IHE ỌMỤMỤ NKE 20
E Webatara Akwụkwọ Nsọ n’Ụzọ Dị Irè
AKWỤKWỌ Nsọ bụ ebe ntụziaka a na-enye ná nzukọ ọgbakọ anyị dabeere. Ọ bụkwa n’akụkụ dị iche iche nke Bible ka ihe anyị na-ekwu n’ozi ubi hiwere isi. Otú ọ dị, ókè ha ga-atụnyeru ụtụ ná nkwurịta okwu anyị na-adabere ruo n’ókè ụfọdụ n’otú e webataruru ha n’ụzọ dị irè.
A chọrọ ihe karịrị nanị izo aka n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ na ịgwa mmadụ ka o soro gị gụọ ya. Mgbe ị na-ewebata akụkụ Akwụkwọ Nsọ, gbalịa imezu ebumnobi abụọ: (1) Kpalie atụmanya ihe, (2) lekwasịkwa anya n’ihe mere e ji jiri amaokwu ahụ na-eme ihe. A pụrụ imezu ebumnobi ndị a n’ọtụtụ ụzọ.
Jụọ Ajụjụ. Nke a bụ ụzọ na-akasị adị irè ma ọ bụrụ na ndị na-ege gị ntị amatabeghị azịza ya. Gbalịa ịjụ ajụjụ ahụ n’ụzọ ga-eme ka ndị mmadụ chee echiche. Jizọs mere nke a. Mgbe ndị Farisii bịakwutere ya n’ụlọ nsọ ma nọrọ n’ihu ọha nwalee ókè ọ maruru Akwụkwọ Nsọ, Jizọs jụrụ ha, sị: “Gịnị ka unu chere banyere Kraịst ahụ? Nwa ònye ka ọ bụ?” Ha zara, sị: “Nwa Devid.” Jizọs jụziri, sị: “Ò sizi aṅaa bụrụ na Devid sitere n’ike mmụọ nsọ kpọọ ya ‘Onyenwe m’?” Ọ gaziri n’ihu ihota ihe e kwuru n’Abụ Ọma 110:1. O mechiri ndị Farisii ọnụ. Otú ọ dị, ìgwè mmadụ ahụ ji obi ụtọ gee Jizọs ntị.—Mat. 22:41-46.
N’ozi ubi, ị pụrụ ịjụ ajụjụ mmeghe ndị dị ka: “Mụ na gị nwere aha aka. Chineke ò nwere aha aka? Anyị pụrụ ịchọta azịza ya n’Abụ Ọma 83:18.” “Ọ̀ dị mgbe a ga-enwe otu ọchịchị ga na-achị ihe nile a kpọrọ mmadụ? Lee otú e si zaa ya na Daniel 2:44.” “Bible ọ̀ na-ekwu okwu n’ezie banyere ọnọdụ ndị dị n’oge anyị? Jiri ihe e kwuru na 2 Timoti 3:1-5 tụnyere ọnọdụ ndị ị maara dịnụ.” “Ọ̀ dị mgbe ịta ahụhụ na ọnwụ ga-akwụsị? A pụrụ ịchọta azịza Bible nyere ná Mkpughe 21:4, 5.”
Mgbe a na-ekwu okwu, iji nlezianya jiri ajụjụ na-ewebata akụkụ Akwụkwọ Nsọ pụrụ ịkpali ndị na-ege gị ntị ilerughachi akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị iche iche anya, ọbụna ndị ha mabu ama. Ma hà ga-eme otú ahụ? Nke ahụ pụrụ ịdabere na ma ajụjụ ndị ị jụrụ, hà na-echegbu ha n’ezie ma ọ bụ na ha adịghị echegbu ha. Ọbụna mgbe isiokwu ahụ na-adọrọ mmasị ndị na-ege ntị, uche ha pụrụ ịkpapụ mgbe ị na-agụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ha nụworo ọtụtụ ugboro. Iji gbochie nke ahụ ime, ọ dị gị mkpa ichebasiri okwu a echiche ike iji mee ka okwu gị na-adọrọ mmasị.
Kwuo Otu Nsogbu. Ị pụrụ ikwu otu nsogbu ma dọrọzie uche gaa n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ nke kwuru okwu banyere ngwọta ya. Emela ka ndị na-ege ntị tụọ anya ihe karịrị ihe ha ga-enweta. Ọtụtụ mgbe, otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ na-ekwu nanị otu akụkụ nke ihe ngwọta nke otu nsogbu. Otú ọ dị, ka ị na-agụ otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ, ị pụrụ ịgwa ndị na-ege ntị ka ha tụlee nduzi ọ na-enye n’ụzọ isi mee ihe banyere ọnọdụ ahụ.
N’otu aka ahụ, ị pụrụ ikwupụta otu ụkpụrụ omume nsọpụrụ Chineke ma jirizie ihe ndekọ Bible gosi amamihe dị n’ịgbaso ya. Ọ bụrụ na otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ nwere isi ihe abụọ a kapịrị ọnụ (ma ọ bụ karịa ma eleghị anya) bụ́ ndị metụtara ihe a na-ekwu, ndị ọkà okwu ụfọdụ na-agwa ndị na-ege ntị ka ha lee ma ha ga-ahụ ha. Ọ bụrụ na otu nsogbu eyie ka o sibigaara otu ìgwè ndị na-ege ntị ike ókè, ị pụrụ ịkpali ha iche echiche site n’ikwu ọtụtụ ihe a pụrụ ime, mgbe ahụkwa nye ohere ka akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ na nkọwa ya zaa ya.
Zoo Aka na Bible Dị Ka O Kwuchaa O Bie. Ọ bụrụ na ị kpasuola mmasị n’isiokwu gị kwuo otu echiche ma ọ bụ karị bụ́ ndị e nwere banyere akụkụ ya ụfọdụ, ị pụrụ iwebata akụkụ Akwụkwọ Nsọ nanị site n’ikwu, sị: “Lee ihe Okwu Chineke na-ekwu n’isiokwu a.” Nke a na-egosi ihe mere ihe ị gaje ịgụ ji bụrụ o kwuchaa o bie.
Jehova jiri ndị ikom dị ka Jọn, Luk, Pọl na Pita dee akụkụ ụfọdụ nke Bible. Ma ọ bụ nanị odide ka ha dere ya; ọ bụ Jehova bụ Onye Chepụtara ya. Karịsịa mgbe ị na-agwa ndị na-adịghị amụ Akwụkwọ Nsọ okwu, iwebata otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ site n’ikwu na “Pita dere sị” ma ọ bụ na “Pọl kwuru na” nwere ike ọ gaghị na-akpali akpali otú okwu mmeghe nke na-eme ka a mata akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ dị ka okwu Chineke ga na-akpali. Ọ bụ ihe kwesịrị ịrịba ama na mgbe ụfọdụ, Jehova gwara Jerimaịa ka ọ malite nkwupụta okwu dị iche iche site n’ikwu, sị: “Nụrụnụ okwu Jehova.” (Jer. 7:2; 17:20; 19:3; 22:2) Ma ànyị ji aha Jehova mee ihe n’iwebata akụkụ Akwụkwọ Nsọ ma ọ bụ na anyị ejighị ya, tupu anyị emechie nkwurịta okwu anyị, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike igosi na ihe dị n’ime Bible bụ okwu ya.
Buru Ihe Ndị E Kwuru Gburugburu Ya n’Uche. I kwesịrị ịmata ihe ndị e kwuru gburugburu ya mgbe ị na-ekpebi otú ị ga-esi ewebata otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ. N’ọnọdụ ụfọdụ, ị ga-ekwu kpọmkwem ihe ndị e kwuru gburugburu ya; otú ọ dị, n’ụzọ ndị ọzọ, ihe ndị e kwuru gburugburu ya pụrụ inwe mmetụta n’ihe ị ga-ekwu. Dị ka ihe atụ, ị̀ ga-ewebata ihe Job na-atụ egwu Chineke kwuru n’otu ụzọ ahụ ị ga-esi ewebata ihe otu n’ime ndị nkasi obi ụgha ya kwuru? Ọ bụ Luk dere akwụkwọ Ọrụ Ndịozi, ma o hotakwara ihe Jems, Pita, Pọl, Filip, Stivin, ndị mmụọ ozi, tinyere Gameliel na ndị Juu ndị ọzọ na-abụghị Ndị Kraịst kwuru. Ònye ka ị ga-asị na ọ bụ ya kwuru ihe dị n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ị na-ehota? Dị ka ihe atụ, cheta na ọ bụghị Devid haziri abụ ọma nile, ọ bụghịkwa Solomọn dere akwụkwọ Ilu nile. Ọ bakwara uru ịmata onye onye ahụ so dee Bible na-agwa okwu na ihe ọ na-ekwu maka ya n’ozuzu ya.
Jiri Ihe Ọmụma Banyere Ọnọdụ Gbara Ihe Gburugburu Mee Ihe. Nke a na-adị irè karịsịa ma ọ bụrụ na ị pụrụ igosi na ọnọdụ ndị dị n’oge ihe ndekọ ahụ dị na Bible mere yiri ndị ị na-atụle. N’ọnọdụ ndị ọzọ, ihe ọmụma banyere ọnọdụ gbara ihe gburugburu na-adị mkpa iji ghọta otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị ga-eji Ndị Hibru 9:12, 24 mee ihe n’okwu banyere ihe mgbapụta ahụ, ị pụrụ ịhụ na ọ ga-adị mkpa tupu ị gụọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ, ibu ụzọ kọwaa ná mkpirikpi ọnụ ụlọ kasị dịrị n’ime n’ụlọikwuu ahụ, bụ́ nke Akwụkwọ Nsọ na-egosi na ọ na-ese onyinyo ebe Jizọs banyere mgbe ọ rịgooro n’eluigwe. Ma ewebatala ihe ọmụma gafere ókè banyere ọnọdụ gbara ihe gburugburu nke na ọ ga-ekpuchi akụkụ Akwụkwọ Nsọ ị na-ewebata.
Iji mee ka ụzọ i si ewebata Akwụkwọ Nsọ ka mma, tụlee ihe ndị ọkà okwu nwere ahụmahụ na-eme. Rịba ụzọ dị iche iche ha na-eji eme ihe ama. Tụlee otú ụzọ ndị a dịruru irè. N’ịkwadebe okwu nke gị, chọpụta akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị bụ́ isi, chebakwara ihe akụkụ Akwụkwọ Nsọ nke ọ bụla kwesịrị imezu echiche n’ụzọ pụrụ iche. Jiri nlezianya hazie otú ị ga-esi ewebata nke ọ bụla ka e wee jiri ha mee ihe n’ụzọ ga-enwe mmetụta kasị ukwuu. Ka ị na-enwekwu ahụmahụ, jiri otu ụzọ ahụ na-ewebata akụkụ Akwụkwọ Nsọ nile i ji na-eme ihe. Ka akụkụ a nke okwu gị na-adịwanye mma, ị ga na-elekwasịkwu anya n’Okwu Chineke.