Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 5/07 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2007
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite na May 14
  • Izu Na-amalite na May 21
  • Izu Na-amalite na May 28
  • Izu Na-amalite na June 4
Ozi Alaeze Anyi—2007
km 5/07 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite na May 14

Abụ nke 205

Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara mbụ nke ọnwa May. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 8, ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche May 15 na Teta! April–June. Mgbe a na-enyefe Teta! ahụ, jiri ụzọ nke mbụ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe.

Minit 20: Ịkwado Ọrụ Alaeze n’Ógbè Anyị na n’Ụwa Nile. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya nke ga-adabere n’isi nke 12 nke akwụkwọ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova.

Minit 15: “Ọ ‘Na-enye Onye Dara Mbà Ike.’”a Dị ka oge kwere mee, gwa ndị na-ege ntị ka ha kọwaa akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha.

Abụ nke 1 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite na May 21

Abụ nke 41

Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Tụlee Igbe Ajụjụ.

Minit 15: “Mmadụ Iwepụta Onwe Ya Ịrụ Ọrụ Na-eweta Ngọzi”b Gbaa otu onye nkwusa ma ọ bụ ndị nkwusa abụọ a maara dị ka ndị na-ewepụta onwe ha ịrụ ọrụ, ajụjụ ọnụ. Jụọ ha ọrụ ndị ha wepụtarala onwe ha ịrụ? Olee mgbanwe ndị ọ dị mkpa ka ha mee iji nwee ike ịrụ ọrụ ndị ahụ, oleekwa otú ha si mee mgbanwe ndị ahụ? Olee ngọzi ndị ha nwetarala n’ihi ya?

Minit 20: “Ị̀ Na-eji Okwu Chineke Eme Ihe Mgbe Nile?”c Gụnye ihe ndị e kwuru n’igbe ndị dị na peeji nke 143-144 nke akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi.

Abụ nke 202 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite na May 28

Abụ nke 46

Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa May. Gụọ akụkọ ndekọ ego na akwụkwọ ozi ekele maka onyinye afọ ofufo. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 8, ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche June 1 na Teta! April–June. Mgbe a na-enyefe Teta! ahụ, jiri ụzọ nke abụọ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe.

Minit 20: Nyefee Akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ n’Ọnwa June. Mee ka ihe ụfọdụ e kwuru n’akwụkwọ ahụ, bụ́ ndị ga-aka abara ndị nọ n’ókèala unu uru, pụta ìhè ma tụlee ụzọ ndị a tụrụ aro isi nyefee ya bụ́ ndị dị n’Ozi Alaeze Anyị nke February 1999. Jiri aro ndị dabara adaba n’ókèala unu mee ihe ngosi nke ụzọ a pụrụ isi nyefee ya. Dị ka oge kwere mee, gwa ndị na-ege ntị ka ha kọọ ihe ọma ndị si n’iji akwụkwọ ahụ nyere ndị enyi ha ma ọ bụ ndị ezinụlọ ha aka, pụta.

Minit 15: Ahụmahụ Ndị E Nwetara n’Ozi Ubi. Gwa ndị rụrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka na March, April, na May nakwa ndị nkwusa ndị ọzọ jechikwuru ozi ubi anya n’ọnwa ndị ahụ ka ha kọọ ahụmahụ ndị ha nwetara. Gwakwa ndị gaghachiri na nke ndị ha nyefere magazin ma buru n’obi ịmalite mụwara ha Bible, ka ha kọọ ahụmahụ ndị ha nwetara mgbe ha mere nke a. A pụrụ iji otu ma ọ bụ abụọ n’ime ahụmahụ ndị nke bụ́ ịgba a kọrọ mee ihe ngosi.

Abụ nke 21 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite na June 4

Abụ nke 99

Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị.

Minit 15: “Ì Nwere Ókèala nke Aka Gị?”d Gụnye okwu dị nkenke nke sitere n’aka onye nlekọta ije ozi banyere otú ókèala ọgbakọ unu haruru, ugboro ole a na-arụzu ya, na ókèala ndị dịnụ a pụrụ ikenye ndị nkwusa ka ọ bụrụ ókèala nke aka ha.

Minit 20: “Kụziere Ụmụ Gị Ito Jehova.”e Mgbe a na-atụle paragraf nke 4, gụnye ihe e kwuru na peeji nke 3 nke Ozi Alaeze Anyị nke July 2005.

Abụ nke 169 na ekpere mmechi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

d Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

e Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya