Na-ekwuzi Okwu Chineke Ekwuzi
1 Mgbe Filip na-agbara otu onye ọchịchị àmà, ‘ọ saghere ọnụ ya, zie ya ozi ọma Jisọs, na-amalite site n’ihe a e deworo n’otu akụkụ akwụkwọ nsọ.’ (Ọrụ 8:35) Filip nọ “na-ekwuzi okwu nke eziokwu ahụ.” (2 Tim. 2:15) Otú ọ dị, taa, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị achọpụtawo na ọtụtụ ndị nkwusa adịghị ejikebe Bible eme ihe mgbe ha na-agba àmà. Ị̀ na-eji Bible eme ihe n’ozi gị?
2 Ihe nile anyị kweere ma na-ezi sitere n’Okwu Chineke. (2 Tim. 3:16, 17) Ọ bụ ya na-adọta ndị mmadụ n’ebe Jehova nọ, na-ezikwa ha ihe maka ndụ. Ọ bụ ya mere o ji dị mkpa ka anyị na-eji Bible na-eme ihe n’ozi anyị kama ịdị na-ekwu okwu nanị n’isiokwu ndị na-amasị anyị. (Hib. 4:12) Ebe ọ bụ na ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ amachaghị Bible, ọ dị anyị mkpa ịdị na-agụpụta ihe site na ya iji gosi ha nduzi dị irè ọ na-enye nakwa ọdịnihu ọ na-ekwu na ihe a kpọrọ mmadụ pụrụ inwe.
3 Gụpụta Ihe Kpọmkwem Site na Bible: Ọ bụrụ na ndị nọ n’ógbè unu na-enwe obi abụọ ịhụ ndị ji akpa akwụkwọ na-ekwusa ozi ọma, i nwere ike ịgbalị ịga n’ọnụ ụzọ n’ejighị akpa. Ị pụrụ itinye akwụkwọ a na-enyefe n’ọnwa ahụ bụ́ nke ị chọrọ iji mee ihe n’obere ihe ma jiri Bible n’aka ma ọ bụ tinye ya n’akpa uwe gị. Mgbe gị na mmadụ malitere ikwurịta okwu, ị pụziri iwepụta Bible ahụ n’emeghị ka onye ahụ chee na ị na-anwa ikwuru ya okwuchukwu. Nọdụ otú onye na-ege gị ntị ga-enwe ike iso gị na-agụ Bible gị. Ikekwe gwa ya ka ọ gụpụta otu amaokwu n’olu dara ụda. Ọ ga-enwe mmetụta ka ukwuu mgbe ọ pụrụ ịhụ ihe Bible kwuru kama ịnụ ya nanị site n’ọnụ gị. N’ezie, iji nyere ya aka ịghọta isi ihe dị n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ, mesie okwu ndị na-ewepụta echiche okwu ike.
4 Iji Otu Akụkụ Akwụkwọ Nsọ Chee Ihe n’Ihu Mmadụ: Mgbe ị kọwasịrị onwe gị, ị pụrụ ikwu, sị: “Ndị mmadụ na-elega anya n’ebe dị iche iche iji nweta nduzi ná ndụ ha. Olee ebe i chere bụ́ ebe kasị mma isi nweta nduzi dị irè? [Nye ohere maka nzaghachi.] Gịnị ka i chere banyere okwu a? [Gụọ Ilu 2:6, 7, nyekwa ohere maka nzaghachi.] Amamihe mmadụ akụwo nnọọ afọ n’ala, na-akpatara ọtụtụ mmadụ obi nkoropụ. Otú ọ dị, amamihe Chineke abụwo nke a pụrụ ịdabere na ya na nke bara uru mgbe nile.” Mgbe ahụ gosi ya akwụkwọ ndị ị na-enyefe, ma si na ya mee ka otu ihe atụ nke amamihe bara uru nke Chineke pụta ìhè.
5 Jisọs ji Akwụkwọ Nsọ mee ihe iji nyere ndị nwere obi eziokwu aka. (Luk 24:32) Pọl ji Akwụkwọ Nsọ gosipụta ịbụ eziokwu nke ihe ndị ọ kụziri. (Ọrụ 17:2, 3) Obi ike na ọṅụ anyị nwere n’ozi ahụ ga-amụba ka anyị na-ejiwanye nkà ekwuzi Okwu Chineke ekwuzi.