Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 8/00 p. 8
  • Nzukọ Na-abara Ndị Na-eto Eto Uru

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nzukọ Na-abara Ndị Na-eto Eto Uru
  • Ozi Alaeze Anyi—2000
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee Uru Ọmụmụ Ihe Ndịàmà Jehova Ga-abara Gị?
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị Ịna-ezukọ Maka Ife Chineke?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Ụzọ Isi Nwetakwuo Ọṅụ ná Nzukọ
    Ozi Alaeze Anyi—1999
  • Otú Jehova Si Edu Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2000
km 8/00 p. 8

Nzukọ Na-abara Ndị Na-eto Eto Uru

1 Otu nwa agbọghọ nọ n’afọ iri na ụma kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, ana m eche na ọ bụ ndị na-eto eto kasị enwe ihe isi ike ná ndụ. Ndị na-akwa iko, ndị na-aṅụ ọgwụ ọjọọ na ndị na-aṅụbiga mmanya ókè gbara anyị gburugburu.” Ị̀ na-eche otú ahụ? Ọ bụrụ otú ahụ, olee ihe i chere ga-enyere gị aka ịlụso mmetụta ọjọọ ndị a ọgụ? Okwukwe dị gị mkpa, inwe okwukwe siri ike n’izi ezi nke ụzọ Jehova, n’ihi na ma i nweghị ya, “ọ bụ ihe a na-apụghị ime, bụ́ ime ihe ga-atọ Chineke ezi ụtọ.” (Hib. 11:6) Ịga nzukọ ọgbakọ ga-enyere gị aka iwusi nkwenye gị ike dị ka onye Kraịst na mkpebi gị izere ihe ọjọọ.

2 E Nwere Ọtụtụ Uru Ị Ga-erite ná Nzukọ: Gịnị na-eme ka nri dị ụtọ nke e so ezi ndị enyi na-eri bụrụ ihe na-enye ọṅụ? Ọ́ bụghị njikọta nke ihe oriri dị mma na mkpakọrịta na-enye obi ụtọ nke e nwere n’ọnọdụ na-eme ka a tụsara ahụ? Nzukọ anyị na-eme ka anyị nwee otu ụdị ahụmahụ ahụ na-enye obi ụtọ, mana ọ bụ n’ụzọ ime mmụọ.

3 Ihe ndị a na-atụle ná nzukọ na-ewuli elu, site n’ihe ndị metụtara nsogbu ndị a na-enwe ná ndụ kwa ụbọchị ruo n’ịmụ amụma Bible ndị na-adọrọ mmasị. A na-enye ntụziaka bara uru bụ́ ndị na-akụziri gị ụzọ isi bie ndụ kasị mma na isi nagide ihe ịma aka ndị ị na-ezute. Ndị enyi a na-enweta ná nzukọ bụ ndị kasị mma a pụrụ inweta n’ebe ọ bụla, ọnọdụ ime mmụọ dị n’ebe ahụ dị mma ma na-enye nchebe. (Abụ Ọma 133:1) Ka a sịkwa ihe mere otu onye ntorobịa ji kwuo, sị: “M na-aga akwụkwọ ụbọchị nile, ọ na-agwụkwa m ike. Ma nzukọ yiri ala mmiri nke dị n’ọzara, bụ́ ebe m na-enweta ume ọhụrụ iji nagide nsogbu nke ụbọchị na-esonụ n’ụlọ akwụkwọ.” Onye ntorobịa ọzọ sịrị: “Achọpụtawo m na mụ na ndị ọzọ hụrụ Jehova n’anya ịdị na-akpachi anya na-enyere m aka ịnọ ya nso.”

4 Site n’idebanye aha gị n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, ị na-amụta ụzọ e si enweta ihe ọmụma Bible, kwadebe ya dị ka okwu, ma kwuo ya n’ụdị mkparịta ụka n’ihu ndị na-ege ntị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Cheedị banyere uru dị n’ịbụ onye a zụrụ n’iji nkà na-akụzi eziokwu na-azọpụta ndụ, ndị dị n’Okwu Chineke! Olee ebe ọzọ ndị na-eto eto pụrụ isi nweta ọzụzụ dị otú ahụ bara uru?

5 Ụzọ Isi Rite Uru Kasị Ukwuu ná Nzukọ: Iji rite uru kasịnụ ná nzukọ, e nwere ihe atọ dị mkpa ọ gụnyere. Ha bụ, ime nkwadebe, ikere òkè, na itinye ya n’ọrụ.

6 Kwadebe Maka Ha: Wepụta oge iji na-akwadebe mgbe nile maka nzukọ. Ekwela ka ọrụ ụlọ akwụkwọ, ọrụ nwa oge, ma ọ bụ ihe omume ntụrụndụ napụ gị oge dị gị mkpa iji tụlee ihe ndị a ga-atụle ná nzukọ ọ bụla tupu oge eruo. Inwe usoro ihe omume dị mma na-aba uru. Nke mbụ, gbasoo usoro ọgụgụ Bible kwa izu maka Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Ọ na-ewe nanị minit ole na ole kwa ụbọchị iji gụọ ma tụgharịa uche n’isiakwụkwọ ndị e kenyere. Wepụta oge iji kwadebe maka Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ na Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche. Ụfọdụ na-eme nke a ọ dịkarịa ala otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ tupu e nwee nzukọ ndị ahụ. Ruo n’ókè o kwere mee, mee otu ihe ahụ maka ihe omume ndị e dokwara ná Nzukọ Ije Ozi kwa izu.

7 Kere Òkè na Ha: Bible na-asị na a hụrụ Jisọs n’ụlọ nsọ mgbe ọ dị afọ 12, ka ọ na-ege ntị, na-ajụ ajụjụ, ma na-azakwa ajụjụ. (Luk 2:46, 47) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, o tinyere onwe ya dum. Ị ga-erite uru ná nzukọ karị mgbe i tinyere mgbalị ikere òkè na ha.—Ilu 15:23.

8 Ọ dị gị mkpa itinye uche nke ọma n’ihe a na-akụzi ná nzukọ. Mgbe ụfọdụ, ige ntị n’okwu na-esi ike karịa ikwu ya ekwu. N’ihi gịnị? Uche gị pụrụ ịdị na-awagharị mgbe onye ọzọ na-ekwu okwu. Olee otú ị pụrụ isi lụsoo nke a ọgụ? Site n’idetu ihe. Detuo isi ihe ndị dị mkpa, bụ́ ndị ị ga-achọ izo aka na ha mgbe e mesịrị. Idetu ihe ga-enyere gị aka itinye uche n’ihe omume ahụ. Ọzọkwa, sapeta akụkụ akwụkwọ nsọ ma soro na-agụ ha mgbe ọkà okwu na-agụ ha.

9 Tụkwasị na nke ahụ, mee ka ọ bụrụ ihe mgbaru ọsọ gị ikere òkè ná ntụle ajụjụ na azịza ọ bụla e nwere ná nzukọ. Ị ga-erite uru ọbụna karị ma ọ bụrụ na i chebara ihe ị chọrọ ikwu echiche nke ọma. Ilu 15:28 na-ekwu, sị: “Obi onye ezi omume na-atụgharị uche n’ịza okwu.”

10 Na-etinye Ihe Ị Na-amụta n’Ọrụ: Nzọụkwụ ikpeazụ bụ ijide n’aka na ihe ị na-amụta ‘na-arụsi ọrụ ike n’ime gị.’ (1 Tesa. 2:13) Ka ị na-etinye isi ihe ndị mara mma ị na-amụta ná nzukọ ọ bụla n’ọrụ, ị ga-abịarukwu Jehova Chineke nso. Ọ ga-abụ onye dị adị nye gị, ị ga-enweta ọṅụ na afọ ojuju dị ukwuu ka ị “na-ejegharị n’eziokwu ahụ,” na-eme ya ka ọ bụrụ nke gị.—3 Jọn 4.

11 Ka unu, ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị na-eto eto, na-akwadebe mgbe nile maka nzukọ, na-ekere òkè na ha, ma na-etinye ihe unu na-amụta n’ọrụ, unu ga-anụ ụtọ nzukọ ndị ahụ n’ụzọ zuru ezu. N’otu oge ahụ, unu ga-enweta abamuru nile unu pụrụ inweta site na ha. A ga-ewusi okwukwe unu ike, tinyekwara mkpebi unu iguzosi ike n’ezi ihe nye Nna unu nke eluigwe, bụ́ Jehova.—Abụ Ọma 145:18.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya