ? (b) N’echiche dị aṅaa ka mpi abụọ nke anụ ọhịa ahụ si yie nke nwa atụrụ, ò sikwa aṅaa yie “dragọn” mgbe ọ na-ekwu okwu? (ch) Gịnị ka ndị hụrụ mba ha n’anya na-efe n’ezie, gịnịkwa ka e jiworo ịhụ mba n’anya tụnyere? (Lee nkọwa ala ala peji.)
26 Gịnị ka nke a pụrụ ịbụ? Ọ bụ Alaeze Ụwa nke Anglo-America—otu ihe ahụ dị ka isi nke asaa nke anụ ọhịa mbụ ahụ kama nke a bụ n’ọnọdụ pụrụ iche! Iwepụta ya iche n’ọhụụ ahụ dị ka anụ ọhịa dị iche na-enyere anyị aka ịhụta n’ụzọ doro anya karị ụzọ o si eme ihe n’adabereghị n’onye ọ bụla ọzọ n’ime ụwa. Ihe mejupụtara anụ ọhịa nke a nwere mpi abụọ bụ alaeze ụwa abụọ dị adị n’otu oge, ndị kwụụrụ onwe ha, ma na-emekọrịta ihe. Mpi ya abụọ ndị “yiri nke nwa atụrụ” na-ezo aka na o mere onwe ya ka ọ dị ka à ga-asị na ọ dị nwayọọ, na ọ dịghịkwa akpa ike, nweekwa ụdị ọchịchị dị mma nke ụwa dum kwesịrị ichigharịkwuru. Ma ọ na-ekwu okwu “dị ka dragọn” n’ihi na ọ na-eji nrụgide na iyi egwu na ọbụna ime ihe ike pụtara ìhè na-eme ihe mgbe ọ bụla a na-anakwereghị ụdị ọchịchị nke ya. Ọ gbabeghị ndị mmadụ ume ido onwe ha n’okpuru Alaeze Chineke nke dị n’okpuru ọchịchị nke Nwa Atụrụ nke Chineke, kama nke ahụ, ọ na-agba ha ume ido onwe ha n’okpuru ọchịchọ Setan, bụ́ oké dragọn ahụ. Ọ kwalitewo nkewasị mba dị iche iche na ịkpọasị ndị jikọrọ aka bụrụ ife anụ ọhịa mbụ ahụ ofufe.c
27. (a) Àgwà dị aṅaa nke anụ ọhịa ahụ nwere mpi abụọ ka e gosiri site n’eziokwu ahụ bụ na ọ na-eme ka ọkụ si n’eluigwe rịdata? (b) Olee otú ọtụtụ ndị si ele ihe ahụ nọchiri anya anụ ọhịa ahụ nwere mpi abụọ anya taa?
27 Anụ ọhịa nke a nwere mpi abụọ na-eme oké ihe ịrịba ama dị iche iche, ọbụna na-eme ka ọkụ si n’eluigwe rịdata. (Tụlee Matiu 7:21-23.) Ihe ịrịba ama nke ikpeazụ a na-echetara anyị Elaịja, bụ́ onye amụma Chineke ahụ nke ya na ndị amụma Beal rụrịtara ụka. Mgbe o nwere ihe ịga nke ọma n’ime ka ọkụ site n’eluigwe rịdata n’aha Jehova, ọ nwapụtara n’ụzọ na-enweghị ngọpụ na ọ bụ ezi onye amụma, na ndị amụma Beal bụkwa ndị amụma ụgha. (1 Ndị Eze 18:21-40) Dị ka ndị amụma Beal ndị ahụ, anụ ọhịa ahụ nwere mpi abụọ chere na ya nwere iru eru zuru ezu dị ka onye amụma. (Mkpughe 13:14, 15; 19:20) Ee, ọ na-ekwu na ya emeriwo ikike nile nke ihe ọjọọ n’agha ụwa abụọ, meriekwa ihe ahụ a sị na ọ bụ ọchịchị kọmụnist nke na-adịghị asọpụrụ Chineke! N’ezie, ọtụtụ ndị na-ele ihe ahụ nọchiri anya anụ ọhịa ahụ nwere mpi abụọ n’oge a anya dị ka onye nchebe nke inwe onwe na isi iyi nke ihe onwunwe ndị dị mma.
Ihe Oyiyi nke Anụ Ọhịa Ahụ
28. Olee ụzọ Jọn si gosi na anụ ọhịa ahụ nwere mpi abụọ adịghị nwayọọ dị ka mpi ya ndị yiri nke nwa atụrụ na-egosi?
28 Anụ ọhịa nke a nwere mpi abụọ ọ̀ dị nwayọọ dị ka mpi ya yiri nke nwa atụrụ na-egosi? Jọn gara n’ihu ikwu, sị: “O wee na-eduhie ndị bi n’elu ụwa n’ihi ihe ịrịba ama nile nke e nyere ya ike ime n’ihu anụ ọhịa ahụ; na-asị ndị bi n’elu ụwa, ka ha kpụọrọ anụ ọhịa ahụ ihe oyiyi, bụ́ nke nwere ogbugbu mma agha ahụ, wee dị ndụ. E wee nye ya ike inye ya ume, bụ́ ihe oyiyi nke anụ ọhịa ahụ, ka ihe oyiyi ahụ nke anụ ọhịa ahụ wee kwuo okwu, meekwa ka e gbuo ha, ka ha hà, bụ́ ndị ọ bụla na-akpọghị isiala nye ihe oyiyi nke anụ ọhịa ahụ.”—Mkpughe 13:14, 15.
29. (a) Gịnị bụ nzube nke ihe oyiyi nke anụ ọhịa ahụ, oleekwa mgbe e guzobere ihe oyiyi nke a? (b) N’ihi gịnị ka ihe oyiyi nke anụ ọhịa ahụ na-abụghị ihe ọkpụkpụ na-adịghị ndụ?
29 Gịnị bụ “ihe oyiyi nke anụ ọhịa ahụ,” gịnị bụkwa nzube ya? Nzube ya bụ ịkwalite ofufe nke anụ ọhịa ahụ nwere isi asaa nke ọ bụ ihe oyiyi ya, wee si otú a mee ka anụ ọhịa ahụ nọgide na-adị adị. A kpụrụ ihe oyiyi nke a mgbe anụ ọhịa ahụ nwere isi asaa bilitesịrị site n’ogbugbu mma agha ya, ya bụ, mgbe agha ụwa mbụ ahụ gasịrị. Ọ bụghị ihe ọkpụkpụ na-adịghị ndụ, dị ka nke ahụ Nebukadneza guzobere n’ọzara Dura. (Daniel 3:1) Anụ ọhịa ahụ nwere mpi abụọ na-ekunye ihe oyiyi nke a ume ndụ ka o wee dị ndụ, meekwa ihe dị mkpa n’akụkọ ihe mere eme nke ụwa.
30, 31. (a) Gịnị ka akụkọ ihe ndị mere eme na-egosipụta na ihe oyiyi nke a bụ? (b) Ọ̀ dịwo ndị ọ bụla e gburu n’ihi ịjụ ife ihe oyiyi nke a ofufe? Kọwaa.
30 Ụzọ ihe mere eme si mee gosiri na ihe oyiyi nke a bụ òtù ahụ nke Britain na United States tụrụ aro ya, kwalite, ma kwadookwa, nke a maara na mbụ dị ka League of Nations. Mgbe e mesịrị, ná Mkpughe isi nke 17, a ga-ahụ ya ọzọ n’ihe nnọchianya dị iche, bụ́ nke anụ ọhịa na-acha uhie uhie, dị ndụ, na-ekukwa ume, nke kwụụrụ onwe ya. Òtù nke a jikọtara mba nile ‘na-ekwu okwu,’ n’echiche nke bụ́ na o ji mpako na-azọrọ na ọ bụ nanị ya nwere ike iwetara ihe a kpọrọ mmadụ udo na ịnọ ná ntụkwasị obi. Ma n’ezie, ọ ghọwo ọgbọ ebe mba ndị nọ n’òtù ahụ na-ezukọta ịkọrịta ọnụ na ịkpọrịta onwe ha iyi. Ọ na-eji nkewapụ ma ọ bụ ọnọdụ ọdịndụ ọnwụ ka mma na-eyi mba ma ọ bụ ndị ọ bụla nke jụrụ ịkpọ isiala nye ike ọchịchị ya egwu. Òtù League of Nations chụpụrụ mba ndị jụrụ ịgbaso ụkpụrụ echiche ya nile. Ná mmalite nke oké mkpagbu ahụ, “mpi” nọ dị ka ndị agha nke ihe oyiyi nke anụ ọhịa nke a ga-arụzu otu ọrụ mbibi dị mkpa.—Mkpughe 7:14; 17:8, 16.
31 Kemgbe Agha Ụwa nke Abụọ, ihe oyiyi nke anụ ọhịa ahụ—nke a na-ahụta ugbu a dị ka òtù United Nations—egbuwo ndị mmadụ n’ụzọ nkịtị. Dị ka ihe atụ, na 1950, ndị agha UN weghaara ọgbọ agha n’agha ahụ dị n’etiti North Korea na South Korea. Ndị agha UN ahụ, ha na ndị South Korea, gburu ihe a na-eche na o ruru 1,420,000 ndị North Korea na ndị China. N’otu aka ahụkwa, site na 1960 ruo 1964, usuu ndị agha United Nations nọ na-ebu agha na Congo (Kinshasa). Karịsịa, ndị ndú ụwa, gụnyere ndị popu bụ́ Paul nke Isii na John Paul nke Abụọ, anọgidewo na-ekwu na ihe oyiyi nke a bụ olileanya ikpeazụ kachasị mma mmadụ nwere maka udo. Ha nọgidere na-ekwu na ọ bụrụ na ihe a kpọrọ mmadụ ajụ ife ya ofufe, agbụrụ mmadụ ga-ebibi onwe ya. Ha si otú a jiri ụzọ ihe atụ na-eme ka e gbuo mmadụ nile jụrụ ịgbaso ihe oyiyi ahụ ma fee ya ofufe.—Deuterọnọmi 5:8, 9.
Akara Anụ Ọhịa Ahụ
32. Olee otú Jọn si kọwaa otú Setan si eduzi akụkụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke nzukọ ya a na-ahụ anya iwetara ihe fọdụrụ ná mkpụrụ nke nwanyị Chineke ahụhụ?
32 Ugbu a, Jọn hụrụ otú Setan si eduzi akụkụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị iche iche nke nzukọ ya a na-ahụ anya iji wetara ndị fọdụrụ ná mkpụrụ nke nwanyị Chineke ahụ ahụhụ kachasị ukwuu. (Jenesis 3:15) Ọ bịaghachiri n’ịkọwa “anụ ọhịa ahụ” n’onwe ya, sị: “Ọ na-emekwa mmadụ nile, ndị nta na ndị ukwu, na ndị ọgaranya na ndị ogbenye, na ndị nweere onwe ha na ndị ohu, ka a kaa ha akara n’aka nri ha, ma ọ bụ n’egedege ihu ha; ka onye ọ bụla gharakwa ịpụ ịzụta ahịa ma ọ bụ ire ihe, ma ọ bụghị onye nwere akara ahụ, bụ́ aha nke anụ ọhịa ahụ ma ọ bụ ọnụ ọgụgụ aha ya. N’ebe a ka amamihe dị. Onye nwere uche, ya gụọ ọnụ ọgụgụ nke anụ ọhịa ahụ; n’ihi na ọ bụ ọnụ ọgụgụ mmadụ: ọnụ ọgụgụ ya bụkwa [narị isii na iri isii na isii].”—Mkpughe 13:16-18.
33. (a) Gịnị bụ aha anụ ọhịa ahụ? (b) Gịnị ka e jikọtara ya na ọnụ ọgụgụ ahụ bụ isii? Kọwaa.
33 Anụ ọhịa ahụ nwere aha, aha nke a bụkwa ọnụ ọgụgụ: 666. A na-eji ọnụ ọgụgụ ahụ bụ isii eme ihe banyere ndị iro Jehova. Otu nwoke onye Filistia nke sitere n’ụmụ Rafa “toro ogologo,” “mkpịsị aka ya abụọ dị isii isii, mkpịsị ụkwụ ya abụọ dịkwa isii isii.” (1 Ihe Emere 20:6) Eze Nebukadneza guzobere ihe oyiyi e ji ọlaedo mee nke dị cubit 6 n’obosara, na 60 cubit n’ịdị elu, iji jikọta ndị nọ n’ọkwa ọchịchị ya nile n’otu ofufe. Mgbe ndị ohu Chineke jụrụ ife ihe oyiyi ahụ ofufe, eze ahụ mere ka a tụba ha n’ime ọkụ na-enwu ajọ onwunwu. (Daniel 3:1-23) Ọnụ ọgụgụ ahụ bụ isii dị ala karịa asaa, nke nọchiri anya izu ezu dị ka Chineke si ele ihe anya. N’ihi nke a, idepụta ọnụ ọgụgụ ahụ bụ isii ugbo atọ nọchiri anya ihe na-ezughị okè ma ọlị.
34. (a) Gịnị ka e gosiri site n’eziokwu ahụ bụ na ọnụ ọgụgụ nke anụ ọhịa ahụ “bụ ọnụ ọgụgụ mmadụ”? (b) N’ihi gịnị ka 666 ji bụrụ aha kwesịrị ekwesị maka usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụwa nke Setan?
34 A na-eji aha amara mmadụ. Ya mere, olee otú e si eji ọnụ ọgụgụ nke a mara anụ ọhịa ahụ? Jọn kwuru na “ọ bụ ọnụ ọgụgụ mmadụ,” ọ bụghị nke onye bụ mmụọ, nke mere na ọnụ ọgụgụ ahụ na-enye aka igosi na anụ ọhịa ahụ sitere n’ụwa, nke na-ese onyinyo ọchịchị mmadụ. Dị nnọọ ka isii na-erughị n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nke asaa, otú ahụ ka 666—isii e dere ugbo atọ—si bụrụ aha kwesịịrị nnukwute usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke na-erughị eru ma ọlị n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ izu okè nke Chineke. Anụ ọhịa ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụwa ahụ nọ na-achị achị n’okpuru aha ahụ bụ ọnụ ọgụgụ, nke bụ 666, ka nnukwute usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị, okpukpe ndị bụ isi, na ndị eze ahịa nọ na-eme ka anụ ọhịa ahụ nọgide na-arụ ọrụ dị ka ihe na-akpagbu ihe a kpọrọ mmadụ, na-emegidekwa ndị Chineke.
35. Gịnị ka ọ pụtara bụ ịnata akara nke aha anụ ọhịa ahụ n’egedege ihu ma ọ bụ n’aka nri?
35 Gịnị ka ọ pụtara bụ ịnata akara nke aha anụ ọhịa ahụ n’egedege ihu ma ọ bụ n’aka nri? Mgbe Jehova nyere Israel Iwu ahụ, ọ gwara ha, sị: “Unu ga-edokwa okwu ndị a n’obi unu na n’ime mkpụrụ obi unu; unu ga-ekekwa ha n’elu aka unu ka ha bụrụ ihe ịrịba ama, ha ga-abụkwa mkpọnihu n’etiti anya unu.” (Deuterọnọmi 11:18) Nke a pụtara na ndị Israel ga na-edebe Iwu ahụ n’ihu ha mgbe nile, ka o wee na-eduzi ha n’ihe nile ha na-eme na echiche ha nile. E kwuru na e dekwasịrị aha Nna ahụ na nke Jisọs n’egedege ihu 144,000 ndị ahụ e tere mmanụ. Nke a na-egosipụta ha ịbụ ndị dịịrị Jehova Chineke na Jisọs Kraịst. (Mkpughe 14:1) N’iṅomi nke a, Setan na-eji akara ọjọọ nke anụ ọhịa ahụ na-eme ihe. A na-arụgide onye ọ bụla na-eme ihe a na-eme kwa ụbọchị, dị ka ịzụ ihe na ire ihe, ka o mee ihe n’ụzọ anụ ọhịa ahụ si na-eme, dị ka ihe atụ, n’ime ememe ụbọchị ezumike dị iche iche. A na-atụ anya ka ha fee anụ ọhịa ahụ ofufe, na-ekwere ka ọ chịa ndụ ha, ka ha wee nweta akara ya.
36. Nsogbu dịgasị aṅaa ka ndị jụrụ ịnara akara anụ ọhịa ahụ nwetaworo?
36 Ndị jụrụ ịnara akara anụ ọhịa ahụ anọgidewo na-enwe ihe isi ike. Dị ka ihe atụ, malite n’afọ ndị 1930, ha jere ụlọikpe ọtụtụ ugbo, nweekwa ntachi obi n’oge dị iche iche ọha mmadụ na-eti ha ihe, na-akpagbukwa ha n’ụzọ ndị ọzọ. Ná mba ndị nwere ọchịchị aka ike, a tụbara ha n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche, ebe ọtụtụ n’ime ha nọ wee nwụọ. Kemgbe agha ụwa nke abụọ, ọtụtụ ụmụ okorobịa anọwo n’ụlọ mkpọrọ ruo ogologo oge, ọbụna na a tawo ụfọdụ n’ime ha ahụhụ, gbuokwa ha, n’ihi na ha jụrụ imebi nnọpụiche ndị Kraịst ha. Ná mba ndị ọzọ, ọ naghị ekwe ndị Kraịst omume ịzụrụ ihe ma ọ bụ ire ihe n’ụzọ nkịtị; ụfọdụ ndị apụghị inwe ihe onwunwe; a na-edina ndị ọzọ n’ike, gbuo ha ma ọ bụ chụpụ ha n’ala nke aka ha. N’ihi gịnị? N’ihi na ezi akọ na uche ha ekweghị ha ịzụrụ kaadị òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị.d—Jọn 17:16.
37, 38. (a) N’ihi gịnị ka ụwa ji bụrụ ebe na-adịghịrị ndị ahụ jụrụ ịnara akara anụ ọhịa ahụ mfe ibi n’ime ya? (b) Olee ndị na-anọgide n’ikwesị ntụkwasị obi, gịnịkwa ka ha kpebisiri ike ime?
37 N’akụkụ ụwa ụfọdụ, okpukpe na-abami ná ndụ ndị obodo nke na a na-ekewapụ onye ọ bụla na-akwado eziokwu Bible n’ebe ezinụlọ na ndị enyi ya mbụ nọ. A chọrọ okwukwe dị ukwuu iji nwee ntachi obi. (Matiu 10:36-38; 17:22) N’ime ụwa ebe ihe ka n’ọnụ ọgụgụ na-efe ihe onwunwe ofufe, ebe emeghị ihe n’eziokwu jupụtakwara, ọtụtụ mgbe, ezi onye Kraịst aghaghị ịtụkwasị Jehova obi kpam kpam na Ọ ga-akwado ya ná mgbalị ya ịgbaso ụzọ eziokwu. (Abụ Ọma 11:7; Ndị Hibru 13:18) N’ime ụwa nke na-egwugharị n’ime mmiri nke adịghị ọcha, ọ chọrọ mkpebi siri oké ike iji nọgide na-adị ọcha, n’enweghị ntụpọ. Mgbe mgbe, ndị dọkịta na ndị nọọsụ na-arụgide ndị Kraịst nọ n’ọrịa ka ha mebie iwu Chineke banyere ịdị nsọ nke ọbara; ọbụna na ha na-eguzogide iwu ụlọikpe ndị megidere okwukwe ha. (Ọrụ 15:28, 29; 1 Pita 4:3, 4) N’oge mgbe enweghị ọrụ na-aba ụba, ọ na-esiwanyekwa ike ka ezi onye Kraịst zere ọrụ nke ga-eme ka o mebie ikwesị ntụkwasị obi ya n’ebe Chineke nọ.—Maịka 4:3, 5.
38 Ee, ọ dịrịghị ndị ahụ na-enweghị akara nke anụ ọhịa ahụ mfe ibi n’ime ụwa. Ọ bụ ngosipụta pụtara ìhè nke ike na ngọzi Jehova ịhụ na ndị fọdụrụ ná mkpụrụ nke nwanyị ahụ, ha na ìgwè mmadụ karịrị nde isii nọgidere n’ikwesị ntụkwasị obi ha n’agbanyeghị nrụgide nile ha na-enwe imebi iwu Chineke. (Mkpughe 7:9) N’ịdị n’otu, gburugburu ụwa, ka anyị nile nọgide na-ebuli Jehova na ụzọ ezi omume ya nile elu, ka anyị nọgidere na-ajụ ịnara akara anụ ọhịa ahụ.—Abụ Ọma 34:1-3.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Iji nwetakwuo nkọwa, biko lee peji 165-179 nke akwụkwọ bụ́ “Ṅaa Ntị n’Amuma Daniel!” nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
b The Interpretation of St. John’s Revelation, nke R. C. H. Lenski dere, peji 390, 391.
c Ndị na-enye nkọwa ihe na-eme eme ekwuwo na ịhụ mba n’anya bụ, n’ezie, okpukpe. N’ihi nke a, ndị na-ahụ mba ha n’anya na-efe akụkụ anụ ọhịa ahụ nke mba ha nọ n’ime ya nọchitere anya ya. Banyere ịhụ mba n’anya na United States, anyị na-agụ, sị: “Ịhụ mba n’anya, ọ bụrụ na e lee ya anya dị ka okpukpe, nwere ọtụtụ ihe ndị yiri ibe ha ya na okpukpe ndị ọzọ bụ isi nke oge ochie . . . Onye na-ahụ mba ya n’anya dị ka okpukpe n’oge a maara na ya dabeere na chi nke mba ya. Ọ dị ya mkpa ịnata enyemaka Ya dị ike. N’ebe Ọ nọ ka ọ na-ahụta isi iyi nke izu okè na obi ụtọ ya. Ọ na-edo onwe ya n’okpuru Ya, n’ikwu ya nnọọ n’echiche nke okpukpe. . . . A na-aghọta mba ahụ dị ka nke na-adị ruo mgbe ebighị ebi, ihe ọnwụ nke ụmụ ya kwesịrị ntụkwasị obi na-eme bụkwa nanị ịtụkwasị ihe n’otuto na ịdị ebube ya nke na-adịghị anwụ anwụ.”—Carlton J. F. Hayes, dị ka e hotara ya na peji 359 nke akwụkwọ bụ What Americans Believe and How They Worship, nke J. Paul Williams dere.
d Lee, dị ka ihe atụ, Ụlọ Nche nke September 1, 1971, peji nke 520 (Bekee); December 15, 1974, peji nke 533; December 1, 1975, peji nke 725; August 1, 1979, peji nke 23; June 1, 1979, peji nke 20 (Bekee); November 15, 1980, peji nke 22.
[Foto dị na peeji nke 195]
E nyere ya ikike ikunye ihe oyiyi nke anụ ọhịa ahụ ume