Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Febụwarị 20
IZU NA-AMALITE NA FEBỤWARỊ 20
Abụ nke 37 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 17 ¶1-7 (Nkeji 25)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Aịzaya 58-62 (Nkeji 10)
Nke 1: Aịzaya 61:1-11 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Gịnị Mere Nrara Anyị Raara Onwe Anyị Nye Chineke Ji Egosi na Anyị Hụrụ Ya n’Anya ma Nwee Okwukwe n’Ebe Ọ Nọ? (Nkeji 5)
Nke 3: Àgwà Ndị E Ji Mara Chineke—td 20CH (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Ịma ọkwa. Kwuo akwụkwọ a ga-enye ndị mmadụ n’ọnwa Mach, meekwa otu ihe ngosi.
Nkeji 10: Gịnị Ka Anyị Mụtara? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gụọnụ Abụ Ọma 63:3-8 na Mak 1:32-39. Tụleekwanụ otú amaokwu Baịbụl ndị ahụ nwere ike isi nyere anyị aka n’ozi ọma.
Nkeji 15: “Kpọọ Ndị Mmadụ Ka Ha Bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs.” Ajụjụ na azịza. Ọ bụrụ na unu enwetala akwụkwọ ikpo òkù maka Ncheta Ọnwụ Jizọs, nye onye ọ bụla bịara ọmụmụ ihe otu. Kwurịtanụ ihe e dere na ya. Mgbe unu na-atụle paragraf nke 2, mee ihe ngosi ga-ewe nkeji ole na ole iji gosi otú e nwere ike isi nye mmadụ akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ. Mgbe unu na-atụle paragraf nke 3, gwa onye nlekọta ije ozi ka o kwuo otú e nwere ike isi rụchaa ókèala ọgbakọ unu.
Abụ nke 8 na Ekpere