Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 2/98 p. 3-6
  • Ịgbara Ndị Asụsụ na Okpukpe Nile Àmà

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịgbara Ndị Asụsụ na Okpukpe Nile Àmà
  • Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịgbara Ndị Na-asụ Asụsụ Ọzọ Àmà
  • Ịgbara Ndị Nọ n’Okpukpe Ndị Na-abụghị nke Ndị Kraịst Àmà
  • Ikwusara Ndị Na-asụ Asụsụ Ọzọ Ozi Ọma
    Ozi Alaeze Anyi—2009
  • Unu Nwere Ike Ịga Chọọ Ha Tupu Unu Agaa Ozi Ọma
    Ozi Alaeze Anyi—2012
  • Ochịchọ Ihe A Kpọrọ Mmadụ Na-achọ Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Gịnị Ka Ị Ga-agwa Onye Alakụba?
    Ozi Alaeze Anyi—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1998
km 2/98 p. 3-6

Ịgbara Ndị Asụsụ na Okpukpe Nile Àmà

1 Ndị Kraịst na narị afọ mbụ ji ịnụ ọkụ n’obi gbaara ndị na-asụ asụsụ ndị ọzọ ndị na-ekpekwa okpukpe dị iche iche àmà. N’ihi ya, “ka ọ na-erule afọ 100 ikekwe ógbè ọ bụla dị Mediterranean nso nwere ógbè ndị Kraịst bi n’ime ya.”—History of the Middle Ages.

2 Na Nigeria, ọtụtụ mmadụ na-asụ asụsụ ndị ọzọ na-abụghị Bekee. Ọtụtụ ìgwè mmadụ na-ekpe okpukpe dị iche iche. N’ihi inwe asụsụ na okpukpe dị iche iche, ọ bụ nnọọ ihe ima aka ịmata otú a ga-esi soro ndị nile dị otú ahụ kparịta ụka ma gbaara ha àmà mgbe anyị zutere ha. Ya bụ, anyị pụrụ inwe ókèala ndị ozi ala ọzọ n’ógbè anyị. Olee otú anyị pụrụ isi gbasoo iwu Jisọs “ikwusara ụmụ mmadụ ozi ọma na ịgba àmà zuru ezu” (NW) nye ndị asụsụ na okpukpe nile?—Ọrụ 10:42.

Ịgbara Ndị Na-asụ Asụsụ Ọzọ Àmà

3 Imeri Ihe Mgbochi nke Asụsụ: Obi abụọ adịghị ya na ọtụtụ ndị na-amụta ihe ngwa ngwa karị, na-enwekwa nghọta miri emi karị mgbe a kuziiri ha ihe n’asụsụ ala ha. “N’ihi ozi ọma” na ka ha wee ‘ghọọ ndị na-enwekọ ya,’ ọtụtụ ụmụnna nwoke na nwanyị amụwo asụsụ ọzọ. (1 Kọr. 9:23) Ọ bụ ezie na otu nwanyị na-asụ Chinese so n’ụzọ magazin otu nwanna nwanyị na-asụ Bekee ruo ọtụtụ afọ, nwanyị ahụ ekweghị ka a mụọrọ ya Bible ruo mgbe nwanna nwanyị ọzọ, onye nọ na-amụ Chinese, nyefere ya akwụkwọ n’asụsụ ahụ. A nakweere ya na ọmụmụ ihe ozugbo. Ihe butere ọdịiche nile bụ mgbalị nke nwanna nwanyị nke abụọ ikwu okwu ole na ole n’asụsụ nwanyị ahụ.—Tụlee Ọrụ 22:2.

4 Ezi ihe mere Ụlọ Nche November 1, 1992, ji kwuo okwu a, sị: “Ịmụ asụsụ mba ọzọ abụghị nanị na ọ ga-ewulite ikike ụbụrụ nke ndị na-eto eto kamakwa ọ ga-eme ka ha baara nzukọ Jehova uru karị.” Ọtụtụ ndị òtù ezinụlọ Betel n’ọtụtụ mba amalitewo ọrụ nke ịmụ asụsụ ọhụrụ. N’ụzọ dị otú a, ụmụnna nwoke enyewo aka karịsịa n’ọgbakọ ebe ọ dị ha mkpa idu ndú. Ọ bụrụ na ị maara asụsụ ọzọ ma ọ bụ ọ bụrụ na ị dị njikere ịmụ asụsụ ọzọ, gị onwe gị kwa nwere ike inyere ọgbakọ ma ọ bụ ìgwè na-asụ asụsụ ala ọzọ aka.—Mat. 9:37, 38.

5 Otu nwanna nwoke na Florida, U.S.A., onye mụtara Vietnamese tupu ọ bata n’eziokwu na-enwe nnukwu ọṅụ ugbu a n’iso ndị na-asụ Vietnamese kerịta ozi ọma ahụ. Iji wepụtakwuo onwe ya iji were ọmụma ọ maara asụsụ ahụ gbaa àmà, ọ kwagara ezinụlọ ya n’ime ime obodo ebe e nwere mkpa ka ukwuu n’ubi ndị na-asụ Vietnamese. Kemgbe o mere nke ahụ, ọ na-enwe nnọọ ihe ịga nke ọma n’ịmụrụ ọtụtụ ndị si Vietnam Bible.

6 Otu nwanna nwanyị onye ọsụ ụzọ na California, U.S.A., zutere ọtụtụ ndị ntị chiri n’ókèala ya. O kpere ekpere maka enyemaka Jehova ịchọta onye pụrụ ịkụziri ya asụsụ ogbi ka o wee kụziere ha eziokwu. Otu ụbọchị ka ọ na-azụta ihe ná nnukwu ụlọ ahịa dị n’ógbè ya, otu nwa agbọghọ ntị chiri jekwutere ya wee dee ihe n’akwụkwọ na-arịọ ya inyere ya aka ịchọta otu ngwá ahịa. Mgbe o nyesịịrị ya aka ịchọta ya, onye ọsụ ụzọ ahụ dere ihe n’akwụkwọ na-egosi ọchịchọ ya ịmụ asụsụ ogbi iji nyere ndị ntị chiri n’ógbè ahụ aka. Mgbe ahụ nwanyị ahụ ntị chiri dere, sị, “Gịnị mere i ji chọọ inyere ndị ntị chiri aka?” Nwanna nwanyị ahụ deghachiri, sị: “Abụ m otu n’ime Ndịàmà Jehova, achọkwara m inyere ndị ntị chiri aka ịghọta Bible. Obi ga-adị m ụtọ ịkụziri gị Bible ma ọ bụrụ na ị ga-akụziri m asụsụ ogbi.” Nwanna nwanyị ahụ na-ekwu, sị: “Ị pụghị iche n’echiche ọṅụ m mgbe ọ sịrị, ‘Ọ dị mma.’” Nwanna nwanyị ahụ gara n’ụlọ nwanyị ahụ kwa uhuruchi ruo izu isii. Ọ mụtara asụsụ ogbi, nwanyị ahụ ntị chiri mụtakwara eziokwu e wee mee ya baptism! Nke ahụ mere ihe karịrị afọ 30 gara aga, nwanna nwanyị ahụ ka nọkwa na-agbara ndị ntị chiri àmà, ugbu a, ọ nọkwa n’ọgbakọ asụsụ ogbi.

7 Ọ bụrụ na ị na-asụ asụsụ ọzọ were were ma nwee ọchịchọ, nweekwa ike ịkwaga ebe mkpa ka ukwuu n’ubi ahụ, gịnị ma gị na ndị okenye n’ọgbakọ kwurịta maka ya. Ọ bụrụ na ha echee na i ruru eru maka nzọụkwụ ahụ, jụọ onye nlekọta sekit ma ọ dị ebe dị nso ị ga-eje ozi. Ma e nweghị, ị pụrụ idetara Society akwụkwọ, ọ bụrụhaala na ndị okenye zitekwuru akwụkwọ nke ha na-akọwa ihe ha maara maka iru eru na nkà gị n’asụsụ.—Lee Ụlọ Nche August 15, 1988, peji nke 21-23.

8 Iji Ngwá Ọrụ E Nyere Na-eme Ihe: Akwụkwọ anyị dị n’ọtụtụ asụsụ Nigeria na n’asụsụ mba ọzọ. Ọ ga-adị mma ịchịrị traktị ma ọ bụ broshuọ Na-achọ n’asụsụ ndị a na-asụ n’ókèala gị. Ọ bụrụ na o doro anya na Bekee abụghị asụsụ ala nna mmadụ, jụọ ya asụsụ ndị ọ na-agụ. Nke a pụrụ ime ka nhọrọ gị nke akwụkwọ ndị ị ga-enyefe hie nne. Dị ka ihe atụ, onye na-asụ Urdu nwekwuru ike na-agụ Arabic.

9 Ọ bụrụgodi na ị dịghị asụ asụsụ onye i zutere n’ọrụ ịgba àmà gị, ị ka nwere ike iche ozi ọma ahụ n’ihu ya. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’iji akwụkwọ nta bú Good News for All Nations eme ihe. O nwere ozi dị nkenke e biri n’asụsụ 59. Dị ka ntụziaka dị na peji nke 2 nke akwụkwọ ahụ na-akọwa, mgbe ị chọpụtasịrị asụsụ onye nwe ụlọ, hapụ ya ka ọ gụpụta ihe ọmụma ahụ e biri ebi na peji kwesịrị ekwesị n’akwụkwọ nta ahụ. Mgbe ọ gụpụtasịrị ya, gosi ya mbipụta dị asụsụ ya. Ọ bụrụ na i nweghị, gosi ya mbipụta ahụ na Bekee. Gosi na ị ga-agbalị iji akwụkwọ e dere n’asụsụ ya lọghachite. Jụọ ya aha ya, detuo ya na adres ya. Ikekwe ị pụrụ inye ọgbakọ ma ọ bụ ìgwè dịkarịsịrị nso maka asụsụ ahụ ihe ọmụma ahụ. Ọ bụrụ na ọ dịghị onye na-asụ asụsụ ahụ ga-eweghara nleta ahụ, ọ pụrụ ịbụ na ị ga-enwe ike ịnakwere ihe ịma aka ahụ, ikekwe ọbụna na-amụrụ onye ahụ ihe site n’ịdị na-esonye na mbipụta nke Bekee.—1 Kọr. 9:19-23.

Ịgbara Ndị Nọ n’Okpukpe Ndị Na-abụghị nke Ndị Kraịst Àmà

10 Inwe ihe ọmụma ụfọdụ nke okpukpe mmadụ na-enyere anyị aka ịgba àmà dị irè banyere Alaeze Chineke. Akwụkwọ bụ́ Mankind’s Search for God na-enye anyị nghọta nke okpukpe ndị bụ isi dị n’ụwa ka anyị wee ghọta nkwenkwe ụmụ mmadụ nke ọma iji nyere ha aka inweta ihe ọmụma nke eziokwu.

11 Igbe dị na peji nke ikpeazụ nke ihe ntinye a na-enye ndepụta mbipụta ndị dị ugbu a ndị nzukọ Jehova bipụtaworo iji gbaara ndị na-abụghị ndị Kraịst àmà. Site n’ịgụ akwụkwọ ndị a, anyị na-aghọta otú anyị ga-esi were ozi ọma ahụ jekwuru ụmụ mmadụ. Ihe a na-agaghị echezọ dị ka ihe enyemaka bụ akwụkwọ nta Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible. Peji nke 13-16 nke akwụkwọ ahụ na-atụ aro ndị dị irè n’ụzọ a ga-esi zaghachi ndị Buddha, ndị Hindu, ndị Juu na ndị Alakụba.

12 Ilezi Anya n’Ihe Ị Na-ekwu: Anyị kwesịrị ilezi anya ịghara iwe ndị okpukpe ụfọdụ ịbụ otu site n’ikwubi na nkwenkwe nke aka ha bụ nnọọ otu ihe dị ka ndị ọzọ nọ n’okpukpe ha. Kama nke ahụ, gbalịa ịghọta otú onye ị na-agwa okwu si eche echiche. (Ọrụ 10:24-35) Dị ka onye Alakụba, a zụlitere Salimoon ikwere na Koran bụ okwu Chineke. Ma ọ pụghị ma ọlị ịnakwere ozizi ndị Alakụba na Chineke kasị dị ebere ga-ata ụmụ mmadụ ahụhụ na hel na-ere ọkụ. Otu ụbọchị, Ndịàmà Jehova kpọrọ ya òkù ịbịa otu nzukọ. N’ịmata eziokwu ahụ ozugbo, o ji obi ụtọ eje ozi ugbu a dị ka okenye n’ọgbakọ ndị Kraịst.

13 Mgbe a na-agbara ndị na-enweghị nkwenkwe ndị Kraịst àmà, ọ dị anyị mkpa ilezi anya ka ụzọ anyị sị agwa ha okwu ghara ime ka anyị tụfuo ohere iji soro ha kparịta banyere ozi ọma ahụ. (Ọrụ 24:16) Ndị òtù okpukpe ụfọdụ na-enwe oké mmetụta banyere mgbalị ọ bụla ịtọghata ha pụọ n’okpukpe ha. Ya mere mụrụ anya ịchọta isi ihe ndị unu ga-ekwekọrịta na ha iji wee dọta ha n’okwu eziokwu dum nke Okwu Chineke. Ndị yiri atụrụ ga-anabata ụzọ njekwu dị obi ọma na nkọwa doro anya nke eziokwu ahụ.

14 Nhọrọ okwu anyị bụkwa ihe dị mkpa a ga-atụle, ma ọ bụghị otú ahụ anyị ewere ihe na-enweghị isi mee ka ụmụ mmadụ ghara ịnụ ozi anyị. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na i gosi onwe gị ozugbo dị ka onye Kraịst, onye na-ege gị ntị pụrụ iwere gị na-egbughị oge dị ka onye si chọọchị Krisendọm, nke pụrụ iwelite ihe mgbochi. Ọ pụkwara ịba uru ịkpọ Bible “Akwụkwọ Nsọ” ma ọ bụ “ihe odide ndị dị nsọ.”—Mat. 21:42; 2 Tim. 3:15.

15 Ọ bụrụ na i zute onye na-adịghị ekpe okpukpe ndị Kraịst ma chee na ị dịghị njikere ịgbara ya àmà ozugbo, jiri ohere ahụ mata ya nanị, hapụrụ ya otu traktị, ma gbanwerịtanụ aha. Mgbe ahụ laghachi n’otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ, mgbe ị kwadosịrị nke ọma maka ịgba àmà.—1 Tim. 4:16; 2 Tim. 3:17.

16 Ịgbara Ndị Buddha Àmà: (Lee isi nke 6 na Mankind’s Search for God.) Nkwenkwe ndị Buddha na-adị iche hie nne site n’otu onye òtù ruo onye ọzọ. Kama ịkwado ịdị adị nke Onye Okike bụ́ onye, Okpukpe Buddha na-ewere nwoke India, Buddha Gautama, nke narị afọ nke isii T.O.A., dị ka onye a ga-eṅomi n’okpukpe. Mgbe mbụ ọ hụrụ onye ahụ na-adịghị, agadi nwoke, na onye nwụrụ anwụ, ihe ndụ pụtara chegburu Gautama. ‘À mụrụ ụmụ mmadụ nanị ka ha taa ahụhụ, kaa nká, ma nwụọ?’ ka o chere. N’ezie, anyị pụrụ ịza ndị Buddha nwere obi eziokwu, ndị chọrọ ịmata azịza ha ajụjụ ndị ahụ.

17 Mgbe ị na-agwa ndị Buddha okwu, jiri nanị ozi na-enye olileanya na eziokwu doro anya ndị a na-ahụ n’akwụkwọ kasị akwụkwọ nsọ nile, bụ́ Bible mee ihe. Dị ka ọtụtụ ndị ọzọ, ndị Buddha nwere oké mmasị n’udo, omume ọma, na ndụ ezinụlọ, ha na-anabatakarịkwa nkwurịta okwu n’isiokwu ndị a. Nke a pụrụ iduga gị n’ime ka Alaeze ahụ pụta ìhè dị ka ezi ngwọta nye nsogbu ihe a kpọrọ mmadụ.

18 N’obodo ụfọdụ na United States, e nwewo oké nnubata nke ndị China ndị kwere n’okpukpe Buddha na nkà ihe ọmụma Ọwụwa Anyanwụ ndị ọzọ. Ọtụtụ bụ ụmụ akwụkwọ na-aga mahadum na United States. Mgbe otu nwanna nwanyị na Montana hụrụ nwoke China n’ebe a na-ere ihe e ji esi nri, o nyefere ya traktị e dere n’asụsụ ya ma wepụta onwe ya ịmụrụ ya Bible. O kwuru, sị: “Ị̀ na-ekwu maka Bible Nsọ? Anọwo m na-achọ nke a eri ndụ m nile!” O bidoro ịmụ ihe n’izu ahụ, malitekwa ịbịa nzukọ nile.

19 Ruo ihe karịrị afọ iri, otu nwanna nwanyị bụ́ ọsụ ụzọ na Nevada anọwo na-akụziri ụmụ akwụkwọ na-asụ Chinese eziokwu. Mgbe ọ na-arụ ọrụ n’otu ụlọ nwere ọnụ ụlọ asatọ nke ụmụ akwụkwọ ndị a bi, o kpegaara Jehova ekpere inyere ya aka ịmalite ọmụmụ ihe n’ọnụ ụlọ nke ọ bụla. N’ime izu abụọ, ọ na-amụrụ ọ dịkarịa ala otu nwata akwụkwọ ihe n’ọnụ ụlọ nke ọ bụla. Ụzọ njekwu na-adịrị ya irè bụ ikwu na ya achọpụtawo otu ihe nchegbu na-adịkarị n’etiti ụmụ akwụkwọ—ha nile chọrọ udo na obi ụtọ. Mgbe ahụ ọ jụọ ma nke a ọ̀ bụkwu nchegbu ha. Ha na-ekwekarị. Ọ na-eduga uche ha na broshuọ bụ Lasting Peace and Happiness—How to Find Them, nke e mere maka ndị China. Mgbe o nwesịrị ọmụmụ ihe nanị ugboro ise, otu nwata akwụkwọ gwara ya na ọ nọwo na-achọ eziokwu eri ogologo oge ma na ya achọtawo ya ugbu a.

20 Ịgbara Ndị Hindu Àmà: (Lee isi nke 5 na Mankind’s Search for God.) Okpukpe Hindu enweghị nkwenkwe a kapịrị ọnụ. Nkà ihe ọmụma ya dị nnọọ mgbagwoju anya. Ndị Hindu nwere nkwenkwe atọ n’ime otu maka chi ha bụ́ isi bụ́ Brahman (Brahma Onye Okike, Vishnu Onye Nchebe, na Siva Onye Mbibi). Nkwenkwe ná mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ dị mkpa n’ozizi ha nke ịlọ ụwa, nke na-eme ka ndị Hindu na-ele ndụ anya dị ka ihe dabeere n’akara aka. (Lee akwụkwọ Reasoning, peji nke 317-321, na Ụlọ Nche, May 15, 1997, peji nke 3-8.) Okpukpe Hindu na-akụzi ikwe ibe nọrọ, na okpukpe nile na-eduga n’otu eziokwu.

21 Ụzọ a ga-agbaso n’ịgbara onye Hindu àmà bụ ịkọwa olileanya anyị dabeere na Bible nke ibi ruo mgbe ebighi ebi n’izu okè mmadụ n’elu ala tinyere azịza ndị na-eju afọ Bible na-enye maka ajụjụ ndị dị mkpa na-eche ihe nile a kpọrọ mmadụ ihu.

22 Ịgbara Ndị Juu Àmà: (Lee isi nke 9 na Mankind’s Search for God.) N’adịghị ka okpukpe ndị ọzọ na-abụghị ndị Kraịst, okpukpe ndị Juu gbadoro mkpọrọgwụ n’akụkọ ihe mere eme, ọ bụghị n’akụkọ ifo. Site n’Akwụkwọ Nsọ Hibru e dere n’ike mmụọ nsọ, e nwere ihe njikọ dị mkpa n’ọchịchọ ihe a kpọrọ mmadụ na-achọ ezi Chineke ahụ. Ma, n’ekwekọghị n’Okwu Chineke, ozizi bụ́ isi nke Okpukpe ndị Juu oge a bụ nkwenkwe ná mkpụrụ obi mmadụ na-adịghị anwụ anwụ. A pụrụ iguzobe ihe e kwekọrịtara na ya site n’ikwusi ike na anyị na-efe Chineke Abraham na site n’ikwere na anyị na-eche otu ihe isi ike ihu n’ụwa taa.

23 Ọ bụrụ na i zute onye Juu na-enweghị okwukwe na Chineke, ịjụ ma ọ bụ otú ọ na-eche kemgbe pụrụ inyere gị aka ịghọta ihe ga-amasị ya karịsịa. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ịbụ na ọ nụtụbeghị nkọwa na-eju afọ maka ihe mere Chineke ji kwere ka nhụjuanya dịrị. A pụrụ ịgba ndị Juu nwere obi eziokwu ume ịtụleghachi nkọwa Jisọs dị ka Mesaịa, ọ bụghị site ná nkọwahie nke Krisendọm na-akọwahie ya, kama n’ụzọ ndị Juu dere Akwụkwọ Nsọ Grik si gosipụta ya.

24 Ịgbara Ndị Alakụba Àmà: (Lee isi nke 12 na Mankind’s Search for God.) Ndị Alakụba bụ ndị òtù Muhammad, nke gụnyere ikwere n’Allah dị ka otu chi ha na Muhammad (570-632 O.A.) dị ka onye amụma ikpeazụ ya na nke kasị mkpa. N’ihi na ha ekweghị na Chineke nwere nwa, ndị Alakụba na-ele Jisọs Kraịst anya dị ka onye amụma dị ala nke Chineke, ọ dịghị ihe ọzọ. Koran, nke na-erubeghị afọ 1,400, na-ehota ma Akwụkwọ Nsọ Hibru ma Akwụkwọ Nsọ Grik. E nwere myirịta ndị siri ike dị n’etiti Alakụba na Okpukpe Katọlik. Okpukpe abụọ ahụ na-ezi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi mmadụ, ọnọdụ nke ịta ahụhụ nwa oge, na ịdị adị nke hel na-ere ọkụ.

25 Otu ihe doro anya a ga-ekwekọrịta na ya bụ nkwenkwe anyị na e nwere nanị otu ezi Chineke nakwa na e ji ikike ya dee Bible. Onye ji nlezi anya gụọ Koran ahụwo izo aka gaa na Torah, Abụ Ọma, na Oziọma ịbụ okwu Chineke, ọ gụtụwokwa na e kwesịrị ile ha anya n’ụzọ dị otú ahụ ma gee ha ntị. N’ihi ya, ị pụrụ iwepụta onwe gị ịmụrụ onye ahụ ihe ndị a.

26 Ụzọ iche ihe n’ihu a pụrụ ịdị irè maka onye sịrị na ya bụ onye Alakụba: “Agwabeghị m ọtụtụ ndị Alakụba okwu, ma agụwo m ihe banyere ozizi ole na ole n’okpukpe unu n’akwụkwọ a. [Sapeta peji nke 15 n’akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible.] O kwuru na i kwere na Jisọs bụ onye amụma ma na Muhammad bụ onye amụma ikpeazụ nakwa nke kasị mkpa. Ì kwekwuru na Mosis bụ ezi onye amụma? [Nye ohere maka nzaghachi.] M̀ pụrụ igosi gị ihe Mosis mụtara site n’aka Chineke banyere aha nke aka Ya?” Mgbe ahụ gụpụta Ọpụpụ 6:2, 3. Ná nletaghachi, ị pụrụ ịtụle isiokwu nta sị “One God, One Religion” [Otu Chineke, Otu Okpukpe], na peji nke 13 n’akwụkwọ nta bụ́ The Time for True Submission to God.

27 Taa, ọtụtụ na-eme omume n’ikwekọ n’okwu Aịsaịa 55:6, nke na-agụ, sị: “Chọọnụ Jehova mgbe a na-achọta Ya, kpọkuonụ Ya mgbe Ọ nọ nso.” Nke a metụtara ndị nile nwere obi eziokwu, n’agbanyeghị asụsụ ha na-asụ ma ọ bụ okpukpe ha. Anyị pụrụ inwe obi ike na Jehova ga-agọzi mgbalị anyị ka anyị na-agbalị ịga “mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ.”—Mat. 28:19.

[Igbe dị na peeji nke 6]

Akwụkwọ Ndị E Mere Maka Ndị Na-abụghị Ndị Kraịst

Ndị Buddha

In Search of a Father (Akwụkwọ nta)

“Lee! Ana M Eme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ” (Broshuọ)

Ndị China

Lasting Peace and Happiness—How to Find Them (Broshuọ)

Ndị Hindu

From Kurukshetra to Armageddon—And Your Survival (Akwụkwọ nta)

Our Problems—Who Will Help Us Solve Them? (Broshuọ)

The Path of Divine Truth Leading to Liberation (Akwụkwọ nta)

Victory Over Death—Is It Possible for You? (Akwụkwọ nta)

Why Should We Worship God in Love and Truth? (Broshuọ)

Ndị Juu

A Peaceful New World—Will It Come? (Traktị nke 17)

Jehovah’s Witnesses—What Do They Believe? (Traktị nke 18)

Will There Ever Be a World Without War? (Broshuọ)

Ndị Alakụba

How to Find the Road to Paradise (Traktị)

The Time for True Submission to God (Akwụkwọ nta)

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya