Ozi Anyị—Ngosipụta nke Ezi Ịhụnanya
1 Site n’ozi anyị anyị na-egosi nrubeisi anyị n’iwu abụọ ahụ kasịnụ. (Mat. 22:37-39) Ịhụnanya anyị maka Jehova na-akwali anyị ikwu ihe dị mma banyere ya. Ịhụnanya anyị maka ndị agbata obi anyị na-akpali anyị ịgba ha ume ịchọ ịmata uche na nzube Chineke ka ha wee nwee ike ịhụ Jehova n’anya ma debe onwe ha n’ọnọdụ inweta ihe mgbata n’ọsọ nke ndụ ebighị ebi, dị ka anyị. Ya mere, site n’ozi anyị anyị na-asọpụrụ aha Jehova ma soro ndị agbata obi anyị na-ekerịta olileanya Alaeze ahụ dị oké ọnụ ahịa. Ee, ozi anyị bụ ngosipụta nke ezi ịhụnanya maka Chineke na mmadụ.
2 Ịhụnanya anyị na-akpali anyị ịgwa ụdị mmadụ nile okwu n’ụdị ọnọdụ nile. (1 Kọr. 9:21-23) Iji maa atụ: N’ime otu ụgbọelu, otu onye Kraịst bụ́ okenye nọ n’akụkụ otu ụkọchukwu Roman Katọlik. Okenye ahụ jụpụtara ụkọchukwu ahụ ihe n’ọnụ site n’iji nkà jụọ ajụjụ ole na ole, ma mgbe ahụ, chigharịa nkwurịta okwu ahụ ihu gaa n’Alaeze. Ka ọ na-erule mgbe ụkọchukwu ahụ rịturu n’ụgbọelu ahụ, ọ natawo akwụkwọ anyị abụọ. Lee ụdị ihe ọma si n’okenye ahụ igosipụta ezi ịhụnanya maka onye agbata obi ya pụta!
3 Ezi Ịhụnanya Na-akpali Anyị Ime Nkwusa: Ndị na-arụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka na nke oge nile na-egosipụta ezi ịhụnanya n’ezie maka Chineke na ndị agbata obi. Ndị ọsụ ụzọ na-achụ oge na ume ọrụ ha n’àjà mgbe nile inyere ndị ọzọ aka n’ụzọ ime mmụọ. Gịnị na-akpali ha ime nke a? Otu ọsụ ụzọ kwuru, sị: “Ama m na ịhụnanya bụ mkpụrụ nke mmụọ Chineke. Ya mere e wezụga ya, agaghị m anọ n’eziokwu ma ọlị, ma ya fọdụkwa ihe ịgara m nke ọma dị ka ọsụ ụzọ. Ịhụnanya na-eme ka m nwee mmasị n’ebe ndị mmadụ nọ, na-amara mkpa ha, m makwaara na ndị mmadụ na-anabata ịhụnanya.” Jisọs gosipụtara ụdị ịhụnanya ahụ maka ụmụ mmadụ. N’otu oge ya na ndị na-eso ụzọ ya ike gwụsịrị na-aga otu ebe ‘izuru ike nke nta,’ ìgwè mmadụ bu ha ụzọ ruo ebe ahụ. Gịnị ka Jisọs mere? N’ịbụ onye ‘nwere ọmịiko n’ahụ ha,’ ọ hapụrụ mkpa nke onwe ya iji wee ‘zie ha ọtụtụ ihe.’—Mak 6:30-34.
4 Ọbụna mgbe ndị mmadụ jụrụ ozi ọma anyị na-ezi, anyị na-enwe ọṅụ ime obi, na-amata na, n’ịbụ ndị ịhụnanya kpaliri, anyị emewo ike anyị inyere ha aka inweta nzọpụta. Mgbe Kraịst ga-ekpe anyị nile ikpe n’ikpeazụ, obi ga-adị anyị ụtọ na anyị gosipụtara ezi ịhụnanya site ‘n’ijezu ozi anyị.’—2 Tim. 4:5.