Nletaghachi Na-eduga n’Ọmụmụ Bible
1. N’ihi gịnị ka ọrụ ịga nletaghachi ji dị oké mkpa?
1 Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ọrụ ọ bụghị nanị ime nkwusa kamakwa ‘ime ndị na-eso ụzọ na izi ha ihe.’ (Mat. 28:19, 20) Onye na-eme nkwusa na-ezisa ozi, ma onye nkụzi na-eme ihe karịrị nke ahụ. Ọ na-akụzi ihe, na-enye nkọwa, na-enyekwa ihe àmà. Otu ụzọ anyị si akụziri ndị ọzọ ihe bụ site n’ịga nletaghachi na nke ndị nwere mmasị n’ebumnobi nke ịmalitere ha ọmụmụ Bible.
2. Ole ndị ka anyị kwesịrị ịgara nletaghachi?
2 Olee ndị i kwesịrị ịgara nletaghachi? Jide n’aka ịgaghachi na nke ndị nile naara akwụkwọ ma ọ bụ ọbụna ndị gositụrụ mmasị n’ozi ọma ahụ. Ọ bụrụ na ị chọta onye nwere mmasị mgbe ị nọ na-agba àmà n’ebe ọha na eze na-anọ, gbalịa ịnata onye ahụ adres ya ma ọ bụ nọmba telifon ya ka i wee nwee ike ịzụlite mmasị ya. Nwee nchekwube na ị ga-enwe ike ịmalite ọmụmụ Bible. Nọgide na-achọ ndị ga-ekweta ka e duziere ha ọmụmụ Bible, ma eleghị anya ị ga-achọtakwa ha.—Mat. 10:11.
3, 4. Gịnị ka ime nletaghachi ndị dị irè na-agụnye?
3 Gosi Mmasị Onwe Onye: Ime nkwadebe maka nletaghachi na-arụpụta ihe na-amalite ná nleta mbụ. Ndị na-ezisa ozi ọma na-enwe ihe ịga nke ọma na-arịba ihe na-amasị onye nwe ụlọ ama, ha na-adaberekwa na nke ahụ nwee nkwurịta okwu ndị ọzọ. Ụfọdụ na-achọpụta na ọ na-aba uru iwelite otu ajụjụ ná mmechi nke nleta iji kwadebe onye nwe ụlọ maka nleta ọzọ. Ezi mmasị anyị nwere n’ebe ndị mmadụ nọ na-eme ka anyị nọgide na-eche banyere ha ọbụna mgbe anyị siworo na nke ha pụọ, ọ na-akpalikwa anyị ịgaghachi ọzọ n’egbughị oge. Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, gbalịa ịlaghachi mgbe mmasị ahụ na-ajụbeghị oyi—ikekwe mgbe otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ gasịrị.
4 Mgbe ị na-aga nletaghachi, gbalịa ikwu okwu na-adabere ná nkwurịta okwu unu nwere n’oge gara aga. Mee ka ọ bụrụ ihe mgbaru ọsọ gị ịkọrọ ya, ma ọ dịkarịa ala, otu isi ihe sitere n’Akwụkwọ Nsọ, bụ́ nke na-ewuli elu n’oge nke ọ bụla, dịkwa njikere ige ntị. Mara onye nwe ụlọ nke ọma karị. Mgbe ahụ, ná nleta ndị ọzọ, soro ya kerịta eziokwu sitere n’Okwu Chineke, ndị na-ekwu okwu kpọmkwem banyere nchegbu ya.
5. Olee ụzọ dị mfe a pụrụ isi malite ọmụmụ Bible?
5 Mụrụ Anya Ịchọpụta Ohere Iji Malite Ọmụmụ Bible: Na-eme nletaghachi n’ebumnobi nke ịmalite ọmụmụ Bible. Olee otú a pụrụ isi mee nke a? Kwuo na ị ga-enwe mmasị iso ya tụlee otu isi ihe na-akpali mmasị, sapetakwa n’akwụkwọ Ihe Ọmụma ma ọ bụ broshuọ Na-achọ otu paragraf nke i chere ga-amasị onye ahụ. Gụpụta paragraf ahụ, tụlee ajụjụ ya, tụleekwa otu n’ime akụkụ Akwụkwọ Nsọ ma ọ bụ abụọ e zoro aka na ha. A pụrụ ime nke a kpọmkwem n’ọnụ ụzọ onye nwe ụlọ na minit ise ruo iri. Mechie site n’ịjụ ajụjụ na-esote nke ahụ na ime ndokwa ịga n’ihu ná nkwurịta okwu ahụ n’oge ọzọ.
6. Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị ghọtara mkpa ime nletaghachi dị?
6 Ịzụlite mmasị nile anyị na-achọta bụ akụkụ dị mkpa nke ozi anyị. Ya mere, wepụta oge n’usoro ihe omume gị kwa izu iji na-eme nletaghachi. Ime otú ahụ ga-eme ka ozi gị dịkwuo irè ma na-ewetara gị ezi ọṅụ.