Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jl ihe ọmụmụ 5
  • Olee Uru Ị Ga-erite ma Ị Bịa Ọmụmụ Ihe Anyị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Uru Ị Ga-erite ma Ị Bịa Ọmụmụ Ihe Anyị?
  • Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee Uru Ọmụmụ Ihe Ndịàmà Jehova Ga-abara Gị?
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị Ịna-ezukọ Maka Ife Chineke?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Ụzọ Isi Nwetakwuo Ọṅụ ná Nzukọ
    Ozi Alaeze Anyi—1999
  • N’ihi Gịnị Ka Anyị Ji Ezukọta Ọnụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
jl ihe ọmụmụ 5

ISI NKE 5

Olee Uru Ị Ga-erite ma Ị Bịa Ọmụmụ Ihe Anyị?

Ndịàmà Jehova nọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị n’Ajentina

Ajentina

Ebe Ndịàmà Jehova na-amụ ihe na Siera Liọn

Siera Liọn

Ebe Ndịàmà Jehova na-amụ ihe na Beljọm

Beljọm

Ebe Ndịàmà Jehova na-amụ ihe na Maleshia

Maleshia

Ọtụtụ ndị akwụsịla ịga chọọchị n’ihi na o nweghị ihe ha mụtara ná ndị nke ha garala aga, o nweghịkwa onye na-agba ha ume. Ma, olee ihe mere o ji dị mma ka ị na-abịa ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova? Oleekwa uru ị ga-erite ma ị na-abịa ya?

Obi ga-adị gị ụtọ na gị na ndị hụrụ ibe ha n’anya nọ. N’oge ochie, Onye Kraịst ọ bụla nwere ọgbakọ ọ na-eso amụ ihe. N’ọmụmụ ihe ndị ahụ, ha na-efe Chineke, na-amụ Akwụkwọ Nsọ, ma na-agba ibe ha ume. (Ndị Hibru 10:​24, 25) Ha gaa ọmụmụ ihe, obi na-eru ha ala na ha na ndị enyi ha nọ. (2 Ndị Tesalonaịka 1:3; 3 Jọn 14) Anyị na-amụ ihe otú ahụ Ndị Kraịst oge ochie si amụ, obi na-adịkwa anyị ụtọ ka ha.

Ị ga-amụta otú e si eme ihe Baịbụl kwuru. N’oge ochie, ụmụ nwoke, ụmụ nwaanyị, na ụmụaka na-anọkọ mụọ Okwu Chineke. Otú ahụkwa ka anyị na-eme. Ndị ma akụzi ihe na-eji Baịbụl eme ka anyị ghọta otú anyị ga-esi na-eme ihe Okwu Chineke kwuru. (Diuterọnọmi 31:12; Nehemaya 8:⁠8) Onye ọ bụla bịara ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova nwere ike itinye ọnụ ma e nwee okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ, o nwekwara ike soro bụọ abụ. Ha so n’ụzọ ndị anyị si ekwupụta olileanya anyị nwere na Chineke.​—⁠Ndị Hibru 10:⁠23.

A ga-eme ka okwukwe i nwere na Chineke sikwuo ike. Mgbe Pọl onyeozi nọ n’ụwa, ọ gwara otu ọgbakọ, sị: “Ọ na-agụsi m agụụ ike ịhụ unu, . . . ka anyị wee gbarịta ibe anyị ume, onye ọ bụla site n’okwukwe nke ibe ya, ma nke unu ma nke m.” (Ndị Rom 1:​11, 12) Anyị gaa ọmụmụ ihe, anyị na ụmụnna anyị na-akparịta. Nke a na-eme ka okwukwe anyị na-esikwu ike, obi esiekwa anyị ike ịna-eme ihe Baịbụl kwuru.

Gbalịa bịa ọmụmụ ihe ọzọ anyị ga-enwe ka ị hụ na ihe ndị a anyị kwuru bụ eziokwu. Anyị ga-eji obi anyị niile nabata gị. Anyị anaghị ana ndị bịara ọmụmụ ihe anyị ụtụ ọ bụla.

  • Olee ndị anyị na-amụ ihe ka ha?

  • Olee uru ị ga-erite ma ị bịa ọmụmụ ihe anyị?

IHE ỌZỌ Ị GA-EME

Ọ bụrụ na ị ga-achọ ibu ụzọ hụ otú Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị dị tupu i soro anyị mụọ ihe, gwa Onyeàmà Jehova ọ bụla ị ma ka ọ gaa gosi gị nke dị nso n’ụlọ unu.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya