Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 4/98 p. 1
  • Gaa Nzukọ “Karịakwa Otú A”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gaa Nzukọ “Karịakwa Otú A”
  • Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị Ịna-ezukọ Maka Ife Chineke?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Ihe Mere O Ji Dị Gị Mkpa Ịdị Na-aga Nzukọ Ndị Kraịst
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Olee Uru Ọmụmụ Ihe Ndịàmà Jehova Ga-abara Gị?
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Otú Jehova Si Edu Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1998
km 4/98 p. 1

Gaa Nzukọ “Karịakwa Otú A”

1 Izukọta ọnụ adịwo oké mkpa mgbe nile nye ndị Jehova. Ndị Israel nwere ụlọ nsọ na ụlọ nzukọ ha dị ka ebe ndị e nwere maka ezi ofufe, mmụta Chineke, na mkpakọrịta na-enye ọṅụ. N’otu aka ahụ, ndị Kraịst mbụ ahapụghị ịdị na-ezukọta ọnụ. Ka nrụgide na ule na-arị elu n’oge ikpeazụ a dị oké egwu, mwusi ike n’ime mmụọ nke nzukọ ọgbakọ anyị na-ewusi dịkwa anyị mkpa—ọ dịkwa anyị mkpa “karịakwa otú a.” (Hib. 10:25) Rịba ihe atọ mere anyị ji aga nzukọ ama.

2 Maka Mkpakọrịta: Akwụkwọ Nsọ na-adọ anyị aka ná ntị ‘ịkasirịta ibe anyị obi na iwulirịta ibe anyị elu.’ (1 Tesa. 5:11) Mkpakọrịta nke ndị Chineke na-eji echiche ọma emejupụta uche anyị ma na-akwali anyị ịrụ ọrụ ọma. Ma ọ bụrụ na anyị akpapụ iche, ọ na-adịkarịrị anyị mfe ịnabata echiche nzuzu, nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, ma ọ bụ ọbụna nke rụrụ arụ.—Ilu 18:1.

3 Maka Ntụziaka: Nzukọ ndị Kraịst na-enye usoro ntụziaka Bible na-adịgide adịgide a haziri iji debe ịhụnanya Chineke n’obi anyị. Ha na-enye ntụzi dị irè n’itinye “izu nile nke Chineke” n’ọrụ. (Ọrụ 20:27) Nzukọ na-azụ anyị na nkà nke ikwusa na ịkụzi ozi ọma ahụ, nkà ndị dị mkpa karịa ugbu a iji nwee ọṅụ na-enweghị atụ nke ịchọta na inyere ndị ga-anakwere eziokwu Bible aka.

4 Maka Nchebe: N’ajọ ụwa a, ọgbakọ bụ ebe mgbaba ime mmụọ n’ezie—ebe udo na ịhụnanya na-achị. Mgbe anyị nọ ná nzukọ ọgbakọ, mmụọ nsọ Chineke na-enwe mmetụta dị ike n’ahụ anyị, na-amịpụta mkpụrụ “ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, ikwesị ntụkwasị obi, ịdị nwayọọ, imeru ihe n’ókè.” (Gal. 5:22, 23) Nzukọ na-ewusi anyị ike iguzosi ike na ịkwụrụ chịm n’okwukwe. Ha na-akwadebe anyị ịdị njikere maka ule ndị dị n’ihu.

5 Site n’ịgachi nzukọ anya, anyị na-enwe ahụmahụ nke ihe ọbụ abụ ahụ kọwara, dị ka e dekọrọ n’Abụ Ọma 133:1, 3: “Lee, ka o si dị mma, ka o si dịkwa ụtọ nke ukwuu, bụ́ mbikọ nke ụmụnne, ọbụna ibikọ n’otu!” Ebe ọ bụla ndị Chineke na-eje ozi, na-ezukọkwa taa, “n’ebe ahụ ka Jehova nyere ngọzi ahụ iwu, bụ́ ndụ ruo mgbe ebighị ebi.”—Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya