Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Febụwarị 24
IZU NA-AMALITE NA FEBỤWARỊ 24
Abụ nke 101 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 3 ¶11-18 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Jenesis 32-35 (Nkeji 10)
Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke (Nkeji 20)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl na Satọdee Mbụ n’Ọnwa. Okwu. Kwuo ndokwa e mere maka otú unu ga-esi aga ozi ọma na Satọdee mbụ n’ọnwa Mach. Jiri ihe dị n’ebe e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu” mee ihe ngosi.
Nkeji 15: Ike Agwụla Gị. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ ga-esi n’Akwụkwọ Mgbaafọ 2013, peeji nke 45, paragraf 1, ruo na peeji nke 46, paragraf 1; nakwa peeji nke 136 na nke 137. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ihe ha mụtara.
Nkeji 10: “Anyị Ga-amalite Ịkpọ Ndị Mmadụ Òkù na Mach 22.” Okwu onye nlekọta ije ozi ga-ekwu. Nye onye ọ bụla bịara ọmụmụ ihe otu akwụkwọ ịkpọ òkù. Kwurịtanụ ihe e dere na ya. Kwuo ụfọdụ ihe dị n’akwụkwọ ozi e detaara ndị okenye banyere òkù a anyị ga-akpọ ndị mmadụ. Kwuokwa ndokwa e mere ka e nwee ike inye ya ọtụtụ ndị nọ n’ókèala unu.
Abụ nke 109 na Ekpere