Nzukọ Ije Ozi Maka October
IHE ỊRỊBA AMA: Ozi Alaeze Anyị ga-ahazi Nzukọ Ije Ozi maka izu nke ọ bụla n’oge mgbakọ. Ọgbakọ dị iche iche pụrụ ime mgbanwe dị ka ọ dị mkpa iji nye ohere maka ịga Mgbakọ Distrikti “Okwu Amụma nke Chineke” nakwa maka ntụleghachi ga-ewe minit 30 nke isi ihe ndị dị n’usoro ihe omume ya ná Nzukọ Ije Ozi n’izu na-eso ya. Ntụleghachi kwa ụbọchị nke usoro ihe omume mgbakọ ahụ bụ nke e kwesịrị inye ụmụnna atọ ruru eru tupu oge eruo bụ́ ndị ga-elekwasị anya n’isi ihe ndị pụtara ìhè. Ntụleghachi a a kwadebere nke ọma ga-enyere ọgbakọ aka icheta ihe ndị bụ́ isi maka itinye ha n’ọrụ ná ndụ ha nakwa maka iji ha eme ihe n’ubi. Okwu ọ bụla ndị na-ege ntị kwuru na ahụmahụ ndị a kọrọ kwesịrị ịdị nkenke ma gaa kpọmkwem n’ihe a na-ekwu.
Izu Na-amalite October 4
Abụ nke 147
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị.
15 min: “Isochi Mmasị A Chọtara—Ihe Dị Oké Mkpa n’Ime Ndị Na-eso Ụzọ.” Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
20 min: “Kere Òkè n’Ịkpọsa Ụtụ Ga-aga nke Ọma.” Ajụjụ na azịza nke onye nlekọta ije ozi ga-eme. Kpalie ndị nkwusa ịsetịpụ ihe mgbaru ọsọ nke inyefe ụtụ. Mesie ike mkpa ọ dị idejupụta mpempe akwụkwọ ndị e ji atụ ụtụ nke ọma na izipụ ha n’egbughị oge.
Abụ nke 130 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite October 11
Abụ nke 194
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ na ahụmahụ ndị e nwere n’ozi ubi.
15 min: Mkpa ọgbakọ.
20 min: Dị Njikere Ịdị Na-enyefe Magazin! Kwuo ngụkọta ọnụ ọgụgụ magazin ọgbakọ unu nyefere n’ọnwa gara aga. Olee otú ọ hà ma e were ya tụnyere ọnụ ọgụgụ a na-enweta site n’aka Society? Ọ bụrụ na e nwere ọdịiche dị ukwuu, gịnị ka ọ dị mkpa ka e mee? Kpọọ ndị na-ege ntị òkù ka ha kwuo okwu n’ihe ndị na-esonụ: (1) Onye nkwusa ọ bụla kwesịrị ikwu ka a na-enye ya magazin ga-ezuru ya ma kwesị ekwesị. (2) Lee Saturday nile anya dị ka Ụbọchị Magazin. (3) Hazie usoro ije ozi gị otú ọ ga-agụnye ọrụ magazin kwa ọnwa. (4) Mee atụmatụ ịdị na-agba àmà mberede karị na-eji magazin amalite mkparịta ụka. (5) Were isiokwu ndị pụrụ iche gakwuru ndị na-achụ ntà ego na ndị ọkà bụ́ ndị kasị yie ka ha ga-enwe mmasị na ha. (6) Nwee ihe ndekọ ziri ezi nke ụtụ ndị i tinyere ma malite ụzọ magazin, na-eji magazin ndị kasị ọhụrụ agaghachi mgbe nile. (7) Jiri magazin ndị mere ochie karị mee ihe nke ọma ka o wee ghara ịdị nke ga-afọdụnụ. Gosi magazin ndị dị ọhụrụ, ma kọwapụta isiokwu ndị yiri ka ha ga-akpali mmasị. Mee ka otu onye toworo eto na otu onye na-eto eto mee ihe ngosi dị nkenke n’otu n’otu nke iche magazin n’ihu mmadụ.—Lee ihe ntinye nke Ozi Alaeze Anyị nke March 1996.
Abụ nke 105 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite October 18
Abụ nke 196
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.
15 min: “Ị̀ Na-akwapụ?” Okwu na-agba ume nke odeakwụkwọ ga-ekwu. Mgbe ọ dị mkpa ka ndị nkwusa gaa n’ọgbakọ ọzọ, ọ dị mkpa ka ha kwụrụ chịm n’ebe ha kwagara ọhụrụ ka e wee zere ndọghachi azụ ime mmụọ ọ bụla. Mesie ike mkpa ọ dị ime ka ndị okenye mara banyere atụmatụ ndị dị otú ahụ na ịrịọ arịrịọ maka enyemaka ha n’ịkpọtụrụ ọgbakọ ọhụrụ ahụ.
20 min: “Ụzọ Isi Nwetakwuo Ọṅụ ná Nzukọ.” Ajụjụ na azịza. Nye ihe atụ ndị a kapịrị ọnụ nke otú anyị pụrụ isi gosi na anyị na-echebara ibe anyị echiche ma na-agba ha ume ná nzukọ. Kpọọ ndị na-ege ntị òkù ịkọ ihe atụ ndị sitere n’ahụmahụ nke ha.
Abụ nke 152 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite October 25
Abụ nke 179
15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Nyere mmadụ nile aka ịkwadebe maka inyefe broshuọ Na-achọ ma ọ bụ akwụkwọ Ihe Ọmụma na November. Kọwaa ụzọ isi kwadebe ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ nke ga-aza ajụjụ bụ́ “Chineke ọ̀ na-aza ekpere?” Jiri isi ihe ndị dị n’ihe ọmụmụ nke 7 dị na broshuọ ahụ ma ọ bụ isi nke 16, paragraf nke 12-14, n’akwụkwọ ahụ mee ihe. Mee ihe ngosi dị mfe nke e ji otu akụkụ akwụkwọ nsọ mee ihe na ya.
15 min: Ịchọta Azịza Nye Ajụjụ Ndị Dabeere na Bible. Onye nkwusa bụ́ onye zutere otu onye nwere mmasị nke jụrụ ya otu ajụjụ dabeere na Bible abịakwute otu ohu na-eje ozi. Kama inye ya azịza nke ajụjụ ahụ, ohu na-eje ozi ahụ akọwaa otú a ga-esi chọta ya. Nke mbụ, ọ tụleghachi arọ ndị dị n’Akwukwọ-nduzi Ulo-akwukwọ, ihe ọmụmụ nke 7, paragraf nke 8-9. Mgbe ahụ, ha abụọ enyochaa otu ajụjụ a na-ajụkarị n’ókèala ọgbakọ ha. Ha agụọ ntụaka ndi a kapịrị ọnụ na-ekwu banyere isiokwu ahụ ma chọta isi ihe ndị doro anya bụ́ ndị mere ka ihe mere e ji nye azịza ahụ dabeere na Bible doo anya. Gbaa ndị na-ege ntị ume inwe ụdị ọmụmụ ihe a bara uru nke ịchọpụta ajụjụ dabeere na Bible.
15 min: Ihe Mgbaru Ọsọ Ndị Anyị Pụrụ Isetịpụ. Okwu na ntụle nke ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ. Tụleghachi ihe mgbaru ọsọ ndị ahụ bara uru e depụtara n’igbe dị na peji nke 11 n’Ụlọ Nche nke March 15, 1997. Gụnye agbamume nke ikere òkè n’ozi ọsụ ụzọ inyeaka ma ọ bụ nke oge nile. Kọwaa otú iru ihe mgbaru ọsọ ndị a pụrụ isi baara anyị uru n’otu n’otu. Kpọọ ndị na-ege ntị òkù ịkọ ọṅụ ndị ha nwere mgbe ha nwere ike ruo ihe mgbaru ọsọ ọchịchị Chineke ụfọdụ.
Abụ nke 151 na ekpere mmechi.