Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Febụwarị 18
IZU NA-AMALITE NA FEBỤWARỊ 18
Abụ nke 52 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
jr isi nke 5 ¶13-18 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Mak 1-4 (Nkeji 10)
Nke 1: Mak 2:18–3:6 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ihe Mere Mmadụ Niile Ji Na-ata Ahụhụ n’Ihi Mmehie Adam—td 26B (Nkeji 5)
Nke 3: Gịnị Ka Ihe Pọl Kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 7:29-31 Pụtara? (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 15: Kwusaa Okwu Chineke n’Oge Nsogbu. (2 Tim. 4:2) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. O si n’Ụlọ Nche Septemba 15, 2008, peeji nke 7 na nke 8, paragraf nke 3-6 nakwa Ụlọ Nche Mee 1, 2001, peeji nke 16, paragraf nke 10 na nke 11. Jụọ ndị na-ege ntị ihe ha mụtara.
Nkeji 15: “Kpọọ Ndị Mmadụ Ka Ha Bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs.” Ajụjụ na azịza. Nye onye ọ bụla bịara ọmụmụ ihe otu akwụkwọ ịkpọ òkù maka Ncheta Ọnwụ Jizọs. Kwurịtanụ ihe e dere na ya. Mgbe unu na-atụle paragraf nke 2, gwa onye nlekọta ije ozi ka o kwuo ndokwa e mere ka e nwee ike inye ọtụtụ ndị nọ n’ókèala unu akwụkwọ ịkpọ òkù. Mgbe unu na-atụle paragraf nke 3, jiri nkeji ole na ole mee ihe ngosi otú e nwere ike isi nye mmadụ akwụkwọ ịkpọ òkù.
Abụ nke 8 na Ekpere