Ọ Bụrụ na Ọ Na-arụpụta Ihe, Jiri Ya Mee Ihe!
1 Ozi Alaeze Anyị na-atụrụ anyị aro dị iche iche na-esepụghị aka maka ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ iji mee ihe n’ozi. Nke a na-enye anyị echiche ọhụrụ n’ụzọ isi nweta mmasị n’ozi Alaeze. Ọ pụrụ ịbụ na ị na-agbalị kwa ọnwa ịmụ otu ma ọ bụ karịa n’ime ụzọ iche ihe n’ihu ndị a. Otú ọ dị, ndị nkwusa ụfọdụ pụrụ ịchọpụta na mgbe ha na-ejila otu n’ime ha mee ihe oge ole na ole, mbipụta ọzọ nke Ozi Alaeze Anyị na-ewepụta ụzọ iche ihe n’ihu ọhụrụ. O doro anya na ikekwe ọ gaghị ekwe mmadụ nile omume ịmụ ụzọ iche ihe n’ihu ọhụrụ tupu ha amara nke bu ụzọ nke ọma.
2 N’ezie, e nwere ọtụtụ puku ndị ọsụ ụzọ na ndị nkwusa ndị ọzọ ndị na-etinye oge dị ukwuu n’ozi ubi. Ọzọkwa, ọtụtụ ọgbakọ na-arụ ókèala ha nile kwa izu ole na ole. N’ọnọdụ ndị a, ndị nkwusa na-anabata ụzọ na echiche ndị ọhụrụ maka iche ozi ahụ n’ihu mmadụ. Nke a na-enyere ha aka imeziwanye nkà ha. Ọ na-emekwa ka ozi ha na-adọkwuru mmasị ma na-amịkwu mkpụrụ, na-enyekwara ha aka imeri ihe ịma aka ndị ha na-ezute.
3 Otú o sina dị, ọ bụrụ na ị kwadowo ụzọ iche ihe n’ihu nke na-adị irè n’ịzụlite mmasị, gbalịsie ike gaa n’ihu jiri ya na-eme ihe! Ọ dịghị mkpa ịkwụsị iji ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ nke dị irè eme ihe bụ́ nke na-arụpụta ihe. Nanị mee ka ya na akwụkwọ a na-enyefe n’ọnwa kwekọọ. Ka ị na-atụle aro ndị a tụrụ n’Ozi Alaeze Anyị, chọọ okwu ndị na-adọrọ mmasị ị pụrụ ịchọ itinye n’ụzọ i si eche ihe n’ihu mmadụ.
4 Ya mere mgbe ị natara mbipụta ọhụrụ nke Ozi Alaeze Anyị, cheta na ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ dịgasị na ya bụ nanị aro. Ọ bụrụ na ị pụrụ iji ha mee ihe, ọ dị mma. Ma ọ bụrụ na ị chọtaworị ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ na-arụpụta ihe n’ókèala gị, jiri ya mee ihe! Ihe dị mkpa bụ ‘ijezu ozi gị’ n’ụzọ mara mma, na-achọta ndị kwesịrị ekwesị ma na-enyere ha aka ịghọ ndị na-eso ụzọ.—2 Tim. 4:5.