Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 2/98 p. 2
  • Nzukọ Ije Ozi Maka February

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nzukọ Ije Ozi Maka February
  • Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite February 2
  • Izu Na-amalite February 9
  • Izu Na-amalite February 16
  • Izu Na-amalite February 23
Ozi Alaeze Anyi—1998
km 2/98 p. 2

Nzukọ Ije Ozi Maka February

Izu Na-amalite February 2

Abụ 166

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Akụkọ Ọchịchị Chineke.

15 min: “Ndịàmà Jehova—Ezi Ndị Na-ezisa Ozi Ọma.” Ajụjụ na azịza. Tụleghachi igbe dị na peji nke 19 n’Ụlọ Nche September 1, 1992.

20 min: “Nyere Ndị Agbata Obi Gị Aka Ịchọpụta Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ.” Tụleghachi isiokwu, na-egosi otú ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ ndị a tụrụ aro ha si bụrụ ihe e chepụtara iji kpalie mmasị ma kwalie ndị na-ege ntị. Mee ka onye toworo eto mee paragraf nke 3-4 n’ihe ngosi, onye ntorobịa, emeekwa paragraf nke 5-6.

Abụ 208 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite February 9

Abụ 96

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.

15 min: “Jiri Mpempe Akwụkwọ Mee Ihe nke Ọma.” Nkwurịta okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ. Gụnye ahụmahụ dị n’Ụlọ Nche December 1, 1996, peji nke 13, paragraf nke 15.

20 min: “Ịgbara Ndị Asụsụ na Okpukpe Nile Àmà.” (Paragraf nke 1-9) Ajụjụ na azịza. Kpọpụta asụsụ ọtụtụ ndị na-asụ n’ókèala unu, gosikwa akwụkwọ ndị ọgbakọ nwegasịrị maka asụsụ ndị ahụ. Dị ka a kọwara na paragraf nke 9, mee ihe ngosi nke iji akwụkwọ nta bụ Good News for All Nations eme ihe.

Abụ 220 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite February 16

Abụ 75

15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego. Tụlee “Usoro Ihe Omume Ọhụrụ Maka Ụbọchị Mgbakọ Pụrụ Iche.”

10 min: Ihe Mere O Ji Dị Gị Mkpa Ịbịa Nzukọ Ọgbakọ. Onye okenye atụlee isi ihe dị n’Ụlọ Nche August 15, 1993, peji nke 8-11, na-emesi ike ịdị mkpa nke ịbịachi nzukọ nile anya.

20 min: “Ịgbara Ndị Asụsụ na Okpukpe Nile Àmà.” (Paragraf nke 10-27) Ajụjụ na azịza. Kpọpụta okpukpe ndị na-abụghị ndị Kraịst dị n’ókèala unu. Mee ka onye nkwusa nwere ahụmahụ mee ihe ngosi nke ụzọ e si agba àmà mbụ nye onye Buddha, onye Hindu, onye Juu, ma ọ bụ onye Alakụba—nke ọ bụla e nwekarịrị n’ógbè unu.

Abụ 15 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite February 23

Abụ 4

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Tụleghachi akwụkwọ a ga-enyefe na March. Kwuo otu ihe ma ọ bụ abụọ iji chee akwụkwọ Ihe Ọmụma n’ihu mmadụ, na-eji okwu ndị sitere n’Ozi Alaeze Anyị nke March 1996, peji nke 8. Kwusie okwu ike banyere ihe mgbaru ọsọ nke ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi.

15 min: “Ọ Bụru na Ọ Na-arụpụta Ihe, Jiri Ya Mee Ihe!” Ajụjụ na azịza. Mee ka otu ma ọ bụ ndị nkwusa abụọ nwere ahụmahụ so ná ndị na-ege ntị kwuo okwu ná nkenke banyere ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ ha nọgideworo na-eji eme ihe n’ihi ịdị mfe nke ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ ahụ na ihe ọ rụpụtaworo. Mgbe ahụ mee ka ụfọdụ kwugasịa ụzọ ndị a tụrụ aro ha ọhụrụ n’Ozi Alaeze Anyị bụ́ ndị dịwokwara ìrè.

20 min: Na-amụgharị Ụzọ Iche Ihe n’Ihu Mmadụ Gị. Okwu dị nkenke dabeere n’Akwukwọ-nduzi Ulo-akwukwọ, peji nke 115-116, paragraf nke 8-9. Kwusie okwu ike n’ịdị mkpa nke ịtụle ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ anyị na ịchọ ụzọ ịdị irè karị. Mee ka ụmụnna nwanyị abụọ mee ihe ngosi otú ha si atụle ihe ha mere n’ọnụ ụzọ, na-akparịta otú ha pụrụ isi mee karịa. Ha na-enwekwa nnọkọ mmụgharị ihe dị nkenke iji nwalee ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ ha zubere iji mee ihe n’oge ọzọ, na-atụrụ ibe ha aro ndị na-enye aka. Onye isi oche ekwubie okwu site n’ịgba mmadụ nile ume ịtụle na ịmụgharị ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ ha.

Abụ 103 na ekpere mmechi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya