Jiri Mpempe Akwụkwọ Mee Ihe nke Ọma
1 Mpempe akwụkwọ ọgbakọ na-aba uru iji gwa ndị nọ n’ógbè adres Ụlọ Nzukọ Alaeze na oge ziri ezi maka nzukọ. Ọ ga-adị mma ịhapụrụ onye ọ bụla ị kpọtụụrụ otu. Iji mee nke a, ọgbakọ ọ bụla kwesịrị inwe mpempe akwụkwọ buru ibu. Maka ọgbakọ ndị na-agbanwe oge nzukọ kwa afọ, na January, e kwesịrị ịtụ ọda mpempe akwụkwọ ọhụrụ n’October tupu o ruo n’afọ ọ bụla ka e wee nwee ndị nwere oge nzukọ ọhụrụ mgbe nile. A ga-eji fọm Handbill Request mee ihe maka nzube a. Ozugbo unu nwere ha, olee otú a pụrụ isi jiri mpempe akwụkwọ mee ihe n’ụzọ kasị mma?
2 Ọtụtụ ndị nkwusa na-achọpụta na inye mmadụ otu bụ ụzọ dị irè iji kọwaa onwe ha ma malite mkparịta ụka. Igosi usoro ihe omume nke nzukọ ma ọ bụ ozi dị n’azụ ya pụrụ imeghe ụzọ ikwurịta okwu banyere ọrụ anyị na nzube ya. Ndị mụrụ ụmụ pụrụ ime ka ụmụ ha ndị obere kere òkè site n’ime ka ha nye mpempe akwụkwọ n’ọnụ ụzọ. Ndị nkwusa na-ekere òkè n’igba àmà site n’ide akwụkwọ ozi kwesịrị itinye mpempe akwụkwọ n’ime akwụkwọ ozi ha ma kpọọ onye ahụ okù ịbịa nzukọ. Ọ pụrụ ịbụ na e nwere ike ịhapụ mpempe akwụkwọ n’ụlọ ndị na-anọghị n’ụlọ, ọ bụrụhaala na e leziri anya tinye ha n’okpuru ụzọ ebe anya na-agaghị ahụ ha ma ọlị.
3 Mpempe akwụkwọ abụrụwo ihe e ji eme ihe iji duru ndị nwere obi eziokwu gaa n’eziokwu. Otu ahụmahụ na-akọ banyere otu nwanyị onye, n’ihi mpempe akwụkwọ, mezuru ọchịchọ ọ nọ na-enwe kemgbe ịghọta Bible. Mgbe o jisịrị abalị kpegara Chineke ekpere, di na nwunye bụ́ Ndịàmà kụrụ mgbịrịgba ụzọ ya n’ụtụtụ. N’ilepụ anya site n’oghere e si elepụ anya, o kwuru na ya apụghị imeghe ụzọ. Ndịàmà ahụ si n’okpuru ụzọ fanye mpempe akwụkwọ. Ọ gụrụ, sị: “Mara Bible Gị.” Ọ hụrụ ya wee meghe ụzọ. A malitere ọmụmụ ihe ozugbo, e mekwara ya baptism ka e mesịrị. N’eledaghị ike nke mmụọ Chineke anya mgbe ọ bụla, ka anyị jiri mpempe akwụkwọ na-eme ihe mgbe nile ka anyị na-ejezu ozi anyị.