Anyị Enwekwuola Ohere Anyị Ga-eji Na-eto Jehova
1. Olee ihe a malitere n’ọnwa Mach afọ a nke ga-enyere anyị aka ịsụ ụzọ inyeaka?
1 Anyị kwuru na malite n’ọnwa Mach 2013, onye nkwusa ọ bụla na-asụ ụzọ inyeaka n’ọnwa Mach, Eprel, na n’ọnwa onye nlekọta sekit bịara ileta ọgbakọ ha nwere ike inye awa iri atọ. Ọ bụ otú a ka ọ ga na-adị n’afọ ọ bụla. Ọ bụrụ na ọbịbịa onye nlekọta sekit unu ga-esi n’otu ọnwa gafee n’ọnwa ọzọ, ndị na-asụ ụzọ inyeaka n’oge ahụ nwere ike ịhọrọ otu n’ime ọnwa ndị ahụ ma nye awa iri atọ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ọ ga-abịa ileta ọgbakọ unu ná ngwụcha ọnwa Julaị ruo ná mmalite ọnwa Ọgọst. Ị chọọ, gị ahọrọ ọnwa Julaị ma ọ bụ Ọgọst nye awa iri atọ. Ndị niile na-asụ ụzọ inyeaka n’ọnwa onye nlekọta sekit bịara ileta ọgbakọ ga-anọ ya ná nzukọ onye nlekọta sekit na ndị ọsụ ụzọ oge niile na ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche ga-enwe. Ha ga-anọ ná nzukọ ahụ ruo n’isi. Ihe ọ pụtara bụ na ọ bụrụ na anyị agaghị enyeli awa iri ise, anyị ka nwere ike ịsụ ụzọ inyeaka ugboro anọ n’afọ ma nye awa iri atọ n’ọnwa nke ọ bụla.—Ọma 109:30; 119:171.
2. Olee uru ndị na-asụ ụzọ inyeaka n’oge onye nlekọta sekit bịara ileta ọgbakọ ha ga-erite?
2 Oge Onye Nlekọta Sekit Bịara Ileta Ọgbakọ: Ọtụtụ ndị nkwusa ga-enwezi ike ịsụ ụzọ inyeaka n’oge onye nlekọta sekit bịara ileta ọgbakọ ha. Nke a ga-eme ka ọ gbaa ha ume, hanwa agbaakwa ya. (Rom 1:11, 12) Ọtụtụ ndị na-asụ ụzọ inyeaka nwere ike ịnara ndị ha na-arụrụ ọrụ ikike ka ha na onye nlekọta sekit nwee ike ịrụkọ n’ozi ọma mgbe ọ bịara ileta ọgbakọ ha. Ndị nkwusa ọrụ ha na-agaghị ekwe pụta ozi ọma na Wenezdee ruo Fraịdee nwere ike ịgwa onye nlekọta sekit ka ha na ya rụọ n’ozi ọma na Satọdee ma ọ bụ na Sọnde. Ihe ọzọ bụ na obi ga-adị ndị ọsụ ụzọ inyeaka ụtọ mgbe ha na onye nlekọta sekit na ndị ọsụ ụzọ oge niile na ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche ga-enwe nzukọ. Nke a ga-agba ha ume.
3. Olee ihe mere oge a na-echeta ọnwụ Jizọs ji bụrụ oge dị mma iji sụọ ụzọ inyeaka?
3 N’Ọnwa Mach na Eprel: O nwere ihe anyị bidoro n’afọ 2011. Anyị kwuru na ọ bụrụ na mmadụ na-asụ ụzọ inyeaka n’oge a na-echeta ọnwụ Jizọs, o nwere ike inye awa iri atọ n’ọnwa ahụ. Ma ọ bụghịzi naanị n’ọnwa a na-echeta ọnwụ Jizọs ka mmadụ nwere ike inye awa iri atọ. Ọ bụrụ na mmadụ chọrọ ịsụ ụzọ inyeaka n’ọnwa Mach na Eprel, o nwere ike inye awa iri atọ ma ọ chọọ. Nke a ga-eme ka o tokwuo Jehova. (Hib. 13:15) Ọnwa Mach na Eprel dị mma iji sụọ ụzọ inyeaka. Ọ bụ n’ọnwa ndị ahụ ka anyị na-akpọ ndị mmadụ ka ha bịa soro anyị cheta ọnwụ Jizọs. Ihe ọzọ bụ na anyị na ọtụtụ ndị nkwusa anyị na ha na-arụbeghị mbụ n’ozi ọma nwere ike soro gaa ozi ọma n’ihi na ọtụtụ n’ime ha ga-asụ ụzọ inyeaka n’ọnwa Mach na Eprel. E chetachaa ọnwụ Jizọs, anyị na-agakwa hụ ndị bịara ya, gwakwa ha ka bịa gere okwu ihu ọha pụrụ iche. Ị̀ ga-asụ ụzọ inyeaka n’ọnwa Mach ma ọ bụ Eprel?—Luk 6:45.