Ị Chọọ Ka Mkpụrụ Ị Kụrụ Too, Na-agba Ya Mmiri
1. Gịnị ka anyị kwesịrị ịgba mmiri ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka o too?
1 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka mkpụrụ anyị kụrụ n’ubi too, anyị ga na-agba ya mmiri. Otú ahụkwa ka anyị kwesịrị ime ma anyị chọọ ka mkpụrụ nke eziokwu anyị kụrụ n’obi ndị bi n’ókèala anyị too. (1 Kọr. 3:6) Anyị kwesịrị ịga nletaghachi na nke ndị anyị ziri ozi ọma ma jiri Okwu Chineke gbaa mkpụrụ nke eziokwu anyị kụrụ n’obi ha mmiri ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ọ gbanye mgbọrọgwụ, too, ma mịwa mkpụrụ.
2. Gịnị ka anyị nwere ike ime ka onye anyị ziri ozi ọma nwee mmasị n’ihe anyị na ya ga-ekwurịta n’ụbọchị ọzọ?
2 Jụọ Ajụjụ: Mgbe ị na-akwadebe ihe ị ga-ezi n’ozi ọma, ọ́ gaghị adị mma ma ị kwadebe ajụjụ onye ị na-ezi ozi ọma ga-achọ ka ị bịaghachi na nke ya zaa? Jụọ onye ahụ ajụjụ ahụ ma i zichaa ya ozi ọma chọwa ịla, gwakwa ya ụbọchị ị ga-abịaghachi zaa ya ajụjụ ahụ. Ọtụtụ ndị nkwusa na-ajụ ndị ha ziri ozi ọma ajụjụ a ga-eji akwụkwọ Bible Na-akụzi zaa, ka ha nwee ike isi otú ahụ malitere onye ahụ ọmụmụ Baịbụl.
3. Olee ihe ndị i nwere ike ide n’akwụkwọ gbasara onye ị ga-aga nletaghachi na nke ya?
3 Dee Ihe Gbasara Onye ahụ Ede: Ozugbo i zichara mmadụ ozi ọma n’ụbọchị mbụ ị gara na nke ya, gbaa mbọ detuo ihe gbasara ya n’akwụkwọ. Dee aha onye ahụ na adres ya. Echefukwala ide ụbọchị na oge gị na ya kwurịtara okwu na ihe gị na ya kwurịtara. Ọ bụrụkwa na i nyere ya akwụkwọ, dee aha akwụkwọ ahụ. Ọ̀ gwara gị chọọchị ọ na-aga? Ò nwere ezinụlọ? Mgbe gị na ya na-ekwurịta okwu, ò nwere ihe ndị ị chọpụtara bụ́ mkpa ya? Ihe ndị ahụ ga-enyere gị aka ịma ebe ị ga-ebido ma ị gaghachi na nke ya. Deekwa mgbe gị na ya yiri agba na ị ga-abịaghachi nakwa ajụjụ ị ga-aza ma ị gaa.
4. Ọ bụrụ na anyị na-aga nletaghachi na nke onye nwere mmasị ma anyị anaghị enweta ya, olee ihe mere o ji dị mma ka anyị nweere ya ndidi?
4 Nwee Ndidi: Setan na-agbasi mbọ ike ịhụ na o ‘weere okwu’ nke eziokwu a kụrụ n’obi ndị mmadụ. (Mak 4:14, 15) N’ihi ya, ọ bụrụ na ị na-aga na nke onye nwere mmasị i ziri ozi ọma ma ị naghị enweta ya n’ụlọ, adala mbà. I nwere ike izigara ya akwụkwọ ozi ma ọ bụkwanụ dee ihe ị chọrọ ịgwa ya ná mpempe akwụkwọ, dewe ya n’ọnụ ụzọ ya. Otu ọsụ ụzọ guzo n’ọnụ ụzọ malitere otu nwaanyị ọmụmụ Baịbụl. Ma, o nwetaghị ya n’ụlọ ọzọ, n’ihi ya, ya edeere ya akwụkwọ ozi. Mgbe nwanna nwaanyị ahụ mechara nweta ya n’ụlọ, nwaanyị ahụ kelere ya maka ọmarịcha akwụkwọ ozi o deere ya. Ka anyị na-agba mkpụrụ nke eziokwu anyị kụrụ n’obi ndị mmadụ mmiri, obi ga-atọ anyị ụtọ ma mkpụrụ ahụ puwe, towe ma “na-amị mkpụrụ okpukpu iri atọ nakwa iri isii nakwa otu narị.”—Mak 4:20.