Ụzọ Isi Nwetakwuo Ọṅụ ná Nzukọ
1 Nzukọ dị oké mkpa maka ahụ ike ime mmụọ anyị. Ihe anyị na-eme tupu nzukọ, n’oge nzukọ na-aga n’ihu, na mgbe ọ gasịrị, na-emetụta kpọmkwem ọṅụ anyị na-enweta site na ha. Olee otú anyị pụrụ isi nyere onwe anyị na ndị ọzọ aka ịnọgide na-enwe ọṅụ dị ukwuu n’ịga nzukọ?
2 Tupu Nzukọ: Ime nkwadebe na-emetụta kpọmkwem ọṅụ anyị na-enweta site ná nzukọ. Mgbe anyị kwadebere nke ọma, anyị na-enwe ọchịchọ ka ukwuu ịṅa ntị na ikere òkè. Ọzọkwa, anyị kwesịrị ịkwado ihe omume ọ bụla anyị nwetara ime ná nzukọ nke ọma na-eburu n’uche inye ihe ọmụma ziri ezi dị ka ntụziaka e nyere si dị na ime ka ndị na-ege ntị nọgide na-enwe mmasị n’ihe ị na-ekwu. Anyị kwesịrị ịmụgharị ya nke ọma. Mgbe anyị tụnyere ụtụ n’ime ka e nwee nzukọ na-ekpo ọkụ na nke na-ewuli elu, bụ́ nke baara onye ọ bụla uru, ọganihu anyị na-apụta ìhè, anyị na-enwekwa ọṅụ ka ukwuu.—1 Tim. 4:15, 16.
3 N’oge Nzukọ Na-aga n’Ihu: Ịza ajụjụ ná nzukọ pụrụ inyere anyị aka ịnụkwu ụtọ ha. E kwesịrị iwere akụkụ ndị na-achọ ka ndị na-ege ntị tinye ọnụ dị ka ihe omume ndị e nyere onye ọ bụla nọ n’ime ọgbakọ. Azịza ndị dị mkpirikpi ma gaa n’ihe a chọrọ na-adịkarịsị irè. Ịkọ ahụmahụ ndị na-ewuli elu ná mkpirikpi pụrụ ịbụ ihe na-agba ume na nke na-enye ume ọhụrụ, anyị kwesịkwara ịmụrụ anya ịgụnye ha mgbe ọ bụla ọ dabara adaba. (Ilu 15:23; Ọrụ 15:3) Mgbe anyị na-eme ihe omume ná nzukọ, anyị kwesịrị iji ịnụ ọkụ n’obi na nkwenye siri ike kwuo okwu, mee ka ọ dị ụtọ, bụrụ ihe a pụrụ ime eme, na nke bara uru.
4 Mgbe Nzukọ Gasịrị: Ịgwa ndị ọzọ okwu obiọma, ekele enyi, na isi ihe ole na ole ndị a tụlere ná nzukọ ga-abara anyị nile uru. Ikwupụta ọṅụ anyị nwere ịhụ ka ụmụaka, ndị agadi, na ndị ọhụrụ na-ekere òkè na-eme ka ịhụnanya nke òtù ụmụnna ahụ mikwuo emi. Kama ịdị na-akatọ ụfọdụ ndị pụrụ ịhapụ ịbịa nzukọ, anyị kwesịrị isoro ha kerịta ọṅụ anyị nwetara site n’ịga, si otú ahụ na-agba ha ume ịga.—Hib. 10:24, 25.
5 Ka anyị ghara ịnapụ onwe anyị ndokwa a dị oké mkpa maka ịgbarịta onwe anyị ume. (Rom 1:11, 12) Site n’iji ịdị uchu na-etinye ezi mgbalị, anyị nile pụrụ ịnọgide na-enweta ọṅụ site n’ịga nzukọ ndị Kraịst.