Ilu
4 Ụmụ m, nabatanụ aka ná ntị onye bụ́ nna na-adọ unu.+
Geenụ ntị ka unu ghọta ihe,
2 N’ihi na m ga-enye unu ezigbo ntụziaka.
Unu ahapụla ihe m na-akụziri* unu.+
4 Nna m kụziiri m ihe ma sị m: “Ka ihe m na-agwa gị ghara ịpụ gị apụ n’obi.+
Na-edebe iwu m ka i wee dịrị ndụ.+
5 Nweta amamihe. Gbalịa ka ị na-aghọta ihe.+
Echefula ihe m kwuru, ahapụkwala ya.
6 Ahapụla amamihe. Ọ ga-azọ gị ndụ.
Jiri ya kpọrọ ihe. Ọ ga-echebe gị.
7 Nweta amamihe n’ihi na amamihe bụ ihe kacha mkpa.*+
N’ihe niile ị na-enweta, gbalịa ka nghọta soro na ha.+
8 Jiri amamihe kpọrọ ihe nke ukwuu. Ọ ga-eme ka ị bụrụ onye ukwu.+
A ga na-akwanyere gị ùgwù maka na i ji obi gị niile nabata ya.+
9 Ọ ga-ekpuwe gị okpu mara mma e ji okooko kpaa.
Ọ ga-ekpuwe gị okpueze mara mma.”
11 M ga-akụziri gị otú ị ga-esi mara ihe.+
M ga na-edu gị ka ị na-aga n’ezigbo ụzọ.+
12 E nweghị ihe ga-anọchiri gị ụzọ mgbe ị na-eje ije.
Ị gaghịkwa ada ada mgbe ị na-agba ọsọ.
13 Nabata aka ná ntị a dọrọ gị. Ajụla ya.+
Jiri ya kpọrọ ihe n’ihi na ọ ga-azọ gị ndụ.+
Abanyela na ya. Si ebe ọzọ gafere.+
16 N’ihi na ha enweghị ike ihi ụra ọ gwụla ma hà mere ihe ọjọọ.
Ụra anaghị atụ ha ọ gwụla ma hà kwaturu mmadụ.
17 Ihe ọjọọ na-atọ ha ụtọ ka nri,
Tigbuo zọgbuo na-atọkwa ha ụtọ ka mmanya.
19 Ụzọ ndị ajọ omume yiri ọchịchịrị.
Ha amaghị ihe na-akwatu ha.
20 Nwa m, ṅaa ntị n’okwu m na-agwa gị.
Gee ntị nke ọma n’ihe m na-ekwu.
21 Echefula ha.
Dowe ha n’ime ime obi gị,+
22 N’ihi na ha na-azọ ndị na-anabata ha ndụ,+
Ha na-emekwa ka ahụ́ dị ha mma.
27 Abanyela n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe.+
Wepụ ụkwụ gị n’ihe ọjọọ.