Ozi Ọma Jọn Dere
7 Mgbe e mechara, Jizọs nọ na Galili na-ekwusa ozi ọma n’ihi na ọ chọghị ịga Judia maka na ndị Juu nọ na-achọ igbu ya.+ 2 Ma, ememme ndị Juu a na-akpọ Ememme Ụlọikwuu*+ na-eru nso. 3 N’ihi ya, ụmụnne ya ndị nwoke+ sịrị ya: “Hapụ ebe a gawa Judia, ka ndị na-eso ụzọ gị hụkwa ọrụ ndị ị na-arụ. 4 N’ihi na e nweghị onye na-eme ihe ọ bụla na nzuzo ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ka mmadụ niile mara ya. Ọ bụrụ na ị na-eme ihe ndị a, gosi ụwa onwe gị.” 5 N’eziokwu, ụmụnne ya ndị nwoke enweghị okwukwe na ya.+ 6 N’ihi ya, Jizọs sịrị ha: “Oge m erubeghị,+ ma oge ọ bụla dịịrị unu mma. 7 E nweghị ihe mere ụwa ga-eji kpọọ unu asị. Ma ọ kpọrọ m asị n’ihi na m na-agba àmà na ọrụ ya dị njọ.+ 8 Gawanụ ememme a. Agawabeghị m, n’ihi na oge m eruchabeghị.”+ 9 Mgbe ọ gwachara ha ihe ndị a, ọ nọdụrụ na Galili.
10 Ma mgbe ụmụnne ya ndị nwoke gawarala ememme ahụ, ọ gawakwara. Ma ọ gara na nzuzo, ka ndị mmadụ ghara ịmata. 11 N’ihi ya, ndị Juu malitere ịchọ ya n’ememme ahụ, na-asị: “Olee nwoke ahụ?” 12 Ọtụtụ n’ime ndị nọ n’ebe ahụ weturu olu ala na-ekwu okwu banyere Jizọs. Ụfọdụ nọ na-asị: “Ọ bụ ezigbo mmadụ.” Ndị ọzọ na-asị: “Ọ bụghị ezigbo mmadụ. Ọ na-eduhie ìgwè mmadụ a.”+ 13 Ma, e nweghị onye na-ekwu banyere ya n’ihu ọha n’ihi na ha na-atụ ndị Juu egwu.+
14 Mgbe ememme ahụ gara ọkara, Jizọs gbagooro n’ụlọ nsọ ma malite izi ihe. 15 O juru ndị Juu anya, ha ana-asị: “Olee otú nwoke a si mara Akwụkwọ Nsọ,*+ ebe ọ bụ na ọ gụghị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ?”*+ 16 Ma Jizọs sịrị ha: “Ihe m na-ezi abụghị nke m, kama ọ bụ nke onye zitere m.+ 17 Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ ime uche Chineke, ọ ga-ama ma ihe m na-ezi ò si n’aka Chineke+ ka m̀ na-ekwu echiche m. 18 Onye na-ekwu echiche nke ya na-achọ otuto nke ya. Ma onye na-achọ otuto nke onye zitere ya+ bụ onye eziokwu, ajọ omume adịghịkwa n’ime ya. 19 Ọ̀ bụ na Mosis enyeghị unu Iwu?+ Ma e nweghị onye n’ime unu na-erube isi n’Iwu ahụ. Gịnị mere unu ji na-achọ igbu m?”+ 20 Ìgwè mmadụ ahụ zara, sị: “Mmụọ ọjọọ ji gị. Ònye na-achọ igbu gị?” 21 Jizọs wee sị ha: “Otu ihe ka m mere, ya eju unu niile anya. 22 Ọ bụ ya mere Mosis ji nye unu iwu ibi úgwù.+ Ọ bụghị na o si n’aka Mosis, kama o si n’aka nna nna unu hà.+ Unu na-ebikwa mmadụ úgwù n’ụbọchị izu ike. 23 Ebe ọ bụ na a na-ebi mmadụ úgwù n’ụbọchị izu ike ka a ghara ịda Iwu Mosis, gịnị mere unu ji na-ewesa m iwe ọkụ maka na m gwọrọ mmadụ n’ụbọchị izu ike?+ 24 Kwụsịnụ ile mmadụ anya n’ihu mgbe unu na-ekpe ikpe, kama na-ekpenụ ikpe ziri ezi.”+
25 Ụfọdụ ndị bi na Jeruselem malitere ịsị: “Ọ́ bụghị nwoke a ka a na-achọ igbu?+ 26 Ma lee, ọ na-ekwu okwu n’ihu ọha, e nweghịkwa ihe ha na-agwa ya. Ọ̀ ga-abụ na ndị isi amatala n’eziokwu na ọ bụ ya bụ Kraịst? 27 Anyị ma ebe nwoke a si.+ Ma mgbe Kraịst ga-abịa, e nweghị onye ga-ama ebe o si.” 28 Mgbe Jizọs na-ezi ihe n’ụlọ nsọ, o ji oké olu kwuo, sị: “Unu ma m, marakwa ebe m si. Ọ bụghị m zitere onwe m,+ kama Onye zitere m dị adị, unu amaghịkwa ya.+ 29 Ama m ya+ n’ihi na abụ m onye nnọchiteanya ya. Ọ bụ ya zitere m.” 30 N’ihi ya, ha malitere ịchọ otú ha ga-esi jide ya.+ Ma e nweghị onye bitụrụ ya aka n’ihi na oge ya erubeghị.+ 31 Ma ọtụtụ n’ime ìgwè mmadụ ahụ nwere okwukwe na ya.+ Ha nọkwa na-asị: “Mgbe Kraịst ga-abịa, ọ̀ ga-arụ ọrụ ebube karịrị nke nwoke a na-arụ?”*
32 Ndị Farisii nụrụ ka ìgwè mmadụ ahụ na-atakwu ihe ndị a banyere Jizọs, ndị isi nchụàjà na ndị Farisii wee dunye ndị nche ka ha gaa jide ya. 33 Jizọs wee sị: “Mụ na unu ka ga-anọtụkwu tupu mụ alakwuru Onye zitere m.+ 34 Unu ga-achọ m, ma unu agaghị ahụ m, unu enweghịkwa ike ịbịa n’ebe m nọ.”+ 35 N’ihi ya, ndị Juu kwurịtara, sị: “Ebee ka nwoke a bu n’uche ịga ka anyị ghara ịhụ ya? Ò bu n’uche ịgakwuru ndị Juu bi n’obodo ndị Grik ka ọ kụziere ndị Grik ihe? 36 Gịnị ka o bu n’obi mgbe ọ sịrị, ‘Unu ga-achọ m, ma unu agaghị ahụ m, unu enweghịkwa ike ịbịa n’ebe m nọ’?”
37 N’ụbọchị ikpeazụ, nke bụ́ nnukwu ụbọchị n’ememme ahụ,+ Jizọs guzoro ọtọ ma jiri oké olu kwuo, sị: “Ọ bụrụ na mmiri na-agụ onye ọ bụla, ya bịakwute m ṅụọ mmiri.+ 38 Onye ọ bụla nwere okwukwe na m, ‘Mmiri nke na-enye ndụ ga-esi n’ime ya na-asọpụta,’+ otú e kwuru ya n’Akwụkwọ Nsọ.” 39 Ma, ọ na-ekwu banyere mmụọ nsọ nke ndị nwere okwukwe na ya na-aga ịnata, n’ihi na ha anatabeghị mmụọ nsọ+ ebe ọ bụ na e mebeghị ka Jizọs dị ebube.+ 40 Ụfọdụ n’ime ìgwè mmadụ ahụ ndị nụrụ ihe a o kwuru malitere ịsị: “N’eziokwu, ọ bụ ya bụ Onye Amụma ahụ.”+ 41 Ndị ọzọ nọ na-asị: “Onye a bụ Kraịst.”+ Ma ụfọdụ nọ na-asị: “Kraịst ọ̀ ga-esi na Galili bịa?+ 42 Ọ̀ bụ na e kwughị n’Akwụkwọ Nsọ na Kraịst ga-esi n’agbụrụ Devid,+ nakwa na ọ ga-esi na Betlehem,+ bụ́ obodo Devid?”+ 43 Ìgwè mmadụ ahụ kewaziri n’ihi ya. 44 Ụfọdụ n’ime ha chọrọ ijide ya, ma e nweghị onye bitụrụ ya aka.
45 Ndị nche ahụ wee laghachikwuru ndị isi nchụàjà na ndị Farisii. Ndị isi nchụàjà na ndị Farisii jụrụ ha, sị: “Gịnị mere na unu akpụtaghị ya?” 46 Ndị nche ahụ zara, sị: “E nwetụbeghị onye ọzọ kwuru okwu otú a.”+ 47 Ma, ndị Farisii kwuru, sị: “È duhiekwala ununwa? 48 È nwere otu n’ime ndị isi ma ọ bụ ndị Farisii nwere okwukwe na ya?+ 49 Ma ìgwè mmadụ a na-amaghị Iwu* bụ ndị a bụrụ ọnụ.” 50 Nikọdimọs, onye bịakwuteburu Jizọs, onye bụ́kwa otu n’ime ndị Farisii, sịrị ha: 51 “Iwu anyị ekwughị na a ga-ama mmadụ ikpe ma ọ bụrụ na e bughị ụzọ nụ n’ọnụ onye ahụ ma mara ihe ọ na-eme, ka ò kwuru otú ahụ?”+ 52 Ha zara ya, sị: “Gịnwa ì sikwu na Galili? Chọọ n’Akwụkwọ Nsọ, ị ga-ahụ na e nweghị onye amụma ga-esi na Galili.”*