Ụzọ A Ga-esi Na-eji Ụzọ Ndị A Tụrụ Aro Ha Isi Na-ezi Ozi Ọma Eme Ihe
1. Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele aro ndị ahụ a tụrụ maka ụzọ isi na-ezi ndị mmadụ ozi ọma anya?
1 Ụzọ ndị a tụrụ aro ha isi na-enyefe magazin anyị na akwụkwọ anyị ndị ọzọ na-apụta n’Ozi Alaeze Anyị mgbe nile. Mgbe anyị nọ n’ozi, ọ dịghị mkpa na anyị ga na-eji aro ndị ahụ eme ihe kpọmkwem otú ahụ e si dee ha. E depụtara ha iji nyere anyị aka ịghọta ihe anyị pụrụ ikwu. Okwu anyị ga-aka adị irè ma ọ bụrụ na anyị ejiri okwu nke aka anyị mee ihe. Ikwu okwu otú anyị si ekwu okwu na-enye aka eme ka ahụ́ ruo onye nwe ụlọ ala, ọ na-egosikwa na ihe anyị na-ekwu si anyị n’obi nakwa na anyị kwenyesiri ike na ya.—2 Kọr. 2:17; 1 Tesa. 1:5.
2. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka anyị buru otú e si eme ihe n’ókèala anyị n’uche mgbe anyị na-akwadebe otú anyị ga-esi zie ozi ọma?
2 Mee Ka Okwu Gị Kwekọọ n’Ọnọdụ E Nwere: Otú e si eme ihe n’ókèala anyị na-emetụta otú anyị si ezi ozi ọma na ya n’ụzọ dị ukwuu. Gị na onye nwe ụlọ ùnu pụrụ ikele onwe unu tupu i webata ozi ọma ahụ ná mkparịta ụka unu, ka ndị nọ n’ókèala unu hà na-atụ anya ka ị gwa ha ihe ị bịara n’egbughị oge? Otú e si zie ozi ọma n’otu ebe abụghị otú e si ezi ya n’ebe ọzọ, mgbe ụfọdụkwa, ọ bụghị otú i si zie otu onye ozi ọma ka ị ga-esi zie onye ọzọ. Ọ dịkwa mkpa ka anyị jiri nghọta na-eme ihe mgbe anyị na-ajụ ajụjụ. Ajụjụ ndị kwesịrị ekwesị n’ebe ụfọdụ nwere ike ime ka ahụ́ ghara iru ndị mmadụ ala n’ebe ọzọ. N’ihi ya, anyị aghaghị ichezi echiche echezi ma mee ka ụzọ anyị si ezi ozi ọma kwekọọ n’ọnọdụ e nwere n’ókèala anyị.
3. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka anyị na-eburu n’uche nzụlite na ụzọ iche echiche nke ndị anyị na-agwa okwu?
3 Ọzọkwa, ọ dị mkpa ka anyị buru nzụlite na ụzọ iche echiche nke ndị nọ ókèala anyị n’uche mgbe anyị na-akwadebe maka ozi ubi. Dị ka ihe atụ, ma eleghị anya, otú ị ga-esi kọwaara onye ji okpukpe Katọlik kpọrọ ihe Matiu 6:9, 10 ga-adị iche n’otú ị ga-esi kọwaara ya onye na-amaghị ekpere “Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe.” Ọ bụrụ na anyị eburu ụzọ chebara ya echiche, anyị pụrụ ime ka okwu anyị kwekọọ n’ọnọdụ ndị e nwere iji mee ka ọ dọrọkwuo mmasị nke ndị anyị na-ezute n’ozi ubi.—1 Kọr. 9:20-23.
4. N’ihi gịnị ka ime ezi nkwadebe ji dị mkpa?
4 Ọbụna mgbe anyị bu n’uche iji aro ndị ahụ a tụrụ mee ihe otú e si dee ha, ọ pụtatụghị na anyị agaghị eme ezi nkwadebe. Anyị kwesịrị ịgụ isiokwu anyị bu n’obi iji mee ihe n’ozi nke ọma ma chọpụta isi ihe ndị dị n’ime ha bụ́ ndị pụrụ ịkpali mmasị. Mgbe ahụ, anyị kwesịrị iwebata ha n’okwu anyị. Ọ bụ nanị mgbe anyị ghọtara ezi ihe ọmụma ndị dị n’akwụkwọ anyị ka anyị pụrụ iji ịnụ ọkụ n’obi nyefee ha.
5. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwadebe ụzọ ọzọ dị iche a pụrụ isi zie ozi ọma, oleekwa otú anyị pụrụ isi mee ya?
5 Ụzọ Ndị Ọzọ A Pụrụ Isi Mee Ihe: È kwuru ka anyị na-eji nanị aro ndị ahụ a tụrụ na-eme ihe? Ee e. Ọ bụrụ na e nwere ụzọ ọzọ ka adịrị gị mfe isi zie ozi ọma ma ọ bụ nwee akụkụ Akwụkwọ Nsọ ọzọ ị pụrụ iji mee ihe, were ha mee ihe. Karịsịa, a bịa n’inyefe magazin, chọọ ohere ị ga-eji were isiokwu ndị dị n’ime magazin ahụ bụ́ ndị pụrụ ịdọrọ mmasị ndị mmadụ n’ókèala unu n’ụzọ pụrụ iche mee ihe. Mgbe a na-eme ihe ngosi nke otú a ga-esi ezi ozi ọma ná Nzukọ Ije Ozi, a pụrụ ime ndokwa iji ụzọ ọ bụla kasị adị irè n’ókèala unu mee ihe ngosi ahụ. N’ụzọ dị otú a, a pụrụ inyere mmadụ nile aka izi ozi ọma n’ụzọ dị mma.