Ị̀ Na-eji Okwu Chineke Eme Ihe Mgbe Nile?
1 N’ụwa a nke imerime mmadụ na-adịghị ekwere n’ihe Bible kwuru, ezi Ndị Kraịst ji ịnụ ọkụ n’obi na-akpọsa Okwu Chineke. Ebe anyị kwenyesiri ike na “Akwụkwọ Nsọ dum sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke,” anyị kwenyeere Jizọs Kraịst, bụ́ onye kwuru n’ekpere o kpegaara Jehova, sị: “Okwu gị bụ eziokwu.” (2 Tim. 3:16; Jọn 17:17) Olee otú anyị pụrụ isi na-eji Okwu Chineke eme ihe nke ọma mgbe nile?
2 Mara Ihe Akwụkwọ Nsọ Kwuru: Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Jizọs tinyere onwe ya n’ịmụ Okwu Chineke. Nke a mere ka o nwee ike iji Akwụkwọ Nsọ zie ihe n’oge nile o jere ozi n’ụwa. (Luk 4:16-21; 24:44-46) Olee otú anyị pụrụ isi mụta iburu ọtụtụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ga na-enyere anyị aka, n’isi? Ọ bụ site n’ịdị na-agụ Bible kwa ụbọchị ma na-atụgharị uche n’amaokwu ndị gbara anyị nnọọ ume ma ọ bụ ndị anyị chọpụtara na ha ga-abara anyị uru n’ozi ubi. Mgbe anyị na-akwadebe maka nzukọ ọgbakọ, anyị kwesịrị ịdị na-asapeta Bible ma na-agụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha, ọ bụrụkwa na o kwe mee, anyị akwadebe otú anyị ga-esi akọwa ha. Mgbe anyị gara ọmụmụ ihe, anyị kwesịrị ịdị na-asapeta Bible anyị mgbe ọkà okwu na-agụ Bible. Ịma ihe ndị e kwuru na Bible ga-eme ka anyị dị njikere ‘ijizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi.’—2 Tim. 2:15.
3 Kwe Ka Bible Kwuo Okwu: Mgbe anyị nọ n’ozi ubi, anyị kwesịrị ịdị na-ekwe ka Bible kwuo okwu. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na o kwe mee, anyị kwesịrị ịgụrụ onye nwe ụlọ otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ. Ọ bụrụ na ọ jụọ ajụjụ ma ọ bụ kwuo okwu mgbochi ụfọdụ, ọ kasị mma iji Bible zaghachi ya. Mgbe onye nwe ụlọ ji ọrụ n’aka, anyị ka pụkwara ịdọrọ uche ya gaa n’otu ihe e kwuru na Bible site n’ịsị ya, “Tupu mụ alaa, biko kwe ka m gụọrọ gị otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ a.” Mgbe ọ bụla o kwere mee, sapeta Bible gị ma gụọrọ ya ebe ahụ, kwekwa ka ọ hụ ebe ahụ ị na-agụ.
4 Mgbe e gosiri otu onye nwe ụlọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e ji kọwaara ya na Bible akwadoghị ozizi Atọ n’Ime Otu, o kwuru n’olu dara ụda, sị, “Anọwo m na-aga chọọchị kemgbe a mụrụ m, ma amabeghị m na e kwuru ihe a na Bible!” O kwere ka e bido duziwere ya ọmụmụ Bible ozugbo. Jizọs kwuru na atụrụ ya ga-ege ntị n’olu ya. (Jọn 10:16, 27) Ụzọ kasị mma ndị nwere obi eziokwu ga-esi amata eziokwu ahụ bụ site n’igosi ha ya kpọmkwem n’Akwụkwọ Nsọ. Ya mere, ka anyị jiri Okwu Chineke, nke bụ́ okwu nke eziokwu ahụ, na-eme ihe mgbe nile!