Ihe Mere O Ji Dị Gị Mkpa Ịdị Na-aga Nzukọ Ndị Kraịst
RUO ọtụtụ ọnwa, Rosario, nke bi na Ebe Ndịda America, ritere uru isoro Elizabeth na-amụ Bible. Rosario nwere obi ụtọ ịmụta banyere Alaeze Chineke na ụzọ ọ ga-esi wetaghachi ọnọdụ Paradaịs n’elu ala. Ma, mgbe ọ bụla Elizabeth kpọrọ ya òkù ịbịa nzukọ ndị a na-enwe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ọ jụrụ. O chere na ya pụrụ ịmụ Bible n’ụlọ ya ma na-etinye ihe o kwuru n’omume, na-eme otú ahụ n’agaghị nzukọ nile nke ọgbakọ. Ì chewo echiche ma nzukọ ndị Kraịst hà na-abara gị uru n’ezie? N’ihi gịnị ka Chineke ji mee ndokwa ka ndị ya na-ezukọta ọnụ?
Ebe ọ bụ na ndị Kraịst na narị afọ mbụ dị nnọọ iche n’ebe ndị nọ ha gburugburu nọ, mkpakọrịta ziri ezi dị mkpa maka nlanarị ha. Pọl onyeozi degaara otu ọgbakọ nke ndị Kraịst oge mbụ akwụkwọ ozi, sị: “Unu wee ghọọ ndị na-adịghị ịta ụta ndị na-aghọghịkwa aghụghọ, ụmụ Chineke ndị a na-apụghị ịta ụta n’etiti ọgbọ gbagọrọ agbagọ nke na-enwekwa anya uhie, ndị a na-ahụ unu n’etiti ha dị ka ndị na-enye ìhè n’ụwa.” (Ndị Filipaị 2:15) Ndị Kraịst karịsịa nwere oge ihe isi ike na Judia, ọ bụ n’ihi ha ka Pọl ji dee, sị: “Ka anyị na-atụgharịtakwa uche n’ahụ ibe anyị ịkpasu ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche; ka anyị gharakwa ịhapụ nzukọ nke onwe anyị, dị ka ụfọdụ na-eme, kama ka anyị na-adụsi ndị ọzọ ọdụ ike; ka anyị mee karịakwa otú a, n’ụzọ hà otú unu na-ele ụbọchị ahụ anya ka ọ na-abịaru nso.” (Ndị Hibru 10:24, 25) Olee ụzọ anyị na-esi akpasu ịhụnanya na ọrụ ọma n’ahụ ibe anyị site n’izukọta ọnụ?
Ụzọ Ndị Kraịst Si “Na-amụcha” Ibe Ha
Okwu Grik Pọl ji mee ihe na nke a sụgharịrị ịbụ “ịkpasu” pụtara n’ụzọ nkịtị “ịmụcha.” Otu ilu Bible na-akọwa ụzọ ndị Kraịst si “na-amụcha” ibe ha mgbe ọ sịrị: “Ígwè na-amụcha ígwè; otú a ka mmadụ na-amụcha ihu enyi ya.” (Ilu 27:17; Eklisiastis 10:10) Anyị dị ka ígwè ọrụ nke e kwesịrị ịdị na-amụcha mgbe nile. Ebe ọ bụ na igosipụta ịhụnanya anyị maka Jehova na ime mkpebi ndị dabeere n’okwukwe anyị pụtara ịdị iche pụọ n’ụwa, ọ dị mkpa anyị ịgbaso ụzọ dị iche mgbe nile, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, pụọ na nke ihe ka n’ọnụ ọgụgụ na-agbaso.
Mgbalị a na-eme mgbe nile ịdị iche pụrụ ime ka ịnụ ọkụ n’obi anyị maka ọrụ ọma jụọ oyi. Ma mgbe anyị nọ n’etiti ndị ọzọ hụrụ Jehova n’anya, anyị na-amụcha ibe anyị—anyị na-akpasu ịhụnanya na ọrụ ọma n’ahụ ibe anyị. N’aka nke ọzọ, mgbe anyị nọ nanị anyị, ọ na-eyi ka anyị na-eche banyere onwe anyị karị. Echiche rụrụ arụ, nke na-achọ ọdịmma onwe ya nanị, ma ọ bụ nke nzuzu pụrụ ịbata n’uche anyị. “Ọchịchọ nke ya onwe ya na-achọsi ike ka onye na-ekewapụ onwe ya na-achọ, ọ bụ ezi nzube ihe nile ka ọ na-alụsosi ọgụ ike.” (Ilu 18:1) Nke ahụ mere Pọl ji degara ọgbakọ nọ n’obodo Tesalọnaịka akwụkwọ, sị: “Na-akasirịtanụ ibe unu obi, wulirịtakwa ibe unu elu dị ka ụlọ, dị ka unu na-emekwa.”—1 Tesalọnaịka 5:11.
Mgbe Rosario mụsịrị ọmụmụ ihe ya nke ozizi Bible ndị bụ isi, ọ ka lakwara azụ n’iso ọgbakọ na-akpakọrịta. Ya mere, n’enweghị ike inye enyemaka ọzọ, Elizabeth kwụsịrị ịga na nke ya. Mgbe ọnwa ụfọdụ gasịrị otu onye nlekọta bịara leta Rosario wee jụọ, sị: “Ọbụna ma à sị na onye ọ bụla so n’otu ezinụlọ pụrụ inweta nri dị mma site n’iri ihe n’ụlọ oriri, gịnị ga-efunahụ ndị òtù ezinụlọ ahụ nile n’ihi erikọghị nri ọnụ n’ụlọ?” Rosario zaghachiri, sị: “Ha agaghị enweta mkpakọrịta nke ezinụlọ.” Ọ ghọtara isi ihe ahụ wee malite ịbịachi anya ná nzukọ nile. Ọ hụrụ na ọ bara uru nke ukwuu nke na ọ bịawo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nzukọ nile ọ bụla e nweworo kemgbe ahụ.
Ịnụ ka ndị ọzọ kwupụtara okwukwe ha n’otu ihe ahụ nke i kwere na ya na-agba ume, otú ahụ ka ọ dịkwa ịhụ ụzọ okwukwe dị otú siworo gbanwee ndụ ha. Pọl maara nke a site n’ahụmahụ onwe ya, o degakwaara ọgbakọ ahụ dị na Rom akwụkwọ, sị: “Ịhụ unu anya na-agụsi m ike, ka m wee mee ka unu keta onyinye amara ụfọdụ nke mmụọ nsọ, ka e wee mee ka unu guzosie ike; nke ahụ bụ, ka e wee kasie mụ na unu obi n’etiti unu, site n’okwukwe anyị kwekọrọ, ma nke unu ma nke mụ onwe m.” (Ndị Rom 1:11, 12) N’ezie, ọ bụ mgbe ọtụtụ afọ gasịrị ka Pọl nwere ike ịga Rom, mgbe ọ gakwara, ọ bụ dị ka onye mkpọrọ nọ n’aka ndị Rom. Ma mgbe ọ hụrụ ụmụnna sitere Rom bụ́ ndị ji ụkwụ gaa ihe karịrị 60 kilomita site n’obodo ha ịbịa zute ya, ‘Pọl kelere Chineke, nweekwa obi ike.’—Ọrụ 28:15.
Ịchọta Nri Ime Mmụọ n’Oge Dị Oké Egwu
Ka ọ nọ mkpọrọ n’ụlọ ya na Rom, Pọl degaara ndị Hibru akwụkwọ banyere ịghara ịhapụ nzukọ nke onwe ha. Ọ bụ ihe dị mkpa nye anyị na o kwukwara okwu ndị ahụ bụ́: “N’ụzọ hà otú unu na-ele ụbọchị ahụ anya ka ọ na-abịaru nso.” (Ndị Hibru 10:25) Ndịàmà Jehova anọgidewo na-egosi site n’Akwụkwọ Nsọ na afọ ahụ bụ́ 1914 kara akara mmalite nke oge ọgwụgwụ nke ụwa nke a, na “ụbọchị nke ikpe na ịla n’iyi nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke” abịaruwokwa nso. (2 Pita 3:7) Dị ka akwụkwọ Bible nke Mkpughe si kwuo, mgbe a chụpụrụ Ekwensu n’eluigwe ná mmalite nke oge ọgwụgwụ, o were oké iwe wee ‘pụọ ibu agha megide ndị fọdụrụ, bụ́ ndị na-edebe ihe nile Chineke nyere n’iwu, ndị na-enwekwa àmà nke Jisọs.’ (Mkpughe 12:7-17) Ya mere, idebe ihe nile Chineke nyere n’iwu siri ike ugbu a karịsịa; ọ dị mkpa ka anyị soro ndị kwere ekwe ibe anyị na-ezukọta ọbụna karị. Nzukọ dị iche iche ga-enyere anyị aka ime ka okwukwe na ịhụnanya anyị maka Chineke sie ike iji wee guzogide mwakpo nile nke Ekwensu.
Ịhụnanya nke Chineke na okwukwe adịghị ka ụlọ ndị na-adịgide adịgide ma e wusịa ha. Kama, ha dị ka ihe ndị dị ndụ na-eto eto nwayọọ nwayọọ site n’inye ha nri mgbe mgbe ma bụrụ nke na-akpọnwụ ma nwụọ ma ọ bụrụ na a kwụwa ha agụụ. Nke ahụ mere Jehova ji ewepụta nri ime mmụọ mgbe mgbe iji gbaa ndị ya ume. Nri dị otú ahụ dị anyị nile mkpa, ma olee ebe anyị pụrụ inweta ya ma e wezụga n’ọgbakọ Chineke nakwa nzukọ ya nile? Ọ dịghị ebe ọzọ.—Deuterọnọmi 32:2; Matiu 4:4; 5:3.
Jisọs jụrụ otu ajụjụ nke pụrụ inyere anyị aka ịhụ ụzọ o si enye ọgbakọ ndị Kraịst nri. Ọ jụrụ, sị: “Ònyekwa bụ ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche, nke onyenwe ya mere onye isi ezinụlọ ya, inye ha ihe e ji azụ ha n’oge ya? Ngọzi na-adịrị ohu ahụ, onye, mgbe onyenwe ya ga-abịa, ọ ga-ahụ ya ka ọ na-eme otú a.” (Matiu 24:45, 46) Ònye ka Jisọs họpụtara na narị afọ mbụ inye ndị na-eso ụzọ ya nri, ònyekwa ka ọ hụrụ ka o ji ikwesị ntụkwasị obi na-enye ha nri ná nlaghachi ya n’ike Alaeze? N’ụzọ doro anya, ọ dịghị mmadụ ọ bụla nke dịworo ndụ gabiga narị afọ ndị ahụ nile. Ihe àmà na-egosi na ohu ahụ bụ ọgbakọ nke ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ, dị nnọọ ka mba Israel bụ ohu Chineke tupu oge ndị Kraịst. (Aịsaịa 43:10) Ee, Jisọs na-ewepụta nri ime mmụọ anyị site n’aka òtù ahụ zuru ụwa ọnụ nke ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ, nke na-ezite nri ime mmụọ ahụ n’oge a site n’ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova.
Ndokwa Jisọs mere maka usoro isi na-ewepụta nri ime mmụọ bụ nke Pọl onyeozi gara n’ihu ịkọwa, sị: “Mgbe ọ rịgoro n’elu, ọ dọtara usuu ndị a dọtara n’agha n’agha, nyekwa mmadụ onyinye dị iche iche. . . . Ya onwe ya nyekwara ụfọdụ ka ha bụrụ ndị ozi; nyekwa ụfọdụ ka ha bụrụ ndị amụma; nyekwa ụfọdụ ka ha bụrụ ndị na-ezisa ozi ọma; nyekwa ụfọdụ ka ha bụrụ ndị na-azụ atụrụ Chineke na ndị ozizi; ime ka ndị nsọ zuo okè ịrụ ọrụ nke ije ozi, iwuli ahụ nke Kraịst elu dị ka ụlọ: ruo mgbe anyị nile ga-eru ịdị n’otu nke okwukwe na nke mmazu nke Ọkpara Chineke, ruo ịbụ nwoke tozuru okè, ruo ọ̀tụ̀tụ̀ nke ogologo nke ozuzu nke Kraịst.”—Ndị Efesọs 4:8, 11-13.
Ọ bụ n’ụzọ bụ isi n’ime ọgbakọ ha—ná nzukọ dị iche iche—ka ‘onyinye dị ná mmadụ’ ndị a wuliri ụmụnna elu. Dị ka ihe atụ, n’Antiọk, “Judas na Saịlas, ebe ha onwe ha bụkwa ndị amụma, ha wee were ọtụtụ okwu kasie ụmụnna ahụ obi, meekwa ka obi ha guzosie ike.” (Ọrụ 15:32) Okwu ndị ikom ruru eru n’ụzọ ime mmụọ na-ekwu n’oge a ga-emekwa ka okwukwe anyị baa ụba n’otu aka ahụ ka o wee ghara ịkpọnwụ ma ọ bụ ghara ịdị na-arụ ọrụ.
Ọ pụrụ ịbụ eziokwu na anyị enwewo ọganihu dị mma n’ihi enyemaka onwe onye nke otu onye so n’ọgbakọ ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na anyị amalitebeghị ịbịa nzukọ dị iche iche. Bible na-asị na e nwere oge mgbe ọ dị unu “mkpa ọzọ ka mmadụ zie unu ihe bụ ihe ozizi mbụ nke mmalite okwu si n’ọnụ Chineke pụta; . . . ndị mmiri ara dị mkpa, ọ bụghị nri siri ike.” (Ndị Hibru 5:12) Ma mmadụ agaghị anọgide na-aṅụ mmiri ara ruo ebighị ebi. Nzukọ ndị Kraịst na-enye usoro ihe omume na-aga n’ihu n’ihu nke ọzụzụ Bible a haziri iji mee ka ịhụnanya Chineke na okwukwe dị n’ime ya dịrị ndụ nakwa iji wepụta enyemaka dị irè n’itinye “izu nile nke Chineke” n’ọrụ. (Ọrụ 20:27) Nke a karịrị “mmiri ara.” Bible gara n’ihu ikwu, sị: “Nri siri ike bụ nke ndị tozuru okè, ndị a nwaworo nghọta ha n’ihi omume ha na-eme mgbe dum ịtụle ihe ọma na ihe ọjọọ.” (Ndị Hibru 5:14) Ná nzukọ dị iche iche, a na-atụle ọtụtụ isiokwu nke nwere ike ghara ịbụ akụkụ nke ọzụzụ bụ isi nke ntụziaka Bible ebe obibi, dị ka ọmụmụ amaokwu ruo n’amaokwu nke amụma Bible ndị dị mkpa nakwa ntụle miri emi nke ụzọ anyị pụrụ isi ṅomie Chineke ná ndụ anyị.
Ihe Ncheta Jehova—Dị Ka Olu Ị Nụrụ n’Azụ Gị
Site n’ọmụmụ ihe ọgbakọ ndị dị otú ahụ, Jehova na-echetara anyị mgbe nile banyere ụdị ndị anyị kwesịrị ịbụ. Ihe ncheta ndị dị otú ahụ dị mkpa. E wezụga ha ọ ga-adịrị anyị mfe inwe ọchịchọ ọdịmma onwe onye nanị, mpako, na anyaukwu. Ihe ncheta ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ ga-enyere anyị aka inwe mmekọrịta na-aga nke ọma n’ebe ndị mmadụ ndị ọzọ na Chineke n’onwe ya nọ. “Echere m echiche ụzọ m nile, wee mee ka ụkwụ m abụọ laghachi n’ihe àmà gị nile,” ka onye dere Abụ Ọma 119:59 kwupụtara.
Ka anyị na-abịachi anya ná nzukọ nile nke ndị Kraịst, anyị na-enwe ahụmahụ nke mmezu amụma Jehova site n’ọnụ Aịsaịa, nke na-asị: “Onye Ozizi gị Kasị Ukwu agaghị ezobe onwe ya ọzọ, anya gị aghaghịkwa ịghọ anya na-ahụ Onye Ozizi gị Kasị Ukwu. Ntị gị abụọ ga-anụkwa okwu n’azụ gị nke na-asị: ‘Nke a bụ ụzọ ahụ. Na-aganụ ije na ya.’” Jehova na-ahụ ọganihu anyị ma jiri ịhụnanya na-agbazi anyị olu ma ọ bụrụ na anyị azọhie ụkwụ. (Aịsaịa 30:20, 21, NW; Ndị Galetia 6:1) Ọ na-ewepụtakwa ọbụna enyemaka karịrị nke a.
Ịnata Mmụọ Nsọ Site n’Ọgbakọ
Site n’ịbịachi anya ná nzukọ ndị Kraịst nke Ndịàmà Jehova, a na-eme ka anyị guzosie ike site na mmụọ nsọ Chineke, nke na-adịkwasị n’ahụ ndị ya. (1 Pita 4:14) Ọzọ, ndị nlekọta ndị Kraịst nọ n’ọgbakọ abụrụwo ndị a họpụtara site na mmụọ nsọ. (Ọrụ 20:28) Ike ọrụ nke a sitere n’aka Chineke na-enwe mmetụta dị ike n’ahụ ndị Kraịst. Bible na-asị: “Mkpụrụ nke mmụọ nsọ bụ ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obi ọma, ịdị mma, [okwukwe, NW], ịdị nwayọọ, imeru ihe n’ókè.” (Ndị Galetia 5:22, 23) Mmụọ nsọ, n’ịrụ ọrụ site ná nzukọ Chineke, ga-enyekwara anyị aka inweta nghọta dị ebube banyere ihe Jehova nwere imere ndị hụrụ ya n’anya. Mgbe ọ kọwasịrị na ndị a ma ama n’usoro ihe a apụghị ịghọta nzube Chineke, Pọl dere, sị: “Ọ bụ anyị onwe anyị ka Chineke kpugheere ha site n’aka mmụọ nsọ.”—1 Ndị Kọrint 2:8-10.
E wezụga nri ime mmụọ nke na-agba okwukwe ume, ọgbakọ na-enye ọzụzụ maka ndị chọrọ ikere òkè n’ọrụ bụ isi nke ọgbakọ. Gịnị bụ nke ahụ?
Ọzụzụ nke Ọgbakọ Na-enye
Ọgbakọ ndị Kraịst abụghị òtù ọrụ ọma ebe ndị mmadụ na-enweta nnọọ ntụrụndụ na ma eleghị anya na-agba onwe ha ume ibi ndụ ka mma. Jisọs nyere ọgbakọ ọrụ iji ozi ọma nke Alaeze gaa na nke ndị bi n’ọchịchịrị ime mmụọ. (Ọrụ 1:8; 1 Pita 2:9) Malite n’ụbọchị ahụ e guzobere ya, na Pentikọst 33 O.A., ọ bụ nzukọ nke ndị nkwusa. (Ọrụ 2:4) Ì nwewo ahụmahụ nke ịgbalị ịkọrọ mmadụ banyere nzube nile nke Jehova ma ghara ime ka o kweta? Nzukọ nile nke ọgbakọ na-enye ọzụzụ onwe onye ná nkà nke izi ihe. Site n’ịtụle ihe atụ ndị dị na Bible, anyị na-amụta ụzọ isi guzobe otu ihe e kwekọrịtara na ya nke a ga-eji tụgharịa uche, ụzọ isi jiri Akwụkwọ Nsọ mee ihe dị ka ihe ndabere maka arụmụka ezi uche dị na ya, na ụzọ isi nyere ndị ọzọ aka ịtụgharị uche site n’iji ajụjụ na ihe atụ na-eme ihe. Nkà ndị dị otú ahụ pụrụ inyere gị aka inwe ahụmahụ nke ọṅụ na-enweghị atụ nke inyere onye ọzọ aka ịghọta eziokwu Bible.
N’ime ụwa nke a ọgba aghara na-etisa, nke rụrụ arụ, ọgbakọ ndị Kraịst bụ n’ezie ebe mgbaba ime mmụọ. Ọ bụ ezie na ihe mejupụtara ya bụ ndị na-ezughị okè, ọ bụ ebe e nwere udo na ịhụnanya. Ya mere, bụrụ onye na-abịachi anya ná nzukọ ya nile ma nwee n’onwe gị ahụmahụ dị n’eziokwu nke okwu onye ọbụ abụ ahụ bụ́: “Lee, ka o si dị mma, ka o si dịkwa ụtọ nke ukwuu, bụ́ mbikọ nke ụmụnne, ọbụna ibikọ n’otu! . . . Jehova nyere ngọzi ahụ iwu, bụ́ ndụ ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 133:1, 3.