Bido Ugbu A Mewe Atụmatụ Ịgakwu Ozi Ọma
1. Olee ihe anyị nwere ike ime n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs? Oleekwa ihe anyị kwesịrị ime ugbu a?
1 Kwa afọ, oge Ncheta Ọnwụ Jizọs na-abụ oge pụrụ iche anyị ‘ji eto Jehova nke ukwuu.’ (Ọma 109:30) Ì nwere ike iwepụtakwu oge gaa ozi ọma n’ọnwa Mach iji gosi Jehova otú obi dị gị maka nzite o zitere Ọkpara ya ka ọ bịa gbapụta anyị? Ọ bụrụ na i nwere ike, bido ugbu a haziwe otú ị ga-esi eme ya.—Ilu 21:5.
2. Olee otú obi dị ma gị ma ndị nkwusa ndị ọzọ mgbe e kwuru na ndị ọsụ ụzọ inyeaka nwere ike inye awa iri atọ n’ọnwa Eprel afọ gara aga?
2 Ịsụ Ụzọ Inyeaka: N’afọ gara aga, ndị nkwusa ṅụrịrị nnukwu ọṅụ mgbe a gwara ha na ndị chọrọ ịsụ ụzọ inyeaka n’ọnwa Eprel nwere ike inye awa iri atọ. Otu nwanna nwoke kwuru n’akwụkwọ ozi o dere, sị: “M ka nọ ụlọ akwụkwọ sekọndrị, agaghịkwa m abụli ọsụ ụzọ oge niile ugbu a. Ma, m ga-edejupụta fọm ọsụ ụzọ inyeaka, kwuo na m ga-enye awa iri atọ n’ọnwa Eprel. O ruo mgbe ahụ, m ga-agbalị lee ma m̀ ga-arụta awa iri ise.” Otu nwanna nwaanyị nke na-arụ ọrụ na-anaghị enye ya ohere kwukwara, sị: “Awa iri atọ agaghị ara m ahụ́ ịrụzu.” Mgbe ahụ a mara ọkwa maka inye awa iri atọ n’ọnwa Eprel, otu nwanna nwaanyị na-asụbu ụzọ oge niile, onye gaferela iri afọ asatọ, kwuru, sị: “O teela m nọ na-atụ anya ụdị ihe a. Jehova ma na ọ bụ mgbe ahụ m bụ ọsụ ụzọ oge niile ka m kacha nwee obi ụtọ.” Ndị na-enwelighị ike ịsụ ụzọ inyeaka n’ọnwa ahụ wepụtakwuru oge gaa ozi ọma.
3. Olee ihe mere anyị ji kwesị iche echiche ma ànyị ga-asụ ụzọ inyeaka n’ọnwa Mach, Eprel, na Mee?
3 Ọnwa Mach afọ a ga-abụ ọnwa magburu onwe ya ịsụ ụzọ inyeaka n’ihi na ndị chọrọ ịsụ ụzọ inyeaka nwere ike ịhọrọ ma hà ga-enye awa iri atọ ma ọ bụ awa iri ise n’ọnwa ahụ. Ihe ọzọ bụ: Na Satọdee Mach 17, anyị ga-amalite ịkpọ ndị mmadụ ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs anyị ga-enwe n’Eprel 5. Ọtụtụ n’ime anyị rụchaa ọrụ ịsụ ụzọ inyeaka n’ọnwa Mach, ha nwere ike rụkwuo n’ọnwa Eprel na Mee, bụ́ mgbe ha ga-enyezi awa iri ise zuru ezu.
4. Olee ihe anyị nwere ike ime ka anyị nwee ike wepụtakwuo oge gaa ozi ọma n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs? Oleekwa ihe ọ ga-arụpụta?
4 Ná mgbede ọzọ unu ga-enwe Ofufe Ezinụlọ, ọ ga-adị mma ma unu kparịta otú onye ọ bụla n’ezinụlọ unu ga-esi wepụtakwuo oge gaa ozi ọma n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs. (Ilu 15:22) Rịọnụ Jehova ka o nyere unu aka. (1 Jọn 3:22) Anyị wepụtakwuo oge gaa ozi ọma n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs, anyị ga-ewetakwuru Jehova otuto. Nke a ga-emekwa ka anyị nwekwuo obi ụtọ.—2 Kọr. 9:6.