Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite na Febụwarị 24, 2014.
1. Gịnị ka ihe Setan gwara Iv mere ka o chewe? Gịnị ka mkpụrụ osisi ahụ Iv riri gosiri? (Jen. 3:6) [Jen. 6, w11 5/15 p. 16-17 para. 5]
2. Olee ihe nyeere Ebel aka inwe okwukwe na Jehova? Olee uru okwukwe ahụ baara ya? (Jen. 4:4, 5; Hib. 11:4) [Jen. 6, w13 1/1 p. 12 para. 3; p. 14 para. 4-5]
3. Olee otú ndị nne na nna ga-esi enyere ụmụ ha aka ka ha ghara inwe mmasị ná “ndị dike” na “ndị ikom a ma ama” n’ụwa a? (Jen. 6:4) [Jen. 13, w13 4/1 p. 13 para. 2]
4. Olee ihe anyị mụtara n’akụkọ Lọt na nwunye ya, nke dị na Jenesis 19:14-17, 26? [Jen. 27, w03 1/1 p. 16-17 para. 20]
5. Olee otú Ebreham si gosi na ya nwere okwukwe na Chineke ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ nakwa na mkpụrụ ahụ o kwere ya ná nkwa ga-esi n’agbụrụ Aịzik? (Jen. 22:1-18) [Feb. 3, w09 2/1 p. 18 para. 4]
6. Jenesis isi iri abụọ na ise amaokwu iri abụọ na atọ kwuru na ‘nke okenye ga-ejere nke nwata ozi.’ Gịnị ka anyị mụtara n’amụma a? [Feb. 10, w03 10/15 p. 29 para. 1]
7. Gịnị ka nrọ ahụ Jekọb rọrọ banyere “ubube” pụtara? (Jen. 28:12, 13) [Feb. 10, w04 1/15 p. 28 para. 6]
8. Gịnị mere Leban ji na-achọ terafim ahụ Rechel zuuru? (Jen. 31:30-35) [Feb. 17, w04 6/1 p. 29 para. 2]
9. Gịnị ka anyị mụtara n’ihe mmụọ ozi zara Jekọb na Jenesis 32:29? [Feb. 24, w13 8/1 p. 10]
10. Olee ihe ga-enyere anyị aka ka ụdị ihe ahụ mere Daịna ghara ime anyị? (Jen. 34:1, 2) [Feb. 24, w01 8/1 p. 20-21]