Isi 8
Ndụ Ezinụlọ—Ụzọ Ị Pụrụ Isi Nwee Ihe Ịga nke Ọma
1-3. Olee otú anyị pụrụ isi rụọ ọrụ maka ihe ịga nke ọma ka ukwuu ná ndụ ezinụlọ?
IHE ka ukwuu n’ụmụ mmadụ kwere na ndụ ezinụlọ na obi ụtọ nwere njikọ. N’otu nnyocha, 85 pasent nke ndị ikom sịrị na ha “na-eche na ‘ndụ ezinụlọ’ dị mkpa nke ukwuu iji nwee ndụ obi ụtọ na afọ ojuju.” Ma ị pụrụ ịma banyere ọtụtụ ndị ikom ndị họrọwooro ịgba alụkwaghịm. Ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị inyom kwa na-achọ ịgba alụkwaghịm iji kwụsị alụmdi na nwunye gbụworo ndị nọ na ya, jupụta n’esemokwu ma ọ bụ mmegbu.
2 Anyị apụghị ịgbanwe ihe ndị ọzọ na-eme. Ma anyị kwesịrị inwe mmasị n’ime ka ndụ ezinụlọ anyị na-akawanye mma, karịsịa mmekọrịta nke dị n’etiti di na nwunye. Anyị nile pụrụ ime nke ọma ịjụ, sị: ‘Olee otú mmekọrịta nke a dị n’ụlọ m?’
3 Onye Okike bụ Onye Malitere ndokwa ezinụlọ. (Ndị Efesọs 3:14, 15) Ọ na-enye okwu ndụmọdụ dị irè, bụ́ nke nyewooro ọtụtụ di na nwunye aka inwe ihe ịga nke ọma ná ndụ ezinụlọ. Otu okwu ndụmọdụ ahụ pụkwara ịbara gị uru.
IHE MMỤTA BARA URU NDỊ SITERE N’ALỤMDI NA NWUNYE MBỤ
4-6. Òkè dị aṅaa ka nraranye keere n’alụmdi na nwunye mbụ ahụ, gịnịkwa mere o ji dị mkpa?
4 N’akụkụ mmalite nke Bible, anyị na-ahụ ihe ndekọ nke ụzọ Chineke si malite ezinụlọ mbụ nke mmadụ. N’otu oge mgbe Jehova Chineke kesịrị nwoke mbụ ahụ, bụ́ Adam, Ọ sịrị:
“Ọ dịghị mma ka mmadụ ahụ nọrọ nanị ya; M ga-emere ya onye inye aka kwesịrị ya. Agịrịga ahụ, bụ́ nke O wepụtara n’ahụ mmadụ ahụ, Jehova, bụ́ Chineke wee wuo ya dị ka ụlọ ka ọ ghọọ nwanyị, O mee ka ọ bịakwute mmadụ ahụ. Mmadụ ahụ wee sị, Ehee! nke a bụ nnọọ ọkpụkpụ si n’ọkpụkpụ m pụta, na anụ ahụ si n’anụ ahụ m pụta. . . . N’ihi nke a ka nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya, rapara n’ahụ nwunye ya: ha ewee ghọọ otu anụ ahụ.”—Jenesis 2:18, 22-24.
5 Rịba ama na ezinụlọ mbụ ahụ amaliteghị site ná mmadụ abụọ ikpebi ibikọ ọnụ. Chineke nyere ike ka e nwee alụmdi na nwunye ahụ, e jikọkwara ha n’ime nkekọ nke na-adịgide adịgide. N’ihu Onye Ọchịchị nke kachasị elu e nwere n’elu na ala, Adam nabatara Iv ịbụ nwunye ya.
6 Mgbe nwoke na nwanyị weere nzọụkwụ ndị a chọrọ iji guzobe alụmdi na nwunye nke dị irè ma bụrụ nke a matara, ha na-arara onwe ha nyerịta ibe ha n’ihu ọha. (Jenesis 24:4, 34-67; Matiu 25:1-10) A dịghị enwe nraranye dị otú ahụ mgbe mmadụ abụọ bikọrọ ọnụ n’abụghị ná njikọ alụmdi na nwunye. Kama nke ahụ, mmekọrịta ha bụ ụdi nke Bible kpọrọ “ịkwa iko” ma ọ bụ ‘ịkwa iko ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye.’ (Ndị Hibru 13:4) Ọbụna a sị na ha na-ekwupụta na ha hụrụ ibe ha n’anya, mmekọrịta ha yikarirị ka ọ ga-ata ahụhụ ka oge na-aga n’ihi na o nweghị nraranye ahụ siri ike nke alụmdi na nwunye nke Bible na-egosi na ọ dị oké mkpa. Dị ka ihe atụ:
Otu nwanyị dị 34 afọ kọwara, sị: “Ma eleghị anya m na-eme dị ka onye mgbe ochie, ma nraranye nke alụmdi na nwunye na-eme ka m nọrọ ná ntụkwasị obi karị. . . . Enwere m ịhụnanya n’inwe ntụsara ahụ nke ikwekọrịta gwa onwe anyị nakwa ụwa na anyị chọrọ ịbụ otu.”
Otu onye nkụzi dị 28 afọ mere ka a mara ihe ọ chọpụtara, sị: “Mgbe afọ ole na ole gasịrị, amalitere m inwe mmetụta ka à ga-asị na m na-ebi n’ihe na-abaghị uru. Ibikọ ọnụ [n’alụghị di na nwunye] enyeghị ndokwa ọ bụla maka ọdịnihu.”
N’ihe ọmụmụ o mere n’isiokwu ahụ, onye ọkà mmụta ná mmekọrịta ọha na eze bụ Nancy M. Clatworthy chọpụtara na di na nwunye ndị raara onwe ha nye site n’ịbanye n’alụmdi na nwunye, ma bụrụ ndị na-ebikọghị ọnụ tupu alụmdi na nwunye, gosipụtara “mmetụta ka ukwuu nke obi ụtọ na afọ ojuju.”
7-9. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’alụmdi na nwunye mbụ ahụ banyere ndị nne na nna na ndị ọgọ?
7 Ihe ndekọ Bible nke alụmdi na nwunye mbụ pụkwara inyere anyị aka izere nsogbu ndị metụtara nne na nna na ndị ọgọ. Nsogbu ndị dị otú ahụ, dị ka otu onye n’ime ndị na-enye ndụmọdụ n’alụmdi na nwunye kwuru, so ná ndị a na-ahụkarị. Ma tupu e nwee nsogbu ọ bụla n’etiti ndị mụrụ ụmụ na ndị ọgọ, Bible kwuru banyere alụmdi na nwunye mbụ ahụ, sị: “Nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya rapara n’ahụ nwunye ya.”—Jenesis 2:24.
8 Dị ka ihe sitere n’okike, ihe ka ọtụtụ n’ime anyị hụrụ ndị mụrụ anyị n’anya. Bible na-agba ume ọbụna ka anyị nye ihe iji nyere ha aka n’afọ agadi ha, ma ọ bụrụ na mkpa ya dị. (1 Timoti 5:8; Deuterọnọmi 27:16; Ilu 20:20) Ma Akwụkwọ Nsọ na-emesi ya ike na ozugbo ị lụrụ di ma ọ bụ nwunye, di ma ọ bụ nwunye gị na-aghọ onye ikwu kachasị dị gị nso. Di ma ọ bụ nwunye gị na-aghọ onye mbụ a ga-ahụ n’anya, lekọta ma ọ bụ gakwuru.
9 Echiche nke a na-akatọ onye lụrụ di ma ọ bụ nwunye ‘ịgbala ụlọ’ gakwuru ndị mụrụ ya ma ọ bụrụ na nsogbu ebilite. Ọ na-enyekwara ndị nne na nna aka ịghọta na, ozugbo ụmụ ha lụrụ di ma ọ bụ nwunye, ha ‘na-ahapụ’ ma nwee ezinụlọ nke dịịrị onwe ya iche, ọbụna ọ bụrụ na omenala na ihe ndị metụtara ego achọọ ka ha biri nso ma ọ bụ soro ndị mụrụ ha biri ruo oge ụfọdụ. Ọ bụ ihe ziri ezi na ụmụntakịrị ga-ele ya anya dị ka ihe dị oké ọnụ, ma eleghịkwa anya nwetatụ ihe site n’amamihe na ahụmahụ nke ndị mụrụ ha. (Job 12:12; 32:6, 7) Ma ihe Jenesis 2:24 na-ekwu bụ ihe mgbochi nye ndị mụrụ ụmụ ịnwa iduzi ma ọ bụ ilekọta ndụ nke ụmụ ha ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye. Ee, itinye ndụmọdụ a nke Bible n’ọrụ pụrụ ime ka e nwee ihe ịga nke ọma n’alụmdi na nwunye.
NWUNYE OLE?
10, 11. Ihe mmụta dị aṅaa bara uru ka anyị pụrụ inweta site na Jenesis banyere ọnụ ọgụgụ nke ndị a ga-alụ?
10 Anyị pụkwara ịhụ site n’ihe ndekọ Jenesis ahụ na Chineke nyere Adam nanị otu nwunye. N’omenala ụfọdụ, a na-enye onye bụ nwoke ike ịlụ ọtụtụ nwunye. Ma ịlụ ọtụtụ nwunye ọ̀ na-eduje n’obi ụtọ ezinụlọ? N’ụzọ megidere nke ahụ, ahụmahụ na-egosi na ọ na-edujekarị n’oké ekworo ma ọ bụ ịma aka, na imeso ndị nwunye e bu ụzọ lụọ n’ụzọ na-adịghị mma. (Ilu 27:4; Jenesis 30:1) Ma ịlụ ọtụtụ nwunye ma ịchụpụ nwunye site n’ịgba alụkwaghịm dịrị adị n’etiti ndị Hibru mgbe ochie. Ebe ọ na-ekwe ka nke ahụ dị otú a, Chineke nyere ndị Israel iwu iji gbochie oké ime ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Otú ọ dị, n’inwe mkparịta ụka n’okwu ahụ, Jisọs dọọrọ uche gaa ná nzube Chineke dị ka e gosiri na Jenesis. Mgbe a jụrụ ajụjụ banyere ịgba alụkwaghịm n’ọnọdụ dị iche iche, Jisọs sịrị:
“Únu agụghị na Onye kere ha site ná mmalite mere ha nwoke na nwanyị, wee sị, N’ihi nke a ka nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya, rapara n’ahụ nwunye ya . . . ? . . . Ya mere, ihe Chineke kekọtara, mmadụ atọsala. . . . Ọ bụ n’ihi obi etili [ndị Hibru] ka Mosis [n’iwu Chineke] kwere ka unu hapụ nwunye unu: ma site ná mmalite a dịghị eme otú a. Ma asị m unu, Onye ọ bụla nke ga-ahapụ nwunye ya ma ọ bụghị n’ihi ịkwa iko, lụrụkwa nwunye ọzọ, ọ na-akwa iko.”—Matiu 19:3-9.
11 Jisọs mere ka o doo anya na n’etiti ndị na-eso ụzọ ya, ụkpụrụ ahụ agaghị abụ ịlụ ọtụtụ nwunye, kama nanị otu, dị ka Chineke dokwara site ná mmalite. (1 Timoti 3:2) Ịmata amamihe na ikike Chineke n’ọnọdụ nke a bụ nzọụkwụ nke na-eduje n’inwe obi ụtọ.
12, 13. Echiche dị aṅaa ka Bible na-agba ume ya banyere ịgba alụkwaghịm?
12 Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ihe Jisọs kwuru banyere ịgba alụkwaghịm. Mgbe ọ bụla ọ bụ ihe kwere mee inweta ịgba alụkwaghịm n’ụzọ dị mfe, ịgba alụkwaghịm na-ejupụta. Anyị na-ahụ nke a taa. Ma Chineke na-ele alụmdi na nwunye anya ịbụ ihe na-adịgide adịgide. N’ezie, Jisọs kwuru na ọ bụrụ na ikpe ama di ma ọ bụ nwunye mmadụ n’ihe banyere “ịkwa iko” (Grik, porneia, nke pụtara oké omume mmekọahụ rụrụ arụ), si otú a soro onye ọzọ na-aghọ “otu anụ ahụ,” onye nke aka ya dị ọcha pụrụ ịgba alụkwaghịm ma lụọ onye ọzọ. Ma, e wezụga nke ahụ, Onye Okike ahụ na-ele ndị bụ di na nwunye anya dị ka ndị e jikọrọ ọnụ n’ụzọ na-adịgide adịgide. Ndị matara ikike Chineke nwere n’okwu a si otú a na-enwe ihe ka ukwuu mere ha ga-eji rụọ ọrụ ma wusiwanye alụmdi na nwunye ha ike, na-emerikwa nsogbu ọ bụla. (Eklisiastis 4:11, 12; Ndị Rom 7:2, 3) N’ihi nke a, kama ịkpata obi ilu, echiche nke a bụ ihe enyemaka n’inwe ihe ịga nke ọma n’alụmdi na nwunye. Ahụmahụ na-egosi nke ahụ.
13 Ụfọdụ ndị pụrụ iche, sị, ‘Ma alụmdi na nwunye ụfọdụ nwere nsogbu ndị siri ike, ma ọ bụ na di na nwunye ahụ adịghị ekwekọ.’ Mgbe ahụ gịnị ka a ga-eme? E nwere ihe ndị ọzọ bara uru ndị anyị pụrụ ịmụta site na Bible.
DI NKE HỤRỤ NWUNYE YA N’ANYA N’EZIE
14-16. Olee otú ndị bụ di pụrụ isi tinye ndụmọdụ Bible nyere ha n’ọrụ?
14 Ihe bụ isi n’ihe ịga nke ọma nke ezinụlọ bụ ụzọ di si ele nwunye ya anya ma na-emeso ya. Ma ònye ga-ekwu nke bụ ụzọ kasị mma? Ihe Bible na-ekwu banyere alụmdi na nwunye mbụ ahụ na-enyekwara anyị aka ọzọ. Ihe ndekọ ahụ na-akọwa na Chineke ji ụfọdụ n’ime ahụ Adam wee meere ya onye ibe. Ka oge na-aga, Bible mere ka okwu ahụ sawanye mbara, sị:
“Ndị bụ di jikwa ụgwọ ỊHỤ NWUNYE NKE AKA HA N’ANYA DỊ KA HA HỤRỤ AHỤ NKE ONWE HA N’ANYA. Onye na-ahụ nwunye nke aka ya n’anya na-ahụ onwe ya n’anya: n’ihi na ọ dịghị onye ọ bụla kpọrọ ahụ onwe ya asị mgbe ọ bụla; kama ọ na-azụ ya na-elezikwa ya anya nke ọma, dị ka Kraịst na-emekwa nzukọ Ya.”
Mgbe ahụ, mgbe o hotasịrị Jenesis 2:24, Pọl gara n’ihu, sị: “Onye ọ bụla ya hụ nwunye nke aka ya n’anya, dị ka ọ na-ahụ onwe ya n’anya.”—Ndị Efesọs 5:28-33.
15 Ndị ikom ụfọdụ na-eche na ha kwesịrị iji anya ike ma ọ bụ egosighị mmetụta na-emeso nwunye ha. Ma Onye Malitere alụmdi na nwunye na-asị na di kwesịrị inwe ịhụnanya dị omimi n’ebe nwunye ya nọ ma gosipụta ịhụnanya ahụ. Iji nwee obi ụtọ n’ezie, ọ dị onye bụ nwunye mkpa ijide n’aka na a hụrụ ya n’anya n’ezie.
16 Onye bụ di ‘ịzụ ma na-elezi nwunye ya anya dị ka ahụ onwe ya’ gụnyere ya ime mgbalị ịbụ ezi onye na-enye ihe. Ma o kwesịghị itinye oge dị ukwuu n’inweta ihe e ji ebi ndụ nke na ọ na-elefuru anya itinye oge n’isoro nwunye ya nọkọọ na igosipụta mmetụta nke inwe mmasị n’ebe ọ nọ dị ka onye bụ mmadụ. Ọzọ, ọ dịghị nwoke ọ bụla isi zuru okè, ọbụna mgbe iwe were ya, nke na-akpọ ahụ nke onwe ya asị ma ọ bụ na-eti ahụ nke onwe ya ihe. N’ihi nke a, ihe Bible na-ekwu na-akagbu mmadụ iwekwasị nwunye ya iwe ọkụ.—Abụ Ọma 11:5; 37:8.
17-19. Gịnị ka nwunye ịbụ “onye inyeaka” kwesịrị ịpụta nye di?
17 E mere nwanyị nke mbụ ịbụ ‘onye inyeaka nke di ya.’ (Jenesis 2:18) Chineke matara na nwoke ahụ na nwanyị ahụ nwere ihe dị iche ndị mejupụtara ha. Nke ahụ bụ eziokwu. Dị ka o si adịkarị, ndị inyom na-adị iche n’ebe ndị ikom nọ n’àgwà na n’ụzọ ha si eme ihe. Nwoke pụrụ ịbụ onye na-eme mkpebi ngwa ngwa, nwanyị abụrụ onye na-enwe ndidi karị. Nwanyị pụrụ inwe mmasị n’ịnọ n’etiti ìgwè mmadụ, nwoke abụrụ onye na-ahọrọ ịnọ nanị ya. Nwoke pụrụ ịdị na-emesi okwu ike banyere ime ihe n’oge, nwanyị abụrụ onye “na-atụsara ahụ” karị n’ihe metụtara oge. Okwu Bible ahụ banyere okike Chineke kere Iv ịbụ “onye inyeaka” kwesịrị inyere ndị bụ di aka ịghọta ọdịiche ndị ahụ.
18 Pita onyeozi na-agba ndị bụ di ume ka ha ‘soro nwunye ha bikọọ n’ụzọ ihe ọmụma, na-ekenye ihe bụ nwanyị nsọpụrụ, dị ka onye na-adịghị ike.’ (1 Pita 3:7) “Nsọpụrụ” ahụ gụnyere ịnagide ọchịchọ ndị pụrụ iche nke onye bụ nwunye pụrụ inwe. Onye bụ di pụrụ inwe mmasị n’egwuregwu, ma nwunye ya pụrụ inweta ọṅụ n’ịga lee ihe ndị a kpọbara n’ụlọ ahịa ma ọ bụ ikiri ndị na-agba egwú. Ọchịchọ nke ya dị nnọọ mkpa dị ka nke nwoke. Nsọpụrụ na-eme ohere maka ọdịiche ndị ahụ.
19 Ọnọdụ uche nke onye bụ nwunye, nke usoro ịhụ nsọ ya na-emetụta, pụrụ iju onye bụ di anya mgbe ụfọdụ, ma eleghịkwa anya, onye bụ nwunye. Ma onye bụ di pụrụ inye aka n’ime ka ha nwerịta obi ụtọ site n’ịgbalị ịghọta na ‘isoro ya bikọọ n’ụzọ ihe ọmụma.’ Mgbe mgbe ihe ọ chọrọ karịsịa bụ onye ahụ bụ di ịbịa ya nso ma jide ya aka n’ụzọ dị nro mgbe ọ na-esoro ya na-akparịta nkata n’ụzọ ịhụnanya.
NWUNYE NKE NA-ASỌPỤRỤ DI YA
20-22. Bible na-agba nwunye ume inwe echiche dị aṅaa banyere di ya?
20 Ebe ọ bụ na nwanyị aghaghị ime akụkụ nke ya ka e wee nwee obi ụtọ ezinụlọ, Onye Okike ahụ na-enyekwa ndị bụ nwunye nduzi.
21 Ozugbo ọ gwasịrị ndị bụ di ka ha hụ nwunye ha n’anya, Bible kwukwara, sị: “Ka nwunye leziekwa anya ka ọ na-atụ egwu di ya.” (Ndị Efesọs 5:33) N’alụmdi na nwunye mbụ, e nwere ihe ndị kwesịwororị ịkpali Iv ka o lega anya n’ebe di ya nọ. E bu ụzọ kee Adam. O nwere ihe ọmụma na ahụmahụ ka hie nne ná ndụ, ọbụna na ọ nataworị nduzi site n’aka Chineke.
22 Ma olee banyere alụmdi na nwunye ndị e nwere n’oge a? Ọ bụrụ na di ejiri obi eziokwu gbalịa itinye okwu ndụmọdụ Bible nke e buworo ụzọ kwuo banyere ya n’ọrụ, nke a yikarịrị ka ọ̀ ga-akpali nwunye ya inye ya nsọpụrụ. Ọbụna n’ebe onye bụ nwunye pụrụ ịdị mma karị n’ụzọ ụfọdụ, ma ọ bụ ebe di ya pụrụ ịdị na-ada mbà, e nwere ihe mere a ga-eji zụlite nsọpụrụ—n’ihi ịkwanyere ndokwa Jehova ùgwù, nke ezinụlọ bụ akụkụ ya. Pọl onyeozi dere, sị:
“Ndị bụ nwunye, na-edonụ onwe unu n’okpuru di nke aka unu, dị ka n’okpuru Onyenwe anyị. N’ihi na di bu isi nke nwunye, dị ka Kraịst anyị bụkwa isi nke nzukọ Ya.”—Ndị Efesọs 5:22, 23.
23, 24. N’ihi gịnị ka ndị bụ́ nwunye ga-eji nwee ntụkwasị obi na ndụmọdụ nke a ga-enye aka?
23 Nke a apụtaghị ikwu na onye bụ di ga-aghọ onye ọchịchị aka ike nke mazuru ihe nile n’ezinụlọ. Nke ahụ agaghị ekwekọ n’ihe nlereanya ịhụnanya, ezi uche, na nghọta nke Kraịst. Chineke na-agba ndị bụ nwunye ume ka ha lega anya n’ebe di ha nọ maka ịchịisi. N’ihe ndị dị oké mkpa metụtara ezinụlọ, di na nwunye pụrụ imekọ ihe ọnụ, dị ka akụkụ dị iche iche nke otu ahụ. Ma, Chineke na-ele onye bụ di anya dị ka onye ga-aza ajụjụ n’ụzọ bụ isi maka ezinụlọ ahụ.—Ndị Kọlọsi 3:18, 19.
24 Ahụmahụ na-egosi na ihe Bible na-ekwu n’isiokwu nke a ziri ezi. Ka onye bụ nwunye na-arụ ọrụ iji ruo eru maka ịhụnanya na nlekọta nke di ya, ma na-elegara ya anya maka nduzi n’ihe ndị metụtara ezinụlọ, ọ ga-achọpụta mgbe mgbe na di ahụ na-esitekarị n’ọchịchọ nke obi ya na-ebu ibu ọrụ dịịrị ya ma na-arụzu ha n’ụzọ ịhụnanya.—Ilu 31:26-28; Taịtọs 2:4, 5.
ỊRỤKỌ ỌRỤ ỌNỤ IJI NWETA IHE ỊGA NKE ỌMA EZINỤLỌ
25-28. Òkè dị aṅaa ka nkwurịta okwu na-ekere n’ihe ịga nke ọma ezinụlọ?
25 Nkwurịta okwu bụ ihe dị mkpa nke a na-adịghị ahụ n’ọtụtụ ezinụlọ. Otu onye ọkà mmụta mmekọrịta mmadụ na ibe ya kwuru, sị: “Ọtụtụ di na nwunye adịghị ege ibe ha ntị, ọtụtụ na-abanyekwa n’ịlụ ọgụ n’ihi nke a.” Anyị aghaghị inwe mkpasu iwe, obi nkoropụ, na ịbụ ndị ihe na-agazirighị ná ndụ. Olee otú anyị pụrụ isi gbochie nke a ibibi alụmdi na nwunye anyị? Ezi nkwurịta okwu na-enye aka. Lezie anya ka ị ghara iwere ya n’ihe efu, nanị ịchọpụta na unu ji nke nta nke nta na-ala azụ n’ịgwarịta ibe unu okwu.
26 Rụọ ọrụ iji nwee nkwurịta okwu. N’ezie, ị̀ na-eme ka ọ bụrụ ihe e ji mara gị ikwurịta ihe ndị ị na-eme na mmetụta ndị ị na-enwe? Ọtụtụ mgbe ọ na-ahụ anyị ahụ̀ ikwu okwu, anyị adịghịkwa anụ ihe onye nke ọzọ na-ekwu. (Ilu 10:19, 20; Jemes 1:19, 26) Kama nanị ịnọrọ na-eche oge mgbe ị ga-enwe ohere ikwu okwu, gee ntị, gbalịa ịghọta, ma eleghị anya na-azaghachi, sị, ‘Ihe i bu n’uche ọ̀ bụ . . . ?’ ma ọ bụ, ‘Ihe ị na-ekwu ọ̀ bụ . . . ?’ (Ilu 15:30, 31; 20:5; 21:28) Di ma ọ bụ nwunye nke ji obi eziokwu na-ege ntị n’echiche na mmetụta onye nke ọzọ na-enwe eyikarịghị ka ọ ga-eme omume n’ụzọ na-egosi ọchịchọ onwe onye ma ọ bụ n’ụzọ na-egosi adịghị nro.
27 Nkwurịta okwu na-abụ ihe bara uru ọbụna karị ma ọ bụrụ na di na nwunye ekwurịta ihe bụ nsogbu ha abụọ, na-adabere na ndụmọdụ Bible. Dị ka ihe atụ, a na-achọta ụzọ magburu onwe ya maka ikwurịta banyere ego ezinụlọ na-enweta na atụmatụ akụ̀ na ụba na 1 Timoti 6:6-10, 17-19 na Matiu 6:24-34. A na-achọta okwu ndụmọdụ dị ukwuu nke sitere n’Akwụkwọ Nsọ banyere akụkụ ndị a na-ezutekarị n’ihe banyere ndụ ezinụlọ n’akwụkwọ ahụ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ.a
28 Ebe ọ bụ na okwu ndụmọdụ Bible sitere n’aka onye kasị mara banyere alụmdi na nwunye na ndụ ezinụlọ, bụ́ Jehova Chineke, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya na, ọ bụrụ na anyị ejiri ndidi nọgidesie ike na-etinye ya n’ọrụ, ndụmọdụ ya pụrụ inyere anyị aka ịrụ ọrụ iji nweta ihe ịga nke ọma. Ọtụtụ puku di na nwunye ndị Kraịst gburugburu ụwa emewo nke a, na-enweta ihe ndị na-enye obi ụtọ si na ya pụta n’ime alụmdi na nwunye ha.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York Inc., bipụtara.
Igbe dị na peeji nke 80]
“N’oge ndụ m dị ka onye lụrụ nwunye,” ka otu nwoke sitere n’ebe ọdịda anyanwụ United States kwuru, “enwetawo m ihe nile m chọrọ n’ụzọ ihe onwunwe—ebe obibi mara mma, ụgbọ ala dị iche iche, ọtụtụ ụgbọ epeepe na ịnyịnya. Ma ihe ndị a ewetaghịrị m obi ụtọ. Nwunye m enweghị mmasị n’otu ihe ndị ahụ m nwere mmasị na ha. Anyị na-ese okwu mgbe nile. M na-aṅụ wii wii iji nweta udo nke uche.
“Ana m apụ n’ụlọ n’ihe ka ukwuu ná ngwụsị izu m na-achụ nta. Ọzọ, ọrụ m na-akpọpụkwa m n’ụlọ. Nke a dujere n’ibi ndụ nke ịkwa iko. Echeghị m na nwunye m hụrụ m n’anya, ya mere apụrụ m ma soro ndị inyom dị iche iche na-enwe mmekọrịta ruo mgbe o yiri ka ndụ m ọ bịaruwo ná ngwụsị.
“N’oge nke a, agụrụ m Bible. Ndị Efesọs isi nke ise mesiri m obi ike ịnwale nwunye m ọzọ. Achọpụtara m na ọ dịghị mgbe o doro onwe ya n’okpuru, mụ onwe m adịghịkwa mgbe m nyere ezi nduzi. Ma ka m na-eme njem ọrụ n’izu nke na-eso, akwara m iko ọzọ.”
Otu enyi tụụrụ ya aro na ọ bụrụ na o nwere mmasị n’ezie n’ebe Chineke nọ, Ndịàmà Jehova pụrụ inyere ya aka. Ọ gara n’ihu, sị: “Ndịàmà nyere aka n’ezie. Otu n’ime ndị nlekọta nọ n’ọgbakọ ahụ wepụtara oge iji na-eduziri m ọmụmụ Bible. N’ihi mgbanwe dị ukwuu n’ụzọ m si ebi ndụ, nwunye m sonyere n’ọmụmụ ihe ahụ. Ugbu a, na nke mbụ ya, ndụ ezinụlọ anyị bụ nke obi ụtọ, ọbụna na ụmụ anyị ndị nwanyị abụọ pụrụ ịchọpụta ọdịiche e nwere. Ọnụ agaghị enwe ike ịkọwa obi ụtọ dị ukwuu nke nwunye m na mụ onwe m chọtaworo n’itinye Bible n’ọrụ ná ndụ anyị.”
[Foto dị na peeji nke 85]
Nkwurịta okwu—ọ dị mkpa maka alụmdi na nwunye obi ụtọ