Isi nke 15
Iwulite Ezinụlọ nke Na-asọpụrụ Chineke
1-3. N’ihi gịnị ka ụfọdụ na-enweghị ike idozi nsogbu ndị a na-enwekarị n’alụmdi na nwunye na n’ịbụ nne ma ọ bụ nna, ma n’ihi gịnị ka Bible pụrụ iji nye aka?
KA E were na i mere atụmatụ iwu ụlọ nke gị. Ị zụta ala. N’oké atụmanya, i ji anya nke uche gị na-ahụ ụlọ ọhụrụ gị. Ma gịnị ma ọ bụrụ na i nweghị ngwá ọrụ na nkà owuwu ihe ọ bụla? Lee ka mgbalị gị nile ga-esi bụrụ ihe nkụda mmụọ!
2 Ọtụtụ di na nwunye na-abanye n’ọlụlụ na-arọ nrọ ezinụlọ obi ụtọ, ma ghara inwe ma ngwá ọrụ ma nkà ndị dị mkpa iji wuo ya. Ngwa ngwa ụbọchị agbamakwụkwọ ahụ gasịrị, ụkpụrụ omume ndị na-adịghị mma na-ebilite. Ịlụ ọgụ na nsegharị okwu na-abụ kwa ụbọchị. Mgbe a mụrụ ụmụ, nne na nna ọhụrụ ahụ na-ahụ na ha enweghị nkà n’ịbụ ndị mụrụ ụmụ dị ka ha na-enweghị n’alụmdi na nwunye.
3 Otú ọ dị, ọ bụ ihe obi ụtọ na Bible pụrụ inye aka. Ụkpụrụ ya dị iche iche dị ka ngwá ọrụ ndị na-eme ka i nwee ike iwu ezinụlọ obi ụtọ. (Ilu 24:3) Ka anyị lee otú o si bụrụ otú ahụ.
NGWÁ ỌRỤ DỊ ICHE ICHE MAKA IWU ALỤMDI NA NWUNYE OBI ỤTỌ
4. N’ihi gịnị ka a ga-eji tụọ anya nsogbu n’alụmdi na nwunye, oleekwa ụkpụrụ ndị a na-enye n’ime Bible?
4 N’agbanyeghị otú di na nwunye yiruru ka hà kwekọruru n’ibe ha, ha dị iche n’ọdịdị mmetụta uche, ahụmahụ ha nwere na nwata, na nzụlite ezinụlọ. Ya mere, a ga-atụ anya nsogbu ụfọdụ mgbe agbamakwụkwọ gasịrị. Olee otú a ga-esi dozie ha? Ọ dị mma, mgbe ndị owuwu ihe na-ewu ụlọ, ha na-ele anya n’akwụkwọ ụkpụrụ ya. Ndị a bụ usoro nduzi a ga-agbaso. Bible na-enye ụkpụrụ dị iche iche nke Chineke maka iwu ezinụlọ obi ụtọ. Ka anyị tụlee ole na ole n’ime ndị a ugbu a.
5. Olee otú Bible si ekwusi okwu ike maka mkpa nke ịnọgidesi ike n’ihe n’alụmdi na nwunye?
5 Ịnọgidesi Ike n’Ihe. Jisọs sịrị: “Ihe Chineke kekọtara, mmadụ atọsala.”a (Matiu 19:6) Pọl onyeozi dere, sị: “Ka ịlụ di na nwunye bụrụ ihe a na-asọpụrụ n’etiti unu nile, ka ihe ndina unu bụrụkwa ihe a dịghị emerụ emerụ: n’ihi na Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko ikpe, ha na ndị na-akwa iko, bụ́ ndị ikom nwere nwunye na ndị inyom nwere di.” (Ndị Hibru 13:4) Ya mere ndị di na nwunye kwesịrị inwe echiche nke ibu ọrụ n’ebe Jehova nọ ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye ndị ha lụrụ.—Jenesis 39:7-9.
6. Olee otú ịnọgidesi ike n’ihe ga-esi nye aka ichebe alụmdi na nwunye?
6 Ịnọgidesi ike n’ihe na-eme ka alụmdi na nwunye ahụ dị ùgwù, nọrọkwa ná nchebe. Ndị di na nwunye na-anọgidesi ike n’ihe maara na, ihe ọ sọrọ ya mee, ha ga-akwado ibe ha. (Eklisiastis 4:9-12) Lee ka o si dị iche n’ebe ndị na-agbahapụ alụmdi na nwunye ha ozugbo a hụrụ ntakịrị nsogbu nọ! Ndị dị otú ahụ na-ekwubi ngwa ngwa na ha ‘họọrọ onye na-ekwesịghị ekwesị,’ na ha ‘ahụkwaghị onwe ha n’anya,’ na ịlụ onye ọhụrụ bụ ihe ngwọta ya. Ma nke a adịghị enye nke ọ bụla n’ime di na nwunye ahụ ohere ito eto. Kama nke ahụ, ndị dị otú ahụ na-adịghị anọgidesi ike n’ihe pụrụ ibugara onye ọhụrụ otu nsogbu ndị ahụ. Mgbe mmadụ nwere ụlọ dị mma ma chọpụta na elu ya na-ehi mmiri, n’ezie ọ na-agbalị idozi ya. Ọ dịghị nnọọ akwaga n’ụlọ ọzọ. N’otu aka ahụ, ịgbanwe onye òtù ọlụlụ abụghị ụzọ isi dozie ihe iseokwu ndị kpatara nsogbu alụmdi na nwunye. Mgbe nsogbu bilitere, anwala isi n’alụmdi na nwunye ahụ pụọ, kama rụsie ọrụ ike ichebe ya. Ịnọgidesi ike n’ihe dị otú ahụ na-emeso njikọ ahụ dị ka ihe ruru eru ịbụ nke e chekwara, nke e jigidere, na nke e ji kpọrọ oké ihe.
7. N’ihi gịnị ka nkwurịta okwu ji esikarịrị ndị di na nwunye ike, ma olee otú iyikwasị “mmadụ ọhụrụ” ahụ pụrụ isi nye aka?
7 Nkwurịta Okwu. “Mmebi echiche nile dị mgbe izu nzuzo na-adịghị,” ka otu ilu Bible na-ekwu. (Ilu 15:22) Ma, nkwurịta okwu na-esiri di na nwunye ụfọdụ ike. N’ihi gịnị ka o ji dị otú ahụ? N’ihi na ndị mmadụ nwere ụzọ dị iche iche isi na-ekwurịta okwu. Nke a bụ ihe mere eme na-edubakarị n’oké nghọtahie na obi mgbawa. Nzụlite mmadụ pụrụ iso na-akpata nke a. Dị ka ihe atụ, a pụrụ ịzụlitewo ụfọdụ n’ọnọdụ ebe nne na nna na-esegharị okwu. Ugbu a dị ka ndị toruworo ogo mmadụ lụrụ di ma ọ bụ nwunye, ha nwere ike ghara ịma ka e si agwa nwunye ma ọ bụ di ha okwu n’ụzọ obi ọma na ịhụnanya. Ka o sina dị, ọ bụghị iwu na ezinụlọ gị ga-eretọ ghọọ ‘ụlọ jupụtara n’ọgụ.’ (Ilu 17:1) Bible na-emesi okwu ike banyere iyikwasị “mmadụ ọhụrụ,” ọ dịghịkwa anabata ihe ilu, iti mkpu, na nkwulu.—Ndị Efesọs 4:22-24, 31.
8. Gịnị pụrụ inye aka mgbe gị na onye òtù ọlụlụ gị na-ekwekọrịtaghị?
8 Gịnị ka ị pụrụ ime mgbe a na-enweghị nkwekọrịta? Ọ bụrụ na mmụọ amalite ịdị ọkụ, ị pụrụ ime nke ọma ịgbaso okwu ndụmọdụ nke Ilu 17:14 (NW): “Tupu esemokwu ahụ etiwapụ, wezụga onwe gị.” Ee, ị pụrụ ịhapụgodị nkwurịta okwu ahụ ruo mgbe e mesịrị, mgbe ma gị ma onye òtù ọlụlụ gị dajụworo. (Eklisiastis 3:1, 7) Ihe ọ sọrọ ya mee, gbalịsie ike ịbụ onye “na-anụ ihe ọsọ ọsọ, onye na-adịghị ngwa ikwu okwu, na-adịghịkwa ngwa iwe iwe.” (Jemes 1:19) Ihe mgbaru ọsọ gị kwesịrị ịbụ idozi ọnọdụ ahụ, ọ bụghị imeri n’arụmụka. (Jenesis 13:8, 9) Mee nhọrọ n’okwu gị na n’ụzọ ikwu okwu nke ga-eme ka gị na onye òtù ọlụlụ gị dajụọ. (Ilu 12:18; 15:1, 4; 29:11) Karịsịa, anọgidela n’ọnọdụ mkpasu iwe, kama chọọ enyemaka site n’ịgwakọ Chineke okwu ọnụ n’ekpere obi umeala.—Ndị Efesọs 4:26, 27; 6:18.
9. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na nkwurịta okwu na-amalite n’obi?
9 Otu ilu Bible na-asị: “Obi onye maara ihe na-eme ka ọnụ ya nwee uche, ọ na-atụkwasịkwara egbugbere ọnụ ya abụọ mmụta.” (Ilu 16:23) Mgbe ahụ, n’ezie, ụzọ isi nwee nkwurịta okwu na-aga nke ọma dị n’obi, ọ bụghị n’ọnụ. Gịnị bụ àgwà gị n’ebe onye òtù ọlụlụ gị nọ? Bible na-agba ndị Kraịst ume ‘iji obi na-esorịta n’ahụhụ.’ (1 Pita 3:8) Ị̀ pụrụ ime nke a mgbe onye òtù ọlụlụ gị na-enwe nchekasị na-egbu mgbu? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ ga-enyere gị aka ịma otú ị ga-esi zaghachi.—Aịsaịa 50:4.
10, 11. Olee otú di pụrụ isi tinye ndụmọdụ 1 Pita 3:7 n’ọrụ?
10 Nsọpụrụ na Nkwanye Ùgwù. A gwara ndị Kraịst bụ́ di ka ha soro nwunye ha na-ebikọ “n’ụzọ ihe ọmụma, na-ekenye ha nsọpụrụ dị ka ite dị pekepeke karị, nke bụ́ nwanyị.” (1 Pita 3:7, NW) Mmadụ ịsọpụrụ nwunye ya gụnyere ịghọta uru ya. Di nke so nwunye ya na-ebikọ “n’ụzọ ihe ọmụma” nwere echiche dị elu maka mmetụta ya, ume ọrụ, ọgụgụ isi, na ịdị ùgwù ya. O kwesịkwara ịchọ ịmụta ụzọ Jehova si ele ụmụ nwanyị anya ma chọọ ka e mesoo ha.
11 N’ụlọ gị, ka anyị were na i nwere otu ite bara uru nke ukwuu nke dị nnọọ pekepeke. Ị́ gaghị eji oké nlezianya na-eji ya eme ihe? Ee, Pita jiri okwu bụ́ “ite dị pekepeke karị” mee ihe n’otu ụzọ ahụ, nke a kwesịkwara ịkpali onye Kraịst bụ́ di igosipụta mmetụta dị nro maka nwunye ya ọ hụrụ n’anya.
12. Olee otú nwunye pụrụ isi gosi na ya na-atụ egwu di ya?
12 Ma olee ndụmọdụ Bible na-enye nwunye? Pọl dere, sị: “Ka nwunye leziekwa anya ka ọ na-atụ egwu di ya.” (Ndị Efesọs 5:33) Dị nnọọ ka nwunye nwere mkpa nke inwe mmetụta nke na di ya nwere nsọpụrụ na ịhụnanya miri emi maka ya, di nwekwara mkpa nke inwe mmetụta nke na nwunye ya na-akwanyere ya ùgwù. Nwunye nke na-akwanye ùgwù agaghị eji echeghị echiche kpọsaa amaghị eme di ya, ma di ya ọ̀ bụ onye Kraịst ma ọ bụ na ọ bụghị. Ọ gaghị anapụ ya ùgwù ya site n’ịkatọsị ya na iwetu ya ala ma ọ̀ bụ mgbe ha nọ nanị ha ma ọ bụ n’ihu ọha.—1 Timoti 3:11; 5:13.
13. Olee otú a pụrụ isi kwupụta echiche n’ụzọ dị n’udo?
13 Nke a apụtaghị na nwunye apụghị ikwupụta echiche ya. Ọ bụrụ na ọ dị ihe na-enye ya nsogbu, ọ pụrụ iji nkwanye ùgwù kwupụta ya. (Jenesis 21:9-12) A pụrụ iji ịtụrụ di ya bọl mee ihe atụ ịgwa ya uche ya. Ọ pụrụ iji ịdị nro tụọ ya ka o wee dịrị ya mfe ịghọrọ ya, ma ọ bụ ọ pụrụ ịtụsi ya nnọọ ike nke na ọ ga-emerụ ya ahụ. Lee ka o si aka nnọọ mma mgbe mmadụ abụọ ahụ zeere ibogharị onwe ha ebubo ma, kama nke ahụ, na-ekwu okwu n’ụzọ obi ọma na ịdị nro!—Matiu 7:12; Ndị Kọlọsi 4:6; 1 Pita 3:3, 4.
14. Gịnị ka i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na onye òtù ọlụlụ gị na-egosi mmasị dị nta n’itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ n’alụmdi na nwunye?
14 Dị ka anyị hụworo, ụkpụrụ dị iche iche nke Bible pụrụ inyere gị aka iwulite alụmdi na nwunye obi ụtọ. Ma gịnị ma ọ bụrụ na onye òtù ọlụlụ gị egosi mmasị dị nta n’ihe Bible nwere ikwu? A ka pụrụ ịrụzu ihe dị ukwuu ma ọ bụrụ na i tinye ihe ọmụma Chineke n’ọrụ n’ọnọdụ nke gị. Pita dere, sị: “Ndị bụ nwunye, na-edonụ onwe unu n’okpuru di nke aka unu; ka, ọbụna a sị na ụfọdụ ekwenyeghị okwu Chineke, ka e wee site n’ibi obi nwunye ha rite ha n’uru n’ebe a na-ekwughị okwu; mgbe ha na-ele ibi obi unu dị ọcha, ya na egwu.” (1 Pita 3:1, 2) Ee, otu ihe ahụ ga-adịkwara di nke nwunye ya na-enweghị mmasị na Bible. N’agbanyeghị ihe onye òtù ọlụlụ gị họọrọ ime, kwere ka ụkpụrụ dị iche iche nke Bible mee gị di ma ọ bụ nwunye ka mma. Ihe ọmụma Chineke pụkwara ime gị nne ma ọ bụ nna ka mma.
ỊZỤLITE ỤMỤAKA N’IKWEKỌ N’IHE ỌMỤMA CHINEKE
15. Olee otú e si ebufe mgbe ụfọdụ ụzọ na-adịghị mma isi zụọ ụmụ, ma olee otú a pụrụ isi gbanwee usoro nke a?
15 Nanị inwe mma ịkwá osisi ma ọ bụ hama adịghị eme mmadụ ọkwa nkà maara ọrụ. N’otu aka ahụ, nanị inwe ụmụaka adịghị eme mmadụ nne ma ọ bụ nna nwere nkà. N’ịmara amara ma ọ bụ n’amaghị ama, ndị nne na nna na-azụlite ụmụaka n’ụzọ e si zụlite ha onwe ha. Otú a, mgbe ụfọdụ a na-ebufe ụzọ na-adịghị mma ezinụlọ si azụlite ụmụaka site n’otu ọgbọ gaa na nke na-eso ya. Otu ilu Hibru oge ochie na-asị: “Nna anyị hà eriwo mkpụrụ vine na-achaghị acha, ezé ụmụ ha wee na-eru izizi.” Ma, Akwụkwọ Nsọ na-egosi na ọ bụghị iwu na mmadụ ga-agbaso usoro nne na nna ya guzobere. Ọ pụrụ ịhọrọ ụzọ nke dị iche, nke ụkpụrụ nchịkwa dị iche iche nke Jehova na-akpali.—Ezikiel 18:2, 14, 17.
16. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa igbo mkpa ezinụlọ gị, gịnịkwa ka nke a na-agụnye?
16 Jehova na-atụ anya ka ndị Kraịst bụ́ nne na nna nye ụmụ ha nduzi na nlekọta kwesịrị ekwesị. Pọl dere, sị: “Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla ebughị ụzọ cheere ndị nke aka ya ihe na-akpa ha, ma nke kachasị ndị ezinụlọ nke aka ya, ọ gọnarịwo okwukwe anyị, jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe ná njọ.” (1 Timoti 5:8) Lee aha okwu dị ike ha bụ! Imezu òkè gị dị ka onye na-enye ihe, nke gụnyere ilekọta mkpa anụ ahụ, ime mmụọ, na mmetụta uche nile nke ụmụ gị, bụ ihe ùgwù na ibu ọrụ dịịrị onye na-asọpụrụ Chineke. Bible na-enye anyị ụkpụrụ dị iche iche ndị pụrụ inyere ndị nne na nna aka iwulite ọnọdụ obi ụtọ maka ụmụ ha. Tụlee ụfọdụ n’ime ndị a.
17. Gịnị dị mkpa ma ọ bụrụ na ụmụ gị ga-enwe iwu Chineke n’obi ha?
17 Setịpụ ihe nlereanya ọma. E nyere ndị nne na nna n’Israel iwu, sị: “Ị ga-ejisikwa ike izi . . . ụmụ gị [okwu Chineke], ị ga-ekwukwa okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ n’ụlọ gị, na mgbe ị na-eje ije n’ụzọ, na mgbe ị na-edina ala, na mgbe ị na-ebili ọtọ.” Ndị nne na nna gaje ịkụziri ụmụ ha ụkpụrụ nile nke Chineke. Ma e ji okwu na-esonụ bute ntụziaka a ụzọ: “Okwu ndị a, nke mụ onwe m na-enye gị n’iwu taa, ga-adịkwasịkwa n’obi gị.” (Deuterọnọmi 6:6, 7, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ee, ndị nne na nna apụghị inye ihe ha na-enweghị. Ị ghaghị ibu ụzọ kụbanye iwu Chineke n’obi nke gị ma ọ bụrụ na ị chọrọ ka e dekwasị ha n’obi nke ụmụ gị.—Ilu 20:7; tụlee Luk 6:40.
18. N’igosi ịhụnanya, olee otú Jehova siworo setịpụ ihe nlereanya magburu onwe ya maka ndị nne na nna?
18 Nye ihe imesi obi ike nke ịhụnanya gị. N’oge baptism Jisọs, Jehova kwupụtara, sị: “Gị onwe gị bụ Ọkpara m M hụrụ n’anya; ihe Gị dị m ezi mma.” (Luk 3:22) Jehova si otú a nakwere Ọkpara ya, na-ekwupụta nnwapụta ya n’ezoghị ọnụ ma na-enye ihe imesi obi ike nke ịhụnanya Ya. Jisọs mesịrị gwa Nna ya, sị: “Ị hụrụ m n’anya mgbe a ka atọghị ntọala ụwa.” (Jọn 17:24) Mgbe ahụ, dị ka nne na nna na-asọpụrụ Chineke, nyenụ ụmụ unu ihe ngosipụta okwu ọnụ na ndị a na-ahụ anya nke ịhụnanya unu maka ha—na-emekwa nke a ọtụtụ mgbe. Na-echeta mgbe nile na ịhụnanya “na-ewuli elu.”—1 Ndị Kọrint 8:1.
19, 20. Gịnị ka inye ụmụ ịdọ aka ná ntị n’ụzọ kwesịrị ekwesị na-agụnye, oleekwa otú ndị nne na nna pụrụ isi rite uru site n’ihe nlereanya Jehova?
19 Nye ịdọ aka ná ntị. Bible na-ekwusi okwu ike banyere ịdị mkpa nke ịdọ aka ná ntị site n’ịhụnanya. (Ilu 1:8) Ndị nne na nna na-ahapụ ibu ọrụ ha nke iduzi ụmụ ha ụzọ taa aghaghị imesị nnọọ chee ihe na-agbawa obi ọ ga-arụpụta ihu n’ọdịnihu. Ma, a dọkwara ndị nne na nna aka ná ntị megide imebiga ihe ókè n’akụkụ nke ọzọ. “Ndị bụ nna,” ka Pọl dere, “akpasukwala ụmụ unu iwe, ka obi ghara ifu ha.” (Ndị Kọlọsi 3:21) Ndị nne na nna aghaghị izere ịgbazi ụmụ ha olu gabiga ókè ma ọ bụ jiri ihe ndị ha na-emezighị emezi na-agụ egwú mgbe nile ma na-akatọgharị mgbalị ha.
20 Jehova Chineke, Nna anyị nke eluigwe, na-esetịpụ ihe nlereanya n’ịdọ aka ná ntị. Ọ dịghị mgbe mgbazi olu ya na-agabiga ókè. “M ga-apịa gị ihe ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ kwesịrị ekwesị,” ka Chineke gwara ndị ya. (Jeremaịa 46:28, NW) Ndị nne na nna kwesịrị iṅomi Jehova n’akụkụ nke a. Ịdọ aka ná ntị nke gabigara ókè ezi uche dị na ya ma ọ bụ nke gafere nzube e bu n’uche nke bụ ịgbazi olu na ịkụzi ihe na-akpasu iwe n’ezie.
21. Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi mata ma ịdọ aka ná ntị ha ọ̀ dị irè?
21 Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi mata ma ịdọ aka ná ntị ha ọ̀ dị irè? Ha pụrụ ịjụ onwe ha sị, ‘Gịnị ka ịdọ aka ná ntị m na-arụzu?’ O kwesịrị ịkụzi ihe. Nwa gị kwesịrị ịghọta ihe mere e ji na-adọ ya aka ná ntị. Nne na nna kwesịkwara inwe nchegbu maka mmetụta mgbazi olu ha ga-emesị nwee. N’eziokwu, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụmụaka nile ga-ebu ụzọ lee ịdọ aka ná ntị anya ọjọọ. (Ndị Hibru 12:11) Ma ịdọ aka ná ntị ekwesịghị mgbe ọ bụla ime ka nwatakịrị nwee mmetụta nke ịbụ onye e menyere ụjọ ma ọ bụ onye a gbahapụrụ ma ọ bụ nye ya echiche nke na ọ bụ ajọ mmadụ site n’ọmụmụ. Tupu ọ na-agbazi ndị ya olu, Jehova sịrị: “Atụla egwu . . . n’ihi na gị ka M nọnyeere.” (Jeremaịa 46:28) Ee, e kwesịrị ịgbazi olu n’ụzọ nke nwa gị ga-esi nwee echiche nke na ị nọnyeere ya dị ka nne ma ọ bụ nna na-ahụ n’anya, nke na-enye nkwado.
INWETA “EZI NDỤMỌDỤ”
22, 23. Olee otú ị pụrụ isi nweta ezi ndụmọdụ dị mkpa iji wulite ezinụlọ obi ụtọ?
22 Anyị pụrụ inwe obi ekele na Jehova ewepụtawo ngwá ọrụ ndị dị anyị mkpa iji wuo ezinụlọ obi ụtọ. Ma nanị inwe ngwá ọrụ ndị ahụ ezughị. Anyị aghaghị ịmụ iji ha eme ihe nke ọma. Dị ka ihe atụ, onye na-ewu ihe owuwu pụrụ ịzụlite àgwà ndị na-adịghị mma n’ụzọ o si eji ngwá ọrụ ya eme ihe. Ọ pụrụ iji ụfọdụ n’ime ha na-eme ihe na-ekwesịghị ekwesị ma ọlị. N’okpuru ọnọdụ ndị a, ụzọ ime ihe ya yikarịrị nnọọ ka ọ ga-akpata ịrụpụta ihe na-adịchaghị mma. N’otu aka ahụ, ị pụrụ ịmatawo ugbu a àgwà ndị na-adịghị mma gbebataworo n’ezinụlọ gị. Ụfọdụ pụrụ ịbami abami ma sie ike ịgbanwe. Otú ọ dị, gbasoo okwu ndụmọdụ Bible bụ́: “Ka onye maara ihe wee nụ, wee tụkwasị ihe mmụta n’amamihe ya; ka onye nghọta wee nwetakwa ezi ndụmọdụ.”—Ilu 1:5.
23 Ị pụrụ inweta ezi ndụmọdụ site n’ịnọgide na-anara ihe ọmụma Chineke. Mụrụ anya ịhụ ụkpụrụ Bible ndị metụtara ndụ ezinụlọ, meekwa mgbanwe n’ebe ndị ọ dị mkpa. Lee ndị Kraịst tozuru etozu bụ́ ndị na-esetịpụ ihe nlereanya ọma dị ka ndị òtù ọlụlụ na nne ma ọ bụ nna. Kwunyere ha okwu. Karịsịa, wegara Jehova nchegbu gị nile n’ekpere. (Abụ Ọma 55:22; Ndị Filipaị 4:6, 7) Ọ pụrụ inyere gị aka ịnụ ụtọ ndụ ezinụlọ obi ụtọ nke na-asọpụrụ ya.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Nanị ihe ndabere Akwụkwọ Nsọ maka ịgba alụkwaghịm nke ga-enye ohere maka nlụgharị bụ “ịkwa iko”—mmekọahụ n’abụghị n’ime alụmdi na nwunye.—Matiu 19:9.
NWALEE IHE ỌMỤMA GỊ
Olee otú ịnọgidesi ike n’ihe, nkwurịta okwu, nsọpụrụ, na nkwanye ùgwù si etinye ihe n’alụmdi na nwunye nke obi ụtọ?
N’ụzọ dịgasị aṅaa ka ndị nne na nna pụrụ isi mesie ụmụ ha obi ike banyere ịhụnanya ha?
Olee ihe ndị ịdọ aka ná ntị kwesịrị ekwesị na-agụnye?
[Foto dị na peeji nke 147]