Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Septemba 8
IZU NA-AMALITE NA SEPTEMBA 8
Abụ nke 133 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 12 ¶16-21, igbe dị na peeji nke 127 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ọnụ Ọgụgụ 22-25 (Nkeji 10)
Nke 1: Ọnụ Ọgụgụ 22:36–23:10 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ndụ Ebighị Ebi Abụghị Nrọ—td 30A (Nkeji 5)
Nke 3: Otú E Si Chebe Jizọs—lr isi nke 32 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 15: Na-akpa Ezigbo Àgwà n’Ozi Ọma. (2 Kọr. 6:3) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jụọ ụmụnna ajụjụ ndị a: (1) Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-akpa ezigbo àgwà mgbe anyị na-ezi ozi ọma? (2) Olee otú anyị ga-esi kpaa àgwà ọma (a) mgbe anyị ruru ebe anyị ga-ezi ozi ọma? (b) mgbe anyị na-aga ozi ụlọ n’ụlọ n’ebe ndị mmadụ bi ma ọ bụ mgbe anyị ji ụgbọala aga ozi ụlọ n’ụlọ n’ókèala ndị dị n’ime ime obodo? (ch) mgbe anyị guzo n’ọnụ ụzọ mmadụ? (d) mgbe onye anyị na ya so na-ezi mmadụ ozi ọma? (e) mgbe onye anyị gara na nke ya na-ekwu okwu? (f) mgbe onye anyị gara na nke ya ji ihe n’aka ma ọ bụ mgbe mmiri na-ezo? (g) mgbe onye anyị gara na nke ya gwara anyị okwu ọjọọ?
Nkeji 15: “Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Kwadebe Obi Onye I Ziri Ozi Ọma Maka Mgbe Ị Ga-abịaghachi.” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. A ga-eme ihe ngosi ebe onye nkwusa na-agwa onwe ya okwu mgbe ọ na-akwado ihe ọ ga-ekwu n’ozi ọma. Ọ ga-echepụta ajụjụ ndị ọ ga-ajụ mmadụ nke ọ ga-aza ma ọ bịaghachi na nke onye ahụ.
Abụ nke 68 na Ekpere