Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 4/00 p. 8
  • Jide n’Aka na Ị Gaghachiri!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jide n’Aka na Ị Gaghachiri!
  • Ozi Alaeze Anyi—2000
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nletaghachi Na-eduga n’Ọmụmụ Bible
    Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Nweta Obi Ike Ime Nletaghachi
    Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Nyere Ndị Nwere “Ezi Ọchịchọ Obi” Aka
    Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Ide Ihe Ụfọdụ Gbasara Onye Anyị Ziri Ozi Ọma
    Ozi Alaeze Anyi—2014
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2000
km 4/00 p. 8

Jide n’Aka na Ị Gaghachiri!

1 “Mkparịta ụka ahụ tọrọ nnọọ ụtọ! M ga-echeta ịga nletaghachi n’ebe ahụ.” Ọ̀ dịwo mgbe i kwuru okwu ahụ ma mesịa chefuo ebe onye ahụ bi? Ọ bụrụ otú ahụ, ị maara na nanị ụzọ ị pụrụ isi jide n’aka na ị laghachiri bụ idetu ya edetu.

2 Detuo Ha Nile Edetuo: Mgbe ị ka chetachara mkparịta ụka gị na onye nwere mmasị, wepụta oge iji detuo ihe ọmụma nile dị mkpa banyere nleta ahụ. Dee aha onye ahụ na otú ị ga-esi amata ya. Detuo adres ya, ma akọla nkọ banyere ya—nyochaa ya iji jide n’aka na ihe i deturu ziri ezi. Detuo isiokwu unu kwurịtara, akụkụ akwụkwọ nsọ ọ bụla unu gụrụ, na akwụkwọ i nyefere.

3 Ọ bụrụ na ị jụrụ onye ahụ ajụjụ a ga-aza mgbe ị ga-agaghachi, detuo ya edetuo. Ò nwere ihe ị mụtara banyere onye ahụ, ezinụlọ ya, ma ọ bụ okpukpe ya? Ọ bụrụ otú ahụ, detuo nke a edetuo. Mgbe ahụ, mgbe ọzọ ị gara, ịkpọtụ uche na ya ga-egosi mmasị i nwere n’ebe onye ahụ nọ. N’ikpeazụ, denye ụbọchị na oge i mere nleta nke mbụ na mgbe i kwuru na ị ga-alọghachi. Site n’inwe ihe ndekọ ziri ezi, ị ga-enwe ihe ncheta ndị doro anya, o yichaghịkwa ka ị ga-echefu nkwa i kwere ịlọghachi.—1 Tim. 1:12.

4 Ozugbo ihe ndekọ gị zuru ezu, dokọta ya na ihe ndị ọzọ i ji eje ozi ubi—akpa ozi ọma, Bible, akwụkwọ Reasoning, na akwụkwọ gị—ka o wee dịrị gị nso mgbe nile. Ọ kasị mma idetu ndị na-anọghị n’ụlọ n’akwụkwọ ihe ndekọ ụlọ n’ụlọ ndị dị iche ná ndị i ji edetu nletaghachi gị. N’ezie, n’agbanyeghị mgbalị i na-etinye idetu nletaghachi gị, ihe dị mkpa bụ ijide n’aka na ị na-agaghachi!

5 Na-eche Banyere Onye Ahụ: Mgbe ị na-akwadebe maka ozi, tụleghachi ihe ndekọ nletaghachi gị. Chee banyere onye nke ọ bụla na ihe kasị mma ị pụrụ ime mgbe ị na-agaghachi. Chee otú ị ga-esi zụlite mmasị onye ahụ, iji nwee ọmụmụ Bible ebe obibi. Atụmatụ dị otú ahụ pụrụ ịmụba ihe ị na-arụpụta dị ka onye ozi nke ozi ọma, mụbaakwa ọṅụ gị.—Ilu 21:5a.

6 Ya mere, mgbe ọzọ ị hụrụ onye gere gị ntị, echela na ọ pụrụ ịdịrị gị mfe icheta nleta ahụ. Kama nke ahụ, detuo ya, tụleghachi ihe ndekọ gị, nọgide na-eche banyere onye ahụ, ma jide n’aka na ị ga-agaghachi!

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya