Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Kwadebe Obi Onye I Ziri Ozi Ọma Maka Mgbe Ị Ga-abịaghachi
Ihe Mere O ji Dị Mkpa: Ọ bụrụ na anyị achọpụta na onye anyị ziri ozi ọma nwere mmasị, anyị kwesịrị ịgaghachi na nke ya mgbe ọzọ ọ ga-anọ ya. (1 Kọr. 3:6) Ọ pụtara na tupu anyị alaa, anyị kwesịrị ịkwadebe obi onye ahụ maka mgbe anyị ga-abịaghachi. Otú anyị ga-esi eme ya bụ iyi mgbe anyị ga-abịa nakwa ịgwa ya ajụjụ anyị ga-asa ma anyị bịa. Ajụjụ ahụ ga-eme ka onye ahụ na-atụsi anya anyị ike. Ọ bụrụkwa na akwụkwọ anyị nyere ya zara ajụjụ ahụ, o nwere ike ịgụ ya tupu anyị abịa. Ọ bụrụ na anyị akwadebe obi onye ahụ maka mgbe ọzọ anyị ga-abịa, ịgaghachi na nke ya ga-adịrị anyị mfe n’ihi na anyị amarala ihe anyị na ya ga-akpa. Onye ahụ ga-amakwa ihe anyị na ya ga-akpa ma anyị bịa. Anyị bịaghachi, anyị agwa ya na anyị bịara ịza ajụjụ ahụ anyị jụrụ ụbọchị ahụ anyị bịara na nke ya.
Mee Ihe A n’Ọnwa A:
Ị kwadowe ihe ị ga-ekwu n’ozi ọma, chepụta ajụjụ ị ga-ajụ onye ị ga-ezi ozi ọma nke ị ga-achọ ịza ma ị gaghachi. Gwa onye gị na ya na-arụ ajụjụ ahụ.